Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Bụ Jizọs Kraịst?

Ònye Bụ Jizọs Kraịst?

 Mụta Ihe n’Okwu Chineke

Ònye Bụ Jizọs Kraịst?

Isiokwu a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla, ọ ga-egosikwa gị ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị iji nweta azịza ha. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.

1. Ònye bụ Jizọs Kraịst?

Jizọs dị iche n’ụmụ mmadụ ndị ọzọ n’ihi na ọ bụ mmụọ dịrị ndụ n’eluigwe tupu a mụọ ya n’ụwa. (Jọn 8:23) Ọ bụ onye mbụ Chineke kere, o nyekwara aka n’ike ihe niile ọzọ. Ọ bụ naanị ya bụ onye Jehova ji aka ya kee, ọ bụkwa ya mere e ji akpọ ya Ọkpara Chineke “mụrụ naanị ya.” Jizọs bụkwa Ọnụ Na-ekwuru Chineke, n’ihi ya, a na-akpọkwa ya “Okwu ahụ.”—Jọn 1:1-3, 14; gụọ Ilu 8:22, 23, 30; Ndị Kọlọsi 1:15, 16.

2. Gịnị mere Jizọs ji bịa n’ụwa?

Chineke zitere Ọkpara ya site n’isi n’eluigwe bufee ndụ ya n’akpa nwa nke nwa agbọghọ Juu na-amaghị nwoke bụ́ Meri. Ya mere, ọ bụghị mmadụ bụ nna Jizọs. (Luk 1:30-35) Jizọs bịara n’ụwa (1) iji kụzie eziokwu banyere Chineke, (2) iji setịpụ ihe nlereanya n’ime uche Chineke, na (3) iji nye ndụ ya zuru okè ka ọ bụrụ “ihe mgbapụta.”—Gụọ Matiu 20:28; Jọn 18:37.

3. Gịnị mere ihe mgbapụta ji dị anyị mkpa?

Ihe mgbapụta bụ ụgwọ a kwụrụ iji mee ka a tọhapụ onye e ji eji. Ọnwụ na nká esoghị n’ihe Chineke zubeere ụmụ mmadụ ná mmalite. Olee otú anyị si mara nke a? Chineke gwara mmadụ mbụ, bụ́ Adam, na ọ bụrụ na o mee ihe Baịbụl kpọrọ mmehie, na ọ ga-anwụ. A sị na Adam emehieghị, ọ garaghị anwụ. Ọ bụ ezie na Adam dịrị ndụ ruo ọtụtụ narị afọ mgbe o mechara mmehie, ọ malitere ịnwụ n’ụbọchị ahụ o nupụụrụ Chineke isi. (Jenesis 2:16, 17; 5:5) Adam bufeere ụmụ ya niile mmehie na ụgwọ ọrụ ya, bụ́ ọnwụ. Ya mere, ọnwụ si n’aka Adam “bata” n’ụwa nke ụmụ mmadụ. Ọ bụ ya mere ihe mgbapụta ahụ ji dị anyị mkpa.—Gụọ Ndị Rom 5:12; 6:23.

 4. Gịnị mere Jizọs ji nwụọ?

Ònye ga-akwụli ụgwọ ihe mgbapụta ahụ iji napụta anyị n’aka ọnwụ? Mgbe onye ọ bụla n’ime anyị nwụrụ, ọ na-akwụ naanị ụgwọ mmehie nke ya. O nweghị mmadụ ọ bụla na-ezughị okè nwere ike ịkwụ ụgwọ mmehie nke ndị ọzọ.—Gụọ Abụ Ọma 49:7-9.

Ebe Jizọs na-eketaghị ezughị okè n’aka nna bụ́ mmadụ, ọ nwụrụ maka mmehie nke ndị ọzọ, ọ bụghị mmehie nke ya. Chineke zitere Ọkpara ya ka ọ nwụọ n’ihi anyị iji gosi ịhụnanya pụrụ iche O nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ. Jizọs gosikwara na ọ hụrụ anyị n’anya site n’irubere Nna ya isi na inye ndụ ya maka mmehie anyị.—Gụọ Jọn 3:16; Ndị Rom 5:18, 19.

5. Olee ihe Jizọs na-eme ugbu a?

Mgbe Jizọs gwọrọ ndị ọrịa, kpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ ma napụta ndị mmadụ ná nsogbu, o gosiri ihe ọ ga-emecha meere ụmụ mmadụ niile na-erubere Chineke isi. (Luk 18:35-42; Jọn 5:28, 29) Mgbe Jizọs nwụchara, Chineke mere ka ọ dịghachi ndụ dị ka mmụọ. (1 Pita 3:18) Jizọs cheziiri n’aka nri Chineke ruo mgbe Jehova nyere ya ikike ịghọ Eze ga-achị ụwa niile. (Ndị Hibru 10:12, 13) Jizọs bụ Eze na-achị achị n’eluigwe ugbu a, ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụwa na-ekwusakwa ozi ọma ahụ n’ụwa niile.—Gụọ Daniel 7:13, 14; Matiu 24:14.

N’oge na-adịghị anya, Jizọs ga-eji ike o nwere dị ka Eze kwụsị ahụhụ niile na ndị na-akpata ha. Ọtụtụ nde mmadụ ndị nwere okwukwe na Jizọs ma na-erubere ya isi ga-ekpori ndụ na paradaịs n’elu ụwa.—Gụọ Abụ Ọma 37:9-11.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nke a, gụọ GỊnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? isi nke 4 nke akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 17]

Ọtụtụ nde mmadụ ndị nwere okwukwe na Jizọs ma na-erubere ya isi ga-ekpori ndụ na paradaịs n’elu ụwa