Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jizọs Ọ̀ Nwụrụ n’Obe n’Ezie?

Jizọs Ọ̀ Nwụrụ n’Obe n’Ezie?

 Jizọs Ọ̀ Nwụrụ n’Obe n’Ezie?

OTU akwụkwọ nkà ihe ọmụma kwuru, sị: “Obe bụ ihe oyiyi a kacha jiri mara Ndị Kraịst.” Ọtụtụ ihe osise okpukpe na ihe ndị a tụrụ atụ na-egosi ebe a kpọgidere Jizọs n’obe. Olee ihe mere ọtụtụ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst ji eji ihe oyiyi a efe ofufe? Jizọs ọ̀ nwụrụ n’obe n’ezie?

Ọtụtụ ndị ga-egosi gị ebe ihe ha zara dị na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, Bible Nsọ nke Union Version kwuru na mgbe a na-akpọgbu Jizọs, ndị nọ n’ebe ahụ ji Jizọs na-eme ihe ọchị ma gwa ya ka o “si n’elu obe rịdata.” (Matiu 27:40, 42) Ọtụtụ nsụgharị Baịbụl ndị ọzọ kwukwara otu ihe ahụ. Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society kwuru banyere Saịmọn onye Saịrini, sị: “Ndị agha kwagidere ya ka o buru obe Jisọs.” (Mak 15:21) N’amaokwu ndị a, okwu a sụgharịrị “obe” si n’okwu Grik bụ́ staurosʹ. È nwere ezi ihe mere a ga-eji sụgharịa ya otú ahụ? Gịnị ka okwu Grik ahụ pụtara?

Ọ̀ Bụ Obe?

Ọkà mmụta bụ́ onye Gris bụ́ W. E. Vine kwuru na “isi ihe staurosʹ pụtara bụ ogwe osisi ma ọ bụ osisi kwụ ọtọ. Ọ bụ n’osisi dị otú ahụ ka a na-akpọgbu ndị omekome. Site ná mmalite, okwu ahụ bụ́ staurosʹ na ngwaa ya bụ́ stauroō, ya bụ, ịkpọgide n’elu osisi ma ọ bụ n’ogwe osisi, dị iche n’obe ndị okpukpe nke bụ́ ogwe osisi abụọ a tụhiere otu n’elu ibe ya.”

Akwụkwọ bụ́ Imperial Bible-Dictionary kwuru na okwu bụ́ staurosʹ “pụtara ogwe osisi, osisi kwụ ọtọ, ma ọ bụ ókpòrò osisi, bụ́ nke e nwere ike ịkwụwa ihe ọ bụla na ya, ma ọ bụ nke e nwere ike iji gbaa ala ogige.” Akwụkwọ ọkọwa okwu ahụ kwukwara, sị: “O yiri ka ndị Rom hà ghọtadịrị okwu bụ́ crux (okwu Latịn e si na ya nweta obe) ná mmalite dị ka osisi kwụ ọtọ.” N’ihi ya, o jughị anyị anya na akwụkwọ bụ́ The Catholic Encyclopedia kwuru, sị: “Otú o sina dị, o doro anya na n’oge ochie obe bụ osisi kwụ ọtọ a pịrị ọnụ ya apị, nke na-enweghị osisi a tụhiere n’elu ya.”

E nwere okwu Grik ọzọ, bụ́ xyʹlon, nke ndị so dee Baịbụl ji kọwaa ihe e ji gbuo Jizọs. Akwụkwọ bụ́ A Critical Lexicon and Concordance to the English and Greek New Testament kọwara na xyʹlon bụ “ogwe osisi, osisi.” Ọ gara n’ihu ikwu na staurosʹ, dịkwa ka xyʹlon, “bụ naanị osisi kwụ ọtọ ma ọ bụ ogwe osisi ndị Rom ji akpọgbu ndị a sịrị na ha kpọgburu.”

N’ihi nke a, lee ihe Bible Nsọ nke Union Version kwuru n’Ọrụ 5:30: “Chineke nke nna anyị ha mere ka Jizọs si n’ọnwụ bilie, Onye unu onwe unu gburu, na-akwụba Ya n’elu osisi [xyʹlon].” * Nsụgharị Baịbụl ndị ọzọ sụgharịkwara xyʹlon “osisi”  n’agbanyeghị na ha sụgharịrị staurosʹ “obe.” N’Ọrụ 13:29, Baibul Nsọ (Ndezighari Ọhuru) kwuru banyere Jizọs, sị: “Mgbe ha mezuru ihe niile e deworo n’Akwụkwọ Nsọ banyere Ya, ha si n’osisi ahụ [xyʹlon] wedata Ya tọgbọ Ya n’ili.”

N’ihi isi ihe okwu Grik ndị bụ́ staurosʹ na xyʹlon pụtara, akwụkwọ bụ́ Critical Lexicon and Concordance nke e kwuru ihe o kwuru n’elu sịrị: “Okwu abụọ ahụ dị iche n’obe ndị mmadụ maara taa, bụ́ nke anyị si n’ọtụtụ ihe osise mata.” Ya bụ na ihe ndị dere Matiu, Mak, Luk na Jọn kpọrọ staurosʹ eyitụghị ihe ndị mmadụ na-akpọ obe taa. N’ihi ya, ọ dabara nnọọ adaba na Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ dere okwu bụ́ “osisi ịta ahụhụ” na Matiu 27:40-42 na n’ebe ndị ọzọ okwu bụ́ staurosʹ pụtara. N’otu aka ahụ, Baịbụl bụ́ Complete Jewish Bible sụgharịrị ya “osisi nkwụgbu.”

Otú Obe Si Malite

Ọ bụrụ n’ezie na Baịbụl ekwughị na a kpọgburu Jizọs n’elu obe, oleezi ihe mere chọọchị niile na-ekwu na ha na-akụzi ma na-agbaso Baịbụl—Katọlik, Protestant, na Ọtọdọks—ji eji obe achọ ụlọ okpukpe ha mma ma jiri ya mere ihe oyiyi e ji mara okpukpe ha? Olee otú obe si ghọọ nnọọ ihe oyiyi na-ewu ewu?

Azịza ya bụ na ọ bụghị naanị ndị chọọchị na-ekwu na ha na-agbaso Baịbụl na-asọpụrụ obe, kama nke ahụ, ndị na-amatụghị banyere Baịbụl na ndị fere ofufe ogologo oge tupu chọọchị ndị sị na ha bụ nke Ndị Kraịst amalite ịdị na-asọpụkwara ya. Ọtụtụ akwụkwọ okpukpe kwetara na iji ụdị obe dị iche iche efe ofufe malitere nnọọ n’oge gboo. Dị ka ihe atụ, ná mkpụrụ akwụkwọ ndị Ijipt oge ochie yiri ihe e sere ese na n’ihe osise chi ha na chi nwaanyị ha dị iche iche, a na-enwekarị obe yiri mkpụrụ akwụkwọ T nke nwere ihe dị okirikiri n’elu ya. A na-akpọ ya obe nwere ebe a na-ejide ya aka, e chekwara na ọ na-anọchi anya ndụ. Ka oge na-aga, ndị Chọọchị Koptik, bụ́ chọọchị bidoro n’Ijipt, na chọọchị ndị ọzọ malitere nnọọ iji ya efe ofufe.

Akwụkwọ bụ́ The Catholic Encyclopedia kwuru na “obe oge ochie e nwere yiri ka ọ̀ bụ ụdị nke a na-akpọ obe ‘gamma’ (crux gammata), bụ́ nke ihe ndị na-amụ banyere Eshia na ụmụ akwụkwọ na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie kacha jiri mara ya bụ swastika, bụ́ aha a na-akpọ ya n’asụsụ oge ochie nke ndị India bụ́ Sanskrit.” Ọtụtụ ndị Hindu nọ n’India na ndị Buddha nọ n’Eshia niile ji ya fee ofufe, a ka jikwa ya achọ ihe dị iche iche mma ma na-eyi ya eyi n’ebe ndị ahụ taa.

A maghị kpọmkwem mgbe ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst malitere iji obe emere ihe nnọchianya okpukpe ha. Akwụkwọ  bụ́ Vine’s Expository Dictionary of New Testament Words kwuru, sị: “Ka ọ na-erula ọkara narị afọ nke atọ A.D., chọọchị dị iche iche ahapụla ụfọdụ ozizi Ndị Kraịst ma ọ bụ gwagbuo ha. Iji mee ka a na-akwanyekwuru chọọchị ndị ahụ si n’ezi ofufe dapụ ùgwù, a nabatara ndị na-ekpere arụsị n’ime chọọchị n’emeghị ka ha gbanwee okwukwe ha, kwerekwa ka ha jiri ọtụtụ akara na ihe oyiyi ndị ọgọ mmụọ ha na-efe ofufe,” tinyere obe.

Ụfọdụ ndị edemede na-ekwu na ihe malitere ya bụ ihe onye na-efe chi anyanwụ bụ́ Constantine sịrị merenụ n’afọ 312 O.A., mgbe ya gara agha, sị na ya hụrụ ọhụụ ebe obe gbara n’anyanwụ, e dekwasịkwa n’elu ya okwu Latịn ndị bụ́ “in hoc vince” (jiri nke a merie). Oge ụfọdụ ka nke ahụ gasịrị, e sewere ihe oyiyi a sị na ọ bụ nke Ndị Kraịst n’ọkọlọtọ, ọta, na ejiji agha nke ndị agha ya. (E sere ya n’aka ekpe.) E kwuru na a tọghatara Constantine ịghọ Onye Kraịst, n’agbanyeghị na e meghị ya baptizim ruokwa iri afọ abụọ na ise a tọghatachara ya, mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ. Ụfọdụ ndị na-enyo ihe mere o ji ghọọ Onye Kraịst enyo. Akwụkwọ bụ́ The Non-Christian Cross kwuru, sị: “O mere nnọọ ka à ga-asị na ọ na-atọghata Iso Ụzọ Kraịst ịghọ ihe o chere ndị ọ na-achị ga-anabata nke bụ́ okpukpe Katọlik [zuru ụwa ọnụ] kama ime ka onye a tọghatara ikwere ozizi Jizọs Onye Nazaret.”

Kemgbe ahụ, e nweela ụdị obe dị iche iche ndị mmadụ ji efe ofufe. Dị ka ihe atụ, The Illustrated Bible Dictionary gwara anyị na ihe a na-akpọ obe St. Anthony “yiri T, bụ́ nke ụfọdụ ndị chere na e si n’ihe oyiyi chi [ndị Babịlọn] bụ́ Tammuz nweta, nke bụ́ mkpụrụ akwụkwọ bụ́ tau.” E nwekwara obe St. Andrew, bụ́ nke yiri mkpụrụ akwụkwọ X, na ụdị obe onye ọ bụla maara nke nwere ogwe osisi abụọ a tụhiere otu n’elu ibe ya. Ndị mmadụ chere n’ụzọ na-ezighị ezi na nke ikpeazụ a, a kpọrọ obe Latịn, “bụ ihe e ji kpọgbuo Onyenwe anyị.”

Ihe Ndị Kraịst Narị Afọ Mbụ Kweere

Baịbụl gosiri na na narị afọ mbụ, ọtụtụ ndị nụrụ okwu Jizọs ghọrọ ndị kwere ekwe ma kweta na ọ bụ ọnwụ ịchụàjà ya ga-agbapụta ha ná mmehie na ọnwụ. Mgbe Pọl onyeozi kwusachaara ndị Juu nọ na Kọrịnt ozi ọma, gosi na Jizọs bụ Kraịst ahụ, Baịbụl kwuru, sị, “Krispọs, onyeisi oche nke ụlọ nzukọ ghọrọ onye kwere ekwe n’Onyenwe anyị, otú a kwa ka ọ dị ezinụlọ ya dum. Ọtụtụ n’ime ndị Kọrịnt bụ́ ndị nụrụ ya malitere ikwere nakwa ịbụ ndị e mere baptizim.” (Ọrụ 18:5-8) Kama Pọl ịgwa Ndị Kraịst ibe ya ka ha jiri ihe nnọchianya ma ọ bụ ihe oyiyi okpukpe na-efe ofufe, ọ gwara ha ka ha ‘gbaara ikpere arụsị’ na omume ndị ọzọ nwere ihe jikọrọ ha na ikpere arụsị ‘ọsọ.’—1 Ndị Kọrịnt 10:14.

Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na ndị na-eme nchọpụta ahụbeghị ihe ọ bụla gosiri na Ndị Kraịst oge ochie ji obe fee ofufe. Ọ dabara adaba na akwụkwọ bụ́ History of the Cross kwuru ihe otu onye edemede dịrị ndụ n’ọgwụgwụ narị afọ nke iri na asaa dere, bụ́ onye jụrụ, sị: “Obi ọ̀ ga-atọ Jizọs dị ngọzi ụtọ ịhụ ka ndị na-eso ụzọ Ya ji ihe oyiyi nke ihe ahụ a na-akpọgbu mmadụ na ya na-akpa nganga, bụ́ nke [e kwuru na] o ji ndidi tachie obi n’ahụhụ ọ tara n’elu ya n’asọghị ihere, n’agbanyeghị na aka ya dị ọcha?” Gịnị ka ị ga-aza?

Ụdị ofufe Chineke na-anabata anaghị achọ mmadụ iji ihe oyiyi efe ofufe. Pọl jụrụ, sị: “Oleekwa nkwekọrịta ụlọ nsọ Chineke na arụsị nwere?” (2 Ndị Kọrịnt 6:14-16) Ọ dịghị ebe Akwụkwọ Nsọ kwuru ihe na-egosi na Onye Kraịst kwesịrị iji ihe oyiyi nke ihe e ji kpọgbuo Jizọs fee ofufe.—Tụlee Matiu 15:3; Mak 7:13.

Oleezi ihe e ji ama ezi Ndị Kraịst? Ọ bụghị obe ma ọ bụ ihe oyiyi ọ bụla ọzọ, kama ọ bụ ịhụnanya. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:34, 35.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 E ji otú e si ede asụsụ Igbo n’oge a degharịa ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 19]

Ihe ndị dere Matiu, Mak, Luk na Jọn kọwara eyitụghị ihe ndị mmadụ na-akpọ obe taa

[Foto dị na peeji nke 18]

Ihe osise narị afọ nke iri na asaa nke na-egosi onye a kpọgburu n’elu staurosʹ, o sitere na “De Cruce” nke lipsius

[Foto dị na peeji nke 19]

Ihe osise ndị Ijipt e sere n’ahụ́ ájá (ihe dị ka narị afọ nke 14 T.O.A.) nke gosiri obe ansate, ihe na-anọchi anya ndụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

© DeA Picture Library / Art Resource, NY

[Foto dị na peeji nke 19]

Obe gamma nke dị n’Ụlọ Arụsị ndị Hindu dị na Laxmi Narayan

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 20]

E si ya n’akwụkwọ bụ́ The Cross in Tradition, History, and Art (1897)