Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

 Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

“Ozi ọma nke a nke alaeze . . . ”—MATIU 24:14.

MGBE Jizọs na-ezi Ozizi Elu Ugwu ya ahụ a ma ama, ọ kụziri otu ekpere ihe atụ, bụ́ nke nwere arịrịọ ọ rịọrọ Chineke bụ́: “Ka alaeze gị bịa.” Ọtụtụ nde mmadụ bu ekpere ahụ n’isi ma na-ekpeghachi ya ugboro ugboro. Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma kwuru na ọ bụ “ekpere Ndị Kraịst niile na-ekpekarị n’ofufe ha.” N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị na-ekpe ya amaghị ihe Alaeze ahụ bụ ma ọ bụ ihe ọ ga-eme mgbe ọ bịara.—Matiu 6:9, 10.

Nke ahụ ejughị anyị anya. Ndị ndú okpukpe Krisendọm na-akọwa ihe Alaeze ahụ bụ n’ụzọ dị iche iche, bụ́ ndị na-agbagwoju anya ma na-esi ike nghọta. Otu onye dere na Alaeze Chineke bụ “ihe ime mmụọ . . . ihe a na-anaghị ahụ anya nke jikọrọ mmadụ na Chineke dị ndụ . . . , ihe dị n’etiti mmadụ na Chineke nke na-ewetara ndị ikom na ndị inyom nzọpụta.” Onye ọzọ kọwara na ozi ọma Alaeze bụ “ntụziaka metụtara chọọchị.” Akwụkwọ bụ́ Catechism of the Catholic Church kwukwara, sị: “Alaeze Chineke [bụ] ezi omume na udo na ọṅụ n’ime Mmụọ Nsọ.”

Ị ga-ahụ ebe a kọwara ya otú doro anya karịa na peeji nke 2 nke magazin a. O kwuru, sị: “Alaeze Chineke, nke bụ́ ọchịchị dị n’eluigwe, ga-eme ka ajọ omume niile kwụsị n’oge na-adịghị anya, meekwa ka ụwa ghọọ paradaịs.” Ka anyị hụ otú Baịbụl si kwado nkọwa a.

Ndị Ga-achị Ụwa Niile n’Ọdịnihu

Alaeze bụ ọchịchị nke eze na-achị. Eze nke Alaeze Chineke bụ Jizọs Kraịst a kpọlitere n’ọnwụ. A kọwara otú e si chie ya eze n’eluigwe n’otu ọhụụ e gosiri Daniel onye amụma, bụ́ onye dere, sị: “Anọ m na-ahụ n’ọhụụ m hụrụ n’abalị, ma, lee! onye yiri nwa nke mmadụ [Jizọs] nọ na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe; ọ banyere n’ebe Onye Ochie ahụ [Jehova Chineke] nọ, ha wee kpọrọ ya bịa nso n’ihu Onye ahụ. E wee nye ya ọchịchị na ùgwù na alaeze, ka ndị dị iche iche, mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na-ejere ya ozi. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adịru mgbe ebighị ebi nke na-agaghị agabiga agabiga, alaeze ya bụkwa nke a na-agaghị ebibi ebibi.”—Daniel 7:13, 14.

Akwụkwọ Baịbụl bụ́ Daniel gosikwara na Chineke ga-eme ka Alaeze ahụ guzosie ike, na Alaeze ahụ ga-ekpochapụ ọchịchị niile nke ụmụ mmadụ, a gaghịkwa ebibi ya ebibi. Isi nke 2 kọrọ banyere otu nrọ  Chineke mere ka eze Babịlọn rọọ, bụ́ nke ọ nọ na ya hụ otu nnukwu ihe oyiyi nke nọchiri anya mba ndị chịrị ụwa. Daniel onye amụma kọwara nrọ ahụ. O dere, sị: “N’oge ikpeazụ . . . , Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:28, 44.

Eze nke Alaeze Chineke agaghị achị naanị ya. Mgbe Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa, o mere ka obi sie ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi ike na a ga-akpọlite ha na ndị ọzọ n’ọnwụ ịga eluigwe, nakwa na ha ga-anọdụ ala n’ocheeze. (Luk 22:28-30) Ocheeze o kwuru okwu ya abụghị ocheeze nkịtị, n’ihi na Jizọs kwuru na Alaeze ahụ ga-adị n’eluigwe. Baịbụl kwuru na ndị ahụ ha na Jizọs ga-eso achị si “n’ebo niile na asụsụ niile na ndị niile na mba niile.” Ha ga-abụrụ “Chineke anyị otu alaeze na ndị nchụàjà, ha ga-achịkwa ụwa dị ka ndị eze.”—Mkpughe 5:9, 10.

Ihe Mere Ozi Alaeze ahụ Ji Bụrụ Ozi Ọma

Ị̀ hụrụ na e nyere Kraịst Jizọs ikike ịchị “ndị dị iche iche, mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche” nakwa na ndị ha na ya ga-eso chịa ‘ga-achị ụwa dị ka ndị eze’? Oleezi ndị Alaeze a ga-achị? Ọ bụ ndị nabatara ozi ọma nke a na-ekwusa taa. Ndị ọzọ ọ ga-achịkwa bụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ibi n’elu ala, bụ́kwa ndị ga-enwe olileanya ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

Baịbụl kwuru hoo haa ngọzi ndị mmadụ ga-enweta mgbe Alaeze ahụ ga-achịwa. Lekwa ole na ole n’ime ha:

“Ọ na-eme ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa. Ọ na-agbaji ụta, na-egbujisịkwa ube; ọ na-agbakwa ụgbọ agha ọkụ.”Abụ Ọma 46:9.

“Ha ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie ya; ha agaghị akụ mkpụrụ, onye ọzọ erie ya.”Aịzaya 65:21, 22.

[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”Mkpughe 21:3, 4.

“Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, a ga-emeghekwa ntị nke ndị ntị chiri. Mgbe ahụ ka onye ngwọrọ ga-awụli elu dị ka oké ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.”Aịzaya 35:5, 6.

“Oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya [Jizọs] wee pụta, ndị mere ezi ihe ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ndụ.”Jọn 5:28, 29.

“Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”Abụ Ọma 37:11.

Nke ahụ bụ nnọọ ozi ọma! Amụma Baịbụl ndị mezurula emezu na-egosikwa na oge eruwela mgbe Alaeze ahụ ga-amalite ọchịchị ezi omume ya n’ụwa niile.