Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Bụ “Ọgwụgwụ”?

Gịnị Bụ “Ọgwụgwụ”?

 Gịnị Bụ “Ọgwụgwụ”?

“. . . mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—MATIU 24:14.

AKỤKỌ banyere ọgwụgwụ ụwa juru ebe niile. Ọtụtụ akwụkwọ, fim, na magazin, ma ndị nke na-akpa ọchị ma ndị nke sayensị, na-akọ akụkọ dị iche iche banyere ụbọchị mbibi. Ụfọdụ ihe ha na-ekwu ga-ebibi ụwa bụ agha nuklia, nkume si na mbara igwe na ụwa ịkụkọta, nje na-egbu mmadụ, ihu igwe ịgbanwe gabiga ókè, ma ọ bụ ndị si na mbara igwe ịwakpo ụwa.

Ihe okpukpe dị iche iche kweere dịkwa iche iche; ọtụtụ na-akụzi na “ọgwụgwụ” ga-abụ ọgwụgwụ nke ihe niile dị ndụ n’ụwa. Mgbe otu ọkà mmụta okpukpe na-akọwa Matiu 24:14, o dere ihe a na-emetụ n’ahụ́: “Amaokwu a so n’amaokwu ndị kasị mkpa n’Okwu Chineke . . . Ọgbọ anyị na-eche mbibi dị nnọọ ukwuu ihu nke na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole na-aghọta ụdị ebelebe ga-egbunụ.”

Ndị na-ekwu ụdị ihe ahụ na-echefu otu ihe dị mkpa, nke bụ́ na Jehova Chineke mere ka ụwa “guzosie ike”; o ‘keghị ya n’efu, kama ọ kpụrụ ya ka e biri n’ime ya.’ (Aịzaya 45:18) N’ihi ya, mgbe Jizọs kwuru banyere “ọgwụgwụ,” ihe ọ na-ekwu abụghị na a ga-ebibi ụwa; ọ pụtaghịkwa na a ga-ebibi mmadụ niile bi na ya. Ihe ọ na-ekwu bụ na a ga-ebibi ndị ajọ omume, bụ́ ndị kpọrọ ekwo nkụ jụ ibi ndụ kwekọrọ ná ntụziaka ndị Jehova ji ịhụnanya nye anyị.

Ka anyị tụlee otu ihe atụ. Ka e were ya na i nwere otu ụlọ mara mma ma kwe ka ndị mmadụ biri na ya n’efu. Ụfọdụ ndị bi na ya bi n’udo ma na-elekọtara gị ụlọ gị. Ma, ndị ọzọ bi na ya bụ nnọọ ndị nsogbu, na-alụ ọgụ mgbe niile ma na-akparị ndị nke ahụ bi n’udo. Ha nọ na-ebibisị ụlọ gị ma leghara mbọ niile ị na-agba ime ka ha kwụsị ya anya.

Olee ihe ị ga-eme iji kwụsị nsogbu ahụ? Ị̀ ga-akụtu ụlọ gị? Mbanụ. Ma eleghị anya,  ị ga-achụpụ ndị nke ọjọọ ahụ ma mezie ihe ndị ha mebiri.

Jehova ga-eme ihe yiri nke ahụ. O nyere otu ọbụ abụ mmụọ nsọ ide, sị: “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ma ọ bụ ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ga-enweta ụwa. N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ; ị ga-elekwa anya n’ebe ọ na-anọ, ma ọ gaghị anọ ya. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”—Abụ Ọma 37:9-11.

Pita onyeozi kwukwara otu ihe ahụ. O si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “E nwere eluigwe nke dị site n’oge ochie na ala kpụkọrọ ọnụ nke si na mmiri pụta ma guzoro n’etiti mmiri site n’okwu Chineke; e jikwa ihe ndị ahụ bibie ụwa nke oge ahụ mgbe e mere ka iju mmiri rikpuo ya.” (2 Pita 3:5, 6) Ihe Pita onyeozi na-ekwu banyere ya ebe a bụ Iju Mmiri nke oge Noa. E bibiri ụwa nke bụ́ ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke, ma e bibighị elu ala. Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ bụụrụ “ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’ọdịnihu ihe atụ.”—2 Pita 2:6.

Pita kwuzikwara, sị: “Eluigwe na ụwa dị ugbu a ka e debeere ọkụ.” Ọ bụrụ na anyị akwụsị ebe ahụ, anyị nwere ike ịghọtahie ihe o kwuru. Ma, buru n’uche na amaokwu ahụ gara n’ihu kwuo, sị: “Na ụbọchị mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” Ọ bụghị elu ala ka e bibiri, kama ọ bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Olee ihe sochiri ya? Pita dere, sị: “E nwere eluigwe ọhụrụ [Alaeze Mesaya nke Chineke] na ụwa ọhụrụ [ọha mmadụ bụ́ ndị ezi omume] anyị na-echere dị ka nkwa ya si dị, ezi omume ga-ebikwa n’ime ha.”—2 Pita 3:7, 13.

Amụma Baịbụl gosikwara na mgbe “ọgwụgwụ” ahụ ga-abịa adịla nso. Gụọ Matiu 24:3-14 na 2 Timoti 3:1-5 iji hụ ihe ndị gosiri na nke a bụ eziokwu. *

Ò juru gị anya na Matiu 24:14, bụ́ amaokwu nwatakịrị nwedịrị ike ịghọta, na-agbagwoju ọtụtụ ndị anya? E nwere ihe ndị kpatara ya. Setan emeela ka ndị mmadụ kpuo ìsì ka ha ghara ịhụ eziokwu ndị magburu onwe ha dị n’Okwu Chineke. (2 Ndị Kọrịnt 4:4) Chineke zonahụrụ ndị mpako nzube ya ma kpugheere ya ndị dị umeala n’obi. Jizọs kwuru banyere nke a, sị: “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m enye gị otuto n’ihu ọha n’ihi na i zonahụwo ndị amamihe na ndị nwere ọgụgụ isi ihe ndị a, i kpughewokwara ha ụmụ ọhụrụ.” (Matiu 11:25) Ọ bụụrụ anyị nnukwu ihe ùgwù iso ná ndị ahụ dị umeala n’obi ghọtara ihe Alaeze Chineke bụ n’ezie ma na-atụ anya ngọzi ndị ọ ga-ewetara ndị niile na-akwado ya!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Iji nweta ihe ọmụma zuru ezu, gụọ isi nke 9 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 9]

Alaeze ahụ ga-eweta “ọgwụgwụ” nke ajọ omume niile n’ụwa