Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụwa Na-ekpo Oké Ọkụ—Ò Nwere Ihe Ga-akwụsị Ya?

Ụwa Na-ekpo Oké Ọkụ—Ò Nwere Ihe Ga-akwụsị Ya?

Ụwa Na-ekpo Oké Ọkụ—Ò Nwere Ihe Ga-akwụsị Ya?

E NWERE ihe ndị na-egosi na ụwa na-ekpokwu ọkụ. Otu ihe atụ bụ otu obodo dị n’Alaska bụ́ Newtok, nke dị nso n’ebe oyi kacha atụ n’ụwa. Mmiri dị n’okpuru ala Newtok, bụ́ nke kpụkọburu akpụkọ, agbazewela. Frank, bụ́ otu n’ime ndị bi n’ebe ahụ kwuru, sị: “Achọghịzi m ibi n’ebe a mmiri dị n’okpuru ala ya kpụkọrọ akpụkọ. Ebe niile bụ apịtị apịtị.” Nchọpụta ndị e mere na-egosi na n’ime afọ iri na-abịa abịa mmiri ga-erikpu obodo ahụ.

Òtù Na-amụ Maka Mgbanwe Ihu Ígwé kwuru, sị: “A naghị ajụ ajụ ma ụwa ọ̀ na-ekpokwa ọkụ.” Okpomọkụ dị n’ụwa ugbu a na-egosi na nke ahụ bụ eziokwu. Ihe ndị ọkà mmụta sayensị na-akpọ mgbanwe ihu ígwé emeela ka ihu ígwé dị njọ n’ụwa dum. Nke a emeela ka e nwee oké ọkọchị, nnukwu snoo, oké mmiri ozuzu, oké okpomọkụ na oké ifufe. Gịnị ga-eme ụwa anyị a? À ga-agwọtali ya?

Ịchọpụta Otú Nsogbu Ụwa Hà

Otú ahụ a na-ele onye ọrịa nọ n’ụlọ ọgwụ ahụ́, ndị ọkà mmụta sayensị, bụ́ ndị na-amụ banyere ihu ígwé, na-enyocha ụwa iji mara ihe na-enye ya nsogbu. Ha na-eji nnukwu onyokomita dị iche iche amata mgbe mmiri kpụkọrọ akpụkọ malitere ịgbaze, ụlọ ọrụ dị iche iche na-agụkọkwa otú mmiri si ezo, ha na-ejikwa ígwè dị iche iche amata ma oké osimiri ọ̀ na-ekpo ọkụ ma ọ̀ na-ajụ oyi, ha na-ejikwa ụgbọelu amata otú ikuku dị. Ha na-etinye ihe niile a ha na-achọpụta n’ọkpọka kọmputa ndị ha ji eme nnyocha. Ha na-eji kọmputa emepụta ụdị ihu ígwé ndị yiri ihe ha chọpụtara, wee jiri ha kwuo otú ha chere ihu ígwé ga-adị n’ọtụtụ iri afọ ma ọ bụ ọtụtụ narị afọ na-abịa abịa.

Gịnị ka ha chọpụtarala? Ụfọdụ ndị kweere na ikuku ọjọọ ejupụtala ụwa bụ́ nke na-esi n’ihe ụmụ mmadụ na-emepụta apụta, bụ́ nke na-eme ka e nwee oké okpomọkụ n’ụwa. Magazin bụ́ Time kwuru na naanị n’afọ 2006, ikuku carbon dioxide nke si n’ihe ụmụ mmadụ mepụtara “ruchara ijeri tọn iri atọ na abụọ.” Dị ka ụlọ e ji ugegbe rụọ maka ịzụlite okooko osisi na-eme, ikuku ọjọọ ahụ anaghị ekwe ka oké okpomọkụ pụọ. Ikuku ọjọọ ahụ na-adịgide wee mee ka a na-enwe oké okpomọkụ n’ụwa. Olee otú ọdịnihu ga-adị? Òtù Na-amụ Maka Mgbanwe Ihu Ígwé kwuru na ọ bụrụ na ihe ndị a na-emepụta n’ụwa anọgide na-emepụta ikuku ọjọọ otú ha si eme ugbu a, “ihu ígwé ga-agbanwe nke ukwuu n’ụwa dum.” Ikekwe, ọ ga-adị njọ karịa otú ọ dị ugbu a. Ọtụtụ ndị kweere na ihe ga-eme ka nke a kwụsị bụ ime ka ikuku carbon dioxide a na-emepụta n’ụwa belata. Ma, ọ bụrụgodị na ikuku ọjọọ a na-emepụta akarịghị otú ha dị ugbu a, ihe ndị e ji kọmputa chọpụta na-egosi na “oké okpomọkụ na otuto oké osimiri dị iche iche na-eto [n’ihi okpomọkụ] ga-adịgide ruo ọtụtụ narị afọ.”

Onye Ga-eme Ka Nsogbu A Kwụsị

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọrụ ikwu otú ihu ígwé ga-adị bụ ọrụ siri ike. Akwụkwọ bụ́ Earth Observatory, nke dị n’Ịntanet jụrụ, sị: “Dị ka ihe atụ, ka Ụwa na-ekpokwu ọkụ, gịnị ga-eme ígwé ojii? Ígwé ojii dị n’elu elu n’eluigwe, bụ́ nke na-amịkọrọ okpomọkụ, nke ga-eme ka ụwa kpokwuo ọkụ, ọ̀ ga na-apụta karịa ígwé ojii nke na-ekpuchi ìhè anyanwụ.” Gịnị ka ọ zara? “Ka ọ dị ugbu a, ndị ọkà mmụta sayensị enweghị ike ịza ajụjụ ndị a.”

Ma, Baịbụl kwuru na Jehova bụ́ Chineke bụ “Onye kere eluigwe na ụwa” na “ígwé ojii nke dị n’elu.” (Jenesis 14:19; Ilu 8:28) O kwuru na ya “tinyere amamihe n’ígwé ojii.” N’ezie, ihe ndị ọkà mmụta sayensị na-amaghị doro Jehova anya.—Job 38:36.

Lee ihe Chineke kwuru banyere mmiri na-ezo n’ụwa, bụ́ nke e dere na Baịbụl n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ asaa gara aga. Ọ sịrị: ‘Mmiri na-esi n’eluigwe ezo, ma ọ naghị alaghachi n’ebe ahụ, ọ gwụla ma ò dere ala.’ (Aịzaya 55:10) Nke a kọwara nke ọma otú mmiri si ezo, na otú o si alaghachi n’ígwé ma na-ezoghachi. Alụlụụ dị n’ígwé ojii na-aghọ mmiri wee zoo ‘dee ala.’ Anwụ na-eti wee mee ka alụlụụ kuchaa ma ‘laghachi n’ebe ahụ,’ ma ọ bụ n’ígwé, ka o wee zoo ọzọ. Okwu Jehova kwuru ihe dị iche iche dị ịtụnanya banyere otú ihu ígwé si agbanwe ọtụtụ narị afọ tupu e dee ya n’akwụkwọ ndị ọzọ na-abụghị Baịbụl. Ọ̀ bụ na nke a anaghị eme ka i nwee obi ike n’Onye Okike nakwa n’ihe o nwere ike ime? Ya mere, mgbe anyị na-eche banyere ihe ga-esi ná mgbanwe ihu ígwé na-agbanwe pụta, ọ̀ bụ na amamihe adịghị n’ịtụkwasị “Onye kere ifufe” na ‘nna mmiri ozuzo’ obi, bụ́ onye ma otú ihe ndị dị n’ụwa si arụ ọrụ?—Emọs 4:13; Job 38:28.

O Nwere Ihe Mere E Ji Kee Ụwa

Ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-ekwu ihe dị iche iche banyere ihe ga-eme ụwa anyị n’ọdịnihu, otu ihe doro anya bụ na ụwa enweghị atụ. E nwere ọtụtụ ihe dị ndụ n’ụwa anyị. Ọ dịghị otú ahụ ná mbara ala ndị ọzọ. Gịnị mere e ji nwee ọtụtụ ihe dị ndụ n’ụwa? Ndị ọkà mmụta sayensị kwuru na e nwere ọtụtụ ihe kpatara nke a. Ọ bụ n’ihi na e nwere mmiri dị ukwuu n’ụwa; anyanwụ adịghịkwa ụwa oké anya ma ọ bụ oké nso; ụdị ikuku ndị dị n’ụwa hà otú ha kwesịrị ịha, tinyere ikuku oxygen dị ukwuu.

O nwere ike iju gị anya ịmara na akwụkwọ Baịbụl bụ́ Jenesis kwuru banyere ihe ndị a mgbe ọ na-akọ otú e si kee ihe dị iche iche. Dị ka ihe atụ, Jenesis 1:10 kwuru banyere otú Chineke si mee ka ‘mmiri ọ kpọrọ Oké Osimiri sọkọta ọnụ.’ O doro anya na nke a na-egosi na ụwa nwere mmiri buru ibu. Anyị na-agụ na Jenesis 1:3, sị: “Chineke wee sị: ‘Ka ìhè dị.’” Ụwa anyị dị nso n’anyanwụ nke na mmiri ka ukwuu dị na ya anaghị akpụkọ akpụkọ. Ọ dịghịkwa oké nso n’anyanwụ nke na anyanwụ ga-amịkọrọ mmiri niile dị na ya.

Jenesis 1:6 kwuru na Chineke kere “mbara.” Amaokwu nke iri na otu na nke iri na abụọ kwuru na Chineke mere ka ahịhịa na osisi dị iche iche puo. Ihe a niile na-egosi na e nwere ikuku oxygen, bụ́ nke mmadụ na anụmanụ ga-emecha na-ekuru wee na-adị ndụ.

Gịnịzi ka ihe niile a na-egosi? Ọ na-egosi na o nwere ihe mere Chineke ji kee ụwa wee mee ka mmiri dị ukwuu dịrị na ya, mee ka anyanwụ ghara ịdị ya oké anya ma ọ bụ oké nso, meekwa ka ụdị ikuku ndị dị na ya hà otú ha kwesịrị ịha. Baịbụl gwara anyị, sị: ‘Chineke ekeghị ụwa n’efu, ọ kpụrụ ya ka e biri n’ime ya.’ (Aịzaya 45:18) Abụ Ọma 115:16 kwuru, sị: “Eluigwe bụ eluigwe Jehova, ma ụwa ka o nyere ụmụ mmadụ.” N’ezie, e kere ụwa ka mmadụ biri na ya.

Akwụkwọ Nsọ kwuru na Chineke kere di na nwunye mbụ ma mee ka ha nọrọ n’ogige Iden, bụ́ paradaịs mara mma. Ha ga “na-akọ ihe na ya ma na-elekọta ya.” (Jenesis 2:15) Chineke gwakwara ha, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu.” (Jenesis 1:28) Chegodị echiche banyere ihe ọma ha gaara enweta! Ha gaara eme ka ụwa dum bụrụ Paradaịs, birikwa na ya ruo mgbe ebighị ebi. Nke ahụ bụ ọdịnihu magburu onwe ya!

Ọ dị mwute ikwu na di na nwunye mbụ ahụ erubeghịrị Chineke isi, kama nke ahụ, ha họọrọ imewe ihe masịrị ha, bụ́ ihe ọtụtụ ndị ka na-eme ruo taa. (Jenesis 3:1-6) Gịnị si na ya pụta? Ụmụ mmadụ “na-ebibi ụwa” ruo n’otú a na-echetụbeghị n’echiche, kama ịkọ ihe na ya ma na-elekọta ya. (Mkpughe 11:18) Ma, ihe ga-akasi anyị obi bụ na nzube Chineke maka ụwa a agbanwebeghị. Baịbụl na-emesi anyị obi ike, sị: “[Chineke] tọrọ ntọala ụwa mee ka o sie ike; ọ gaghị ama jijiji ruo mgbe ebighị ebi, ma ọ bụ ruo mgbe niile ebighị ebi.” (Abụ Ọma 104:5) Jizọs kwekwara nkwa mgbe ọ na-ezi ozizi n’elu ugwu, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, n’ihi na ha ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5) Olee otú nke a ga-esi mezuo?

Ihe Ga-adị Mma n’Ọdịnihu

Otu onye chịburu America kwuru, sị: “Mgbanwe ihu ígwé bụ nsogbu zuru ụwa ọnụ.” Ọ̀ bụ na i kwetaghị na ọ dị mkpa ka e dozie nsogbu ahụ n’ụwa dum? Jizọs Kraịst kwuru na ọ bụ Alaeze Chineke ga-edozi nsogbu ahụ. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa.” (Matiu 6:9, 10) Amụma Baịbụl kwuru na n’oge na-adịghị anya, Alaeze eluigwe a nke ga-achị ụwa dum “ga-egwepịa alaeze ndị a niile [ya bụ, ọchịchị ndị na-achị ugbu a], mee ka ha ghara ịdịkwa.” (Daniel 2:44) Ọ ‘ga-ebibikwa ndị na-ebibi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) O doro anya na ọ ga-eme ka ndị niile na-emebi ụwa ma na-ebibi ihe ndị dị n’ime ya zaa ajụjụ. Ọ ga-ebibikwa ha.

Ma, gịnị ga-eme ụwa anyị a e metọrọla emetọ? Ọ dị mma ịmara na mgbe Jizọs nọ n’ụwa ọ rụrụ ọrụ ebube wee mee ka ihe ndị e kere eke kwụsị ike ha na-akpa, dị ka ifufe na oké osimiri. O kwuru naanị mkpụrụ okwu ole na ole oké ifufe wee kwụsị. (Mak 4:35-41) Ebe Jizọs bụ “Onyenwenụ kasị ndị nwenụ niile na Eze nke ndị eze” nke si n’eluigwe na-achị achị, n’oge na-adịghị anya, ọ ga-eme ka ihe ndị e kere eke kwụsị ike ha na-akpa. Ọ ga-eme ya karịa otú o mere mgbe ọ nọ n’ụwa. (Mkpughe 17:14) N’ezie, Jizọs kwuru na ọchịchị ya ga-abụ mgbe “a ga-eme ka ihe dị ọhụrụ.” (Matiu 19:28) Baịbụl ọzọ kpọrọ ya “mgbe a ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ.” (Nsụgharị New International Version) Jizọs ga-eme ka ihe niile dị n’ụwa dị ọhụrụ, mee ka ha dị otú ahụ ihe niile dị n’ogige Iden. Ụwa ga-aghọghachi Paradaịs. (Luk 23:43) Alaeze Chineke ga-eme ka oké ikpo ọkụ ụwa na-ekpo kwụsị.

Ọchịchị Alaeze ahụ nwere ike ịbara gị uru ugbu a. Olee otú ọ ga-esi mee nke a? Jizọs buru amụma, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Ọtụtụ nde mmadụ na-ege ntị n’ozi ọma ahụ. Ọ na-agbanwekwa ndụ ha. Ha na-ahapụkwa omume ọjọọ ndị riri ha ahụ́. Otú ha si ebi n’ezinụlọ ha na-akakwa mma. Ha na-ahụzi ndị na-abụghị ndị agbụrụ ha n’anya, kama ịkpọ ha asị. N’ezie, Alaeze Chineke na-eme ihe ọchịchị ụmụ mmadụ na-enweghị ike ime. O meela ka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ asaa, ndị si n’ihe karịrị narị ala abụọ na iri atọ na ise, bụrụ ụmụnna dị n’otu! N’ezie, ebe ha bụ ndị Alaeze Chineke na-achị, a na-akwadebe ha maka ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’ụwa a.

O nweghị ihe ga-eme ụwa anyị a. Ya bụrụkwa na o nweghị ihe ga-eme gị onwe gị!

[Foto dị na peeji nke 27]

Ọtụtụ narị afọ tupu ụmụ mmadụ edee banyere otú mmiri si ezo, Baịbụl kwuru otú mmiri si ezo, otú o si alaghachi n’ígwé ma zoghachi

[Foto dị na peeji nke 28]

Jizọs “baara ifufe ahụ mba, sịkwa oké osimiri ahụ: ‘Shịị! Daa jụụ!’ Ifufe ahụ wee kwụsị, ebe niile wee daa jụụ”

[Foto dị na peeji nke 29]

Mgbe ụwa ga-aghọghachi Paradaịs, a ga-eme ka oké ikpo ọkụ ụwa na-ekpo kwụsị

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 26]

Godo-Foto