Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-akpọ Aha Chineke Ọ Bụ Ezie na Otú E Si Akpọ Ya Edochaghị Anyị Anya?

Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-akpọ Aha Chineke Ọ Bụ Ezie na Otú E Si Akpọ Ya Edochaghị Anyị Anya?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Jụrụ

Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-akpọ Aha Chineke Ọ Bụ Ezie na Otú E Si Akpọ Ya Edochaghị Anyị Anya?

O nweghị onye dị ndụ taa ma kpọmkwem otú e si akpọ aha Chineke n’asụsụ Hibru n’oge ochie. Ma, ọ dị mma ịmara na aha Chineke pụtara ihe dị ka ugboro puku asaa n’ime Baịbụl. Jizọs mere ka aha Chineke pụta ìhè mgbe ọ nọ n’ụwa, ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere ka e doo aha ahụ nsọ. (Matiu 6:9; Jọn 17:6) Ya mere, otu ihe doro anya bụ na ịkpọ aha Chineke dị Ndị Kraịst oké mkpa. Gịnị mere na otú e si akpọ aha ahụ na mbụ edochaghị anyị anya n’oge a? E nwere isi ihe abụọ kpatara ya.

Nke mbụ bụ na n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, ndị Juu malitere ikwere ihe na-enweghị isi bụ́ na ọ dị njọ ịkpọ aha Chineke. Mgbe onye na-agụ Baịbụl ruru n’ebe e dere aha Chineke, ihe ọ na-eme bụ ịkpọ “Onyenwe anyị” kama ịkpọ aha Chineke. Ndị mmadụ si otú a chefuo ịkpọ aha Chineke mgbe ọtụtụ narị afọ gachara.

Nke abụọ bụ na n’oge ochie, a naghị etinye ụdaume ma a na-ede ihe n’asụsụ Hibru, bụ́ nke yiri otú e si edebiri okwu n’asụsụ Bekee nakwa n’asụsụ ndị ọzọ. Onye na-agụ ihe e dere ede na-eji aka ya etinye ụdaume n’ebe ha kwesịrị ịdị. Ka oge na-aga, a chọpụtara otú a ga-esi na-akpọ okwu Hibru dị iche iche ka e wee ghara ichefucha otú e si akpọ ha. E tinyere akara na-egosi ebe e kwesịrị itinye ụdaume n’okwu niile dị na Baịbụl Hibru. Ma, n’ebe dị iche iche aha Chineke pụtara, ọ ga-abụ na e tinyere akara ahụ maka iji kpọọ okwu bụ́ “Onyenwe anyị,” iji chetara onye na-agụ ihe ka ọ kpọọ okwu e ji dochie aha ahụ, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na e tinyeghị ụdaume ọ bụla na ha.

Ya mere, naanị ihe e nwere ugbu a n’ihe odide bụ mgbochiume anọ a na-akpọ Tetragramatọn. Otu akwụkwọ ọkọwa okwu sịrị na Tetragramatọn bụ “mkpụrụ akwụkwọ anọ e dere n’asụsụ Hibru nke a na-edekarị YHWH ma ọ bụ JHVH n’asụsụ Bekee, nke bụ́ aha Baịbụl kpọrọ Chineke.” Ọ bụ otú a ka e si tinye ụdaume na JHVH, ya aghọọ “Jehovah.” N’asụsụ Igbo, Jehova bụ aha ọtụtụ ndị maara ma nabata na ọ bụ aha Chineke.

Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-atụ aro ka a na-akpọ ya “Yahweh.” Ọ̀ bụ ya kacha yie otú e si akpọ aha Chineke na mbụ? O nweghị onye nke a doro anya. N’ezie, ndị ọkà mmụta ndị ọzọ ekwuola ihe mere a na-ejighị kwesị ịkpọ Chineke “Yahweh.” Ọ dị mma ịmara na otú e si akpọ aha dị iche iche dị na Baịbụl n’asụsụ ndị a na-asụ n’oge a eyichaghị otú e sị akpọ ha n’asụsụ Hibru na mbụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị mmadụ na-anabata ha. Ihe kpatara nke a bụ na aha ndị a aghọọla otú anyị si asụ asụsụ, ha anaghịkwa esiri anyị ike ịmata. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị aha ahụ bụ́ Jehova.

A kpọrọ Ndị Kraịst oge ochie ndị e wepụtaara aha Chineke. Ha kwusaara ndị ọzọ aha ahụ ma gbaa ha ume ịkpọku ya. (Ọrụ 2:21; 15:14; Ndị Rom 10:13-15) O doro anya na ọ dị Chineke mkpa ka anyị na-akpọ aha ya n’asụsụ ọ bụla anyị na-asụ nakwa ka anyị ghọta ihe aha ahụ pụtara ma na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ọ pụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 31]

Ọ dị mma ịmara na aha Chineke pụtara ihe dị ka ugboro puku asaa n’ime Baịbụl