Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Chineke Aghaghị Ịhụ Obiọma n’Anya

Ndị Chineke Aghaghị Ịhụ Obiọma n’Anya

Ndị Chineke Aghaghị Ịhụ Obiọma n’Anya

“Ọ̀ bụkwa gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ́ bụghị nanị ime ihe e kpere n’ikpe, na ịhụ ebere [ma ọ bụ, “obiọma”] n’anya, na iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?”—MAỊKA 6:8.

1, 2. (a) N’ihi gịnị ka ọ na-ekwesịghị iji ju anyị anya na Jehova na-achọ ka ndị ya na-egosipụta obiọma? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa metụtara obiọma ka anyị kwesịrị ịtụle?

JEHOVA bụ Chineke obiọma. (Ndị Rom 2:4; 11:22) Lee ka di na nwunye mbụ ahụ, bụ́ Adam na Iv, na-aghaghị isiwo nwee ekele maka nke ahụ! N’ogige Iden, ihe okike ndị a na-ahụ anya bụ́ ndị na-agba akaebe banyere obiọma Chineke nwere n’ebe mmadụ, bụ́ ndị pụrụ ịnụ ụtọ ha, nọ gbara ha gburugburu. Chineke nọgidekwara na-egosi obiọma n’ebe mmadụ nile nọ, ọbụna n’ebe ndị na-enweghị ekele na ndị ajọ mmadụ nọ.

2 N’ịbụ ndị e mere n’onyinyo Chineke, ụmụ mmadụ nwere ikike nke igosipụta àgwà ndị yiri ndị nke Chineke. (Jenesis 1:26) Ọ bụghị ihe ijuanya na Jehova na-achọ ka anyị na-egosipụta obiọma. Dị ka Maịka 6:8 na-ekwu, ndị Chineke aghaghị ịhụ “ebere [ma ọ bụ, “obiọma”] n’anya.” Ma gịnị bụ obiọma? Olee otú ya na àgwà nsọpụrụ Chineke ndị ọzọ si nwee njikọ? Ebe ụmụ mmadụ nwere ikike igosipụta obiọma, n’ihi gịnị ka ụwa ji bụrụ ebe jupụtara nnọọ n’obi ọjọọ na ebe siri ike obibi? Dị ka Ndị Kraịst, n’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-agbalịsi ike igosipụta obiọma n’imeso ndị ọzọ ihe?

Gịnị Bụ Obiọma?

3. Olee otú ị pụrụ isi kọwaa obiọma?

3 A na-egosipụta obiọma site n’inwe mmasị miri emi n’ọdịmma ndị ọzọ. A na-egosipụta ya site n’ime ihe iji nyere ndị ọzọ aka na ikwu okwu ndị na-egosi nchebara echiche. Inwe obiọma pụtara ime ihe dị mma kama ime ihe dị njọ. Onye nwere obiọma nwere omume enyi, dị nro, nwee ọmịiko ma na-eme amara. Ọ na-emesapụ aka ma na-echebara ndị ọzọ echiche. Pọl onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Yikwasịnụ onwe unu mmetụta ndị dị nro bụ́ ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi.” (Ndị Kọlọsi 3:12) Ya mere, obiọma bụ akụkụ nke ekike ihe atụ nke ezi Onye Kraịst ọ bụla.

4. Olee otú Jehova siworo bute ụzọ n’igosi ihe a kpọrọ mmadụ obiọma?

4 Jehova Chineke ebutewo ụzọ n’igosipụta obiọma. Dị ka Pọl kwuru, ọ bụ mgbe “e mere ka obiọma na ịhụnanya nke Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, nwere maka mmadụ pụta ìhè,” ka “ọ zọpụtara anyị site n’ịsa ahụ́ ahụ nke mere ka anyị dị ndụ na site n’iji mmụọ nsọ mee ka anyị dị ọhụrụ.” (Taịtọs 3:4, 5) Chineke ‘na-asa’ Ndị Kraịst e tere mmanụ ahụ́, ma ọ bụ na-eme ka ha dị ọcha n’ọbara Jizọs, na-eji àjà mgbapụta Kraịst eme ihe n’ihi ha. A na-ejikwa mmụọ nsọ eme ka ha dị ọhụrụ, na-aghọ “ihe e kere ọhụrụ” dị ka ụmụ Chineke e ji mmụọ nsọ mụta. (2 Ndị Kọrint 5:17) Ọzọkwa, obiọma na ịhụnanya Chineke rutere “oké ìgwè mmadụ,” bụ́ ndị ‘saworo uwe mwụda ha ma mee ka ha na-acha ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ.’—Mkpughe 7:9, 14; 1 Jọn 2:1, 2.

5. N’ihi gịnị ka ndị mmụọ Chineke na-eduzi ji kwesị ịdị na-egosipụta obiọma?

5 Obiọma sokwa ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke, ma ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ. Pọl kwuru, sị: “Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye. Ọ dịghị iwu na-emegide ihe ndị dị otú ahụ.” (Ndị Galeshia 5:22, 23) Mgbe ahụzi, ọ̀ bụ na ndị mmụọ Chineke na-eduzi ekwesịghị ịdị na-egosi ndị ọzọ obiọma?

Ezi Obiọma Abụghị Adịghị Ike

6. Olee mgbe obiọma na-abụ adịghị ike, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

6 Ụfọdụ ndị na-ele obiọma anya dị ka adịghị ike. Ha na-eche na mmadụ ekwesịghị ime ebere, na o kwesịrị ọbụna ịbụ onye na-akparị mmadụ mgbe ụfọdụ, ka ndị ọzọ wee hụ ike ya. Otú ọ dị, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ na-achọ ike dị ukwuu iji bụrụ onye nwere obiọma n’ezie na iji zere igosi obiọma hiere ụzọ. Ebe ọ bụ na ezi obiọma so ná mkpụrụ nke mmụọ Chineke, ọ gaghị abụ àgwà na-adịghị ike, nke na-eleghara omume ọjọọ anya. Obiọma hiere ụzọ, n’aka nke ya, bụ adịghị ike, na-eme ka mmadụ na-anakwere ihe ọjọọ.

7. (a) Olee otú Ilaị si leghara ịdọ ụmụ ya aka ná ntị anya? (b) N’ihi gịnị ka ndị okenye na-aghaghị iji nọrọ na nche megide igosi obiọma hiere ụzọ?

7 Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere nnukwu onye nchụàjà Izrel bụ́ Ilaị. O leghaara ịdọ ụmụ ya, bụ́ Họfnaị na Finehas, aka ná ntị, bụ́ ndị na-eje ozi dị ka ndị nchụàjà n’ụlọikwuu ahụ. N’ịbụ ndị òkè Iwu Chineke nyere ha n’anụ e ji chụọ àjà na-ejughị afọ, ha na-agwa ndị na-eje ozi ka ha nata ndị na-achụ àjà anụ a na-esighị n’ọkụ tupu e suree abụba nke anụ ahụ n’ọkụ n’elu ebe ịchụàjà. Ụmụ Ilaị na-esokwa ụmụ nwanyị na-eje ozi n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ enwe mmekọahụ rụrụ arụ. Otú ọ dị, kama ịchụpụ Họfnaị na Finehas n’ọkwá ha, nanị ihe Ilaị mere bụ ịbara ha mba n’ụzọ dị nro. (1 Samuel 2:12-29) Ka a sịkwa ihe mere “okwu Jehova ji dị oké ọnụ na mgbe ahụ”! (1 Samuel 3:1) Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye aghaghị ịkpachara anya ịghara igosi ndị mere ihe ọjọọ, bụ́ ndị pụrụ itinye ọnọdụ ime mmụọ nke ọgbakọ n’ihe ize ndụ, obiọma hiere ụzọ. Ezi obiọma adịghị eleghara okwu na omume ọjọọ ndị na-emegide ụkpụrụ Chineke anya.

8. Olee otú Jizọs si gosipụta ezi obiọma?

8 Onye Nlereanya anyị, bụ́ Jizọs Kraịst, egosighị obiọma hiere ụzọ. Ọ bụ ezi obiọma n’onwe ya. Dị ka ihe atụ, ‘o nwere ọmịiko n’ahụ́ ndị mmadụ, n’ihi na a gbara ha akpụkpọ, chụsasịakwa ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.’ Ndị nwere obi eziokwu nweere onwe ha ịbịakwute Jizọs, ọbụna na-ekutere ya ụmụ ha. Cheedị echiche banyere obiọma na ọmịiko o gosipụtara ka ‘ọ na-ekuru ụmụaka ahụ n’aka ya wee malite ịgọzi ha.’ (Matiu 9:36; Mak 10:13-16) Ọ bụ ezie na Jizọs nwere obiọma, o guzosiri nnọọ ike n’ime ihe ndị ziri ezi n’anya Nna ya nke eluigwe. Ọ dịghị mgbe Jizọs nabatara ihe ọjọọ; o nwere obi ike sitere n’aka Chineke iji katọọ omume ihu abụọ nke ndị ndú okpukpe. Dị ka e kwuru na Matiu 23:13-26, o kwupụtara ọtụtụ ugboro, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ!”

Obiọma na Àgwà Nsọpụrụ Chineke Ndị Ọzọ

9. Olee otú obiọma na ogologo ntachi obi na ịdị mma si nwee njikọ?

9 Obiọma na àgwà ndị ọzọ ndị mmụọ Chineke na-amịpụta nwere njikọ. E denyere ya n’agbata “ogologo ntachi obi” na “ịdị mma.” N’ezie, onye na-azụlite obiọma na-egosipụta àgwà ahụ site n’inwe ogologo ntachi obi. Ọ na-enwe ndidi ọbụna n’ebe ndị na-enweghị obiọma nọ. Obiọma na ịdị mma nwere njikọ n’ihi na a na-egosikarị ya n’ime ihe maka abamuru nke ndị ọzọ. Mgbe ụfọdụ, a pụrụ ịsụgharị okwu Grik e ji mee ihe n’ime Bible maka “obiọma” ịbụ “ịdị mma.” Ngosipụta Ndị Kraịst oge mbụ gosipụtara àgwà a n’etiti onwe ha tụrụ ndị ọgọ mmụọ n’anya nke na ha, dị ka Tertullian si kwuo, kpọrọ ụmụazụ Jizọs ‘ndị jupụtara n’obiọma.’

10. Olee otú obiọma na ịhụnanya si nwee njikọ?

10 E nwere njikọ n’etiti obiọma na ịhụnanya. Banyere ụmụazụ ya, Jizọs kwuru, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Banyere ịhụnanya a, Pọl kwuru, sị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma.” (1 Ndị Kọrint 13:4) Obiọma na ịhụnanya nwekwara njikọ n’okwu ahụ bụ́ “obiọma sitere n’ịhụnanya,” bụ́ nke a na-ejikarị eme ihe n’Akwụkwọ Nsọ. Nke a bụ obiọma sitere n’ịhụnanya nke na-eguzosi ike n’ihe. Mkpọaha Hibru a sụgharịrị ịbụ “obiọma sitere n’ịhụnanya” na-agụnye ihe karịrị mmetụta dị nro. Ọ bụ obiọma nke na-eji ịhụnanya arapagide n’ihe ruo mgbe nzube ya maka ihe ahụ mezuru. A na-egosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya, ma ọ bụ ịhụnanya nke na-eguzosi ike n’ihe, nke Jehova n’ụzọ dịgasị iche iche. Dị ka ihe atụ, a na-ahụ ya ná nnapụta na nchebe ọ na-enye.—Abụ Ọma 6:4; 40:11; 143:12

11. Mmesi obi ike dị aṅaa ka obiọma sitere n’ịhụnanya nke Chineke na-enye anyị?

11 Obiọma sitere n’ịhụnanya nke Jehova na-adọta ndị mmadụ n’ebe ọ nọ. (Jeremaịa 31:3) Mgbe nnapụta ma ọ bụ enyemaka dị ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi mkpa, ha na-amata na obiọma ya sitere n’ịhụnanya bụ n’ezie ịhụnanya nke na-eguzosi ike n’ihe. Ọ gaghị ahapụ ha. N’ihi ya, ha pụrụ iji okwukwe na-ekpe ekpere, dị ka ọbụ abụ ahụ kpere, bụ́ onye sịrị: “Ma ọ bụ ebere Gị [ma ọ bụ, “obiọma sitere n’ịhụnanya”] ka mụ onwe m tụkwasịworo obi; ka obi m tegharịa egwú ọṅụ ná nzọpụta Gị.” (Abụ Ọma 13:5) Ebe ịhụnanya Chineke na-eguzosi ike n’ihe, ndị ohu ya pụrụ ịtụkwasị ya obi kpam kpam. Ha nwere mmesi obi ike a: “Jehova agaghị aha ndị Ya aka, Ọ gaghị ahapụkwa ihe nketa Ya.”—Abụ Ọma 94:14.

N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Nnọọ Obi Ọjọọ n’Ụwa?

12. Olee mgbe ọchịchị mmegbu malitere, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?

12 Azịza nke ajụjụ a dabeere n’ihe mere n’ogige Iden. Ná mmalite nke akụkọ ihe mere eme mmadụ, otu mmụọ e kere eke bụ́ onye ghọrọ onye na-achọ ọdịmma onwe ya nanị na onye dị mpako malitere atụmatụ nke ịghọ onye ọchịchị ụwa. Dị ka ihe si n’atụmatụ ya pụta, ọ ghọrọ “onye na-achị ụwa a,” n’ezie nke na-emegbu nnọọ mmadụ. (Jọn 12:31) A bịara mara ya dị ka Setan bụ́ Ekwensu, onye bụ́ isi na-emegide ma Chineke ma mmadụ. (Jọn 8:44; Mkpughe 12:9) A gbara atụmatụ nzuzo ya nke ịchọ ọdịmma onwe ya nanị bụ́ iguzobe ọchịchị na-ama ọchịchị obiọma Jehova aka, n’anwụ oge na-adịghị anya ka e kesịrị Iv. Ọchịchị ọjọọ si otú a malite mgbe Adam họọrọ inwere onwe ya pụọ n’ọchịchị Chineke, na-ajụ obiọma Ya kpam kpam. (Jenesis 3:1-6) Kama ịchịwa onwe ha n’ezie, Adam na Iv batara nnọọ kpọmkwem n’okpuru nduzi nke onye na-achọ ọdịmma onwe ya nanị na onye mpako bụ́ Ekwensu, ghọọ ndị ọ na-achị.

13-15. (a) Olee ụfọdụ ihe ndị si n’ịjụ ịchịisi ezi omume Jehova pụta? (b) N’ihi gịnị ka ụwa a ji bụrụ ebe obi ịta mmiri jupụtara?

13 Tụlee ụfọdụ ihe ndị si na ya pụta. A chụpụrụ Adam na Iv n’akụkụ ụwa nke bụ́ paradaịs. Ha si n’ubi mara mma nke nwere ihe ọkụkụ na mkpụrụ osisi ndị na-edozi ahụ́ pụọ baa n’ọnọdụ siri ike dị n’èzí ogige Iden ahụ. Chineke gwara Adam, sị: “N’ihi na i gewo ntị n’olu nwunye gị, i wee rie mkpụrụ sitere n’osisi ahụ, nke M nyere gị iwu banyere ya, sị, Gị erila mkpụrụ sitere na ya: ihe a na-abụ ọnụ ka ala bụ n’ihi gị; n’ihe mgbu ka ị ga-eri ihe sitere na ya ụbọchị nile nke ndụ gị; ọ bụkwa ogwu na uke ka ọ ga-epuru gị.” Ọnụ a bụrụ ala pụtara na ịkọ ya ga-abụzi ihe siri oké ike. Ọnụ ahụ a bụrụ ala, na ogwu na uke ya, nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ ụmụ Adam nke na nna Noa, bụ́ Lemek, kwuru banyere ‘ndọgbu nke ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ, bụ́ nke pụtara n’ala Jehova bụworo ọnụ.’—Jenesis 3:17-19; 5:29.

14 Adam na Iv jikwa ịnọ jụụ gbanwere ahụhụ. Chineke gwara Iv, sị: “M ga-eme ka ihe mgbu gị na ịtụ ime gị baa ụba nke ukwuu; n’ihe mgbu ka ị ga-amụ ụmụ; n’ebe di gị nọ ka ọchịchọ gị ga-adị, ya onwe ya ga-achịkwa gị.” Mgbe e mesịrị, Ken, bụ́ nwa mbụ Adam na Iv, kpara àgwà obi ọjọọ nke igbu nwanne ya nwoke bụ́ Ebel.—Jenesis 3:16; 4:8.

15 “Ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ,” ka Jọn onyeozi na-ekwu. (1 Jọn 5:19) Dị ka onye ọchịchị ya, ụwa nke taa na-egosipụta àgwà ọjọọ ndị na-agụnye ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na mpako. Ka a sịkwa ihe mere o ji jupụta n’obi ịta mmiri na obi ọjọọ! Ma ọ gaghị anọgide na-adị otú ahụ. Jehova ga-ahụ na obiọma na ọmịiko, ọ bụghị obi ịta mmiri na obi ọjọọ ga-ejupụta ebe nile mgbe Alaeze ya ga na-achị.

N’okpuru Alaeze Chineke Obiọma Ga-ejupụta Ebe Nile

16. N’ihi gịnị ka e ji jiri obiọma mara ọchịchị Chineke nke sitere n’aka Kraịst Jizọs, gịnịkwa ka nke a na-achọ ka anyị na-eme?

16 Jehova na onye ọ họpụtara ịbụ Eze nke Alaeze Ya, bụ́ Kraịst Jizọs, na-achọ ka e jiri obiọma mara ndị ha na-achị. (Maịka 6:8) Jizọs Kraịst gositụrụ anyị otú ọchịchị nke Nna ya nyefere ya ga-esi bụrụ nke a ga-eji obiọma mara. (Ndị Hibru 1:3) A pụrụ ịhụ nke a n’okwu Jizọs nke o ji kpughee ndị ndú okpukpe ụgha, bụ́ ndị na-ebo ndị mmadụ ibu arọ. O kwuru, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị a na-ebogbu n’ibu, m ga-emekwa ka unu nwee ume ọhụrụ. Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na enwere m obi dị nwayọọ, m dịkwa umeala n’obi, unu ga-enwetakwara mkpụrụ obi unu ume ọhụrụ. N’ihi na yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Matiu 11:28-30) Ihe ka ọtụtụ ná ndị ọchịchị ụwa, ma ndị nke okpukpe ma ndị ọzọ, na-eji ọtụtụ ụkpụrụ na ọrụ ndị a na-adịghị egosi ekele maka ha ebogbu ndị mmadụ. Ma ihe Jizọs na-achọ n’aka ụmụazụ ya na-ekwekọ ná mkpa na ikike ha. N’ezie, yok ya bụ nke na-enye ume ọhụrụ na nke na-adịghị egbu mgbu! À dịghị akpali anyị ịdị ka ya n’igosi ndị ọzọ obiọma?—Jọn 13:15.

17, 18. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na ndị ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe na ndị nnọchianya ya n’ụwa ga-egosipụta obiọma?

17 Okwu dị iriba ama Jizọs gwara ndịozi ya na-eme ka a mata otú ọchịchị Alaeze Chineke ga-esi dị nnọọ iche na nke ụmụ mmadụ. Bible na-ekwu, sị: “Esemokwu kpụ ọkụ n’ọnụ bilitekwara n’etiti ha [ndị ahụ na-eso ụzọ] banyere onye ọ bụ n’ime ha nke yiri ka ọ bụ ya kasị ukwuu. Ma ọ sịrị ha: ‘Ndị eze nke ndị mba ọzọ na-eme ka ha bụ ndị nwe ha, a na-akpọkwa ndị nwere ikike n’ebe ha nọ Ndị Ome Mma. Ma, unu onwe unu agaghị adị otú ahụ. Kama ka onye kasị ukwuu n’etiti unu dịrị ka onye kasị bụrụ nwata, ka onye na-emekwa ihe dị ka onyeisi dịrị ka onye na-eje ozi. N’ihi na olee onye ka ukwuu, ọ̀ bụ onye nọ na-eri ihe na tebụl ka ọ̀ bụ onye na-eje ozi? Ọ́ bụghị onye nọ na-eri ihe na tebụl? Ma anọ m n’etiti unu dị ka onye na-eje ozi.’”—Luk 22:24-27.

18 Ndị ọchịchị bụ́ mmadụ na-agbalị igosi ịdị ukwuu ha site ‘n’ime ka ha bụ ndị nwe ndị ọzọ’ nakwa site n’ịchọ oké utu aha dị iche iche, dị ka à ga-asị na utu aha ndị ahụ na-eme ka ha ka ndị ha na-achị. Ma Jizọs kwuru na ezi ịdị ukwuu na-abịa site n’ijere ndị ọzọ ozi—iji ịdị uchu na ịnọgidesi ike n’ihe na-agbalị ijere ndị ọzọ ozi. Ndị nile ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe ma ọ bụ ndị ga-eje ozi dị ka ndị nnọchianya ya n’ụwa aghaghị ịgbalị ịgbaso ihe nlereanya ya nke ịdị umeala n’obi na obiọma.

19, 20. (a) Olee otú Jizọs si kọwaa otú obiọma Jehova haruru? (b) Olee otú anyị pụrụ isi na-eṅomi Jehova n’igosipụta obiọma?

19 Ka anyị tụlee ndụmọdụ ịhụnanya ọzọ Jizọs nyere. N’igosi otú obiọma Jehova haruru, Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụkwa ndị na-ahụ unu n’anya ka unu na-ahụ n’anya, olee uru ọ baara unu? N’ihi na ọbụna ndị mmehie bụ ndị hụrụ ha n’anya ka ha na-ahụ n’anya. Ọ bụrụkwa ndị na-emere unu ihe ọma ka unu na-emere ihe ọma, uru gịnị ka ọ baara unu n’ezie? Ọbụna ndị mmehie na-eme otu ihe ahụ. Ọzọ, ọ bụrụ na ọ bụ ndị unu nwere olileanya ịnata ọmụrụ nwa ka unu na-agbazinye ihe n’anaghị ọmụrụ nwa, uru gịnị ka ọ baara unu? Ọbụna ndị mmehie na-agbazinye ndị mmehie ihe n’anaghị ha ọmụrụ nwa ka ha wee nwetaghachi ihe hà otú ahụ. Kama nke ahụ, nọgidenụ na-ahụ ndị iro unu n’anya ma na-eme ihe ọma, na-agbazinyekwa ihe n’anaghị ọmụrụ nwa, n’enweghị olileanya inwetaghachi ihe ọ bụla; ụgwọ ọrụ unu ga-adịkwa ukwuu, unu ga-abụkwa ụmụ nke Onye Kasị Elu, n’ihi na ọ dị obiọma n’ebe ndị na-enweghị ekele na ndị ọjọọ nọ. Nọgidenụ na-eme ebere, dị nnọọ ka Nna unu na-eme ebere.”—Luk 6:32-36.

20 Obiọma Chineke adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị. Ọ dịghị achọ ihe ọ bụla, ọ dịghịkwa atụ anya ka a kwụghachi ya ihe ọ bụla. Jehova ji obiọma “na-eme ka anyanwụ ya na-awakwasị ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri na-ezokwasị ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Matiu 5:43-45; Ọrụ 14:16, 17) N’iṅomi Nna anyị nke eluigwe, ọ bụghị nanị na anyị na-ezere imerụ ndị na-enweghị ekele ahụ́ kama anyị na-emere ha ihe ọma, ọbụna ndị meworo ihe dị ka ndị iro anyị. Site n’igosipụta obiọma, anyị na-egosi Jehova na Jizọs na anyị chọrọ ibi n’Alaeze Chineke, mgbe obiọma na àgwà nsọpụrụ Chineke ndị ọzọ ga-abami ná mmekọrịta nile nke ụmụ mmadụ.

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-egosipụta Obiọma?

21, 22. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịdị na-egosipụta obiọma?

21 Nye ezi Ndị Kraịst, igosipụta obiọma dị ezigbo mkpa. Ọ bụ ihe àmà na-egosi na mmụọ nsọ Chineke nọ n’ọrụ n’ime anyị. Ọzọkwa, mgbe anyị na-egosipụta ezi obiọma, anyị na-eṅomi Jehova Chineke na Kraịst Jizọs. A chọkwara obiọma n’aka ndị Alaeze Chineke ga-achị. Ya mere, anyị ga-ahụ obiọma n’anya ma mụta igosipụta ya.

22 Olee ụzọ ụfọdụ dị iré anyị pụrụ isi na-egosipụta obiọma ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị? Isiokwu na-esonụ ga-atụle nke a.

Ì Si Aṅaa Aza?

• Gịnị bụ obiọma?

• N’ihi gịnị ka ụwa ji bụrụ ebe jupụtara n’obi ọjọọ na ebe siri ike obibi?

• Olee otú anyị si mara na obiọma ga-ejupụta n’ọchịchị Chineke?

• N’ihi gịnị ka igosi obiọma ji dị mkpa maka ndị na-achọ ibi n’Alaeze Chineke?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 13]

Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-agbalị iji obiọma na-emeso ìgwè atụrụ ahụ ihe

[Foto dị na peeji nke 15]

Obiọma sitere n’ịhụnanya nke Jehova agaghị ahapụ ndị ohu ya n’oge ihe isi ike

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Jehova ji obiọma na-eme ka anyanwụ na-awakwasị mmadụ nile, na-emekwa ka mmiri na-ezokwasị ha