Samuel nke Mbụ 2:1-36

  • Ekpere Hana kpere (1-11)

  • Ihe ọjọọ ụmụ Ịlaị abụọ na-eme (12-26)

  • Jehova kpere ezinụlọ Ịlaị ikpe (27-36)

2  Hana wee kpee ekpere, sị: “Jehova emeela ka obi bụrụ m sọ aṅụrị.+ Jehova enyekwuola m ike.* Ọnụ akaala m ịgwa ndị iro m okwu,N’ihi na m na-aṅụrị ọṅụ na ị zọpụtara m.   O nweghị onye dị nsọ ka Jehova. O nweghị onye dị ka gị.+ O nweghịkwa oké nkume siri ike ka Chineke anyị.+   Unu etuzila ọnụ. Unu anyakwala isi,N’ihi na Jehova bụ Chineke ma ihe niile.+ Ọ na-eleru àgwà ndị mmadụ anya, kwuzie nke dị mma na nke na-adịghị mma.   A gbajisiela ụta ndị dike. Ma, e nyela ndị na-adịghị ike ike.+   Ndị na-erijubu afọ na-arụzi ọrụ ngo iji nweta nri. Ma agụụ anaghịzi agụ ndị agụụ na-agụbu.+ Nwaanyị aga amụọla ụmụ asaa.+ Ma nwaanyị mụrụ ọtụtụ ụmụ agbarala aka nwa.   Jehova nwere ike igbu mmadụ, nweekwa ike ime ka mmadụ dị ndụ. O nwere ike ime ka mmadụ banye n’ili,* nweekwa ike ime ka mmadụ si n’ili pụta.+   Jehova nwere ike ime ka mmadụ daa ogbenye, nweekwa ike ime ka mmadụ baa ọgaranya.+ O nwere ike iweda mmadụ ala, nweekwa ike ibuli mmadụ elu.+   Ọ na-esi n’ájá ekulite onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya. Ọ na-esi n’ebe a na-ekpofu ntụ* ekulite ndị ogbenye,+Ka ha soro ụmụ ndị eze nọdụ ala. Ọ na-echikwa ha eze. Ntọala ụwa dị Jehova n’aka.+ O dokwasịkwara ụwa n’elu ntọala ahụ.   Ọ na-edu ndị na-erubere ya isi.+ Ma a ga-ala ndị ọjọọ n’iyi n’ọchịchịrị,+N’ihi na ọ bụghị ike mmadụ siri na-eme ka o merie onye ọzọ.+ 10  Jehova ga-ebibi ndị na-alụso ya ọgụ.*+ Mgbe ọ ga-ewesa ha iwe, égbè eluigwe ga-agba.+ Jehova ga-ekpe ụwa niile ikpe.+ Ọ ga-enye eze ya ike,+Nyekwuokwa onye o tere mmanụ ike.”*+ 11  Elkena wee laa n’ụlọ ya na Rema. Ma nwa ya nwoke ahụ bidoro ijere Jehova ozi,+ na-enyere Ịlaị onye nchụàjà aka. 12  Ma, ụmụ Ịlaị bụ ndị ọjọọ.+ Ha anaghị atụ egwu Jehova. 13  A bịa n’ihe e kwesịrị inye ndị nchụàjà, ihe a ka ha na-eme:+ Ọ na-abụ mgbe ọ bụla mmadụ na-achụ àjà, onye na-ejere onye nchụàjà ozi ejiri ndụdụ nwere ezé atọ bịa mgbe anụ e ji chụọ àjà ka dị n’ọkụ. 14  Ọ na-adụnyekwa ya n’ụdị ite ọ bụla e ji na-esi anụ ahụ. Ihe ọ bụla ndụdụ ahụ dụtara ka onye nchụàjà na-ewere. Otú a ka ha na-eme ndị Izrel niile na-abịa na Shaịlo. 15  Ọ na-abụkwa, tupu onye na-achụ àjà esuo abụba anụ o ji achụ àjà ọkụ,+ onye na-ejere onye nchụàjà ozi na-abịa, sị ya: “Wetara onye nchụàjà anụ ọ ga-ahụ n’ọkụ. Ọ bụ anụ ndụ ka ọ ga-anara gị, ọ bụghị nke e siri n’ọkụ.” 16  Ọ bụrụ na onye ahụ asị ya: “Ka e burugodị ụzọ suo abụba anụ ọkụ.+ E suchaa ya, gị ewerezie ihe masịrị gị.” Ọ na-asị: “Mba, nye m ya ugbu a, ma i nyeghị m ya, m ga-ewere ya n’ike.” 17  Mmehie ndị ahụ na-eje ozi bịara hie nne n’anya Jehova,+ n’ihi na o nweghị ihe ha* ji àjà a na-achụrụ Jehova kpọrọ. 18  Samuel na-eyi ákwà efọd e ji linin kwaa+ ejere Jehova ozi,+ n’agbanyeghị na ọ bụ nwata. 19  Nne ya na-akwakwara ya obere uwe elu na-enweghị aka. Ọ na-achịgakwara ya uwe ahụ kwa afọ ma ya na di ya gaa ịchụ àjà a na-achụ n’afọ ọ bụla.+ 20  Ịlaị wee gọzie Elkena na nwunye ya, sị: “Ka Jehova mee ka nwaanyị a mụta nwa unu ga-eji dochie nwa a unu nyere Jehova.”+ Ha wee laghachi n’obodo ha. 21  Jehova chetakwara Hana, ya amụọ ụmụ+ nwoke atọ ọzọ na ụmụ nwaanyị abụọ. Samuel nọkwa na-eto, ihe ya ana-amasị Jehova.+ 22  Ugbu a, Ịlaị akaala nká. Ma, ọ nụrụ ihe niile ụmụ ya nọ na-eme+ ndị Izrel niile nakwa otú ha na ụmụ nwaanyị ndị na-eje ozi n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute si edina.+ 23  Ọ na-asịkwa ha: “Gịnị mere unu ji na-eme ụdị ihe ndị a? Ihe m na-anụ mmadụ niile na-ekwu gbasara unu adịghị mma. 24  Ụmụ m, kwụsịnụ ihe a unu na-eme, n’ihi na ihe m na-anụ ndị Jehova na-akọsa gbasara unu adịghị mma. 25  Ọ bụrụ na mmadụ emehie mmadụ ibe ya, onye ọzọ nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere ya aka.* Ma ọ bụrụ na ọ bụ Jehova ka mmadụ mehiere,+ ònye ga-arịọchitere ya arịrịọ?” Ma ha egeghị nna ha ntị, n’ihi na Jehova ekpebiela igbu ha.+ 26  N’oge ahụ niile, nwata ahụ bụ́ Samuel nọ na-eto, ihe ya ana-amasịkwa ma Jehova ma ndị mmadụ.+ 27  Otu onye amụma Chineke bịakwutere Ịlaị, sị ya: “Jehova kwuru, sị: ‘Ọ̀ bụ na mụ emeghị ka nna nna gị na ezinụlọ ya mara onye m bụ mgbe ha ka nọ n’Ijipt na-agbara Fero ohu?*+ 28  Ọ bụkwa ya ka m họọrọ n’ebo Izrel niile+ ka ọ bụrụ onye nchụàjà nakwa ka ọ na-aga n’elu ebe ịchụàjà m+ na-achụ àjà, na-amụnye insens* ọkụ, yirikwa efọd na-ejere m ozi. Ọ bụ ya mere m ji nye ya na ụmụ ya ikike iwere ụfọdụ anụ n’anụ ndị Izrel ga-eji chụọrọ m àjà.+ 29  Gịnị mere gị na ụmụ gị ji jiri àjà a na-achụrụ m na onyinye m kwuru ka a na-eweta n’ụlọ m na-egwu egwu?+ Gịnị mere i ji na-akwanyere ụmụ gị ùgwù karịa m? Gịnị mere unu ji eri ihe kacha mma n’onyinye ndị m bụ́ Izrel na-enye m?+ 30  “‘Ọ bụ ya mere Jehova bụ́ Chineke Izrel ji sị: “N’eziokwu, o nwere mgbe m kwuru na ezinụlọ gị na ezinụlọ nna nna gị ga na-ejere m ozi mgbe niile.”+ Ma, Jehova na-ekwuzi ugbu a, sị: “Tụfịakwa! Agaghịzi m ekwe ka ọ dị otú ahụ, n’ihi na ọ bụ ndị na-akwanyere m ùgwù ka m ga-akwanyere ùgwù.+ Ma, m gaghị akwanyere ndị na-eleda m anya ùgwù.” 31  Oge na-abịa mgbe m ga-eme ka ike gharazie ịdị gị na ezinụlọ nna nna gị. Oge ahụ ruo, a gaghịzi enwe onye ga-aka nká n’ezinụlọ gị.+ 32  Ihe ga na-agaziri ndị Izrel, ma, ị ga na-ahụ onye iro gị n’ụlọ m.+ O nweghịkwa onye ezinụlọ gị ga-aka nká. 33  Ma onye si n’ezinụlọ gị, onye m ga-ahapụ ka ọ na-ejere m ozi n’ebe ịchụàjà m, ga-eme ka anya gị gharazie ịhụ ụzọ, meekwa ka i ruo uju.* Ma, ndị ezinụlọ gị ndị mmadụ ga-eji mma agha gbuo ga-akarị ndị a ga-ahapụ.+ 34  Ihe ị ga-eji mara na ihe a m na-ekwu bụ eziokwu bụ ihe a: Ụmụ gị abụọ, bụ́ Họfnaị na Finihas, ga-anwụ n’otu ụbọchị.+ 35  M ga-ahọrọkwa onye nchụàjà na-erubere m isi.+ Ọ ga-eme ihe dị m mma n’obi. M ga-arụkwara ya ụlọ na-agaghị ada ada. Ọ ga na-ejekwara onye m tere mmanụ ozi mgbe niile. 36  Onye ọ bụla nke fọrọ n’ezinụlọ gị ga-abịa kpọọrọ onye nchụàjà ahụ isiala ka ọ kwụọ ya ụgwọ ma nye ya otu ogbe achịcha. Ọ ga-asịkwa ya: “Biko, nye m otu ọrụ ndị nchụàjà na-arụ ka m nwee ike ịna-ahụtụ achịcha m ga-ata.”’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “buliri mpi m elu.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Mpi.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ, “ahịhịa.”
O nwere ike ịbụ, “Ezigbo ụjọ ga-ejide ndị na-alụso Jehova ọgụ.”
Na Hibru, “Buliekwa mpi onye o tere mmanụ elu.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Mpi.”
O nwere ike ịbụ ụmụ Ịlaị abụọ, mana, ndị na-ejere ndị nchụàjà ozi nwekwara ike iso.
O nwere ike ịbụ, “Chineke ga-ekpechite ọnụ ya.”
Na Hibru, “na-agbara ụlọ Fero ohu.”
Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Ma ọ bụ “meekwa ka ike gwụ mkpụrụ obi gị.”