Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-ebi Ndụ Kwekọrọ ná Nraranye Gị?

Ị̀ Na-ebi Ndụ Kwekọrọ ná Nraranye Gị?

Ị̀ Na-ebi Ndụ Kwekọrọ ná Nraranye Gị?

“Ihe ọ bụla unu na-eme, na-arụnụ ọrụ site ná mkpụrụ obi unu, dị ka unu na-arụrụ Onyenwe anyị ọrụ, ọ bụghịkwa mmadụ.”—NDỊ KỌLỌSI 3:23.

1. N’echiche nke ụwa, gịnị ka okwu ahụ bụ́ “nraranye” na-enye echiche ya?

OLEE otú ndị na-eme egwuregwu si eru ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu n’egwuregwu ha? N’egwuregwu tennis, bọl ụkwụ, basketball, baseball, ọsọ, bọl golf, ma ọ bụ n’egwuregwu ndị ọzọ, onye kasị eme nke ọma na-eru n’ókè ahụ nanị site n’itinye onwe ya kpam kpam na ya. Idozi anụ ahụ na uche ha na-abụ ihe ndị kasị mkpa. Nke a kwekọrọ nke ọma n’otu n’ime nkọwa e nyere okwu ahụ bụ́ “nraranye,” nke bụ́ “mmadụ itinye onwe ya nile n’otu ụzọ iche echiche ma ọ bụ nke omume kpọmkwem.”

2. Gịnị ka “nraranye” pụtara na Bible? Kọwaa.

2 Otú ọ dị, gịnị ka “nraranye” pụtara n’echiche nke Bible? “Rara nye” bụ nsụgharị nke ngwaa Hibru nke pụtara “debe iche; ịbụ nke e debere iche; wezụga.” * N’Israel oge ochie, Onyeisi Nchụàjà bụ́ Erọn kpukwasịrị n’ákwà nkuku isi ya, “okpu nsọ nke onyeisi nchụàjà,” bụ́ ihe dị mbara na-egbuke egbuke e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee bụ́ nke e dekwasịrị okwu Hibru nsụgharị ya bụ “Ihe nsọ Jehova nwere.” Nke ahụ bụ iji chetara onyeisi nchụàjà na ọ ghaghị izere ihe ọ bụla ga-emerụ ebe nsọ ahụ “n’ihi na [ihe àmà nke nraranye, NW] mmanụ nke otite mmanụ nke Chineke ya dịkwasị ya.”—Ọpụpụ 29:6; 39:30; Levitikọs 21:12.

3. Nraranye kwesịrị isi aṅaa emetụta omume anyị?

3 Anyị pụrụ ịhụ na dị ka ihe a na-ekwu ebe a si dị, nraranye bụ ihe dị oké mkpa. Ọ na-enye echiche nke mmadụ iji ọchịchọ obi ya mee ka a mara ya dị ka ohu Chineke, ọ na-achọkwa mmadụ ime omume dị ọcha. Ya mere, anyị pụrụ ịghọta ihe mere Pita onyeozi ji hota Jehova dị ka onye na-ekwu, sị: “Unu ga-adị nsọ; n’ihi na nsọ ka Mụ onwe m dị.” (1 Pita 1:15, 16) Dị ka ndị Kraịst raara onwe ha nye, anyị nwere ibu ọrụ dị ukwuu ibi ndụ kwekọrọ ná nraranye anyị, na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ. Ma gịnị ka nraranye ndị Kraịst na-agụnye?—Levitikọs 19:2; Matiu 24:13.

4. Olee otú anyị si eru na nzọụkwụ nke nraranye, gịnịkwa ka a pụrụ iji tụnyere ya?

4 Mgbe anyị nwetasịrị ezi ihe ọmụma banyere Jehova Chineke na nzube ya nakwa banyere Jisọs Kraịst na òkè ọ na-ekere ná nzube ndị ahụ, anyị kpebiri n’onwe anyị iji obi anyị dum, uche anyị dum, mkpụrụ obi anyị dum, na ike anyị dum na-ejere Chineke ozi. (Mak 8:34; 12:30; Jọn 17:3) A pụrụ ọbụna ile nke ahụ anya dị ka nkwa onwe onye, nrara mmadụ raara onwe ya dum nye Chineke. Anyị emeghị nraranye n’ihi mkpali mmetụta uche anyị nwere na mberede. Anyị ji nlezianya na ekpere chebara ya echiche, na-eji ike iche echiche anyị eme ya. N’ihi ya, ọ bụghị mkpebi ga-adịru nwa oge. Anyị apụghị ịdị ka onye malitere ịkọ ubi ma kwụsịzie n’ụzọ n’ihi na ọ bụ ọrụ tara nnọọ akpụ ma ọ bụ n’ihi na oge owuwe ihe ubi yiri ka ọ̀ dị nnọọ anya ma ọ bụkwanụ yie ihe a na-ejitụghị n’aka. Tụlee ihe atụ nke ụfọdụ ndị ‘tinyeworo aka n’ọ́gụ̀’ nke ibu ọrụ ọchịchị Chineke n’agbanyeghị ihe isi ike nile.—Luk 9:62; Ndị Rom 12:1, 2.

Ha Akwụsịghị Ime Ihe Kwekọrọ ná Nraranye Ha

5. Olee otú Jeremaịa si bụrụ ihe atụ pụtara ìhè nke ohu Chineke raara onwe ya nye?

5 Ozi ibu amụma nke Jeremaịa jere na Jerusalem were ihe karịrị afọ 40 (647-607 T.O.A.), ọ bụghịkwa ọrụ dị mfe. Ọ maara nnọọ ebe ike ya ruru. (Jeremaịa 1:2-6) Obi ike na ntachi obi dị ya mkpa iji chee ndị isi ike nke Juda ihu kwa ụbọchị. (Jeremaịa 18:18; 38:4-6) Otú ọ dị, Jeremaịa tụkwasịrị obi n’ebe Jehova Chineke nọ, bụ́ onye wusikwuru ya ike nke mere ka ọ ghọọ ohu Chineke raara onwe ya nye n’ezie.—Jeremaịa 1:18, 19.

6. Ihe nlereanya dị aṅaa ka Jọn onyeozi setịpụụrụ anyị?

6 Gịnị banyere Jọn onyeozi kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ onye a chụgara n’àgwàetiti Patmọs ahụ dị ize ndụ n’oge ọ bụ agadi n’ihi “okwu Chineke na àmà Jisọs”? (Mkpughe 1:9) Ọ tachiri obi ma bie ndụ kwekọrọ ná nraranye ya dị ka onye Kraịst ruo ihe dị ka afọ 60. O biri ndụ gabiga oge usuu ndị agha Rom bibiri Jerusalem. O nwere ihe ùgwù nke ide otu Oziọma, akwụkwọ ozi atọ e dere n’ike mmụọ nsọ, na akwụkwọ Mkpughe, bụ́ nke ọ nọ na ya hụ agha Amagedọn ga-abịa n’ọdịnihu. Ọ̀ kwụsịrị mgbe ọ matara na Amagedọn agaghị abịa n’oge ndụ ya? Ọ̀ ghọrọ onye na-enweghịzi mmasị? Ee e, Jọn nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ ya, na-amara na ọ bụ ezie na “oge ahụ dị nso,” ọhụụ ya ga-emezu n’oge ka dị n’ihu.—Mkpughe 1:3; Daniel 12:4.

Ihe Atụ nke Nraranye n’Oge A

7. Olee otú otu nwanna nwoke si bụrụ ezi onye nlereanya n’ihe banyere nraranye ndị Kraịst?

7 N’oge a, ọtụtụ puku ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ejiriwo ịnụ ọkụ n’obi nọgidesie ike ná nraranye ha n’agbanyeghị na ha agaghị anọ ndụ hụ Amagedọn. Otu n’ime ndị dị otú ahụ bụ Ernest E. Beavor nke England. Ọ ghọrọ Onyeàmà na 1939 ná mmalite Agha Ụwa nke Abụọ, ọ gbahapụkwara achụmnta ego ya na-enwe ihe ịga nke ọma bụ́ isere ndị na-ebipụta akwụkwọ foto, iji malite ozi oge nile. N’ihi ịnọgide na-anọpụ iche dị ka onye Kraịst, a tụrụ ya mkpọrọ ruo afọ abụọ. Ezinụlọ ya kwadoro ya, na 1950 kwa, ụmụ ya atọ gara Watchtower Bible School of Gilead maka ọzụzụ ozi ala ọzọ, na New York. Nwanna Beavor ji nnọọ ịnụ ọkụ n’obi rụọ ọrụ nkwusa ya nke na ndị enyi ya bịara na-akpọ ya Ernie Amagedọn. O ji nguzosi ike n’ihe bie ndụ kwekọrọ ná nraranye ya, ruokwa kpọmkwem mgbe ọ nwụrụ na 1986, ọ kpọsara ịdị nso nke agha Chineke bụ́ Amagedọn. O leghị nraranye ya anya dị ka nkwekọrịta nwa oge nke ya na Chineke nwere! *1 Ndị Kọrint 15:58.

8, 9. (a) Ihe nlereanya dị aṅaa ka ọtụtụ ụmụ okorobịa si Spain setịpụrụ n’oge ọchịchị Franco? (b) Olee ajụjụ ndị e kwesịrị ịjụ?

8 Ihe atụ ọzọ nke ịnụ ọkụ n’obi na-adịghị anyụ anyụ sitere na Spain. N’oge ọchịchị Franco (1939-1975), ọtụtụ narị ndị na-eto eto bụ́ Ndịàmà raara onwe ha nye nọpụrụ iche dị ka ndị Kraịst. Ọtụtụ n’ime ha nọrọ afọ iri n’ụlọ mkpọrọ ndị agha. Ọbụna a mara otu Onyeàmà, bụ́ Jesús Martín, ikpe ịga mkpọrọ ngụkọta ya ruru afọ 22. E tiri ya ihe nke ukwuu mgbe a kpọchiri ya n’otu ụlọ mkpọrọ ndị agha dị n’Ebe Ugwu Africa. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị a dị mfe, ma ọ jụrụ imebi okwukwe ya.

9 Ihe ka ọtụtụ n’oge ndị ahụ, ụmụ okorobịa a amatụghị mgbe, ma ọ bụrụkwarị na ọ dị mgbe, a ga-atọhapụ ha, n’ihi na a mara ha ọtụtụ ikpe, otu gasịa ibe ya esochie. Ma, ha nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe ma jigidesie ịnụ ọkụ n’obi ha maka ozi ahụ ike ka e ji ha eji. Mgbe ọnọdụ ahụ malitere ịka mma n’ikpeazụ na 1973, e si n’ụlọ mkpọrọ tọhapụ ọtụtụ n’ime Ndịàmà a, bụ́ ndị nọ ná mmalite afọ ndị 30 ha, ha banyekwara n’ozi oge nile ozugbo, ụfọdụ ghọrọ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ha biri ndụ kwekọrọ ná nraranye ha n’ụlọ mkpọrọ, ihe ka ọtụtụ anọgidewokwa na-eme otú ahụ kemgbe a tọhapụsịrị ha. * Gịnị banyere anyị taa? Ànyị na-ekwesị ntụkwasị obi nye nraranye anyị dị ka ndị a guzosiri ike n’ihe?—Ndị Hibru 10:32-34; 13:3.

Ile Nraranye Anyị Anya n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị

10. (a) Ànyị kwesịrị isi aṅaa na-ele nraranye anyị anya? (b) Olee otú Jehova si ele ozi anyị na-ejere ya anya?

10 Olee otú anyị si ele nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke ime uche ya anya? Ọ̀ bụ ihe mbụ ná ndụ anyị? Ihe ọ sọrọ ọnọdụ anyị ya bụrụ, ma ànyị bụ ndị na-eto eto ma ọ bụ ndị agadi, ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ ndị na-alụbeghị, ndị ahụ siri ike ma ọ bụ ndị ọrịa, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ibi ndụ kwekọrọ ná nraranye anyị, dị ka ọnọdụ anyị si dị. Ọnọdụ otu onye pụrụ ikwe ka o jee ozi oge nile dị ka ọsụ ụzọ, dị ka onye ọrụ afọ ofufo n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society, dị ka onye ozi ala ọzọ, ma ọ bụ n’ozi njegharị. N’aka nke ọzọ, ụfọdụ ndị nne na nna pụrụ iji nnọọ ọrụ n’aka, na-ahụ maka mkpa anụ ahụ na nke ime mmụọ nke ezinụlọ ha. Obere awa ha na-etinye n’ozi kwa ọnwa hà dị ala n’anya Jehova karịa ọtụtụ awa ndị na-eje ozi oge nile na-etinye? Ee e. Ọ dịghị mgbe Chineke na-atụ anyị anya n’aka inye ihe anyị na-enweghị. Pọl onyeozi kwupụtara ụkpụrụ a, sị: “A sị na obi dị ọkụ dị ya, ọ bụ ihe a ga-anara nke ọma dị ka ihe ọ bụla mmadụ nwere si dị, ọ bụghị dị ka ihe ọ na-enweghị.”—2 Ndị Kọrint 8:12.

11. Na gịnị ka nzọpụta anyị dabeere?

11 Otú o sina dị, nzọpụta anyị na-adabere, ọ bụghị n’ihe ọ bụla anyị pụrụ ime, kama n’obiọma na-erughịrị mmadụ nke Jehova site n’aka Kraịst Jisọs, Onyenwe anyị. Pọl kọwara n’ụzọ doro anya, sị: “Mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke; a na-ewerekwa amara Ya na-agụ ha ná ndị ezi omume n’onyinye efu site ná mgbapụta ahụ nke dị n’ime Kraịst Jisọs.” Otú ọ dị, ọrụ anyị na-agba akaebe nye okwukwe siri ike anyị nwere ná nkwa Chineke.—Ndị Rom 3:23, 24; Jemes 2:17, 18, 24.

12. Gịnị mere anyị ekwesịghị ime ntụnyere?

12 Ọ dịghị anyị mkpa iji oge anyị tinyere n’ozi Chineke, akwụkwọ e ji amụ Bible anyị nyefere, ma ọ bụ ọmụmụ Bible ole anyị duziri na-atụnyere nke ndị ọzọ. (Ndị Galetia 6:3, 4) N’agbanyeghị ihe anyị rụzuru n’ozi ndị Kraịst, anyị nile aghaghị icheta okwu Jisọs nke na-akpali ịdị obi umeala: “Otú a unu onwe unu kwa, mgbe ọ bụla unu ga-emesị ihe nile a kaworo aka nye unu, sịnụ, Anyị bụ ohu ndị na-abaghị n’ihe; anyị emewo ihe anyị ji ụgwọ ime.” (Luk 17:10) Ugboro ole ka anyị pụrụ ikwu n’ezie na anyị emewo “ihe nile a kaworo aka” nye anyị? Ya mere, ajụjụ bụ, Olee otú ozi anyị na-ejere Chineke kwesịrị ịdịru ná mma?—2 Ndị Kọrint 10:17, 18.

Ime Ka Ụbọchị nke Ọ Bụla Baa Uru

13. Àgwà dị aṅaa dị anyị mkpa ka anyị na-emezu nraranye anyị?

13 Mgbe Pọl nyesịrị ndị bụ́ nwunye, ndị bụ́ di, ụmụaka, ndị nne na nna, na ndị ohu ndụmọdụ, o dere, sị: “Ihe ọ bụla unu na-eme, na-arụnụ ọrụ site ná mkpụrụ obi unu, dị ka unu na-arụrụ Onyenwe anyị ọrụ, ọ bụghịkwa mmadụ; ebe unu matara na ọ bụ n’aka Onyenwe anyị ka unu ga-anata ihe nnyeghachi unu, bụ́ ihe nketa ahụ: unu bụ ohu nke Onyenwe anyị Kraịst.” (Ndị Kọlọsi 3:23, 24) Anyị adịghị eje ozi iji kpalie mmasị ndị mmadụ site n’ihe anyị rụzuru n’ozi Jehova. Anyị na-agbalị ijere Chineke ozi site n’ịgbaso ihe nlereanya Jisọs Kraịst. O ji echiche nke ịdị ngwa jee ozi dịtụ mkpirikpi o jere.—1 Pita 2:21.

14. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Pita nyere banyere mgbe ikpeazụ?

14 Pita onyeozi gosipụtakwara echiche nke ịdị ngwa. N’akwụkwọ ozi nke abụọ ya, ọ dọrọ aka ná ntị na na mgbe ikpeazụ, a ga-enwe ndị ọchị—ndị si n’ezi ofufe dapụ na ndị na-enwe obi abụọ—bụ́ ndị, dị ka ọchịchọ nke aka ha si dị, ga-enwe obi abụọ banyere ọnụnọ Kraịst. Otú ọ dị, Pita kwuru, sị: “Onyenwe anyị anọghị ọdụ n’ime nkwa Ya, dị ka ụfọdụ na-agụ ya na ọ bụ ịnọ ọdụ; kama Ọ na-atachiri unu ogologo ntachi obi, n’ihi na O zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị. Ma ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dị ka onye ohi.” Ee, ụbọchị Jehova bụ ihe e ji n’aka na ọ ga-abịa. Ya mere, anyị ga-eme ka nchegbu anyị kwa ụbọchị bụrụ otú okwukwe anyị nwere ná nkwa Chineke siruru n’ike ma bụrụ ihe e ji n’aka n’ezie.—2 Pita 3:3, 4, 9, 10.

15. Ànyị kwesịrị isi aṅaa na-ele ụbọchị ọ bụla ná ndụ anyị anya?

15 Iji jiri nlezianya na-ebi ndụ kwekọrọ ná nraranye anyị, anyị kwesịrị iji ụbọchị ọ bụla mee ihe n’ụzọ ga-ewetara Jehova otuto. Ná ngwụsị nke ụbọchị ọ bụla, ànyị pụrụ ileghachi anya azụ ma hụ otú anyị si tụnye ụtụ n’ụzọ ụfọdụ n’ido aha Chineke nsọ nakwa n’ịkpọsa ozi ọma Alaeze ahụ? Ikekwe ọ bụ site n’omume anyị dị ọcha, mkparịta ụka anyị na-ewuli elu, ma ọ bụ nchegbu ịhụnanya anyị nwere n’ebe ezinụlọ na ndị enyi anyị nọ. Ànyị ji ohere anyị nwere soro ndị ọzọ kerịta olileanya ndị Kraịst anyị? Ọ̀ dịwo onye anyị nyeere aka ichesi echiche ike banyere nkwa Chineke? Ka anyị na-eme ihe bara uru n’ụzọ ime mmụọ kwa ụbọchị, na-ewulite, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀ ime mmụọ hiri nne.—Matiu 6:20; 1 Pita 2:12; 3:15; Jemes 3:13.

Nọgide Na-ahụ Ụzọ nke Ọma

16. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Setan si anwa ime ka nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke gharazie isi ike?

16 Anyị bi n’oge na-esiri ndị Kraịst ike karị. Setan na ndị ozi ya na-anwa ime ka a ghara ịma ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ, ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha, omume ọma na omume ọjọọ, ụkpụrụ omume ọma na ụkpụrụ omume ọjọọ. (Ndị Rom 1:24-28; 16:17-19) O mewo ka ọ dịrị anyị nnọọ mfe imerụ obi anyị site ná nhọrọ ndị anyị na-eme banyere ihe anyị na-ekiri na TV ma ọ bụ site na kọmputa. Anya ime mmụọ anyị pụrụ ịghọ nke na-ahụ inyoghi inyoghi, ma ọ bụ nke na-enweghị ebe o lekwasịrị, nke na anyị agaghị aghọta ụzọ aghụghọ ya. A pụrụ ime ka mkpebi anyị mere ibi ndụ kwekọrọ ná nraranye anyị ghara isi ike, meekwa ka aka anyị ji “ọ́gụ̀” ahụ ghara isi ike ma ọ bụrụ na anyị emebie ihe ndị anyị ji kpọrọ ihe n’ụzọ ime mmụọ.—Luk 9:62; Ndị Filipaị 4:8.

17. Ndụmọdụ Pọl pụrụ isi aṅaa nyere anyị aka ịnọgide na-eso Chineke enwe mmekọrịta?

17 Ya mere, okwu Pọl gwara ọgbakọ dị na Tesalọnaịka bịara nnọọ n’ezi oge: “Nke a bụ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ka e doo unu nsọ, ka unu ghara ịkwa iko; ka onye ọ bụla n’ime unu mata otú ọ ga-enwe nwunye nke aka ya n’odido nsọ na nsọpụrụ, ọ bụghị n’ọchịchọ ọjọọ nke agụụ ihe ọjọọ, ọbụna dị ka ndị mba ọzọ ndị na-amataghị Chineke.” (1 Ndị Tesalọnaịka 4:3-5) Omume rụrụ arụ emewo ka a chụpụ ụfọdụ ndị n’ọgbakọ ndị Kraịst—ndị leghaara nrara ha raara onwe ha nye Chineke anya. Ha kwere ka mmekọrịta ha na Chineke gharazie isi ike, nke mere na ọ dịghịzi ihe ha ji ya kpọrọ ná ndụ ha. Ma, Pọl kwuru, sị: “Chineke akpọghị anyị ka anyị bụrụ ndị na-adịghị ọcha, kama n’odido nsọ. Ya mere onye na-ajụ, ọ bụghị mmadụ ka ọ na-ajụ, kama ọ bụ Chineke, Onye na-enye Mmụọ Nsọ Ya ka Ọ baa n’ime unu.”—1 Ndị Tesalọnaịka 4:7, 8.

Gịnị Bụ Mkpebi Gị?

18. Gịnị kwesịrị ịbụ mkpebi anyị?

18 Ọ bụrụ na anyị ghọtara ịdị mkpa nke nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova Chineke, gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime? Anyị kwesịrị ikpebisi ike ịnọgide na-enwe akọ na uche dị ọcha ma n’omume ma n’ozi anyị. Pita dụrụ ọdụ, sị: “Ebe unu nwere ezi akọ na uche; ka e wee mee ka ihere mee ha, bụ́ ndị na-akparị ibi obi ọma unu n’ime Kraịst, n’ime ihe ahụ nke a na-ekwutọ unu n’ime ya.” (1 Pita 3:16) Anyị nwere ike ịta ahụhụ, a pụkwara ikwutọ anyị n’ihi omume ndị Kraịst anyị, ma otú ahụ ka ọ dịịrị Kraịst n’ihi okwukwe na nguzosi ike ya n’ebe Chineke nọ. “Ya mere,” ka Pita kwuru, “ebe Kraịst hụrụ ahụhụ n’anụ ahụ, unu onwe unu werekwa otu ìzù ahụ kee dị ka ekike agha; n’ihi na onye hụworo ahụhụ n’anụ ahụ agharawo mmehie.”—1 Pita 4:1.

19. Gịnị ka anyị chọrọ ka e kwuo banyere anyị?

19 N’ezie, mkpebi siri ike anyị mere ibi ndụ kwekọrọ ná nraranye anyị ga-echebe anyị pụọ n’ọnyà nke ụwa Setan bụ́ nke na-arịa ọrịa n’ụzọ ime mmụọ, n’ụzọ omume, nakwa n’ụzọ anụ ahụ. Ma, nke karịrị nke ahụ bụ na anyị ga-enwe obi ike na anyị nwere nnwapụta Chineke, bụ́ nke dị mma karịa ihe ọ bụla Setan na ndị ozi ya pụrụ inye. N’ihi ya, ka anyị ghara ikwe ka e kwuo mgbe ọ bụla na anyị ahapụwo ịhụnanya anyị nwere n’oge mbụ anyị matara eziokwu ahụ. Kama nke ahụ, ka e kwuo banyere anyị ihe ahụ e kwuru banyere ndị nọ n’ọgbakọ dị na Taịataịra na narị afọ mbụ: “Amatara m ọrụ gị nile, na ịhụnanya gị na okwukwe gị na ije ozi gị na ntachi obi gị, matakwa na ọrụ ikpeazụ gị karịrị nke mbụ.” (Mkpughe 2:4, 18, 19) Ee, ka anyị ghara ịdị ṅara ṅara n’ihe banyere nraranye anyị, kama ka anyị ‘na-adị ọkụ n’akụkụ mmụọ anyị,’ na-anụ ọkụ n’obi ruo ọgwụgwụ—ọgwụgwụ dịkwa nso.—Ndị Rom 12:11; Mkpughe 3:15, 16.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Lee Ụlọ Nche, January 15, 1988, peeji nke 29.

^ par. 7 Lee Ụlọ Nche nke September 15, 1980, peeji nke 8-11, maka ihe ndekọ zuru ezu banyere ndụ Ernest Beavor.

^ par. 9 Lee 1978 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peeji nke 156-158, 201-218, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị ka nraranye gụnyere?

• Ihe nlereanya ndị dị aṅaa nke ndị ohu Chineke raara onwe ha nye n’oge ochie nakwa n’oge a ka anyị kwesịrị iṅomi?

• Ànyị kwesịrị isi aṅaa na-ele ozi anyị na-ejere Chineke anya?

• Gịnị kwesịrị ịbụ mkpebi anyị banyere nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

Jeremaịa nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị mmeso arụrụala e mesoro ya

[Foto dị na peeji nke 16]

Ernest Beavor setịpụụrụ ụmụ ya ihe nlereanya dị ka onye Kraịst na-anụ ọkụ n’obi

[Foto dị na peeji nke 17]

Ọtụtụ narị Ndịàmà na-eto eto bụ́ ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ ndị dị na Spain nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ka anyị na-eme ihe bara uru n’ụzọ ime mmụọ kwa ụbọchị