Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ E Degaara Ndị Kọrịnt 10:1-18
10 Achọrọ m ka unu mee ihe ndị a m na-agwa unu. Mgbe m na-agwa unu okwu, ana m eme ka Kraịst, onye dị nwayọọ, dịrịkwa obiọma.+ Ma, ụfọdụ n’ime unu na-asị na m na-eme nwayọọ nwayọọ ma mụ na unu nọrọ,+ nakwa na obi na-aka m ịdụ unu ọdụ ma mụ na unu anọghị.+
2 Enwere m olileanya na tupu mụ erute, ndị ahụ na-eche na anyị na-eme otú ndị ụwa na-eme agbanweela, ka m ghara ịbara ha ezigbo mba.
3 N’ihi na ọ bụ eziokwu na anyị bi n’ụwa a,* anyị anaghị alụ agha ka ndị ụwa.*
4 N’ihi na ngwá agha anyị ji alụ agha abụghị ụdị nke ndị ụwa,*+ kama ọ bụ Chineke wetara ha.+ Ha sikwara ezigbo ike iji ha na-akụghasị ihe ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike.
5 Anyị na-ewepụ ihe na-ezighị ezi ndị mmadụ na-eche n’echiche na ihe ọ bụla na-egbochi ha ịma Chineke.+ Anyị na-eme ka ha gbanwee ihe niile ha na-eche n’echiche* ka ha nwee ike ịna-erubere Kraịst isi.
6 Ozugbo unu gosiri na unu na-erube isi n’ihe niile, anyị ga-ejikere ịta onye ọ bụla nupụrụ isi ahụhụ.+
7 Unu na-ele ihe anya otú ha dị n’anya. Ọ bụrụ na e nwere onye obi siri ike na ọ na-eso ụzọ Kraịst, ya chebara ihe a echiche ọzọ: Otú ahụ ọ na-eso ụzọ Kraịst ka anyịnwa na-esokwa.
8 Onyenwe anyị nyere anyị ikike ka anyị na-agba unu ume, ọ bụghị ka anyị na-eme ihe ga-ewute unu.+ Ọ bụrụgodị na ọ ga-eme ka m mee ọnụ obere, ọ gaghị eme ka ihere mewe m.
9 Ma, achọghị m ka unu chewe na m chọrọ iji akwụkwọ ozi m na-edetara unu menye unu ụjọ.
10 N’ihi na, ụfọdụ ndị na-asị: “Akwụkwọ ozi ndị ọ na-ede na-ekwu ihe dị mkpa, na-agbakwa ndị mmadụ ume, ma, ya bịa ihu na ihu, otú ọ dị n’anya na-agwụ mmadụ ike, ọ naghịkwa ekwu ihe bara uru.”
11 Ka ndị na-ekwu ihe a mara na ihe anyị dere n’akwụkwọ ozi anyị ka anyị ga-emekwa ma anyị bịa.+
12 Anyị achọghị iji onwe anyị tụnyere ndị na-eme ọnụ, anyị achọghịkwa ịdị ka ha.+ Ha ji ihe dị ha mma ekpebi ma hà na-eme nke ọma. Ihe a na-egosi na ha amaghị ihe.+
13 Anyị agaghị eji ọrụ anyị na-arụghị eme ọnụ. Naanị ihe anyị ga-eji eme ọnụ bụ ọrụ anyị na-arụ, nke Chineke gwara anyị rụọ. Unu sokwa n’ọrụ a o nyere anyị.+
14 Mgbe anyị bịakwutere unu, anyị arụghị ọrụ Chineke na-agwaghị anyị rụọ, kama anyị bụ ndị mbụ ziri unu ozi ọma gbasara Kraịst.+
15 Anyị anaghị arụ ọrụ a na-enyeghị anyị, anyị ejighịkwa ihe ndị ọzọ rụrụ eme ọnụ. Ma, obi siri anyị ike na ka okwukwe unu na-esikwu ike, ọrụ Chineke nyere anyị ga na-aga nke ọma. Anyị ga-enwekwa ike ịna-arụkwu ya.
16 N’ihi na anyị chọrọ ịga zisaara obodo ndị dị unu anya ozi ọma, ka anyị wee ghara iji ọrụ ndị ọzọ rụrụ na-eme ọnụ.
17 “Ma onye na-eme ọnụ, ya jiri Jehova* na-eme ọnụ.”+
18 N’ihi na ọ bụ onye ihe ya dị Jehova* mma ka ọ na-ekwu okwu ọma gbasara ya,+ ọ bụghị onye na-eto onwe ya.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Grik, “n’anụ ahụ́.”
^ Na Grik, “dị ka anụ ahụ́ si dị.”
^ Na Grik, “nke anụ ahụ́.”
^ Na Grik, “Anyị na-adọrọ echiche ọ bụla n’agha.”