Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ E Degaara Ndị Kọrịnt 10:1-18

  • Pọl kwuru okwu ọma gbasara ozi ya (1-18)

    • Ngwá agha anyị ji alụ agha abụghị ụdị nke ndị ụwa (4, 5)

10  Achọrọ m ka unu mee ihe ndị a m na-agwa unu. Mgbe m na-agwa unu okwu, ana m eme ka Kraịst, onye dị nwayọọ, dịrịkwa obiọma.+ Ma, ụfọdụ n’ime unu na-asị na m na-eme nwayọọ nwayọọ ma mụ na unu nọrọ,+ nakwa na obi na-aka m ịdụ unu ọdụ ma mụ na unu anọghị.+  Enwere m olileanya na tupu mụ erute, ndị ahụ na-eche na anyị na-eme otú ndị ụwa na-eme agbanweela, ka m ghara ịbara ha ezigbo mba.  N’ihi na ọ bụ eziokwu na anyị bi n’ụwa a,* anyị anaghị alụ agha ka ndị ụwa.*  N’ihi na ngwá agha anyị ji alụ agha abụghị ụdị nke ndị ụwa,*+ kama ọ bụ Chineke wetara ha.+ Ha sikwara ezigbo ike iji ha na-akụghasị ihe ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike.  Anyị na-ewepụ ihe na-ezighị ezi ndị mmadụ na-eche n’echiche na ihe ọ bụla na-egbochi ha ịma Chineke.+ Anyị na-eme ka ha gbanwee ihe niile ha na-eche n’echiche* ka ha nwee ike ịna-erubere Kraịst isi.  Ozugbo unu gosiri na unu na-erube isi n’ihe niile, anyị ga-ejikere ịta onye ọ bụla nupụrụ isi ahụhụ.+  Unu na-ele ihe anya otú ha dị n’anya. Ọ bụrụ na e nwere onye obi siri ike na ọ na-eso ụzọ Kraịst, ya chebara ihe a echiche ọzọ: Otú ahụ ọ na-eso ụzọ Kraịst ka anyịnwa na-esokwa.  Onyenwe anyị nyere anyị ikike ka anyị na-agba unu ume, ọ bụghị ka anyị na-eme ihe ga-ewute unu.+ Ọ bụrụgodị na ọ ga-eme ka m mee ọnụ obere, ọ gaghị eme ka ihere mewe m.  Ma, achọghị m ka unu chewe na m chọrọ iji akwụkwọ ozi m na-edetara unu menye unu ụjọ. 10  N’ihi na, ụfọdụ ndị na-asị: “Akwụkwọ ozi ndị ọ na-ede na-ekwu ihe dị mkpa, na-agbakwa ndị mmadụ ume, ma, ya bịa ihu na ihu, otú ọ dị n’anya na-agwụ mmadụ ike, ọ naghịkwa ekwu ihe bara uru.” 11  Ka ndị na-ekwu ihe a mara na ihe anyị dere n’akwụkwọ ozi anyị ka anyị ga-emekwa ma anyị bịa.+ 12  Anyị achọghị iji onwe anyị tụnyere ndị na-eme ọnụ, anyị achọghịkwa ịdị ka ha.+ Ha ji ihe dị ha mma ekpebi ma hà na-eme nke ọma. Ihe a na-egosi na ha amaghị ihe.+ 13  Anyị agaghị eji ọrụ anyị na-arụghị eme ọnụ. Naanị ihe anyị ga-eji eme ọnụ bụ ọrụ anyị na-arụ, nke Chineke gwara anyị rụọ. Unu sokwa n’ọrụ a o nyere anyị.+ 14  Mgbe anyị bịakwutere unu, anyị arụghị ọrụ Chineke na-agwaghị anyị rụọ, kama anyị bụ ndị mbụ ziri unu ozi ọma gbasara Kraịst.+ 15  Anyị anaghị arụ ọrụ a na-enyeghị anyị, anyị ejighịkwa ihe ndị ọzọ rụrụ eme ọnụ. Ma, obi siri anyị ike na ka okwukwe unu na-esikwu ike, ọrụ Chineke nyere anyị ga na-aga nke ọma. Anyị ga-enwekwa ike ịna-arụkwu ya. 16  N’ihi na anyị chọrọ ịga zisaara obodo ndị dị unu anya ozi ọma, ka anyị wee ghara iji ọrụ ndị ọzọ rụrụ na-eme ọnụ. 17  “Ma onye na-eme ọnụ, ya jiri Jehova* na-eme ọnụ.”+ 18  N’ihi na ọ bụ onye ihe ya dị Jehova* mma ka ọ na-ekwu okwu ọma gbasara ya,+ ọ bụghị onye na-eto onwe ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “n’anụ ahụ́.”
Na Grik, “dị ka anụ ahụ́ si dị.”
Na Grik, “nke anụ ahụ́.”
Na Grik, “Anyị na-adọrọ echiche ọ bụla n’agha.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.