Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ije Ozi n’Ebe Ọ Bụla A Chọrọ M

Ije Ozi n’Ebe Ọ Bụla A Chọrọ M

 Akụkọ Ndụ

Ije Ozi n’Ebe Ọ Bụla A Chọrọ M

DỊ KA JAMES B. BERRY SI KỌỌ

Ọ bụ n’afọ 1939. Oké Ndakpọ Akụ̀ na Ụba na-eme ka ndụ taa akpụ na United States, agha na-achọkwa ịda na gburugburu Europe. Mụ na nwanne m nwoke nke m tọrọ bụ́ Bennett aghaghị isi n’ebe obibi anyị dị na Mississippi gaa Houston, Texas, ịchọ ọrụ.

OTU ụbọchị, ka ọ na-erule ngwụsị oge okpomọkụ, anyị nụrụ ịma ọkwa na-akpali akpali site na redio na-eme ụzụ na-agbakasị ahụ: Usuu ndị agha Hitler azọbatawo na Poland. “Amagedọn amalitewo!” ka nwanne m nwoke tiri ná mkpu. Ozugbo, anyị gbahapụrụ ọrụ anyị. Anyị gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị nso ma gaa nzukọ mbụ anyị. N’ihi gịnị ka o jiri bụrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze? Ka m malite n’isi.

A mụrụ m na Hebron, Mississippi, na 1915. Anyị biri n’ime ime obodo ebe a na-akọ ugbo. Ndị Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, na-abịa n’ógbè ahụ ihe dị ka otu ugboro n’afọ ma na-eme ndokwa ikwu okwu n’ụlọ mmadụ. N’ihi ya, ndị mụrụ m nwere ọtụtụ mbipụta dabeere na Bible. Mụ na Bennett bịara kweta ihe akwụkwọ ndị a kụziri: Hel adịghị ọkụ, mkpụrụ obi na-anwụ anwụ, ndị ezi omume ga-ebi n’elu ala ruo mgbe ebighị ebi. N’agbanyeghị nke ahụ, a ka nwere ọtụtụ ihe anyị na-aghaghị ịmụta. Otu oge mgbe m gụsịrị akwụkwọ, mụ na nwanne m nwoke gawara Texas ịchọ ọrụ.

Mgbe anyị mesịrị chọta Ndịàmà n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ha jụrụ ma anyị bụ ndị ọsụ ụzọ. Anyị amaghịdị na onye ọsụ ụzọ bụ onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. Mgbe ahụzi ha jụrụ ma anyị ga-achọ ime nkwusa. “Eenụ!” ka anyị zaghachiri. Anyị bu n’obi na ha ga-eziga anyị na onye ga-egosi anyị otú e si eme nkwusa. Kama  nke ahụ, ha nyere anyị nanị map ma gwa anyị sị, “Rụọnụ n’ebe ahụ!” Mụ na Bennett amaghị ihe ọ bụla banyere otú e si eme nkwusa, anyị kpọkwara ịbụ ndị e menyere ihere asị. N’ikpeazụ, anyị tụnyere kaadị ókèala ahụ n’igbe akwụkwọ ozi ma laghachi Mississippi!

Ime Ka Eziokwu Bible Bụrụ nke Anyị

Mgbe anyị laghachisịrị n’ụlọ, anyị gụrụ akwụkwọ dị iche iche nke Ndịàmà kwa ụbọchị ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu afọ. E nweghị ọkụ eletrik n’ebe obibi anyị, ya mere n’abalị anyị na-eji ìhè ọkụ na-ere ere agụ akwụkwọ. N’oge ndị ahụ, ndị ohu zoonu, ma ọ bụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, na-eleta ọgbakọ Ndịàmà Jehova na Ndịàmà bi n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ iji mee ka ha sikwuo ike n’ụzọ ime mmụọ. Otu n’ime ndị ohu a, bụ́ Ted Klein, letara ọgbakọ anyị ma sonyere mụ na Bennett n’ọrụ ime nkwusa site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ, na-akpọrọkarị anyị abụọ otu mgbe. Ọ kọwaara anyị ihe dị n’ọrụ ịsụ ụzọ.

Isonyere ya kpaliri anyị n’ezie iche echiche imekwu ihe n’ozi Chineke. N’ihi ya n’April 18, 1940, Nwanna Klein mere mụ na Bennett na nwanne anyị nwanyị bụ́ Velva baptism. Ndị mụrụ anyị nọ ya mgbe a na-eme anyị baptism, ha nwekwara obi ụtọ ná mkpebi anyị. Ihe dị ka afọ abụọ mgbe nke ahụ gasịrị, e mekwara ha baptism. Ha abụọ nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke ruo n’ọnwụ ha—papa anyị na 1956 mama anyị kwa na 1975.

Mgbe Nwanna Klein jụrụ m ma m pụrụ ịsụ ụzọ, m gwara ya na m ga-achọ, ma na enweghị m ego, enweghị m uwe, ọ dịghị ihe m nwere. “Nsogbu adịghị,” ka ọ sịrị, “m ga-ahụ maka nke ahụ.” O mere ya. O buru ụzọ zipụ akwụkwọ ndejupụta m maka ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ. Mgbe ahụ, ọ kpọọrọ m gaa New Orleans, dị ihe dị ka kilomita 300 n’ịdị anya, ma gosi m ụfọdụ ọnụ ụlọ ndị mara mma n’elu otu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha bụ maka ndị ọsụ ụzọ. N’oge na-adịghị anya, akwagara m n’ebe ahụ ma malite ọrụ m dị ka onye ọsụ ụzọ. Ndịàmà nọ na New Orleans nyere aka site n’inye ndị ọsụ ụzọ uwe, ego, na nri. N’oge ehihie, ụmụnna ga-ebute nri ma dọsa ya n’ọnụ ụzọ ma ọ bụ ọbụna tinyere anyị ya n’ime friji. Otu nwanna nwoke nwe otu ụlọ nri dị anyị nso na-akpọ anyị ịbịa mgbe nile n’oge ha na-emechi iji buru nri ndị e siri ọhụrụ—dị ka anụ, bred, ofe, na mkpụrụ osisi—e refọrọ erefọ n’ụbọchị ahụ.

Iche Ìgwè Na-eme Ihe Ike Ihu

Ka e mesịrị, e kenyere m ọrụ ịsụ ụzọ na Jackson, Mississippi. Mụ na nwa okoro mụ na ya na-arụkọ ọrụ zutere ìgwè ndị na-eme ihe ike n’ebe ahụ, o yikwara ka ndị nchebe iwu nọ n’ógbè ahụ hà kwadoro ìgwè ahụ! Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ebe ọzọ e kenyere anyị ọrụ—Columbus, Mississippi. Ebe ọ bụ na anyị na-ekwusara ndị si n’agbụrụ na mba nile ozi ọma, ụfọdụ ndị ọcha kpọrọ anyị asị. Ọtụtụ ndị kwetara na anyị dara iwu ịgba ọchịchị mgba okpuru. Ọchịagha nke Usuu Ndị Agha America, òtù hụrụ mba n’anya nke ukwuu, nwere echiche ahụ. Ọtụtụ mgbe ọ kpaliri ìgwè na-eme ihe ike iwe ji ịwakpo anyị.

Na nke mbụ a wakporo anyị na Columbus, otu ìgwè na-eme ihe ike sochiri anyị ka anyị na-ekesa magazin n’okporo ámá. Ha kwanyere anyị na windo ụlọ ahịa a na-ere enyo. Ìgwè mmadụ gbakọtara iji hụ ihe na-emenụ. N’oge na-adịghị anya, ndị uwe ojii rutere ma kpọga anyị ụlọikpe. Ebe ọ bụ na ìgwè ahụ na-eme ihe ike so anyị ruo n’ụlọikpe ahụ, ha mara ọkwa  n’ihu ndị isi nile nọ n’ebe ahụ na ọ bụrụ na anyị apụọ n’obodo ahụ n’ụbọchị a kara aka, anyị pụrụ iji akpụkpọ ahụ anyị pụọ. Ma na ọ bụrụ na anyị apụọ mgbe ụbọchị ahụ gasịrị, anyị agaghị eji akpụkpọ ahụ anyị apụ! Anyị chere na ọ kasị mma ịpụ n’obodo ahụ ruo oge ụfọdụ. Ma ka izu ole na ole gasịrị, anyị laghachiri ma maliteghachi ime nkwusa.

N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, ndị ikom asatọ bụ́ ndị omempụ wakwasịrị anyị ma kwaba anyị n’ime obere ụgbọala abụọ ha. Ha bubara anyị n’ime oké ọhịa, yipụ anyị uwe, ma jiri belt m pịa anyị ọnụ ụtarị 30! Ha ji égbè na ọbụna eriri, aghaghị m ikwu na egwu tụrụ anyị. Echere m na ha gaje ike anyị agbụ ma tụba anyị n’ime mmiri. Ha dọkasịrị akwụkwọ anyị ma fesasịa ya, ọbụnakwa kụrisịa ígwè phonograph anyị n’ogwe osisi.

Ka ha pịasịrị anyị ihe, ha gwara anyị ka anyị yiri uwe anyị ma gawa n’ụzọ banyere n’ime oké ọhịa ahụ n’eleghị anya n’azụ. Ka anyị na-aga, anyị chere nnọọ na ọ bụrụ na anyị anwaa anwaa tụgharịa, ha ga-agbagbu anyị—ọ dịghịkwa ihe a ga-eme ha! Ma ka minit ole na ole gafere, anyị nụrụ ka ha kwọpụrụ ụgbọala ha.

N’oge ọzọ, otu ìgwè na-eme ihe ike iwe ji chụrụ anyị ọsọ, anyị kere uwe anyị gburugburu olu anyị ma gwuo mmiri iji lanarị. Oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, a nwụchiri anyị n’ebubo nke ịgba ọchịchị mgba okpuru. Anyị nọrọ izu atọ n’ụlọ nga tupu e tinye okwu ahụ ọnụ. A kpọsara ihe ahụ merenụ nke ọma na Columbus. Ọbụna e kwere ka ụmụ akwụkwọ mahadum dị nso gbasaa akwụkwọ n’oge iji bịa. Mgbe ụbọchị ahụ ruru, ụlọikpe ahụ juru n’ọnụ—ebe a pụrụ nanị iguzo ọtọ! Ndị na-agbara Ọchịchị akaebe gụnyere ndị ụkọchukwu abụọ, onyeisi obodo, na ndị uwe ojii.

Ọ bụ otu Onyeàmà bụ́ ọkàiwu aha ya bụ G. C. Clarke na onye ọrụ ibe ya ka e zitere ikwuchitere anyị. Ha rịọrọ ka a kagbuo ebubo ahụ nke ịgba ọchịchị mgba okpuru n’ihi enweghị ihe akaebe ọ bụla. Ọkàiwu so Nwanna Clarke arụ ọrụ, ọ bụ ezie na ọ bụghị otu n’ime Ndịàmà Jehova, kwuru okwu ndị dị ike maka anyị. N’otu mgbe ọ gwara ọkàikpe ahụ, sị “Ndị mmadụ na-asị na isi adịghị Ndịàmà Jehova mma. Ọ̀ bụ isi adịghị mma? A sịrị na isi adịghị Thomas Edison mma!” Mgbe ahụ ọ tụrụ bọlb eletrik aka ma sị, “Lee bọlb eletrik ahụ!” Edison, bụ́ onye chepụtara bọlb eletrik pụrụ ịbụ onye ụfọdụ ndị weere dị ka onye isi na-adịghị mma, ma ọ dịghị onye pụrụ ịrụ ihe ndị ọ rụpụtara ụka.

Ka ọ nụsịrị ihe akaebe ahụ, ọkàikpe bụ́ isi n’ụlọikpe ahụ dị n’ógbè ahụ gwara ọkàiwu obodo ahụ sị: “I nweghị ihe akaebe ọ bụla nke ịgba ọchịchị mgba okpuru, ha nwekwara ikike ịrụ ọrụ a. Akpọtaghachikwala ha n’ụlọikpe a iji gbuo oge na ego Gọọmenti nakwa oge m ruo mgbe i nwere ihe akaebe!” Mmeri ghọrọ nke anyị!

Otú ọ dị, ka e mesịrị, ọkàikpe ahụ kpọbatara anyị n’ọfịs ya. Ọ maara na obodo ahụ dum enweghị mmasị ná mkpebi ikpe ya. Ya mere ọ dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Ihe m kwuru bụ dị ka ihe iwu kwuru si dị, ma ndụmọdụ m na-enye unu abụọ bụ: Pụọnụ n’ebe a, ma ọ́ bụghị ya ha ga-egbu unu!” Anyị maara na ihe o kwuru bụ eziokwu, ya mere anyị pụrụ n’obodo ahụ.

Site n’ebe ahụ esonyeere m Bennett na Velva, bụ́ ndị na-eje ozi na Clarksville, Tennessee, dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ka ọnwa ole na ole  gasịrị, e kenyere anyị ọrụ na Paris, Kentucky. Ka otu afọ na ọkara gasịrị, mgbe anyị ka na-achọ nnọọ ijikere iguzobe ọgbakọ n’ebe ahụ, mụ na Bennett natara akwụkwọ ịkpọ òkù pụrụ nnọọ iche.

Ije Ozi Ala Ọzọ

Mgbe anyị hụrụ akwụkwọ ịkpọ òkù ịga klas nke abụọ nke Watchtower Bible School of Gilead, anyị chere, sị, ‘Ha mehiere ihe! Gịnị mere ha ga-eji akpọ ụmụ okorobịa Mississippi abụọ na-amaghị nke a na-akọ òkù ịga ụlọ akwụkwọ ahụ?’ Anyị echeworị na ha chọrọ ndị gụrụ akwụkwọ, ma otú ọ dị, anyị gawara. E nwere 100 ụmụ akwụkwọ na klas ahụ, ihe ọmụmụ ahụ wekwara ọnwa ise. Ngụcha akwụkwọ bụ na January 31, 1944, anyị nwere oké mmasị ije ozi ná mba ọzọ. Ma n’oge ndị ahụ, inweta akwụkwọ ikike ngafe na visa na-ewe oge buru ibu, ya mere e kenyere ụmụ akwụkwọ ọrụ nwa oge na United States. Ka anyị jesịrị ozi ruo oge ụfọdụ dị ka ndị ọsụ ụzọ n’Alabama na Georgia, mụ na Bennett natara ókèala anyị n’ikpeazụ—Barbados, West Indies.

Agha Ụwa nke Abụọ ka na-aga n’ihu, a machibidokwara ọrụ na akwụkwọ Ndịàmà Jehova iwu n’ọtụtụ ebe, gụnyere Barbados. N’ebe a na-enyocha ihe ndị e bubatara ná mba ahụ, ndị isi mepere ma nyochaa ibu anyị ma chọta akwụkwọ ndị anyị zoro na ya. Echiche anyị bụ, ‘Nke anyị agwụla.’ Kama nke ahụ, otu n’ime ndị isi ahụ gwara anyị, sị: “O wutere anyị na anyị aghaghị ịfọghasị ibu unu; a machibidowo ụfọdụ n’ime akwụkwọ a iwu na Barbados.” N’agbanyeghị nke ahụ, o kwere ka anyị buru akwụkwọ ndị ahụ anyị bukọjuru gafee! E mesịa, mgbe anyị gbaara ndị ọrụ gọọmenti àmà, ha kwuru na ha amaghị ihe mere e ji machibido akwụkwọ anyị iwu. E wepụrụ mmachibido iwu ahụ ka ọnwa ụfọdụ gasịrị.

Anyị nwere ọtụtụ ihe ịga nke ọma n’ozi anyị na Barbados. Otu onye n’ime anyị duziri ma ọ dịkarịa ala ọmụmụ Bible 15, ihe kakwa ọtụtụ n’ime ndị mmụta ahụ nwere ọganihu n’ụzọ ime mmụọ. Anyị nwere obi ụtọ ịhụ ụfọdụ ka ha na-abịa nzukọ ọgbakọ. Otú ọ dị, n’ihi ịmachibido akwụkwọ anyị iwu ruo oge ụfọdụ, ụmụnna nọ n’ebe ahụ enweghị nghọta ọhụrụ banyere otú e si eduzi nzukọ dị iche iche. Ya mere, n’oge na-adịghị anya, anyị nwere ike ịzụ ụfọdụ ụmụnna nwoke ndị gbasiri ike. Anyị nwere obi ụtọ inyere ọtụtụ ndị anyị na-amụrụ ihe aka ịmalite ozi ndị Kraịst, nweekwa obi ụtọ ịhụ ọgbakọ ahụ ka ọ na-eto.

Ịzụlite Ezinụlọ

Mgbe m nọsịrị Barbados ruo ihe dị ka ọnwa 18, ọ dịrị mkpa na a ga-awa m ahụ, aghaghịkwa m ịlaghachi United States. Ka m nọ n’ebe ahụ, alụrụ m Onyeàmà aha ya bụ Dorothy bụ́ onye mụ na ya nọworo na-ederịta akwụkwọ ozi. E mesịa, mụ na nwunye m sụrụ ụzọ na Tallahassee, Florida, ma ka ọnwa isii gasịrị, anyị kwagara Louisville, Kentucky, bụ́ ebe otu Onyeàmà nyere m ọrụ. Bennett nwanne m  nwoke nọgidere n’ozi ya na Barbados ruo ọtụtụ afọ. O mesịrị lụọ onye ozi ala ọzọ ibe ya ma jee ozi n’ọrụ njegharị n’àgwàetiti ndị ahụ. N’ikpeazụ, n’ihi ọnọdụ ahụ ike, ha aghaghị ịlọghachi United States. Ha nọgidere n’ọrụ njegharị n’ọgbakọ ndị na-asụ Spanish ruo mgbe Bennett nwụrụ na 1990 n’afọ ndụ nke 73.

Na 1950, Dorothy mụrụ nwa mbụ anyị, nwata nwanyị anyị gụrụ Daryl. Anyị mesịrị nwee ụmụ ise. Nwa anyị nke abụọ, bụ́ Derrick, nwụrụ mgbe ọ dị nanị afọ abụọ na ọkara n’ihi ọrịa meningitis ọkpụkpụ azụ. A mụrụ Leslie na 1956, mụọkwa Everett na 1958. Mụ na Dorothy gbalịsiri ike ịzụlite ụmụ anyị n’ụzọ eziokwu Bible. Anyị gbalịsiri ike mgbe nile inwe usoro ọmụmụ Bible ezinụlọ kwa izu, na-emekwa ka ọ na-amasị ụmụ anyị nile. Mgbe Daryl, Leslie, na Everett ka na-eto eto, izu ọ bụla anyị na-ajụ ha ajụjụ ndị ha ga-emere nchọpụta ma nye azịza ha n’izu na-esonụ. Ha na-emekwa ihe ngosi nke ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Otu na-abanye n’ime ọnụ ụlọ ebe a na-ekowe ákwà ma mee dị ka onye nwe ụlọ. Onye nke ọzọ na-eguzo n’èzí ma kụọ aka. Ha jiri okwu ndị na-atọ ọchị majaa onwe ha, ma nke a nyeere ha aka ịzụlite mmasị maka ọrụ nkwusa. Anyị sokwara ha mee nkwusa mgbe nile.

Mgbe a mụrụ nwa anyị nwoke nke kasị nta, bụ́ Elton, na 1973, ọ fọrọ nke nta ka Dorothy ruo afọ 50, m na-erukwa afọ 60. N’ọgbakọ, ha na-akpọ anyị Abraham na Sera! (Jenesis 17:15-17) Ụmụ anyị ndị nwoke meworo okenye na-akpọkarị Elton eje ozi ọma. Anyị chere na ọ bụ ihe àmà gbara ọkpụrụkpụ bụ́ ndị mmadụ ịhụ ka ezinụlọ—ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ndị mụrụ ụmụ na ụmụ—na-arụkọ ọrụ ọnụ, na-esoro ndị ọzọ ekerịta eziokwu Bible. Ụmụ nwoke ndị tọrọ Elton na-agbanwerịta iku ya n’ubu ha ma nye ya traktị Bible ka o jide n’aka. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na mmadụ nile na-ege ha ntị mgbe ha mepere ụzọ ha ma hụ ọmarịcha nwata nwoke nọ n’ubu deede ya. Ụmụ okoro ahụ kụziiri Elton inye mmadụ traktị mgbe mkparịta ụka gasịrị nakwa ikwu okwu ole na ole. Otú ahụ ka o si malite ime nkwusa.

N’ime ọtụtụ afọ gaferenụ, anyị enwewo ike inyere ndị ọzọ aka ịbịa mara Jehova. Ná ngwụsị afọ ndị 1970, anyị si Louisville kwaga Shelbyville, Kentucky, ije ozi n’ọgbakọ ebe e nwere mkpa. N’ebe ahụ, ọ bụghị nanị na anyị hụrụ uto n’ọgbakọ ahụ kama anyị nyekwara aka n’ịchọta ala na iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. E mesịa, a gwara anyị ka anyị jee ozi n’ọgbakọ ọzọ na-adịghị anya site n’ebe ahụ.

Ọnọdụ Ndụ Ezinụlọ Ndị A Na-atụghị Anya Ha

Ọ gaara amasị m ikwu na ụmụ anyị nile nọgidere n’ụzọ Jehova, ma ọ dịghị otú ahụ. Mgbe ha tolitere ma hapụ ụlọ, atọ n’ime ụmụ anọ anyị dị ndụ hapụrụ ụzọ nke eziokwu ahụ. Otú ọ dị, nwa anyị nwoke bụ́ Everett gbasoro ihe nlereanya m ma banye n’ozi oge nile. O mesịrị jee ozi n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na New York, na 1984 a kpọkwara ya ókù ịga klas nke 77 nke Gilead. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, o jere ebe e kenyere ya ọrụ na Sierra Leone, n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa. Na 1988, ọ lụrụ Marianne, bụ́ onye ọsụ ụzọ si Belgium. Kemgbe ahụ ha ejekọwo ozi ọnụ dị ka ndị ozi ala ọzọ.

Dị ka nne ma ọ bụ nna ọ bụla pụrụ iche n’echiche, ọ bụ ihe na-agbawa obi nye anyị ịhụ ka ụmụ anyị atọ hapụrụ ụzọ nke ndụ bụ́ nke na-enye afọ ojuju ugbu a ma na-enye olileanya mara mma nke ndụ ebighị ebi n’elu ala paradaịs n’ọdịnihu. M na-ata onwe m ụta mgbe ụfọdụ. Ma m na-achọta nkasi obi n’ịmara na ụfọdụ ụmụ mmụọ, ma ọ bụ ndị mmụọ ozi nke Jehova, hapụrụ ijere ya ozi—ọ bụ ezie na Jehova ji ịhụnanya na obiọma enye ịdọ aka ná ntị, ọ dịghịkwa emehie ihe ma ọlị. (Deuterọnọmi 32:4; Jọn 8:44; Mkpughe 12:4, 9) Nke a emewo ka o doo m anya na n’agbanyeghị ókè ndị mụrụ ụmụ pụrụ ịgbalịsiru ike n’ịzụ ụmụ ha n’ụzọ nke Jehova, ụfọdụ pụrụ ịjụ ịnakwere eziokwu ahụ.

Dị ka osisi oké ifufe na-efegharị, anyị ga na-anagide ihe isi ike na nsogbu dị iche iche na-abịara anyị. N’ime ọtụtụ afọ gaferenụ, achọpụtawo m na ịmụchi Bible anya na ịgachi nzukọ anya na-enye m ume iji na-anagide ma na-alanarị n’ụzọ ime mmụọ. Ka m na-akawanye  nká ma na-ahụ ihe ndị m mehiere n’oge gara aga, m na-agbalị ile anya n’akụkụ ndị dị mma. E kwuwerị, ọ bụrụ nnọọ na anyị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi, ahụmahụ ndị dị otú ahụ ga-agbakwụnye ihe n’uto ime mmụọ anyị. Ọ bụrụ na anyị amụta ihe site na ha, akụkụ ndị na-ezighị ezi nke ndụ pụrụ inwe akụkụ ndị ziri ezi.—Jemes 1:2, 3.

Ugbu a mụ na Dorothy enweghịzi ahụ ike ma ọ bụ ume ime ihe ndị anyị chọrọ ime n’ozi Jehova. Ma anyị nwere ekele maka nkwado nke ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst na-enye. N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ná nzukọ nile, ụmụnna na-agwa anyị otú ha nweruru ekele n’ọnụnọ anyị nọ n’ebe ahụ. Ha na-ewepụta onwe ha inyere anyị aka n’ụzọ ọ bụla o kwere mee—ọbụna imezi ụlọ na obere ụgbọala anyị.

Mgbe ụfọdụ, anyị na-enwe ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, na-eduzikwara ndị nwere mmasị ọmụmụ ihe. Ihe pụrụ iche na-enye anyị oké ọṅụ bụ ịnata ozi site n’aka nwa anyị nwoke na-eje ozi n’Africa. Anyị ka na-enwe ọmụmụ Bible ezinụlọ anyị, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị maka anyị abụọ ugbu a. Anyị nwere obi ụtọ na anyị etinyewo ọtụtụ afọ n’ozi Jehova. Ọ na-emesi anyị obi ike na ya agaghị ‘echezọ ọrụ anyị na ịhụnanya ahụ anyị gosiri n’ebe aha Ya dị.’—Ndị Hibru 6:10.

[Foto dị na peeji nke 25]

Mgbe Ted Klein na-eme mụ, Velva, na Bennett baptism n’April 18, 1940

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Mụ na nwunye m, Dorothy, ná mmalite afọ ndị 1940 nakwa na 1997

[Foto dị na peeji nke 27]

Ịkpọsa okwu ihu ọha, bụ́, “Onyeisi Udo” na bọs, na Barbados

[Foto dị na peeji nke 27]

Nwanne m nwoke, bụ́ Bennett n’ihu ebe obibi ndị ozi ala ọzọ