Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Mewo Ka Eziokwu ahụ Bụrụ nke Gị?

Ì Mewo Ka Eziokwu ahụ Bụrụ nke Gị?

 Ì Mewo Ka Eziokwu ahụ Bụrụ nke Gị?

“Ka e nwoghaa unu site n’ime ka uche unu bụrụ ihe ọhụrụ, ka unu wee nwapụta ihe bụ́ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè.”—Ndị Rom 12:2.

1, 2. Gịnị mere na ọ dịghị mfe ịbụ ezi onye Kraịst taa?

ỊBỤ ezi onye Kraịst na mgbe ikpeazụ a—‘oge ndị a dị oké egwu’—adịghị mfe. (2 Timoti 3:1) Nke bụ́ eziokwu bụ na mmadụ aghaghị imeri ụwa iji gbasoo ihe nlereanya Kraịst. (1 Jọn 5:4) Cheta ihe Jisọs kwuru banyere ụzọ ndị Kraịst: “Sinụ n’ọnụ ụzọ dị warara baa: n’ihi na obosara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mbara ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba n’ịla n’iyi, ọtụtụ ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-esi na ya na-aba. N’ihi na warara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mkpagide ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba ná ndụ, ole na ole ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-achọta ya.” O kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ka o soo m n’azụ, ya jụ onwe ya, buliekwa [osisi ịta ahụhụ ya, NW] kwa ụbọchị, na-esokwa m.”—Matiu 7:13, 14; Luk 9:23.

2 Mgbe onye Kraịst chọtara ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduba ná ndụ, ihe ịma aka ọzọ o nwere bụ ịnọgide na ya. Gịnị mere nke ahụ ji bụrụ ihe ịma aka? Ọ bụ n’ihi na nraranye na baptism anyị na-eme ka anyị bụrụ ndị Setan lekwasịrị anya iji omume aghụghọ, ma ọ bụ atụmatụ aghụghọ rata. (Ndị Efesọs 6:11, ihe odide ala ala peeji nke NW) Ọ na-arịba adịghị ike anyị ama ma na-achọ iji ha mee ihe ná mgbalị ya imebi ọnọdụ ime mmụọ anyị. E kwuwerị, ọ nwara ịkụda mmụọ Jisọs, ya mere gịnị mere ọ ga-eji ahapụ anyị?—Matiu 4:1-11.

Ụzọ Aghụghọ Setan

3. Olee otú Setan si kụnye obi abụọ n’uche Iv?

3 Otu ụzọ Setan ji eme ihe bụ ịkụnye obi abụọ n’uche anyị. Ọ na-achọ ebe anyị na-adịghị ike n’ihe agha ime mmụọ anyị. Ná mmalite, o ji ụzọ ahụ mee ihe n’ebe Iv nọ, na-ajụ ya, sị: “Ọ̀ ga-abụ ezie na Chineke sịrị, Unu erila mkpụrụ sitere n’osisi ọ bụla nke ubi a a gbara ogige?” (Jenesis 3:1) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Setan nọ na-ekwu, sị, ‘Ò kwere omume n’ezie na Chineke pụrụ ịmachibido unu iwu dị otú ahụ? Ọ̀ ga-anapụ unu ihe dị mma otú ahụ? Leenụ, Chineke maara na ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere n’osisi ahụ, a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ!’ Setan kụrụ mkpụrụ nke obi abụọ ma chere ka o puo.—Jenesis 3:5.

4. Obi abụọ ndị dị aṅaa ka ụfọdụ ndị pụrụ inwe taa?

4 Olee otú Setan si eji ụzọ a eme ihe taa? Ọ bụrụ na anyị eleghara ọgụgụ Bible anyị, ọmụmụ ihe onwe onye anyị, ekpere anyị, nakwa ozi na nzukọ ndị Kraịst anyị anya, anyị pụrụ ikpughepụ onwe anyị nye obi abụọ ndị ọzọ kpalitere. Dị ka ihe atụ: “Olee otú anyị si mara na nke a bụ eziokwu ahụ dị ka Jisọs si kụzie ya?” “Oge ndị a hà bụ mgbe ikpeazụ n’ezie? E kwuwerị, anyị abanyelarị na narị afọ nke 21.” “Ànyị nọ nnọọ Amagedọn nso, ka ọ ka dị anya?” Ọ bụrụ na anyị enwewa obi abụọ ndị dị otú ahụ, gịnị ka anyị pụrụ ime iji wepụ ha?

5, 6. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime ma ọ bụrụ na anyị enwee obi abụọ?

5 Jemes nyere ndụmọdụ dị irè mgbe o dere, sị: “Ọ bụrụ na amamihe fọdụụrụ onye ọ bụla n’ime unu inwe, ya rịọ n’aka Chineke, Onye na-enye mmadụ nile n’afọ ofufo, n’ataghịkwa ụta; a ga-ewerekwa ya nye ya. Ma ya rịọ n’okwukwe, ghara inwe obi abụọ: n’ihi na onye nwere obi abụọ yiri ebili mmiri nke oké osimiri mgbe ifufe na-efegharị ya, a na-atụlikwa ya elu. N’ihi na, ka mmadụ ahụ ghara iche na ọ ga-anata ihe ọ bụla n’aka Onyenwe anyị; ọ bụ nwoke nwere uche  abụọ, onye na-adịghị eguzo n’otu ebe n’ụzọ ya nile.”—Jemes 1:5-8.

6 Gịnịzi ka anyị na-aghaghị ime? Anyị kwesịrị iji ekpere ‘na-arịọ maka okwukwe na nghọta n’aka Chineke,’ na-etinyekwu ihe ná mgbalị ndị anyị na-eme n’ọmụmụ ihe onwe onye banyere ajụjụ ma ọ bụ obi abụọ ọ bụla anyị nwere. Anyị pụkwara ịrịọ ndị gbasiri ike n’okwukwe maka enyemaka, n’enweghị obi abụọ ma ọlị ma Jehova ọ̀ ga-enye anyị nkwado dị anyị mkpa. Jemes kwukwara, sị: “Ya mere doonụ onwe unu n’okpuru Chineke; ma guzogidenụ ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ. Bịaruonụ Chineke nso, Ọ ga-abịarukwa unu nso.” Ee, obi abụọ anyị nwere ga-akwụsị ka anyị na-abịaru Chineke nso site n’ọmụmụ ihe na ekpere.—Jemes 4:7, 8.

7, 8. Olee akara ụfọdụ bụ́ isi e ji amata ụdị ofufe Jisọs kụziri, ole ndị nwekwara akara ndị a?

7 Were, dị ka ihe atụ, ajụjụ ahụ bụ́: Olee otú anyị si mara na anyị na-efe ụdị ofufe Jisọs kụziri? Iji zaa ajụjụ a, olee akara ndị a na-aghaghị ịtụle? Bible na-eme ka ọ pụta ìhè na ezi ndị Kraịst aghaghị inwe ezi ịhụnanya n’etiti onwe ha. (Jọn 13:34, 35) Ha aghaghị ido aha Chineke, bụ́ Jehova, nsọ. (Aịsaịa 12:4, 5; Matiu 6:9) Ha aghaghịkwa ime ka a mara aha ahụ.—Ọpụpụ 3:15; Jọn 17:26.

8 Ihe ọzọ e ji amata ezi ofufe bụ nkwanye ùgwù n’ebe Okwu Chineke, bụ́ Bible, dị. Ọ bụ akwụkwọ pụrụ iche nke na-ekpughe àgwà Chineke na nzube ya. (Jọn 17:17; 2 Timoti 3:16, 17) Ọzọkwa, ezi ndị Kraịst na-akpọsa Alaeze Chineke dị ka nanị olileanya ụmụ mmadụ nwere maka ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. (Mak 13:10; Mkpughe 21:1-4) Ha na-anọpụ iche na ndọrọ ndọrọ ọchịchị rụrụ arụ nke ụwa a na ụzọ ndụ ya na-emerụ emerụ. (Jọn 15:19; Jemes 1:27; 4:4) Ole ndị taa nwere akara ndị a n’ezie? Ihe ndị mere eme na-egosi na azịza ya bụ nanị otu—Ndịàmà Jehova.

Gịnị Ma Ọ Bụrụ na Ị Nọgide Na-enwe Obi Abụọ

9, 10. Gịnị ka anyị pụrụ ime iji merie obi abụọ ndị anyị nọgidere na-enwe?

9 Gịnị ma ọ bụrụ na obi abụọ erikpuo anyị? Gịnịzi ka anyị kwesịrị ime? Eze Solomọn maara ihe na-enye azịza ya: “Nwa m, ọ bụrụ na ị nara okwu ọnụ m nile, ọ bụrụkwa na i zobe ihe nile m nyere n’iwu n’ebe ị nọ; ị tọọrọ amamihe ntị gị n’ala, wee wezụga obi gị inwe nghọta; ee, ọ bụrụ na ọ bụ mmata ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị; ọ bụrụ na ị chọọ ya dị ka ọlaọcha, ọ bụrụkwa na ọ bụ dị ka akụ̀ zoro ezo ka ị na-egwupụta ya: mgbe ahụ ka ị ga-aghọta egwu Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta.”Ilu 2:1-5, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.

10 Nke ahụ ọ́ bụghị echiche na-atụ n’anya? Ọ bụrụ na anyị dị njikere iji ezi obi na-atọrọ amamihe  Chineke ntị n’ala, ọ bụ “ihe ọmụma Chineke ka [anyị] ga-achọta.” Ee, ihe ọmụma nke Eze Onyenwe eluigwe na ala dị n’ebe aka anyị ga-eru ma ọ bụrụ na anyị dị njikere ịnara ma zobe okwu ọnụ ya nile. Nke ahụ pụtara ichigharịkwuru Jehova n’ekpere nakwa site n’ọmụmụ ihe onwe onye. Akụ̀ zoro ezo nke Okwu ya pụrụ iwepụ obi abụọ ọ bụla ma nyere anyị aka ịhụ ìhè nke eziokwu ahụ.

11. Olee otú obi abụọ si metụta onye na-ejere Elaịsha ozi?

11 A na-ahụ ihe atụ doro anya banyere otú ekpere si nyere otu ohu Chineke na-atụ ụjọ ma na-enwe obi abụọ aka ná 2 Ndị Eze 6:11-18. Onye na-ejere Elaịsha ozi enweghị nghọta ime mmụọ. Ọ pụghị ịghọta na usuu ndị agha nke eluigwe nọ n’ebe ahụ ịkwado onye amụma Chineke, bụ́ onye usuu ndị agha Siria nọchibidoro. Onye ahụ na-eje ozi ji ụjọ tie mkpu, sị: “Ewo, onyenwe m! ànyị ga-eme gịnị?” Elaịsha si aṅaa zaghachi? “Atụla egwu: n’ihi na ndị anyị na ha nọ dị ọtụtụ karịa ndị ha na ha nọ.” Ma olee otú a ga-esi mee ka onye ahụ na-eje ozi kwere? Ọ pụghị ịhụ usuu ndị agha nke eluigwe ahụ.

12. (a) È si aṅaa mee ka onye ahụ na-eje ozi kwụsị inwe obi abụọ? (b) Olee otú anyị pụrụ isi kwụsị obi abụọ ọ bụla anyị pụrụ inwe?

12 “Elaịsha wee kpee ekpere, sị, Jehova, biko, saghee anya ya abụọ, ka o wee hụ. Jehova wee saghee anya nwa okorobịa ahụ; o wee hụ: ma, lee, ugwu ahụ jupụtara n’ịnyinya na ụgbọala ọkụ gburugburu Elaịsha.” N’ụzọ dị otú ahụ, Jehova mere ka onye ahụ na-eje ozi hụ usuu ndị agha nke eluigwe ahụ nọ na-echebe Elaịsha. Otú ọ dị, anyị ekwesịghị ịtụ anya otu ụdị enyemaka ahụ sitere n’aka Chineke taa. Cheta, onye ahụ na-ejere onye amụma ahụ ozi enweghị Bible n’ozuzu ya ịmụ iji mee ka okwukwe ya sikwuo ike. Anyị nwere Bible. Ọ bụrụ na anyị ejiri ya na-eme ihe nke ọma, a pụrụ ime ka okwukwe anyị sikwuo ike n’otu aka ahụ. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ịtụgharị uche n’ọtụtụ ihe ndekọ ndị na-akọwa ọnụnọ Jehova nọ n’obí eluigwe ya. Nke a na-eme ka anyị ghara inwe obi abụọ ọ bụla na Jehova nwere nzukọ eluigwe na-akwado ndị ohu ya n’ọrụ izi ihe ahụ zuru ụwa ọnụ taa.—Aịsaịa 6:1-4; Ezikiel 1:4-28; Daniel 7:9, 10; Mkpughe 4:1-11; 14:6, 7.

Kpachara Anya Banyere Ụzọ Aghụghọ Setan!

13. Olee ụzọ Setan si anwa ime ka anyị ghara ijisi eziokwu ahụ aka ike?

13 Olee ụfọdụ n’ime ụzọ ndị ọzọ Setan si eme ka ọnọdụ ime mmụọ anyị na aka anyị ji eziokwu  ahụ ghara isi ike? Otu n’ime ha bụ omume rụrụ arụ, n’ụdị ya nile. N’ụwa taa nke ara mmekọahụ na-agba, ihe a na-akpọ ime enyi (okwu dị nro e ji edochi anya ekwesịghị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye) ma ọ bụ nlakpu otu abalị (ịkwa iko aghara aghara) aghọọla ihe a na-eme kwa ụbọchị nye ọgbọ na-achụso ndụ ihe ụtọ bụ́ nke tinyere uche n’inweta ihe ụtọ n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu. Ihe nkiri sịnịma, TV, na vidio na-akwalite ụzọ ndụ a. Ihe na-akpali agụụ mmekọahụ jupụtara n’usoro mgbasa ozi, karịsịa n’Internet. Ọnwụnwa na-echere ndị nwere ọchịchọ ịmata ihe dị na ha.—1 Ndị Tesalọnaịka 4:3-5; Jemes 1:13-15.

14. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị Kraịst jiworo daba n’ụzọ aghụghọ Setan?

14 Ụfọdụ ndị Kraịst ekwewo ka ọchịchọ ịmata ihe duhie ha, ha emerụwokwa uche na obi ha site n’ikiri foto ndị na-akpali agụụ mmekọahụ bụ́ ndị a na-egosichaghị nke ọma ma ọ bụ ọbụna ndị e gosiri n’ụzọ zuru ezu. Ha ekwewo ka ha daba n’ọnyà na-adọrọ adọrọ nke Setan. Ime otú ahụ akpatawo ụgbọ okpukpu n’ụzọ ime mmụọ mgbe mgbe. Ndị dị otú ahụ ajụwo ịnọgide na-abụ “ụmụ ọhụrụ n’obi ọjọọ.” Ha aghọbeghị ‘ndị tozuru okè n’uche ha.’ (1 Ndị Kọrint 14:20) Kwa afọ, agbasoghị ụkpụrụ nke Okwu Chineke na-efu ọtụtụ puku mmadụ ihe. Ha eleghaworo iyikwasị na ịnọgide na-eyi “ihe agha nile nke Chineke” anya.—Ndị Efesọs 6:10-13; Ndị Kọlọsi 3:5-10; 1 Timoti 1:18, 19.

Jiri Ihe Anyị Nwere Kpọrọ Ihe

15. Gịnị mere ọ pụrụ iji siere ụfọdụ ndị ike inwe ekele maka ihe nketa ime mmụọ ha?

15 “Unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu,” ka Jisọs kwuru. (Jọn 8:32) Ihe ka ọtụtụ ná Ndịàmà ahapụwo ụzọ ndụ mbụ ha na okpukpe ha na-ekpebu. Ya mere, ọ pụrụ ịdịrị ha mfe karị inwe ekele maka nnwere onwe eziokwu ahụ na-enye. N’aka nke ọzọ, ọ pụrụ isiri ụfọdụ ndị na-eto eto bụ́ ndị ndị nne na nna nọ n’eziokwu ahụ zụlitere ike inwe ekele maka ihe nketa ime mmụọ ha. Ha abụtụbeghị akụkụ nke okpukpe ụgha ma ọ bụ akụkụ nke ụwa a na mmesi ike ọ na-emesi ịchọ ihe ụtọ, iri ahụ nke ọgwụ ọjọọ ya, na omume rụrụ arụ ya. N’ihi ya, ha nwere ike ghara ịhụ nnukwu ọdịiche dị n’etiti paradaịs ime mmụọ anyị na ụwa rụrụ arụ nke Setan. Ụfọdụ pụrụ ọbụna ịdaba n’ọnwụnwa nke idetụ nsí nke ụwa a ire iji hụ ihe ha chere funahụworo ha!—1 Jọn 2:15-17; Mkpughe 18:1-5.

16. (a) Olee ajụjụ ndị anyị pụrụ ịjụ onwe anyị? (b) Gịnị ka a na-akụziri anyị ma na-agba anyị ume ime?

16 Ọ̀ dị anyị mkpa n’ezie ire mkpụrụ aka anyị ọkụ iji mara otú ahụ mgbu na nhụjuanya na-adị? Ọ̀ bụ na anyị apụghị ịmụta ihe site n’ahụmahụ ọjọọ nke ndị ọzọ? Ọ̀ dị anyị mkpa ịbanye “n’apịtị” nke ụwa a iji mara ma ọ dị ihe funahụrụ anyị? (2 Pita 2:20-22) Pita chetaara ndị Kraịst nke narị afọ mbụ bụ́ ndị bụbu akụkụ nke ụwa Setan, sị: “Oge nke gasịworo ezuwo ịrụpụta ihe ndị mba ọzọ na-ezube, na ijegharị n’ime agụụ ịkwa iko, agụụ ihe ọjọọ nile, mmanya ogbugbu nile, ite egwú nile, ịṅụbiga mmanya ókè nile, na ikpere arụsị nile jọgburu onwe ha.” N’ezie, ọ dịghị anyị mkpa ibi “ndụ ịla n’iyi” nke ụwa iji mara otú ndụ pụrụ ịbụru nke rụrụ arụ. (1 Pita 4: 3, 4) N’ụzọ dị iche, a na-akụziri anyị ụkpụrụ omume dị elu nke Jehova n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị, nke bụ́ ebe ndị a na-akụzi Bible. A na-agbakwa anyị ume iji ike iche echiche anyị nwapụta na anyị nwere eziokwu ahụ ma si otú ahụ mee ka eziokwu ahụ bụrụ nke anyị.—Joshua 1:8; Ndị Rom 12:1, 2; 2 Timoti 3:14-17.

Aha Anyị Abụghị Njimara Nkịtị

17. Ànyị pụrụ isi aṅaa bụrụ Ndịàmà Jehova dị irè?

17 Ọ bụrụ na anyị na-eme ka eziokwu ahụ bụrụ nke anyị, anyị ga-achọ iso ndị ọzọ na-ekerịta ya n’oge ọ bụla kwesịrị ekwesị. Nke a apụtaghị na anyị ga-anwa ịmanye ndị na-enweghị mmasị ịnakwere ya. (Matiu 7:6) Kama nke ahụ, ihere agaghị eme anyị ime ka a mara anyị dị ka Ndịàmà Jehova. Ọ bụrụ na mmadụ egositụ mmasị site n’ịjụ ajụjụ si n’ezi obi ma ọ bụ site n’ịnara akwụkwọ e ji amụ Bible, anyị ga-adị njikere iso ya kerịta olileanya anyị. N’ezie, nke a na-atụ aro ka anyị na-eji ụdị ụfọdụ nke akwụkwọ e ji amụ Bible mgbe nile n’agbanyeghị ebe anyị pụrụ ịnọ—n’ebe obibi, n’ebe ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, n’ụlọ ahịa, ma ọ bụ n’ebe ntụrụndụ.—1 Pita 3:15.

18. Olee otú ime ka a mara anyị nke ọma dị ka ndị Kraịst pụrụ isi baara anyị uru dị ukwuu ná ndụ?

18 Mgbe anyị mere ka a mara anyị nke ọma dị ka ndị Kraịst, anyị na-eme ka ihe nchebe anyị megide mwakpo aghụghọ Setan sikwuo ike. Ọ bụrụ na e nwere ememe ọmụmụ ma ọ bụ ememe Krismas ma ọ bụ na-agba lọtrị n’ụlọ ọrụ, ndị ọrụ ibe anyị ga-ekwukarị, sị, “Hapụ ya. Ọ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova.” N’ihi otu ihe ahụ, e nwere ike ndị mmadụ agaghị na-ejikarị omume rụrụ arụ eme ihe ọchị n’ihu anyị. N’ụzọ dị otú a, anyị ime ka a mara ebe anyị kwụ dị ka ndị Kraịst na-abara anyị uru dị ukwuu ná ndụ, ọbụna dị ka Pita onyeozi mere ka ọ pụta ìhè: “Ònye bụkwa onye ahụ nke ga-emejọ unu, ma ọ bụrụ na unu ghọrọ ndị na-anụ ọkụ n’obi n’iso ezi ihe? Ma ọ bụrụkwa na unu ahụ ahụhụ n’ihi ezi omume, ngọzi na-adịrị unu.”—1 Pita 3:13, 14.

19. Olee otú anyị si mara na anyị nọ n’ime ime mgbe ikpeazụ?

19 Uru ọzọ anyị na-erite site n’ime ka eziokwu ahụ bụrụ nke anyị bụ na anyị ga-ekwenyesi ike na oge ndị a bụ n’ezie mgbe ikpeazụ nke usoro ihe a. Anyị ga-ama na ọtụtụ n’ime amụma Bible na-abịaru mmezu ha n’oge anyị. * Ihe ndị na-eyi egwu mere na narị afọ gara aga na-emesi nnọọ ike ịdọ aka ná ntị Pọl bụ́ na “oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1-5; Mak 13:3-37) Otu isiokwu gbara n’akwụkwọ akụkọ na nso nso a banyere narị afọ nke 20 bu isiokwu bụ “A Ga-echeta Ya Dị Ka Ọgbọ nke Omume Anụ Ọhịa.” Isiokwu ahụ kwuru, sị: “1999 ghọrọ afọ a kasị gbuo mmadụ na ya n’ime ọkara nke abụọ nke narị afọ a kasị gbuo mmadụ na ya.”

20. Ugbu a bụ oge ime gịnị?

20 Ugbu a abụghị oge inwe obi abụọ. A na-ahụ ngọzi Jehova nke ọma n’ọrụ nkụzi Bible kasị ukwuu a rụtụworo mgbe ọ bụla n’ụwa nile bụ́ nke a na-arụ ka ọ bụrụ àmà nye mba nile. (Matiu 24:14) Mee ka eziokwu ahụ bụrụ nke gị, ma soro ndị ọzọ kerịta ya. Ọdịnihu ebighị ebi gị na-adabere n’ihe i mere ugbu a. Iselata aka agaghị eweta ngọzi Jehova. (Luk 9:62) Kama nke ahụ, ọ bụ oge ‘iguzosi ike, bụrụ onye a na-apụghị ifopụ efopụ, onye na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè mgbe nile, ebe ị matara na ndọgbu ị na-adọgbu onwe gị n’ọrụ abụghị ihe efu n’ime Onyenwe anyị.’—1 Ndị Kọrint 15:58.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 19 Lee Ụlọ Nche, January 15, 2000, peeji nke 12-14. Paragraf nke 13-18 tụleghachiri ihe àmà isii gbara ọkpụrụkpụ bụ́ ndị na-egosi na anyị anọwo na-ebi na mgbe ikpeazụ kemgbe 1914.

Ị̀ Na-echeta?

• Ànyị pụrụ isi aṅaa kwụsị inwe obi abụọ?

• Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe atụ nke onye na-ejere Elaịsha ozi?

• Ọnwụnwa nke omume dị aṅaa ka anyị na-aghaghị ịnọ na nche mgbe nile megide?

• N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-eme ka a mara anyị nke ọma dị ka Ndịàmà Jehova.

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Inwechi ọmụmụ Bible anya na ikpechi ekpere anya pụrụ inyere anyị aka ịkwụsị inwe obi abụọ

[Foto dị na peeji nke 11]

E ji ọhụụ mee ka onye na-ejere Elaịsha ozi kwụsị inwe obi abụọ

[Foto dị na peeji nke 12]

A na-akụziri anyị ụkpụrụ omume dị elu nke Jehova n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị dị ka nke a dị na Benin