Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ruo n’ókè ha aṅaa ka ọ dị nwunye bụ́ onye Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi mkpa iguzogide ihe omume ịgba alụkwaghịm nke di ya malitere?

Mgbe alụmdi na nwunye ụmụ mmadụ malitere, Chineke kwuru na di na nwunye kwesịrị ‘ịrapara’ n’ahụ ibe ha. (Jenesis 2:18-24) Ndị mmadụ ghọrọ ndị na-ezughị okè, na-enwe nsogbu ndị nke ahụ kpatara n’ime ọtụtụ alụmdi na nwunye, ma ọchịchọ Chineke bụ na di na nwunye kwesịrị ịnọgide na-arapara n’ahụ ibe ha. Pọl onyeozi dere, sị: “Ma enye m ndị nọ n’ọnọdụ di na nwunye iwu, ọ bụghị mụ onwe m, kama ọ bụ Onyenwe anyị, Ka nwunye ghara ikewapụ onwe ya n’ahụ di ya (ma a sị na ọ bụ ezie na o kewapụrụ onwe ya, ya nọgide n’enweghị di; ma o meghị otú a, ka e mee ka ya na di ya dị n’otu); ka di gharakwa ịhapụ nwunye ya.”—1 Ndị Kọrint 7:10, 11.

Okwu ndị ahụ na-eme ka a mara na n’etiti ndị mmadụ na-ezughị okè, di ma ọ bụ nwunye na-ekpebi mgbe ụfọdụ ịhapụ ibe ya. Dị ka ihe atụ, Pọl kwuru na ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye ekewapụ onwe ya, ha abụọ ‘ga-anọgide n’enweghị di ma ọ bụ nwunye.’ N’ihi gịnị? Ọ bụ ezie na di ma ọ bụ nwunye ahụ ekewapụla onwe ya, ma ha abụọ ka bụ ndị e kekọtara n’ahụ ibe ha n’anya Chineke. Pọl pụrụ ikwu nke a n’ihi na Jisọs esetịpụwo ụkpụrụ maka alụmdi na nwunye ndị Kraịst: “Onye ọ bụla nke ga-ahapụ nwunye ya, ma ọ bụghị n’ihi ịkwa iko [Grik, por·neiʹa], lụrụkwa nwunye ọzọ, ọ na-akwa iko.” (Matiu 19:9) Ee, nanị ihe ndabere maka ịgba alụkwaghịm nke na-eweta alụmdi na nwunye ná njedebe n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ kwadoro bụ “ịkwa iko,” ya bụ, mmekọahụ rụrụ arụ. Dị ka ihe àmà na-egosi, n’ọnọdụ ahụ nke Pọl zoro aka na ya, ọ dịghị onye n’ime di na nwunye ahụ nke meworo omume rụrụ arụ, ya mere mgbe nke ọ bụla kewapụrụ onwe ya, alụmdi na nwunye ahụ abịaghị ná njedebe n’anya Chineke.

Pọl kwuziri banyere ọnọdụ ebe ezi onye Kraịst nwere di ma ọ bụ nwunye na-ekweghị ekwe. Tụlee ntụzi Pọl: “Ọ bụrụ na onye ahụ nke na-ekweghị ekwe ekewapụ onwe ya, ya kewapụ onwe ya: e meghị ka nwanna anyị nwoke ma ọ bụ nwanna anyị nwanyị bụrụ ohu n’okwu dị otú a: ma Chineke akpọwo anyị n’udo.” (1 Ndị Kọrint 7:12-16) Gịnị ka nwunye na-ekwesị ntụkwasị obi pụrụ ime ma ọ bụrụ na di ya na-ekweghị ekwe ahapụ ya, ọbụna na-achọ ịgba ya alụkwaghịm n’ụzọ iwu kwadoro?

Ọ pụrụ ịhọrọ iso ya nọgide na-ebi. Ọ pụrụ ịbụ na nwanyị ahụ ka hụrụ ya n’anya, ghọta mkpa mmetụta uche na nke mmekọahụ ha nwekọrọ, ma mata na nkwado n’ụzọ ihe onwunwe dị ya na obere ụmụaka ọ bụla ha nwere mkpa. Ọ pụkwara inwe olileanya na, ka oge na-aga, di ya ga-aghọ onye kwere ekwe ma bụrụ onye a zọpụtara. Otú ọ dị, ọ bụrụ na di ya ewere nzọụkwụ ndị ga-eweta alụmdi na nwunye ahụ ná njedebe (n’ihe ndabere ụfọdụ Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị), nwunye ahụ pụrụ ‘ikwe ka o kewapụ onwe ya,’ dị ka Pọl dere. Otú ahụ ka ọ ga-adịkwa ma ọ bụrụ na di na-ekweghị ekwe eleghara echiche Chineke banyere alụmdi na nwunye anya ma sie ọnwụ na ya ga-ekewapụ onwe ya.

Otú ọ dị, n’ọnọdụ dị otú ahụ, ọ pụrụ ịdị nwanyị ahụ mkpa ichebe onwe ya na ụmụaka ya. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ ga-achọ ijigide ikike o nwere ịkpọrọ ụmụ ya ọ hụrụ n’anya ka o nwee ike ịnọgide na-egosi ha ịhụnanya nke onye bụ́ nne, na-enye ha ọzụzụ banyere omume, na-akụnyekwa okwukwe dabeere n’ọmarịcha ozizi nke Bible n’ime ha. (2 Timoti 3:15) Ịgba alụkwaghịm ahụ pụrụ itinye ihe ndị ruuru ya n’ihe ize ndụ. N’ihi ya, ọ pụrụ iwere nzọụkwụ ndị ga-eme ka a nọchite anya ya nke ọma n’ihu ndị ọchịchị iji chebe ikike o nwere ịkpọrọ ụmụaka ya nakwa iji jide n’aka na iwu ji di ya ịkwado ezinụlọ ahụ ọ na-agbahapụ. N’ebe ụfọdụ, nwanyị nke na-eguzogide ịgba alụkwaghịm pụrụ ịbịanye aka n’akwụkwọ iwu bụ́ ndị na-egosipụta ndokwa dị iche iche maka ikike ịkpọrọ nwa nakwa nkwado ego, n’anabataghị ịgba alụkwaghịm ahụ di ya na-achọ. N’ebe ndị ọzọ, ihe ndị e dere n’akwụkwọ iwu ahụ na-egosi na ọ kwadoro ịgba alụkwaghịm ahụ; n’ihi ya, ọ bụrụ na ikpe ịkwa iko mara di ya, nwunye ịbịanye aka n’akwụkwọ ndị a ga-apụta na ọ na-ajụ di ya.

Ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ n’ógbè ahụ nakwa n’ọgbakọ agaghị amazu ihe merenụ, ihe dị ka ma à gbara alụkwaghịm ahụ n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ kwadoro. Ya mere, tupu ihe eruo nke otú ahụ, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ma nwunye ahụ mee ka onyeisi oche ndị nlekọta na okenye ọzọ nọ n’ọgbakọ ahụ mata ihe ndị bụ́ eziokwu (karịsịa site n’akwụkwọ ozi). N’ụzọ dị otú ahụ a ga-ejide ihe ndị ahụ bụ́ eziokwu aka, a dịghị ama ama ajụjụ ọ bụla ebilite—n’oge ahụ ma ọ bụ mgbe e mesịrị.

Ka anyị gaghachi n’okwu Jisọs bụ́: “Onye ọ bụla nke ga-ahapụ nwunye ya, ma ọ bụghị n’ihi ịkwa iko, lụrụkwa nwunye ọzọ, ọ na-akwa iko.” Ọ bụrụ na ikpe mmekọahụ rụrụ arụ mara onye bụ́ di n’ezie ma ọ chọrọ ịnọgide na-alụ nwunye ya, nwanyị ahụ (nke aka ya dị ọcha n’ihe atụ Jisọs) aghaghị ikpebi ma ọ̀ ga-agbaghara ya, nọgidekwa soro ya na-enwekọ ihe ndina alụmdi na nwunye, ma ọ̀ bụ jụ ịgbaghara ya. Ọ bụrụ na o nwere ọchịchọ ịgbaghara ma nọgide na-ebinyere di ya iwu kwadoro, o meghị omume rụrụ arụ n’ime otú ahụ.—Hosea 1:1-3; 3:1-3.

N’ọnọdụ ebe di nke mere omume rụrụ arụ na-achọ ịgba alụkwaghịm, nwunye ya ka pụrụ ịdị njikere ịgbaghara ya, na-enwe olileanya na ọ ga-alọghachi. Ọ dịịrị nwanyị ahụ ikpebi, na-adabere n’akọ na uche ya na ọnọdụ ya, ma ọ̀ ga-eguzogide ihe omume ịgba alụkwaghịm nke di ya. N’ebe ụfọdụ, nwanyị nke na-eguzogide ịgba alụkwaghịm pụrụ inwe ike ịbịanye aka n’akwụkwọ nke na-ekwupụta ikike ịkpọrọ nwa nakwa nke nkwado n’ụzọ ihe onwunwe n’egosighị na ọ nabatara ịgba alụkwaghịm ahụ; ya ịbịanye aka n’akwụkwọ ndị dị otú ahụ agaghị egosi n’onwe ya na ọ na-ajụ di ya. Otú ọ dị, n’ebe ndị ọzọ, a pụrụ ịgwa nwunye nke na-eguzogide ịgba alụkwaghịm ka ọ bịanye aka n’akwụkwọ ndị na-egosi na ọ nabatara ịgba alụkwaghịm ahụ; ịbịanye aka dị otú ahụ ga-egosi n’ụzọ pụtara ìhè na ọ na-ajụ di ya nke ikpe mara.

Iji zere ohere nke inwe nghọtahie, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya n’ọnọdụ nke a kwa, ka nke bụ́ nwunye nye ndị nnọchiteanya ọgbakọ akwụkwọ ozi nke na-egosipụta nzọụkwụ ndị a na-ewere nakwa ihe ndị a na-eme na ha. Ọ pụrụ idenye na ya gwara di ya na ya nwere ọchịchọ ịgbaghara ya nakwa ịbụ nwunye ya. Nke ahụ ga-apụta na alụkwaghịm ahụ a na-agba megidere ọchịchọ ya; kama ịjụ di ya, ọ ka dị njikere ịgbaghara. Mgbe o mesịrị ka o doo anya otú ahụ na ya nwere ọchịchọ ịgbaghara ma nọgide na-abụ nwunye ya, ya ịbịanye aka n’akwụkwọ ndị na-egosi nanị otú a ga-esi dozie okwu ndị metụtara ego na/ma ọ bụ ikike ịkpọrọ nwa agaghị egosi na ọ na-ajụ di ya. *

Ebe o meworo ka ọchịchọ ya ịgbaghara guzosie ike ọbụna mgbe ịgba alụkwaghịm ahụ gasịrị, ma ya ma di ya adịghị nke nweere onwe ya ịlụ onye ọzọ. Ọ bụrụ na nwunye ahụ aka ya dị ọcha bụ́ onye kwuru na ya chọrọ ịgbaghara ma di ya ajụ, emesịa kpebie ịjụ di ya n’ihi omume ya rụrụ arụ, ha abụọ ga-enwerezi onwe ha. Jisọs gosiri na di ma ọ bụ nwunye aka ya dị ọcha nwere ikike nke ime mkpebi dị otú ahụ.—Matiu 5:32; 19:9; Luk 16:18.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Usoro iwu na akwụkwọ iwu na-adịgasị iche site n’otu ebe ruo ebe ọzọ. Ọnọdụ ndị e depụtara n’akwụkwọ iwu maka ịgba alụkwaghịm kwesịrị ka e jiri nlezianya nyochaa ha tupu a bịanye aka na ha. Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye aka ya dị ọcha abịanye aka n’akwụkwọ ndị na-egosi na ọ dịghị emegide ịgba alụkwaghịm nke onye nke ọzọ na-amalite, nke ahụ pụtara ịjụ onye ahụ.—Matiu 5:37.