Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ọ̀ masịwo gị ịgụ mbipụta Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Ọ dị mma, lee ma ị pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:

Olee ihe dị oké mkpa n’idozi esemokwu dị n’etiti anyị na onye ọzọ?

Anyị kwesịrị ibu ụzọ ghọta na anyị pụrụ iche echiche ma ọ bụ kpaa àgwà ndị na-ezighị ezi. Mgbe ahụ, anyị kwesịrị ịtụlesi ike ma nsogbu ahụ ò si anyị n’aka kama isi onye nke ọzọ n’aka.—8/15, peeji nke 23.

Olee mgbe “oge a ga-eweghachi ihe nile,” bụ́ nke a kpọtụrụ aha n’Ọrụ 3:21 (NW) ga-abụ?

Mweghachi ahụ ga-abịa ná nkebi abụọ. Nke mbụ, e nwere mweghachi nke paradaịs ime mmụọ bụ́ nke na-ewere ọnọdụ ugbu a kemgbe 1919. Mweghachi ọzọ ga-abịa mgbe e weghachiri ụwa anyị ịbụ paradaịs a na-ahụ anya.—9/1, peeji nke 17, 18.

Olee otú o si bụrụ na ndanda enweghị onyeisi, dị ka e kwuru n’Ilu 6:6-8, ma ha ana-esetịpụkwara anyị ezi ihe nlereanya?

N’ìgwè ndanda, e nwere eze nwanyị ndanda, ma, ọ bụ eze nwanyị nanị n’echiche bụ́ na ọ na-eyi àkwá, bụrụkwa nne nke ìgwè ahụ. Ndanda na-adị uchu, anyị kwesịkwara ịdị otú ahụ, na-agbalịsi ike imeziwanye ọrụ anyị, ọbụna ma ọ bụrụ na a dịghị ele anyị anya.—9/15, peeji nke 26.

Amụma Hulda, dị ka e dekọrọ ya ná 2 Ndị Eze 22:20, nke bụ́ na Josaịa ga-anwụ “n’udo,” ò mezuru, ebe ọ bụ na e gburu ya n’agha?

Ee, ọ nwụrụ n’udo n’echiche bụ́ na ọ nwụrụ tupu ọdachi ahụ mere na 609-607 T.O.A., bụ́ mgbe ndị Babilọn nọchibidoro ma bibie Jerusalem.—9/15, peeji nke 30.

Olee otú o si bụrụ ihe kwesịrị ekwesị bụ́ Solomọn ịkọwa nwunye dị ka “nne ele nke na-ahụ n’anya na nne ewu ọhịa mara mma”? (Ilu 5:18, 19)

Nne ewu ọhịa na-adị nwayọọ n’ọdịdị ma na-enwe àgwà ọma. Ma, ọ pụrụ ịdị ndụ ma mụọ nwa n’ebe dị nkume nkume, nke mmadụ na-apụghị iru bụ́ ebe nri dị ụkọ.—10/1, peeji nke 30, 31.

Ole ndị bụ Henry Grew na George Storrs?

Ndị ikom abụọ a biri ndụ n’afọ ndị 1800 ma bụrụ ndị mmụta Bible dị uchu. Grew mụtara na ozizi Atọ n’Ime Otu bụ ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, dịkwa ka ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi na ọkụ ala mmụọ. Storrs ghọtara na ụfọdụ ga-eketa ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ha abụọ bu Charles Taze Russell, bụ́ onye malitere ibipụta magazin a na 1879, ụzọ.—10/15, peeji nke 26-30.

Olee otú Ndịàmà Jehova si ele usoro ịgwọ ọrịa nke mmadụ ji ọbara ya eme, anya?

N’ime ka nkwenkwe ha dabere na Bible, ha adịghị echekwa ọbara nke ha ma mesịa kwere ka a mịnye ha ya. Onye Kraịst ọ bụla na-ekpebiri onwe ya otú a ga-esi jiri ọbara ya mee ihe n’oge ịwa ahụ, ile ahụ, ma ọ bụ ọgwụgwọ. O kwesịrị ịtụle ihe Bible na-ekwu banyere ọbara ma cheta na ọ raara onwe ya kpam kpam nye Chineke.—10/15, peeji nke 30, 31.

Mkpa dị aṅaa pụtara ìhè e nwere n’etiti Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa ka nnyocha e mere ná mmalite afọ a kpughere?

E nwere mkpa maka ihe karịrị Ụlọ Nzukọ Alaeze 11,000 ná mba ndị ka na-emepe emepe, bụ́ ebe ego na-adịchaghị. A na-eji onyinye ndị sitere n’aka ndị Kraịst nọ n’ọtụtụ ala eme ihe iji nye aka n’iwu ebe nzukọ ndị kwesịrị ekwesị.—11/1, peeji nke 30.

Olee ụfọdụ n’ime okwu ndị mbụ e ji mee ihe na Bible bụ́ ndị e jikọrọ ha na ofufe?

Otu bụ lei·tour·giʹa, bụ́ nke a sụgharịrị ịbụ “ijere ọha mmadụ ozi.” Nke ọzọ bụ la·treiʹa, bụ́ nke a sụgharịrị ịbụ “ozi dị nsọ.” (Ndị Hibru 10:11, NW; Luk 2:36, 37, NW)—11/15, peeji nke 11, 12.

Gịnị bụ ihe gbara ọkpụrụkpụ anyị pụrụ ịmụta site n’ihe ndekọ Bible banyere Adam na Iv?

Ngosipụta ọ bụla nke adabereghị na Jehova Chineke bụ nnọọ nzuzu.—11/15, peeji nke 24-27.

Ihe akaebe dị aṅaa dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ka e nwere na Chineke na-enye ndị ohu ya ike?

Devid, Habakuk, na Pọl onyeozi nyechara ihe akaebe nke aka ha banyere eziokwu ahụ bụ́ na Jehova Chineke enyewo ha ume ma ọ bụ ike. (Abụ Ọma 60:12; Habakuk 3:19; Ndị Filipaị 4:13) N’ihi ya, anyị pụrụ inwe obi ike na Chineke nwere ọchịchọ na ikike ime ka anyị sikwuo ike.—12/1, peeji nke 10, 11.