Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka I Ji Ejere Chineke Ozi?

N’ihi Gịnị Ka I Ji Ejere Chineke Ozi?

 N’ihi Gịnị Ka I Ji Ejere Chineke Ozi?

Otu eze na-atụ egwu Chineke nyere nwa ya nwoke ndụmọdụ a n’otu oge, sị: “Mara Chineke nke nna gị, were obi zuru okè, werekwa mkpụrụ obi ọ na-atọ ụtọ, fee Ya ofufe.” (1 Ihe E Mere 28:9) N’ụzọ doro anya, Jehova chọrọ ka ndị ohu ya jiri obi ekele na-ejere ya ozi.

DỊ KA Ndịàmà Jehova, anyị na-ekweta ozugbo na mgbe mbụ a kọwaara anyị nkwa dị iche iche nke Bible, obi anyị jupụtara n’ekele. Kwa ụbọchị, anyị mụtara ihe ọhụrụ banyere nzube Chineke. Ka anyị na-amụtakwu banyere Jehova, otú ahụ ka ọchịchọ anyị nwere ‘iwere obi zuru okè, werekwa mkpụrụ obi ọ na-atọ ụtọ, fee Ya ofufe,’ na-esikwu ike.

Ọtụtụ ndị ghọrọ Ndịàmà Jehova na-anọgide na-eji ọṅụ dị ukwuu ejere Jehova ozi ná ndụ ha nile. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị Kraịst malitere n’ụzọ dị mma, ma ka oge na-aga, ha echefuo ihe ndị na-akwali anyị ijere Chineke ozi. Nke ahụ ò mewo gị? Ọ bụrụ na o mewo gị, obi ekoropụla gị. A pụrụ inwetaghachi ọṅụ furu efu. N’ụzọ dị aṅaa?

Gụkọọ Ngọzi Gị

Nke mbụ, tụgharịa uche ná ngọzi ndị ị na-enweta n’aka Chineke kwa ụbọchị. Chee echiche banyere onyinye ọma dị iche iche Jehova na-enye: ihe okike ya dị iche iche—nke na-eru mmadụ nile aka n’agbanyeghị ọkwá ha ma ọ bụ otú ha nweruru akụ̀ na ụba—nri na ihe ọṅụṅụ ndị o nyere site n’okike, ahụ ike i nwetụrụ, ihe ọmụma i nwere banyere eziokwu Bible, nakwa nke kasịnụ, onyinye o nyere Ọkpara ya. Ọnwụ ya megheere gị ụzọ iji akọ na uche dị ọcha na-ejere Chineke ozi. (Jọn 3:16; Jemes 1:17) Ka ị na-atụgharịkwu uche n’ịdị mma Chineke, otú ahụ ka ekele ị na-enwe n’ebe ọ nọ ga na-amụbakwu. Obi gị ga-akpalizi gị iji obi ekele na-ejere ya ozi n’ihi ihe nile o mewooro gị. Obi abụọ adịghị ya na ị ga-amaliteghachi inwe mmetụta dị ka ọbụ abụ ahụ bụ́ onye dere, sị: “Ọtụtụ ihe ka Gị onwe gị meworo, Jehova, bụ́ Chineke m, bụ́ oké ọrụ Gị nile, na echiche Gị nile n’ebe anyị nọ: a pụghị idoro Gị ha n’usoro; . . . ha karịrị ịgụ ọnụ.”—Abụ Ọma 40:5.

Ọ bụ Devid, bụ́ nwoke nwekwara nsogbu ná ndụ, dere okwu ndị a. Mgbe Devid bụ nwa okorobịa, o biri ihe ka ukwuu ná ndụ ya n’ịgba ọsọ ndụ ka ajọ Eze Sọl na ndị nche ya nọ na-achọgharị ya igbu ya. (1 Samuel 23:7, 8, 19-23) Devid nwekwara adịghị ike onwe onye ndị ọ lụsoro ọgụ. O kwetara nke a n’Abụ Ọma nke 40: “Ihe ọjọọ na-adịghị ọnụ ọgụgụ agbawo m gburugburu, ajọ omume m nile eruwo m ahụ, apụghịkwa m ịhụ ụzọ; ha karịrị agịrị isi nile nke isi m n’ụba.” (Abụ Ọma 40:12) Ee, Devid nwere ọtụtụ nsogbu, ma nsogbu ndị ahụ erikpughị ya kpam kpam. Ọ tụkwasịrị uche n’ụzọ ndị Jehova si na-agọzi ya n’agbanyeghị nsogbu ya, ọ chọpụtakwara na ngọzi ndị ahụ karịrị nnọọ ahụhụ ndị ọ na-ata.

Mgbe o yiri gị ka nsogbu onwe onye ma ọ bụ mmetụta nke ịbụ onye na-erughị eru ọ na-erikpu gị, ọ dị mma ka ị kwụsị ma gụkọọ ngọzi gị, dị ka Devid mere. Obi abụọ adịghị ya na ọ bụ ekele i nwere maka ngọzi ndị dị otú ahụ kpaliri gị ịrara onwe gị nye Jehova; echiche ndị dị otú ahụ pụkwara inyere gị aka inwetaghachi ọṅụ ma nyere gị aka iji obi ekele na-ejere Chineke ozi.

 Nzukọ Ọgbakọ Pụrụ Inye Aka

Tụkwasị n’ịtụgharị uche na nzuzo n’ịdị mma Jehova, ọ dị anyị mkpa iso ndị Kraịst ibe anyị na-akpakọrịta. Ọ bụ ihe agbamume isoro ndị ikom, ndị inyom, na ndị na-eto eto bụ́ ndị hụrụ Chineke n’anya, bụrụkwa ndị kpebisiri ike ijere ya ozi, na-ezukọ mgbe nile. Ihe nlereanya ha pụrụ ịkpali anyị iji mkpụrụ obi anyị dum na-arụ ọrụ n’ozi Jehova. Ọnụnọ anyị nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze pụkwara ịgba ha ume.

N’eziokwu, mgbe anyị lọtara n’ebe obibi anyị mgbe anyị rụsịrị ọrụ siri ike n’ụbọchị ma ọ bụ mgbe anyị nwere nkụda mmụọ n’ihi nsogbu ma ọ bụ adịghị ike ụfọdụ, o nwere ike ghara ịdịrị anyị mfe ichewe banyere ịga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’oge ndị dị otú ahụ, anyị aghaghị iji aka siri ike chịkwaa onwe anyị, ‘na-etipụta ahụ anyị ọnyá,’ dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ka anyị wee nwee ike irube isi n’iwu nke isoro ndị Kraịst ibe anyị na-ezukọ.—1 Ndị Kọrint 9:26, 27; Ndị Hibru 10:23-25.

Ọ bụrụ na nke ahụ adị mkpa, ànyị kwesịrị ikwubi na anyị ahụghị Jehova n’anya n’ezie? Ọ dịghị ma ọlị. Ndị Kraịst tozuru okè n’oge gara aga bụ́ ndị a na-adịghị agbagha ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ agbagha, aghaghị itinye mgbalị siri ike iji mee uche Chineke. (Luk 13:24) Pọl onyeozi bụ otu n’ime ndị Kraịst dị otú ahụ. Ọ kọwara mmetụta ya n’ezoghị ọnụ n’ụzọ dị otú a, sị: “Amatara m na ezi ihe adịghị ebi n’ime m, nke ahụ bụ, n’anụ ahụ m: n’ihi na ịchọ ihe ọma dị nso n’ebe aka m ga-eru, ma ịrụta ihe ọma adịghị nso n’ebe aka m ga-eru. N’ihi na ezi ihe nke m na-achọ ka m na-emeghị: kama ihe ọjọọ nke m na-achọghị, ihe ahụ ka m na-eme.” (Ndị Rom 7:18, 19) Ọ gwakwara ndị Kọrint, sị: “A sị na ana m ezisa ozi ọma, enweghị m ihe ịnya isi; n’ihi na mkpa na-akpa m . . . N’ihi na a sị na emee m ihe a ebe m na-achọ ime ya, enwere m ụgwọ ọrụ: ma ọ bụrụ na emee m ya mgbe m na-achọghị ime ya, e werewo ntụkwasị obi nye ọchịchị ezinụlọ n’aka m.”—1 Ndị Kọrint 9:16, 17.

Dị ka ọtụtụ n’ime anyị, Pọl nwere ọchịchọ mmehie bụ́ ndị na-egbochi ọchịchọ ya ime ihe ziri ezi. Otú ọ dị, ọ lụsosiri ọchịchọ ndị ahụ ọgụ ike, n’ihe kakwa ọtụtụ n’oge ndị ahụ, o nwere ihe ịga nke ọma. N’ezie, Pọl arụzughị nke a n’ike nke aka ya. O dere, sị: “Enwere m ike n’ihe nile n’ime Onye ahụ Nke na-eme m ka m dị ike.” (Ndị Filipaị 4:13) Jehova, bụ́ onye nyere Pọl ike, ga-enyekwa gị ike ime ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na ị rịọ ya maka enyemaka ya. (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ya mere, “na-agbasi mgba ike n’ihi okwukwe ahụ,” Jehova ga-agọzikwa gị.—Jud 3.

Ọ dịghị gị mkpa ịgba mgba a nanị gị. N’ọgbakọ Ndịàmà Jehova, ndị Kraịst bụ́ ndị okenye tozuru okè, bụ́ ndị na-anọgidesi ike na ‘mgba nke okwukwe’ ahụ n’onwe ha, dị njikere inyere gị aka. Ọ bụrụ na ị gakwuru onye okenye maka enyemaka, ọ ga-agbalịsi ike ‘ịgụgụ’ gị. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Ihe mgbaru ọsọ ya ga-abụ ime ihe “[dị] ka ebe izonahụ ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo.”—Aịsaịa 32:2.

“Chineke bụ ịhụnanya,” ọ chọkwara ka ndị ohu ya jiri ịhụnanya na-ejere ya ozi. (1 Jọn 4:8) Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka i mee ka ịhụnanya i nwere n’ebe Chineke nọ dịghachi ọkụ, mee ihe ndị kwesịrị ekwesị iji mee nke ahụ, dị ka e depụtara n’elu. Obi ga-adị gị ụtọ na i mere otú ahụ.