Ozi Ọma Luk Dere 16:1-31
16 Jizọs gwakwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “E nwere otu nwoke bara ọgaranya a gwara na onye na-elekọtara ya ụlọ na-emefusị akụ̀ ya.
2 N’ihi ya, nwoke ahụ kpọrọ onye ahụ, sị ya, ‘Ihe m na-anụ gbasara gị adịghị mma. Weta akwụkwọ i ji dekọọ otú i si mefuo ego m, n’ihi na achọghịzi m ka ị na-elekọta ụlọ m.’
3 Onye ahụ na-elekọta ụlọ wee gwa onwe ya, sị, ‘Gịnị ka m ga-eme, ebe ọ bụ na nna m ukwu ga-achụ m n’ọrụ? Ike adịghị m igwu ala, ihere ịrịọ arịrịọ na-emekwa m.
4 Ehee, ama m ihe m ga-eme, ka ọ ga-abụ, a chụọ m n’ọrụ ilekọta ụlọ, ndị mmadụ anabata m n’ụlọ ha.’
5 O wee kpọọ ndị niile ji nna ya ukwu ụgwọ n’otu n’otu. Ya asị onye nke mbụ, ‘Gịnị ka i ji nna m ukwu n’ụgwọ?’
6 Ya asị, ‘Narị galọn* mmanụ oliv isii (600).’ O wee sị ya, ‘Were akwụkwọ e dere ihe unu kwekọrịtara ma nọdụ ala dee narị atọ (300) ọsọ ọsọ.’
7 Ọ jụkwara onye ọzọ, sị, ‘Gịnị ka gịnwa ji n’ụgwọ?’ Ya asị, ‘Otu narị (100) akpa ọka wit.’* O wee sị ya, ‘Were akwụkwọ e dere ihe unu kwekọrịtara ma dee iri asatọ.’
8 Nna ukwu onye ahụ na-elekọta ụlọ jara ya mma, n’ihi na n’agbanyeghị na ọ bụ onye ajọ omume, ọ kpara àgwà onye ma ihe. N’ihi na ndị oge a* ma ihe n’otú ha si emeso ndị ọgbọ ha ihe karịa ụmụ nke ìhè.+
9 “Ana m asịkwa unu: Jirinụ akụ̀ ajọ omume metara onwe unu ndị enyi,+ ka ọ ga-abụ, mgbe akụ̀ ahụ na-adịkwaghị, ha anabata unu n’ebe unu ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.+
10 Onye kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe kacha nta kwesịkwara ntụkwasị obi n’oké ihe. Onye bụ́ onye ajọ omume n’ihe kacha nta bụkwa onye ajọ omume n’oké ihe.
11 N’ihi ya, ọ bụrụ na unu ekwesịghị ntụkwasị obi n’ihe gbasara akụ̀ ajọ omume, ònye ga-enyefe ezigbo akụ̀ n’aka unu?
12 Ọ bụrụkwa na unu ekwesịghị ntụkwasị obi n’ihe onye ọzọ, ònye ga-enye unu ihe a kwadebeere unu?+
13 O nweghị onye ga-abụli ohu nna ukwu abụọ. N’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya, ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya. Unu agaghị abụli ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.”+
14 Ma ndị Farisii, ndị hụrụ ego n’anya, nọ na-ege ntị n’ihe a niile. Ha wee malite ịkwa ya emo.+
15 N’ihi ya, ọ sịrị ha: “Unu na-eme ka ndị ezi omume n’ihu ndị mmadụ,+ ma Chineke ma obi unu.+ N’ihi na ihe bara uru n’anya ndị mmadụ bụ ihe arụ n’anya Chineke.+
16 “Ihe Iwu Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma* kwuru dị ruo mgbe Jọn bidoro ozi ya. Si n’oge ahụ gawa, a na-ezisa ozi ọma Alaeze Chineke, ụdị mmadụ niile na-agbalịsikwa ike ịbanye na ya.+
17 N’eziokwu, ọ dị mfe eluigwe na ụwa ịla n’iyi karịa otu mkpụrụ akwụkwọ nke dị n’Iwu ahụ ịhapụ imezu.+
18 “Onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm* ma lụọ nwaanyị ọzọ na-akwa iko, onye lụkwara nwaanyị di ya gbara alụkwaghịm* na-akwa iko.+
19 “E nwere otu nwoke bara ọgaranya, onye na-eyi ezigbo ákwà pọpụl na ákwà linin, na-ekpori ndụ, na-ebikwa ndụ okomoko kwa ụbọchị.
20 Ma e nwere onye arịrịọ a na-ebute n’ọnụ ụzọ ámá ya. Aha ya bụ Lazarọs. Ọnyá jukwara ya n’ahụ́.
21 Ọ na-agụkwa ya agụụ iri ihe si na tebụl ọgaranya ahụ na-adapụ. Nkịta na-abịakwa aracha ọnyá ya.
22 Ma ka oge na-aga, onye arịrịọ ahụ nwụrụ, ndị mmụọ ozi eburu ya gaa busa n’akụkụ* Ebreham.
“Ọgaranya ahụ nwụkwara, e lie ya.
23 O si n’ili* ebe ọ nọ na-ata ahụhụ lelie anya hụ Ebreham n’ebe dị anya, hụkwa Lazarọs ka ọ nọ n’akụkụ ya.*
24 O wee tie mkpu, sị, ‘Nna m Ebreham, meere m ebere. Zie Lazarọs ka o detụ ọnụ mkpịsị aka ya ná mmiri ma tasa m n’ire, n’ihi na m na-ahụsi anya n’ọkụ a na-eresi ike.’
25 Ma Ebreham sịrị, ‘Nwa m, cheta na i rijuru ihe ọma afọ mgbe ị nọ ndụ, ma Lazarọs tara ezigbo ahụhụ. Ma ugbu a, a na-akasi ya obi ebe a, gịnwa ana-ahụsi anya.
26 E wezụgakwa ihe a niile, e meela ka nnukwu olulu dị n’agbata anyị na unu, ka ndị chọrọ isi ebe a gakwuru unu ghara inwe ike ịgafe, ndị mmadụ agaghịkwa esi ebe ahụ gafeta ebe anyị nọ.’
27 O wee sị, ‘Ọ bụrụ otú ahụ, nna m, biko, ziga ya n’ụlọ nna m,
28 n’ihi na enwere m ụmụnne ndị nwoke ise, ka ọ gaa gwa ha, ka ha ghara ịbata ebe a a na-ata ụdị ahụhụ a.’
29 Ma Ebreham sịrị, ‘Ha nwere akwụkwọ Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma. Ha mee ihe ha kwuru.’+
30 Ya asị, ‘Mba, nna m Ebreham. Ha agaghị ege ha ntị. Ma, ọ bụrụ na mmadụ esi n’ọnwụ bilie gaa gwa ha, ha ga-echegharị.’
31 Ma ọ sịrị ya, ‘Ọ bụrụ na ha emeghị ihe Mosis+ na ndị amụma dere, ha agaghịkwa ege ntị ma mmadụ si n’ọnwụ bilie gaa gwa ha okwu.’”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Grik, “otu narị bat mmanụ oliv.” Bat bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu bat bụ lita 22 (galọn 5.81). Gụọ B14.
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ “Iwu Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma” pụtara Akwụkwọ Nsọ Hibru niile.
^ Ya bụ, onye gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma, ọ bụghị n’ihi na ọ kwara iko.
^ Ya bụ, nwaanyị a gbara alụkwaghịm, ma, ọ bụghị n’ihi na ọ kwara iko.
^ Na Grik, “busa n’obi.”
^ Ma ọ bụ “na Hedis.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Na Grik, “n’obi ya.”