Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Àjà Otuto Ndị Na-eme Jehova Obi Ụtọ

Àjà Otuto Ndị Na-eme Jehova Obi Ụtọ

Àjà Otuto Ndị Na-eme Jehova Obi Ụtọ

“Unu chee ahụ unu n’ihu Chineke, dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke ezi ụtọ.”—NDỊ ROM 12:1.

1. Gịnị ka Bible na-ekwu banyere uru a kpaara ókè nke àjà ndị ahụ a chụrụ n’okpuru Iwu Mosis bara?

“IWU ahụ, ebe o nwere nanị onyinyo nke ezi ihe ahụ nile gaje ịbịa, ọ bụghị ezi oyiyi onwe ya nke ihe ndị a, ha apụghị ime ka ndị na-abịaru ha nso zuo okè mgbe ọ bụla, site n’otu àjà ndị a nke ha na-eche n’ihu Chineke kwa afọ mgbe nile.” (Ndị Hibru 10:1) N’ebe ahụ, Pọl onyeozi jiri otu okwu pụtara ìhè mesie ya ike na àjà nile a chụrụ n’okpuru Iwu Mosis enweghị abamuru na-adịte aka ma a bịa n’ihe metụtara nzọpụta nke mmadụ.—Ndị Kọlọsi 2:16, 17.

2. N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ ihe na-enweghị isi ịnwa ịghọta ihe ọmụma zuru ezu dị na Bible banyere onyinye na àjà ndị so n’Iwu ahụ?

2 Nke a ọ̀ pụtara na ihe e kwuru na Pentateuch banyere onyinye na àjà abaghịrị ndị Kraịst uru taa? N’ezie, n’ihe ji ntakịrị karịa otu afọ, ndị debara aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa gụchara akwụkwọ ise mbụ nke Bible na nso nso a. Ụfọdụ ndị agbalịsiwo ike ịgụ ma ghọta ihe nile n’ozuzu ha. Mgbalị ha nile ọ̀ bụwo na nkịtị? N’ezie, ọ pụghị ịbụ otú ahụ, n’ihi na “ka ha hà, bụ́ ihe e dere n’akwụkwọ nsọ n’oge gara aga, e dere ha izi anyị ihe, ka anyị wee were ntachi obi na nkasi obi nke ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:4) Mgbe ahụ, ajụjụ bụ, ‘izi ihe’ na “nkasi obi” dị aṅaa ka anyị pụrụ inweta site n’ihe ọmụma dị n’Iwu ahụ metụtara onyinye na àjà dị iche iche?

Iji Zie Anyị Ihe na Iji Kasie Anyị Obi

3. Mkpa bụ́ isi dị aṅaa ka anyị nwere?

3 Ọ bụ ezie na a chọghị n’aka anyị ịchụ àjà nkịtị n’ụzọ Iwu ahụ si kwuo, ihe àjà ndị ahụ meere ụmụ Israel ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ ka dị anyị mkpa, ya bụ, ịbụ ndị a gbaghaara mmehie ha na inwe ihu ọma Chineke. Ebe ọ bụ na anyị adịghịzi achụ àjà nkịtị, olee otú anyị pụrụ isi rite uru ndị dị otú ahụ? Mgbe Pọl rụtụsịrị aka n’erughị eru nke àjà ụmụ anụmanụ, o kwuru, sị: “Mgbe [Jisọs] na-abịa n’ụwa, Ọ sị, Àjà na ihe e chere n’ihu Gị, Ị chọghị ha, ma ahụ ka Ị kwadebere nye m; àjà nsuresị ọkụ na àjà a chụrụ banyere mmehie, ha abụghị ihe dị Gị ezi mma: mgbe ahụ ka M sịrị, Lee, abịawo m (N’akwụkwọ mpịakọta ka e deworo ihe banyere m) ime ihe Ị na-achọ, Chineke.”—Ndị Hibru 10:5-7.

4. Olee otú Pọl si jiri Abụ Ọma 40:6-8 mee ihe n’ihe banyere Jisọs Kraịst?

4 N’ihota ihe site n’Abụ Ọma 40:6-8, Pọl rụtụrụ aka na Jisọs abịaghị ime ka “àjà na ihe e chere n’ihu,” “àjà nsuresị ọkụ na àjà a chụrụ banyere mmehie” dịgide, bụ́ ndị Chineke na-akwadoghịzi n’oge Pọl na-ede akwụkwọ ya. Kama nke ahụ, Jisọs ji ahụ Nna ya nke eluigwe kwadebere bịa, bụ́ nke ya na nke ahụ Chineke kwadebere mgbe O kere Adam kwekọrọ n’ụzọ nile. (Jenesis 2:7; Luk 1:35; 1 Ndị Kọrint 15:22, 45) Dị ka Ọkpara Chineke zuru okè, Jisọs rụrụ ọrụ nke “mkpụrụ” nke nwanyị ahụ, dị ka e buru n’amụma na Jenesis 3:15. Ọ ga-eme ihe iji ‘chifịa Setan n’isi,’ ọ bụ ezie na a ‘ga-echifia Jisọs n’onwe ya n’ikiri ụkwụ.’ N’ụzọ dị otú a, Jisọs ghọrọ ụzọ Jehova megheere ihe a kpọrọ mmadụ maka nzọpụta, bụ́ nke ndị nwere okwukwe nọworo na-atụ anya ya kemgbe oge Ebel.

5, 6. Olee ụzọ ka mma ndị Kraịst nwere isi jekwuru Chineke?

5 N’ikwu banyere ọrụ a pụrụ iche Jisọs rụrụ, Pọl na-ekwu, sị: “Onye ahụ Nke na-amaghị mmehie ka [Chineke] mere ka Ọ bụrụ mmehie n’ọnọdụ anyị; ka anyị onwe anyị wee ghọọ ezi omume Chineke n’ime Ya.” (2 Ndị Kọrint 5:21) A pụkwara ịsụgharị okwu bụ́ “mere ka Ọ bụrụ mmehie” ịbụ ‘mere dị ka àjà mmehie.’ Jọn onyeozi na-ekwu, sị: “Ya onwe ya bụkwa ihe ịjụrụ Chineke obi banyere mmehie nile anyị; ma Ọ bụghị ihe ịjụrụ Ya obi banyere nanị mmehie nke anyị onwe anyị, kama Ọ bụkwa ihe ịjụrụ Ya obi banyere mmehie nke ụwa dum.” (1 Jọn 2:2) N’ihi ya, ọ bụ ezie na ụmụ Israel nwere ụzọ na-adịteghị aka ha si na-ejekwuru Chineke site n’àjà ndị ha chụrụ, ndị Kraịst nwere ihe ndabere ka elu maka ịbịakwute Chineke—àjà Jisọs Kraịst. (Jọn 14:6; 1 Pita 3:18) Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe n’àjà mgbapụta ahụ Chineke nyere ma rubere Ya isi, anyị onwe anyị kwa pụrụ ịbụ ndị a gbaghaara mmehie ha ma na-enwe ihu ọma na ngọzi Chineke. (Jọn 3:17, 18) Nke ahụ ọ́ bụghị ihe na-enye nkasi obi? Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi gosipụta na anyị nwere okwukwe n’àjà mgbapụta ahụ?

6 Mgbe Pọl onyeozi kọwasịrị na ndị Kraịst nwere ihe ndabere ka elu maka ijekwuru Chineke, ọ kọwapụtara, dị ka anyị na-agụ ná Ndị Hibru 10:22-25, ụzọ atọ anyị pụrụ isi gosipụta okwukwe na ekele anyị maka ihe ndị Chineke ji ịhụnanya nye anyị. N’agbanyeghị na ọ bụ ndị ‘na-aba n’ebe nsọ ahụ’—ya bụ, ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị a kpọrọ ịga eluigwe, ka Pọl na-enye ndụmọdụ ya n’ụzọ bụ́ isi—n’ezie ọ dị ihe nile a kpọrọ mmadụ mkpa ịṅa ntị n’okwu Pọl dere n’ike mmụọ nsọ ma ọ bụrụ na ha chọrọ irite uru n’àjà ịjụrụ obi nke Jisọs chụrụ.—Ndị Hibru 10:19.

Chụọ Àjà Ndị Dị Ọcha na Ndị A Na-emerụghị Emerụ

7. (a) Olee otú Ndị Hibru 10:22 si egosipụta ihe e mere mgbe a na-achụ àjà? (b) Gịnị ka a na-aghaghị ime iji jide n’aka na Chineke ga-anakwere àjà a chụrụ?

7 Nke mbụ, Pọl na-agba ndị Kraịst ume, sị: “Ka anyị were obi eziokwu bịaruo nso n’ime nkwezu nke okwukwe, bụrụkwa ndị e fesaworo ọbara n’obi anyị pụọ n’ajọ akọ na uche, ndị a sachawokwara ahụ anyị ná mmiri dị ọcha.” (Ndị Hibru 10:22) Okwu e ji mee ihe n’ebe a na-egosipụta n’ụzọ doro anya ihe ndị e mere n’àjà a chụrụ n’okpuru Iwu ahụ. Nke a dabara adaba n’ihi na ka àjà wee bụrụ nke a nakweere, ọ ghaghị ịbụ nke e ji ezi ebumnobi chụọ, bụrụkwa nke e ji ihe dị ọcha na ihe a na-emerụghị emerụ chụọ. A na-esi n’ìgwè ehi ma ọ bụ ìgwè ewu na atụrụ, ya bụ́ anụ ndị dị ọcha, eweta anụ ndị e ji achụ àjà, ha na-abụkwa ndị “zuru okè,” ndị na-enweghịkwa nkwarụ. Ọ bụrụ na ihe ahụ e ji achụ àjà sitere n’anụ ufe, ọ ghaghị isite n’etiti nduru ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu. Ọ bụrụ na mmadụ emezuo ihe ndị ahụ, “a ga-anarakwa ya nke ọma n’ọnọdụ ya iji kpuchiere ya mmehie ya.” (Levitikọs 1:2-4, 10, 14; 22:19-25) Onyinye ịnata ihu ọma ahụ adịghị enwe ihe na-eko achịcha, nke na-anọchite anya ire ure; ọ gaghị enwekwa mmanụ aṅụ, bụ́ nke yiri ka ọ̀ na-anọchite anya mmiri mkpụrụ osisi, bụ́ nke pụrụ ime ka ihe gbaa ụka. Mgbe a chụrụ àjà ndị ahụ—ma ọ bụ nke anụmanụ ma ọ bụ nke ịnata ihu ọma—n’ebe ịchụàjà, a na-etinye ha nnu, bụ́ ihe nchekwa.—Levitikọs 2:11-13.

8. (a) Gịnị ka a chọrọ n’aka onye wetara ihe ịchụàjà? (b) Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na Jehova na-anakwere ofufe anyị?

8 Gịnị banyere onye wetara ihe maka ịchụàjà ahụ? Iwu ahụ kwuru na onye ọ bụla nke na-abịa n’ihu Jehova aghaghị ịdị ọcha ma bụrụ onye a na-emerụghị emerụ. Onye ihe ọ bụla merụworo ga-eburịrị ụzọ chụọ àjà mmehie ma ọ bụ àjà ikpe ọmụma iji nweghachi ọnọdụ dị ọcha n’ihu Jehova ka àjà nsure ọkụ ma ọ bụ àjà udo ya wee nwee ike ịbụ nke Ọ ga-anakwere. (Levitikọs 5:1-6, 15, 17) Ya mere, ànyị na-aghọta mkpa ọ dị ịnọgide na-enwe ọnọdụ dị ọcha n’ihu Jehova mgbe nile? Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke na-anakwere ofufe anyị, anyị aghaghị ịdị ngwa n’imezi ebe anyị mebiri iwu Chineke. Anyị kwesịrị ịdị ngwa iji ụzọ ndị Chineke meghere maka enyemaka na-eme ihe—“ndị okenye nke nzukọ Kraịst” nakwa “ihe ịjụrụ Chineke obi banyere mmehie nile anyị,” bụ́ Jisọs Kraịst.—Jemes 5:14; 1 Jọn 2:1, 2.

9. Gịnị bụ ọdịiche bụ́ isi dị n’etiti àjà ndị a chụụrụ Jehova na ndị a chụụrụ chi ụgha dị iche iche?

9 Mmesi ike e mesiri mmadụ ịbụ onye na-enweghị ụdị mmerụ ọ bụla bụ, n’ezie, isi ihe dị iche n’etiti àjà ndị a chụụrụ Jehova na ndị ụmụ mmadụ nọ ná mba ndị gbara Israel gburugburu chụụrụ chi ụgha dị iche iche. N’ikwu okwu banyere akụkụ a pụrụ iche nke àjà ndị a chụrụ n’okpuru Iwu Mosis, otu akwụkwọ na-ekwu, sị: “Anyị pụrụ ịrịba ama na e nweghị ihe jikọrọ ya na ịjụ ndị mmụọ ase ma ọ bụ ịgba afa; e nweghị ime ara ara nke okpukpe, imerụsị onwe onye ahụ, ma ọ bụ ịgba akwụna n’ebe nsọ, a machikwara kpam kpam ememe ihe ụtọ na nke ịmụ ọmụmụ bụ́ ndị a na-enwe oké mmekọahụ na ha; e jighị ụmụ mmadụ chụọ àjà; a chụghịrị ndị nwụrụ anwụ àjà.” Ihe a nile na-adọrọ uche gaa n’otu eziokwu: Jehova dị nsọ, ọ dịgḥikwa anabata ma ọ bụ akwado ụdị mmehie ma ọ bụ nrụrụ aka ọ bụla. (Habakuk 1:13) Ofufe a na-efe ya na àjà ndị a na-achụrụ ya aghaghị ịdị ọcha, bụrụkwa ndị a na-emerụghị emerụ—n’ụzọ anụ ahụ, omume, na ime mmụọ.—Levitikọs 19:2; 1 Pita 1:14-16.

10. N’ikwekọ na ndụmọdụ Pọl nke e dekọrọ ná Ndị Rom 12:1, 2, nnyocha onwe onye dị aṅaa ka anyị kwesịrị ime?

10 N’ihi nke a, anyị aghaghị inyocha onwe anyị n’akụkụ nile nke ndụ iji jide n’aka na Jehova na-anabata ozi anyị na-ejere ya. Anyị ekwesịghị iche na ọ bụrụhaala na anyị na-ekeretụ òkè ná nzukọ ndị Kraịst nakwa n’ozi, ihe anyị ji ndụ anyị eme enweghịzi ihe o mere. Anyị ekwesịghịkwa iche na ikere òkè n’ihe omume ndị Kraịst na-eme ka anyị nwere onwe anyị n’ụzọ ụfọdụ pụọ ná mkpa ọ dị ịgbaso iwu Chineke n’akụkụ ndị ọzọ nke ndụ anyị. (Ndị Rom 2:21, 22) Anyị apụghị ịtụ anya inweta ngọzi na ihu ọma Chineke ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka ihe ọ bụla na-adịghị ọcha ma ọ bụ nke e merụrụ emerụ n’anya ya merụọ echiche ma ọ bụ omume anyị. Buru n’uche okwu Pọl, bụ́: “Ụmụnna m, eji m obi ebere nile nke Chineke na-arịọ unu, ka unu chee ahụ unu n’ihu Chineke, dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke ezi ụtọ, nke bụ́ ikpe ekpere unu dị ka uche si dị. Unu ekwekwala ka e mee ka unu yie ajọ oge a: kama ka e nwoghaa unu site n’ime ka uche unu bụrụ ihe ọhụrụ, ka unu wee nwapụta ihe bụ́ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè.”—Ndị Rom 12:1, 2.

Jiri Obi Dum Na-achụ Àjà Otuto

11. Gịnị ka a gụnyere n’okwu ahụ bụ́ “nkwupụta,” bụ́ nke e kwuru ná Ndị Hibru 10:23?

11 Mgbe Pọl na-edegara ndị Hibru akwụkwọ, ọ dọziiri uche gaa n’otu akụkụ dị mkpa nke ezi ofufe: “Ka anyị jidesie nkwupụta nke olileanya anyị ike ka ọ ghara iruda n’ala; n’ihi na Onye ahụ Nke kwere nkwa kwesịrị ntụkwasị obi.” (Ndị Hibru 10:23) Okwu bụ́ “nkwupụta” pụtara n’ụzọ nkịtị “nkwupụta mmehie,” Pọl na-ekwukwa banyere ‘àjà otuto.’ (Ndị Hibru 13:15) Nke a na-echetara anyị ụdị àjà ndị ikom dị ka Ebel, Noa, na Abraham, chụrụ.

12, 13. Gịnị ka onye Israel na-ekweta mgbe ọ na-achụ àjà nsure ọkụ, gịnịkwa ka anyị pụrụ ime iji na-egosipụta otu ụdị mmụọ ahụ?

12 Mgbe onye Israel na-achụ àjà nsure ọkụ, ọ na-eji ‘ọchịchọ obi nke onwe ya eme ya n’ihu Jehova.’ (Levitikọs 1:3, NW) Site n’àjà dị otú ahụ, ọ na-eji ọchịchọ obi eme nkwupụta, ma ọ bụ nkweta ihu ọha, banyere ngọzi na ebere ịhụnanya bara ụba nke Jehova n’ebe ndị ya nọ. Cheta na akụkụ pụrụ iche nke àjà nsure ọkụ bụ na a na-achụ onyinye ahụ dum n’àjà n’ebe ịchụàjà—ihe nnọchianya dabara adaba nke nrubeisi na nraranye zuru ezu. N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, anyị na-egosipụta okwukwe anyị nwere n’àjà mgbapụta ahụ nakwa ekele anyị maka ndokwa ahụ mgbe anyị ji ọchịchọ obi na mkpụrụ obi dum na-achụ ‘àjà otuto anyị, nke bụ́, mkpụrụ egbugbere ọnụ,’ nye Jehova.

13 Ọ bụ ezie na ndị Kraịst adịghị achụ àjà nkịtị—nke anụmanụ ma ọ bụ nke ihe oriri—ha nwere ibu ọrụ nke ịgba àmà maka ozi ọma Alaeze ahụ na ime ndị na-eso ụzọ nke Jisọs Kraịst. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ị̀ na-eji ohere ndị dịnụ eme ihe n’ikere òkè n’ịkpọsa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’ihu ọha ka ọtụtụ ndị wee nwekwuo ike ịbịa mara ihe ndị dị egwu Chineke debeere ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi? Ị̀ na-eji ọchịchọ obi eji oge na ume ọrụ gị eme ihe n’izi ndị nwere mmasị ihe na n’inyere ha aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst? Anyị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ozi, dị ka ísì ụtọ nke àjà nsure ọkụ, na-atọ Chineke ezi ụtọ.—1 Ndị Kọrint 15:58.

Ṅụrịa n’Iso Chineke na Ndị Mmadụ Na-akpakọrịta

14. Olee otú okwu Pọl ndị dị ná Ndị Hibru 10:24, 25 si kwekọọ n’echiche e ji maka ya achụ àjà udo ahụ?

14 N’ikpeazụ, Pọl na-adọrọ uche gaa ná mmekọrịta anyị na ndị Kraịst ibe anyị ka anyị na-efe Chineke ofufe. “Ka anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; ka anyị gharakwa ịhapụ nzukọ nke onwe anyị, dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-adụsi ndị ọzọ ọdụ ike; ka anyị mee karịakwa otú a, n’ụzọ ha otú unu na-ele ụbọchị ahụ anya ka ọ na-abịaru nso.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Okwu ndị bụ́ “ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche,” “nzukọ nke onwe anyị,” nakwa “na-adụsi ndị ọzọ ọdụ ike” na-echetachara anyị ihe àjà udo ahụ a chụrụ n’Israel meere ndị Chineke.

15. Olee myirita anyị na-ahụ n’etiti àjà udo ahụ na nzukọ ndị Kraịst?

15 Okwu Hibru maka ‘udo’ n’okwu bụ́ ‘àjà udo’ dị n’ụdị ihe dị ọtụtụ, ikekwe ọ na-apụta na ikere òkè n’àjà ndị dị otú ahụ na-eme ka mmadụ soro Chineke na ndị ofufe ibe ya nọrọ n’udo. Banyere àjà udo ahụ, otu ọkà mmụta na-ekwu, sị: “N’ezie, nke a bụ oge iso Chineke nke Ọgbụgba Ndụ na-enwe mkpakọrịta obi ụtọ, bụ́ mgbe ọ na-eweda onwe ya n’ala iji ghọọ Ọbịa Israel n’oriri nke àjà ahụ, n’agbanyeghị na Ọ bụ Onye na-ele ha ọbịa mgbe nile.” Nke a na-echetara anyị nkwa Jisọs, bụ́: “Ebe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ zukọworo n’aha m, n’ebe ahụ ka M nọ n’etiti ha.” (Matiu 18:20) Mgbe ọ bụla anyị gara nzukọ ndị Kraịst, anyị na-erite uru site ná mkpakọrịta na-ewuli elu, ntụziaka na-agba ume, nakwa site n’echiche bụ́ na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst so anyị nọrọ. Nke ahụ na-eme ka nzukọ ndị Kraịst bụrụ ihe omume na-enye ọṅụ ma na-ewusi okwukwe ike.

16. N’iburu àjà udo ahụ n’uche, gịnị na-eme ka nzukọ ndị Kraịst bụrụ nke na-enye ọṅụ karịsịa?

16 N’àjà udo, a chụụrụ Jehova abụba nile—ndị gbara eriri afọ, akụrụ, imeju, na úkwù, gburugburu, nakwa ọdụdụ mara abụba nke atụrụ—n’àjà site n’isure ha n’ọkụ, mee ya ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà. (Levitikọs 3:3-16) A na-ewere abụba dị ka akụkụ kasị edozi ahụ na nke kasị mma n’anụ. Ịchụ ya n’àjà n’ebe ịchụàjà na-anọchite anya inye Jehova ihe kasị mma. Ihe na-eme ka nzukọ ndị Kraịst na-enye ọṅụ karịsịa bụ na ọ bụghị nanị na anyị na-enweta ntụziaka kamakwa anyị na-enye Jehova otuto. Anyị na-eme nke a site n’ikere òkè—site n’ime ike anyị nile n’ụzọ kwesịrị ekwesị—n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-abụ abụ, ige ntị nke ọma, na ịza ajụjụ mgbe o kwere mee. “Toonụ Jaa,” ka ọbụ abụ ahụ tiri ná mkpu. “Bukuonụ Jehova abụ ọhụrụ, bụ́ otuto Ya n’ime mkpọkọta ndị ebere Ya.”—Abụ Ọma 149:1.

Ngọzi Bara Ụba Sitere n’Aka Jehova Na-echere Anyị

17, 18. (a) Àjà dị aṅaa dị egwu ka Solomọn chụrụ ná nraranye nke ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem? (b) Ngọzi ndị dị aṅaa ka ndị ahụ nwetara site n’ememe ahụ e mere ná nraranye nke ụlọ nsọ ahụ?

17 Ná nraranye nke ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem, n’ọnwa nke asaa nke afọ 1026 T.O.A., Eze Solomọn chụrụ “àjà n’ihu Jehova,” nke gụnyere “àjà nsure ọkụ na onyinye ịnata ihu ọma na abụba àjà udo.” Tụkwasị n’ihe ndị a chụrụ n’àjà n’onyinye ịnata ihu ọma ahụ, a chụrụ ngụkọta nke ehi 22,000 na atụrụ 120,000 n’àjà n’ememe ahụ.—1 Ndị Eze 8:62-65.

18 Ị̀ pụrụ ichetụ n’echiche ihe ememe buru ibu dị otú ahụ furu na ọrụ a rụrụ na ya? Ma, ngọzi Israel nwetara karịrị nnọọ ihe ha mefuru. Mgbe ememe ahụ gasịrị, Solomọn “zilagara ndị Israel, ha wee gọzie eze, laa n’ụlọikwuu ha na-aṅụrị ọṅụ, obi dịkwa ha mma, n’ihi ezi ihe nile nke Jehova meere Devid, bụ́ ohu Ya, nke O mekwaara Israel, bụ́ ndị Ya.” (1 Ndị Eze 8:66) N’ezie, dị ka Solomọn si kwuo ya, “ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.”—Ilu 10:22.

19. Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nweta ngọzi bara ụba n’aka Jehova ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi?

19 Anyị bi n’oge e jiworo “ezi oyiyi onwe ya nke ihe ndị a” dochie anya “onyinyo nke ezi ihe ahụ nile gaje ịbịa.” (Ndị Hibru 10:1) Jisọs Kraịst, n’ọnọdụ ya dị ka Onyeisi Nchụàjà ihe atụ ahụ, abanyeworị n’eluigwe onwe ya ma chee uru nke ọbara ya n’ihu nna ya iji kpuchie mmehie nke ndị nile na-egosipụta okwukwe n’àjà ya. (Ndị Hibru 9:10, 11, 24-26) Ná ndabere nke oké àjà ahụ nakwa site n’iji obi dum na-achụrụ Chineke àjà otuto dị ọcha na nke a na-emerụghị emerụ, anyị onwe anyị kwa pụrụ ịga n’ihu ‘na-aṅụrị ọṅụ, obi adịkwa anyị mma,’ anyị ana-elepụ anya n’ihu inweta ngọzi n’ụba n’aka Jehova.—Malakaị 3:10.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Ntụziaka na nkasi obi dị aṅaa ka anyị pụrụ inweta site n’ihe ọmụma dị n’Iwu ahụ banyere àjà na onyinye?

• Gịnị bụ ihe mbụ a chọrọ n’aka anyị iji mee ka àjà anyị bụrụ nke a na-anakwere, gịnịkwa ka nke ahụ pụtara nye anyị?

• Gịnị ka anyị pụrụ inye bụ́ nke a pụrụ iji tụnyere àjà nsure ọkụ afọ ofufo?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka a pụrụ isi jiri nzukọ ndị Kraịst tụnyere àjà udo?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 18]

Jehova nyere àjà mgbapụta Jisọs maka nzọpụta nke ihe a kpọrọ mmadụ

[Foto dị na peeji nke 20]

Ka ozi anyị wee bụrụ nke Jehova na-anakwere, anyị aghaghị ịbụ ndị a na-emerụghị emerụ n’ụzọ ọ bụla

[Foto dị na peeji nke 21]

Mgbe anyị na-ekere òkè n’ozi, anyị na-ekweta n’ihu ọha na Jehova dị mma