Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ọ̀ masịwo gị ịgụ mbipụta Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Ọ dị mma, lee ma ị̀ pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:

N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na mmezu amụma banyere “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” nke dị n’Aịsaịa 65:17-19 gụnyere ihe karịrị nlọta nke ndị Juu a dọọrọ n’agha?

Ọ bụ n’ihi na ndị ozi bụ́ Pita na Jọn, mgbe ha na-ede akwụkwọ na narị afọ mbụ O.A., ha rụtụrụ aka ná mmezu ya n’ọdịnihu, bụ́ nke na-agụnye ngọzi ndị a ka ga-enweta. (2 Pita 3:13; Mkpughe 21:1-4)—4/15, peeji nke 10-12.

Gịnị pụrụ ịbụ ihe ndabere maka akụkọ ọdịbendị ndị na-emeghị eme ndị Gris oge ochie kọrọ banyere ndị bụ́ ọkara mmadụ ọkara mmụọ na-eme ihe ike?

Ha pụrụ ịbụ ntinye e tinyere nnu na ose na ngwagbu a gwagburu eziokwu ahụ bụ́ na tupu Iju Mmiri ahụ, ụfọdụ ndị mmụọ ozi nwoghara onwe ha n’ụdị mmadụ ma bie ndụ ime ihe ike na nke rụrụ arụ n’ụwa. (Jenesis 6:1, 2)—4/15, peeji nke 27.

Olee ụfọdụ ihe ize ndụ ndị Kraịst tozuru okè ga-akpachapụ anya maka ha n’agbamakwụkwọ?

Ọ dị mkpa izere oriri oké mkpọtụ, bụ́ nke pụrụ ibilite ma ọ bụrụ na a ṅụọ mmanya na-aba n’anya n’ụzọ a na-achịkwaghị achịkwa, tee egwú a na-achịkwaghị achịkwa, kụọkwa egwú ndị na-ada oké ụda. Ọ gwụla ma e mere ka o doo anya na onye ọ bụla pụrụ ịbịa oriri agbamakwụkwọ, ndị a na-akpọghị ekwesịghị ịga. Nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ kwesịrị ijide n’aka na ndị Kraịst tozuru okè ga-anọ ya ruo mgbe ememe ahụ ga-emechi n’ezi oge.—5/1, peeji nke 19-22.

Gịnị ka aka Abụ Ọma 128:3 zoro n’ebe ụmụ nọ “dị ka ome osisi olive” gburugburu tebụl nwoke, na-enye echiche ya?

Ome ọhụrụ na-esikarị n’úkwù osisi olive epulite. Mgbe ogwe osisi ochie na-adịchaghịzi amị mkpụrụ, ome ndị ọhụrụ pụrụ ịghọ osisi kwụ chịm bụ́ ndị gbara ya gburugburu. N’otu aka ahụ, ndị nne na nna pụrụ ịṅụrị ọṅụ inwe ụmụ na-amị mkpụrụ bụ́ ndị so ha na-ejere Jehova ozi.—5/15, peeji nke 27.

Olee ụfọdụ uru ụmụaka na-erite site n’inwe ọnọdụ ezinụlọ na-ewuli elu?

Ọ na-atọ ntọala maka ha ile ịbụisi anya n’ụzọ ziri ezi, inwe ekele maka àgwà ndị kwesịrị ekwesị, na iso ndị ọzọ na-enwe mmekọrịta obi ụtọ. Ọnọdụ dị otú ahụ pụkwara inyere ha aka iso Chineke bụrụ enyi.—6/1, peeji nke 18.

N’otu ala dị n’Ime Ime Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, gịnị ka e mere iji kwalite echiche bụ́ na ndị Kraịst nile bụ ụmụnna?

A gbara ọgbakọ nile ahụ ume ka ha ghara iji okwu e ji eme ihe maka ndị nọ n’ọnọdụ dị elu na-eme ihe maka mmadụ ụfọdụ. Kama nke ahụ, ha kwesịrị ịdị na-eji otu okwu eme ihe n’ebe mmadụ nile nọ dị ka ụmụnna.—6/15, peeji nke 21, 22.

Ndịàmà Jehova hà na-anabata ọgwụ ndị e si n’ọbara nweta?

Anyị kweere na iwu Bible bụ́ ‘ịhapụ ọbara’ na-akagbu mmịnye ọbara n’ozuzu ya ma ọ bụ nke ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ya (plasma, mkpụrụ ndụ ọbara uhie, mkpụrụ ndụ ọbara ọcha, na platelet). (Ọrụ 15:28, 29) Banyere ụmụ irighiri ihe ndị a na-enweta site n’ihe ndị ahụ bụ́ isi mejupụtara ọbara, onye Kraịst nke ọ bụla ga-emere onwe ya mkpebi, na-eburu ihe Bible na-ekwu na mmekọrịta ya na Chineke n’uche.—6/15, peeji nke 29-31.

Ò kwere omume n’ezie ịchọta udo nke obi taa?

Ee. Site na Bible, Jisọs Kraịst na-eduzi ndị mmadụ gaa n’ụzọ nke ofufe dị ọcha na nke udo ahụ a kọwara n’Aịsaịa 32:18. Ọzọkwa, ndị na-enweta udo dị otú ahụ nwere atụmanya nke inwe udo na-adịgide adịgide n’ụwa ná mmezu nke Abụ Ọma 37:11, 29.—7/1, peeji nke 7.

Òkè dị aṅaa ka George Young keere n’akụkọ ihe mere eme nke ọchịchị Chineke n’oge a?

Malite na 1917, o gosipụtara onwe ya ịbụ onye na-enye ìhè nke ozi ọma Alaeze n’ọtụtụ ala. Ozi ya dugara ya gburugburu Canada, n’àgwàetiti ndị dị na Caribbean, na Brazil nakwa n’ala ndị ọzọ dị n’Ebe Ndịda America, n’Ebe Etiti America, na Spain, na Portugal, duga ya n’ebe bụ́ Soviet Union n’oge ahụ, nakwa na United States.—7/1, peeji nke 22-27.

Gịnị ka 1 Ndị Kọrint 15:29 (NW) bu n’uche mgbe ọ na-ekwu banyere ụfọdụ “[ịbụ] ndị a na-eme baptism n’ihi nzube nke ịbụ ndị nwụrụ anwụ”?

Ihe a na-ekwu bụ na mgbe e ji mmụọ nsọ tee ndị Kraịst mmanụ, e mikpuru ha n’ụzọ ndụ nke ga-eduga n’ọnwụ ha nakwa ná mbilite n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe ga-esochinụ.—7/15, peeji nke 17.

Gịnị ka Pọl onyeozi nọ na-eme n’ime oge ahụ a kọwaworo dị ka afọ ndị a na-amaghị ihe banyere ya?

Ọ pụrụ ịbụ na o nyere aka guzobe ma ọ bụ wusie ọgbakọ ndị dị na Siria na Silisia ike. Ọtụtụ n’ime ihe isi ike ndị ahụ a kpọtụrụ aha ná 2 Ndị Kọrint 11:23-27 aghaghị ịbụwo n’oge ahụ ka ha mere, na-egosi na ọ nọ na-ejesi ozi ike.—7/15, peeji nke 26, 27.

Gịnị pụrụ inyere anyị aka inwe ezi uche n’ihe banyere atụmanya anyị?

Cheta na Jehova bụ onye na-aghọta ihe. Ikpegara ya ekpere pụrụ inyere anyị aka ime ka echiche anyị guzozie, ọ na-egosikwa ịdị obi umeala. Ihe ọzọ na-enye aka bụ inwe echiche ọhụrụ site n’iso enyi tozuru okè kwurịta okwu.—8/1, peeji nke 29, 30.