Levitikọs 2:1-16

  • Àjà ọka (1-16)

2  “‘Ọ bụrụ na mmadụ* chọrọ ịchụrụ Jehova àjà ọka,+ àjà ya kwesịrị ịbụ ntụ ọka e gwere nke ọma. Ọ ga-awụ mmanụ n’elu ya ma tụkwasị frankinsens n’elu ya.+  Ọ ga-ebuteziri ya ụmụ Erọn, bụ́ ndị nchụàjà. Onye nchụàjà ga-ekporo ntụ ọka e gwere nke ọma ga-eju ọbụ aka ya nakwa mmanụ na frankinsens ya niile, ọ ga-esukwa ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, ka ọ bụrụ ihe nọchiri anya àjà+ e wetara. Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ, àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova.  Ihe ọ bụla fọrọ n’àjà ọka ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya.+ Ọ bụ ihe kacha nsọ+ si n’àjà e suru ọkụ a chụụrụ Jehova.  “‘Ọ bụrụ na ị ga-eji achịcha e mere n’ekwú chụọ àjà ọka, ọ ga-abụ achịcha e ji ntụ ọka e gwere nke ọma mee, ya bụ, ogbe achịcha ndị na-ekoghị eko dị okirikiri a gwara mmanụ ma ọ bụ achịcha ndị na-ekoghị eko dị fere fere a wụrụ mmanụ.+  “‘Ọ bụrụ na achịcha ị ga-eji chụọ àjà ọka bụ nke e mere n’ite dị mbadamba,+ ọ ga-abụ achịcha na-ekoghị eko e ji ntụ ọka e gwere nke ọma mee, nke a gwara mmanụ.  A ga-anyawasị ya iberibe iberibe, ị ga-awụsakwa ya mmanụ.+ Ọ bụ àjà ọka.  “‘Ọ bụrụ na achịcha ị ga-eji chụọ àjà ọka bụ nke e mere n’ite e ji eme achịcha, ọ ga-abụ achịcha e ji ntụ ọka e gwere nke ọma na mmanụ mee.  Ị ga-ewetara Jehova àjà ọka e ji ihe ndị a mee. A ga-enyekwa ya onye nchụàjà, onye ga-eweta ya nso n’ebe ịchụàjà.  Onye nchụàjà ga-ewere ụfọdụ n’ime àjà ọka ahụ ka ọ bụrụ ihe nọchiri anya àjà+ e wetara. Ọ ga-esukwa ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, ka ọ bụrụ àjà a na-esu ọkụ, àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova.+ 10  Ihe fọrọ n’àjà ọka ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya. Ọ bụ ihe kacha nsọ si n’àjà e suru ọkụ a chụụrụ Jehova.+ 11  “‘E nweghị àjà ọka unu ga-achụrụ Jehova a ga-etinye ihe na-eko achịcha,+ n’ihi na unu agaghị eji ihe ọ bụla e tinyere ihe na-eko achịcha ma ọ bụ mmanụ aṅụ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ. 12  “‘Unu nwere ike iwetara ha Jehova ka mkpụrụ mbụ,+ ma a gaghị eweta ha n’ebe ịchụàjà ka e jiri ha chụọ àjà na-esi ísì ọma.* 13  “‘Ị ga-etinye nnu n’àjà ọka gị ọ bụla. Ekwela ka nnu ọgbụgba ndụ Chineke gị kọọ ụkọ n’àjà ọka gị. Ị ga-eweta nnu+ mgbe ọ bụla ị na-eweta ihe ị ga-eji chụọ àjà. 14  “‘Ọ bụrụ na ị ga-esi ná mkpụrụ mbụ kara aka wetara Jehova àjà ọka, ị ga-eweta ọka ọhụrụ* e ghere eghe,* mkpụrụ ọka ọhụrụ a na-egwerighị nke ọma, ka ọ bụrụ àjà ọka si ná mkpụrụ mbụ gị kara aka.+ 15  Ị ga-awụ mmanụ n’elu ya ma tụkwasị frankinsens n’elu ya. Ọ bụ àjà ọka. 16  Onye nchụàjà ga-esu ya ọkụ ka ọ bụrụ ihe na-anọchi anya àjà+ e wetara, ya bụ, ụfọdụ n’ime ọka ahụ a na-egwerighị nke ọma na mmanụ na frankinsens ya niile. Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “oko ọka wit ma ọ bụ bali na-akpọbeghị akpọ.”
Ma ọ bụ “a ṅara n’ọkụ.”