Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Oge Ya Ọ̀ Gafeela Ka Ò Kwuru Ihe Ndị Mmadụ Mechara Mata na Ha Bụ Eziokwu?

Oge Ya Ọ̀ Gafeela Ka Ò Kwuru Ihe Ndị Mmadụ Mechara Mata na Ha Bụ Eziokwu?

SAYENSỊ

BAỊBỤL ABỤGHỊ AKWỤKWỌ SAYENSỊ, MA O KWURU ỌTỤTỤ IHE E MECHARA MATA NA HA BỤ EZIOKWU. LEE ỤFỌDỤ N’IME HA.

Eluigwe na ụwa, hà nwere mmalite?

E nwere mgbe ndị ọkà mmụta sayensị a ma ama kwetasiri ike na eluigwe na ụwa enweghị mmalite. Ma ugbu a, ha ekwetala na eluigwe na ụwa nwere mmalite. Ma, ọ bụ ihe Baịbụl kwuru kemgbe.—Jenesis 1:1.

Olee otú ụwa dị?

N’oge ochie, ọtụtụ ndị chere na ụwa dị larịị. Ma, n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ ise gara aga, ndị ọkà mmụta sayensị bụ́ ndị Gris kwuru na ọ dị gburugburu. Ma, kemgbe ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, Aịzaya bụ́ onye so dee Baịbụl kwuru na ‘ụwa dị gburugburu.’— Aịzaya 40:22.

Ihe ndị dị na mbara igwe, hà na-emebi emebi?

Onye ọkà mmụta sayensị, bụ́ onye Gris, aha ya bụ Arịstọtụl, nke biri ndụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ atọ gara aga, kwuru na ọ bụ naanị n’ụwa ka ihe na-emebi emebi. Ọ sịrị na kpakpando ndị dị na mbara igwe emekataghị gbanwee ma ọ bụkwanụ mebie. Ndị mmadụ kwetara ihe a ruo ọtụtụ narị afọ. Ma, n’ihe fọrọ obere ka o ruo narị afọ abụọ gara aga, ndị ọkà mmụta sayensị kwuru na ihe niile, ma ihe ndị dị n’eluigwe ma ihe ndị dị n’ụwa, na-emebi emebi. Lord Kelvin bụ otu n’ime ndị ọkà mmụta sayensị kwetara na ihe niile na-emebi emebi. Ọ sịrị na Baịbụl kwuru banyere eluigwe na ụwa, sị: “Ha niile ga-akakwa nká dị ka uwe.” (Abụ Ọma 102:25, 26) Kelvin kwetakwara ihe Baịbụl kwuru, nke bụ́ na ọ bụrụ na Chineke achọọ o nwere ikike ime ka ihe ọ bụla ghara imebi ihe ndị o kere.—Ekliziastis 1:4.

È nwere ebe e kokwasịrị ụwa ma ọ bụ planet ndị ọzọ?

Arịstọtụl kụziri na e nwere ihe e ji kpakọta planet niile ọnụ. Ọ sịrị na akpakọtara ha, ha esie ike, nakwa na ọ bụ ụwa nọ n’etiti. Ma, n’ihe dị ka narị afọ atọ gara aga, ndị ọkà mmụta sayensị malitere ikweta na o nweghị ebe e kokwasịrị kpakpando, ụwa na planet ndị ọzọ ka ha ghara ịda. Ma, n’akwụkwọ Job e dere kemgbe ihe karịrị puku afọ atọ gara aga, e kwuru na o nweghị ihe Chineke “kokwasịrị ụwa na ya.”—Job 26:7.

 AHỤ́ IKE

BAỊBỤL KWURU IHE NDỊ BỤ ỊGBA NWERE IKE INYERE MMADỤ AKA N’IHE GBASARA AHỤ́ IKE N’AGBANYEGHỊ NA Ọ BỤGHỊ AKWỤKWỌ AHỤ́ IKE.

Ịkpọpụ ndị ọrịa iche.

N’Iwu Mozis, e kwuru ka a na-akpọpụ ndị ekpenta iche ka ha na ndị mmadụ ghara ịnọkọta. Ma, ndị dọkịta amaghị ihe a ruo mgbe ọrịa na-efe efe kpara mkpamkpa n’ihe dị ka narị afọ asaa gara aga. Ọ bụzi mgbe ahụ ka ha malitere mewe ya. Ọ ka na-abakwa uru taa.—Levitikọs isi nke 13 na nke 14.

Mmadụ ịkwọ aka ma o metụ ozu aka.

Tupu ihe dị ka afọ 1890, ọ na-abụkarị ndị dọkịta metụchaa ozu aka, ha aga gwọwa onye ọrịa, n’ebughị ụzọ kwọọ aka. Ihe a ha na-eme gburu ọtụtụ ndị. Ma, Iwu Mozis kwuru na onye ọ bụla metụrụ ozu aka adịghịzi ọcha. O kwudịrị ka onye ahụ were mmiri sụọ uwe ya, saakwa ahụ́ ya ka o nwee ike ịdị ọcha. Ihe ndị a Chineke gwara ha, na-eme ka mmadụ ghara ibute ọrịa.—Ọnụ Ọgụgụ 19:11, 19.

Ịnyụ nsị ebe na-ekwesịghị ekwesị.

Kwa afọ, afọ na-asagbu ihe karịrị ọkara nde ụmụaka. Ihe kacha akpata afọ ọsịsa a bụ nsị ndị mmadụ nyụrụ ebe na-ekwesịghị ekwesị. Iwu Mozis kwuru na onye chọọ ịnyụ nsị, o kwesịrị ịga ebe mmadụ na-anọghị, gwuo ala, ọ nyụchaa, ya ekpochie ya.—Diuterọnọmi 23:13.

Oge e ji ebi úgwù.

Chineke nyere iwu ka a na-ebi nwa nwoke ọ bụla a mụrụ úgwù n’ụbọchị nke asatọ. (Levitikọs 12:3) A chọpụtara na ihe na-eme ka ahụ́ nwatakịrị amụrụ ọhụrụ nwee ike ịkwụsị ịgba ọbara na-amalite ịrụ ọrụ nke ọma ma izu mbụ a mụrụ ya gachaa. N’oge Baịbụl, tupu e nwee ụzọ ọgbara ọhụrụ e si agwọ ọrịa, iche ka otu izu gachaa tupu ebie nwa ọhụrụ úgwù, na-eme ka ọ ghara ịnwụ.

Ịna-enwe obi ụtọ na-eme ka ahụ́ na-adị mmadụ mma.

Ndị na-eme nchọpụta gbasara ahụ́ ike na ndị ọkà mmụta sayensị kwuru na mmadụ ịna-enwe obi ụtọ, ịna-atụ anya na ihe ga-adị mma, ịna-egosi na obi dị ya ụtọ maka ihe e meere ya, nakwa ịna-agbaghara ndị mejọrọ ya, na-enyere mmadụ aka ahụ́ ana-adị ya mma. Baịbụl kwuru, sị: “Obi nke na-aṅụrị ọṅụ bara uru dị ka ihe na-agwọ ọrịa, ma mmụọ nke dara mbà na-amịkpọ ọkpụkpụ.”—Ilu 17:22.