Levitikọs 13:1-59

  • Iwu e nyere gbasara ekpenta (1-46)

  • Ihe yiri ọrịa ekpenta nke pụtara n’uwe (47-59)

13  Jehova gwakwara Mosis na Erọn, sị:  “Ọ bụrụ na e nwee ebe ahụ́ mmadụ zara aza ma ọ bụ na onye ahụ nwere ihe yiri ọnyá kpọchiri akpọchi n’ahụ́ ya ma ọ bụ na ntụpọ pụtara ya n’ahụ́, ya abụrụkwa na ihe ahụ nwere ike ịghọ ọrịa ekpenta*+ n’ahụ́ ya, a ga-akpọgara ya Erọn onye nchụàjà ma ọ bụ otu n’ime ụmụ ya, bụ́ ndị nchụàjà.+  Onye nchụàjà ga-eleru ihe ahụ mere ya n’ahụ́ anya. Ọ bụrụ na ajị dị n’ebe ahụ achawala ọcha, ọ bụrụkwa na ihe ahụ mere ya bara ime, ọ bụ ọrịa ekpenta. Onye nchụàjà ga-eleru ya anya ma kwuo na onye ahụ adịghị ọcha.  Ma ọ bụrụ na ntụpọ ahụ pụtara ya n’ahụ́ na-acha ọcha ma ọ dịghị ka ọ̀ bara ime, ọ bụrụkwa na ajị dị n’ebe ahụ achawabeghị ọcha, onye nchụàjà ga-akpọpụ onye ahụ iche ruo ụbọchị asaa.+  Onye nchụàjà ga-eleruzi ya anya n’ụbọchị nke asaa. Ọ bụrụ na o yiri ka ihe ahụ mere ya ọ̀ laala, ọ bụrụkwa na ọ gbasaghị n’ahụ́ ya, onye nchụàjà ga-akpọpụ ya iche ruo ụbọchị asaa ọzọ.  “Onye nchụàjà ga-eleru ya anya ọzọ n’ụbọchị nke asaa. Ọ bụrụ na ihe ahụ mere ya alawala, ọ bụrụkwa na ọ gbasaghị n’ahụ́ ya, onye nchụàjà ga-ekwu na ọ dị ọcha.+ Ọ bụ naanị ọnyá kpọchiri akpọchi. Onye ahụ ga-asụ uwe ya ma dị ọcha.  Ma ọ bụrụ na ọnyá ahụ kpọchiri akpọchi* gbasara n’ahụ́ ya mgbe o gosicharala onye nchụàjà onwe ya ka e kwuo ma ọ̀ dịla ọcha, ọ ga-egosi onye nchụàjà onwe ya ọzọ.*  Onye nchụàjà ga-eleru ya anya. Ọ bụrụ na ọnyá ahụ kpọchiri akpọchi agbasaala n’ahụ́ ya, onye nchụàjà ga-ekwuzi na onye ahụ adịghị ọcha. Ọ bụ ekpenta.+  “Ọ bụrụ na ekpenta apụta mmadụ n’ahụ́, a ga-akpọgara ya onye nchụàjà. 10  Onye nchụàjà ga-eleru ya anya.+ Ọ bụrụ na e nwere ebe zara aza n’ahụ́ ya ma na-acha ọcha, ọ bụrụkwa na ajị dị n’ebe ahụ na-achazi ọcha, e nweekwa ọnyá+ na ya, 11  ihe ahụ dị ya n’ahụ́ bụ ekpenta na-anaghị ala ngwa ngwa. Onye nchụàjà ga-ekwu na onye ahụ adịghị ọcha. Ọ gaghị akpọpụ ya iche+ n’ihi na o doro anya na ọ dịghị ọcha. 12  Ọ bụrụ na ekpenta ahụ agbasaa n’ahụ́ onye ahụ niile, onye nchụàjà ahụkwa na n’ebe ọ bụla o lere ya anya, ekpenta kpuchiri ya ahụ́ si n’isi ruo n’ụkwụ, 13  ọ bụrụkwa na onye nchụàjà eleruola ya anya ma hụ na ekpenta ahụ kpuchiri ahụ́ ya niile, ọ ga-ekwuzi na onye ahụ adịla ọcha.* Ahụ́ ya niile achawala ọcha, onye ahụ bụzi onye dị ọcha. 14  Ma mgbe ọ bụla ọnyá pụtara ya n’ahụ́, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha. 15  Mgbe onye nchụàjà ga-ahụ ọnyá ahụ, ọ ga-ekwu na onye ahụ adịghị ọcha.+ Ọnyá ahụ adịghị ọcha. Ọ bụ ekpenta.+ 16  Ma ọ bụrụ na ọnyá ahụ achawa ọcha ọzọ, ọ ga-agakwuru onye nchụàjà. 17  Onye nchụàjà ga-eleru ya anya n’ahụ́.+ Ọ bụrụ na ọnyá ahụ achawala ọcha, onye nchụàjà ga-ekwu na onye ahụ ihe ahụ mere adịla ọcha. Onye ahụ dị ọcha. 18  “Ọ bụrụ na etuto etoo mmadụ n’ahụ́ ma laa, 19  ebe ahụ etuto toburu onye ahụ emechaa zaa, chawazie ọcha ma ọ bụkwanụ ntụpọ na-achatụ ọbara ọbara apụta n’ebe ahụ, ọ ga-egosi onye nchụàjà onwe ya. 20  Onye nchụàjà ga-eleru ya anya.+ Ọ bụrụ na ọ dị ka ihe ahụ ọ̀ bara ime, ọ bụrụkwa na ajị dị n’ebe ahụ achawala ọcha, onye nchụàjà ga-ekwu na onye ahụ adịghị ọcha. Ọ bụ ekpenta pụtara n’etuto ahụ. 21  Ma ọ bụrụ na onye nchụàjà eleruo ya anya ma hụ na e nweghị ajị na-acha ọcha dị n’ebe ahụ, hụkwa na ọ baghị ime nakwa na ọ lawala, onye nchụàjà ga-akpọpụ ya iche ruo ụbọchị asaa.+ 22  Ọ bụrụ na ọ gbasaala n’ahụ́ ya, onye nchụàjà ga-ekwu na onye ahụ adịghị ọcha. Ọ bụ ekpenta. 23  Ma, ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbasaghị n’ahụ́ ya, ọ bụ etuto ahụ toro ya mere ka ebe ahụ dị otú ahụ. Onye nchụàjà ga-ekwu na onye ahụ dị ọcha.+ 24  “Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọkụ eree mmadụ, onye ahụ enwee apa n’ebe ọkụ rere ya, ọ bụrụkwa na ntụpọ na-achatụ ọbara ọbara ma ọ bụ nke na-acha ọcha apụta n’ọnyá dị n’apa ahụ, 25  onye nchụàjà ga-eleru ya anya. Ọ bụrụ na ajị dị ná ntụpọ ahụ na-achazi ọcha, ọ bụrụkwa na ọ dị ka ọ̀ bara ime, ọ bụ ekpenta pụtara n’apa ahụ. Onye nchụàjà ga-ekwu na onye ahụ adịghị ọcha. Ọ bụ ekpenta. 26  Ma ọ bụrụ na onye nchụàjà eleruo ya anya ma hụ na e nweghị ajị ọcha dị ná ntụpọ ahụ, ntụpọ ahụ abaghịkwa ime, ọ lawakwala, onye nchụàjà ga-akpọpụ ya iche ruo ụbọchị asaa.+ 27  Onye nchụàjà ga-eleru ya anya n’ụbọchị nke asaa. Ọ bụrụ na ọ gbasaala n’ahụ́ ya, onye nchụàjà ga-ekwu na onye ahụ adịghị ọcha. Ọ bụ ekpenta. 28  Ma, ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbasaghị ya n’ahụ́, ọ bụrụkwa na ọ lawala, ọ bụ apa ahụ mere ka ebe ahụ zaa azaa, onye nchụàjà ga-ekwu na onye ahụ dị ọcha, n’ihi na ọ bụ apa ahụ mere ka ebe ahụ zaa. 29  “Ọ bụrụ na e nwee ihe mere nwoke ma ọ bụ nwaanyị n’isi ma ọ bụ n’agba, 30  onye nchụàjà ga-eleru ihe ahụ mere ya anya.+ Ọ bụrụ na ọ dị ka ihe ahụ ọ̀ bara ime, ya abụrụkwa na ntutu dị n’ebe ahụ na-achazi odo odo, o jughịkwa eju otú o juburu, onye nchụàjà ga-ekwu na onye ahụ adịghị ọcha. Ọ bụ ọrịa bịara ya n’ala isi ma ọ bụ n’afụ ọnụ.* Ọ bụ ekpenta isi ma ọ bụ ekpenta agba. 31  Ma ọ bụrụ na onye nchụàjà ahụ na ihe ahụ mere ya adịghị ka ọ̀ bara ime nakwa na e nweghị ntutu ojii dị na ya, onye nchụàjà ga-akpọpụ onye ahụ ihe ahụ mere iche ruo ụbọchị asaa.+ 32  N’ụbọchị nke asaa, onye nchụàjà ga-eleru ihe ahụ mere ya anya. Ọ bụrụ na ihe ahụ mere ya agbasaghị, ntutu na-acha odo odo apụtaghịkwa na ya, ọ bụrụkwa na ọ dịghị ka ihe ahụ mere ya ọ̀ bara ime, 33  a ga-akpụ onye ahụ isi ma ọ bụ kpụọ ya afụ ọnụ,* ma a gaghị akpụ ebe ahụ ihe mere ya. Onye nchụàjà ga-akpọpụzi onye ahụ ihe ahụ mere iche ruo ụbọchị asaa ọzọ. 34  “Onye nchụàjà ga-eleru ebe ahụ ihe ahụ mere ya anya n’ụbọchị nke asaa. Ọ bụrụ na ihe ahụ mere ya n’ala isi ma ọ bụ n’afụ ọnụ* agbasaghị n’ahụ́ ya, ọ dịghịkwa ka ọ̀ bara ime, onye nchụàjà ga-ekwu na onye ahụ dị ọcha. Ọ ga-asụkwa uwe ya wee dị ọcha. 35  Ma ọ bụrụ na ihe ahụ mere ya agbasaa n’ahụ́ ya mgbe e kwuchara na ọ dị ọcha, 36  onye nchụàjà ga-eleru onye ahụ anya. Ọ bụrụ na ihe ahụ mere ya agbasaala n’ahụ́ ya, onye nchụàjà agaghị achọwa ka ọ hụ ntutu na-acha odo odo. Onye ahụ adịghị ọcha. 37  Ma ọ bụrụ na o leruru ihe ahụ mere ya anya ma hụ na ọ gbasaghị n’ahụ́ ya nakwa na ntutu ojii etopụtala na ya, ihe ahụ mere ya alaala. Onye ahụ dị ọcha. Onye nchụàjà ga-ekwukwa na ọ dị ọcha.+ 38  “Ọ bụrụ na ntụpọ apụtasịa nwoke ma ọ bụ nwaanyị n’ahụ́, ya abụrụ na ntụpọ ndị ahụ na-acha ọcha, 39  onye nchụàjà ga-eleru ntụpọ ndị ahụ anya.+ Ọ bụrụ na ntụpọ ndị ahụ anaghị acha ezigbo ọcha, ọ bụ ọkọ nkịtị ghara ya n’ahụ́. Onye ahụ dị ọcha. 40  “Ọ bụrụ na ntutu adapụsịa nwoke n’isi, isi ya akwọchaa, onye ahụ dị ọcha. 41  Ọ bụrụ na ntutu adapụsịa n’ihu isi ya, ihu isi ya akwọchaa, onye ahụ dị ọcha. 42  Ma ọ bụrụ na ọnyá na-achatụ ọbara ọbara apụta n’ebe ahụ isi ya kwọchara akwọcha ma ọ bụ n’ihu isi ya, ọ bụ ekpenta na-abịa ya n’isi ma ọ bụ n’ihu isi ya. 43  Onye nchụàjà ga-eleru ya anya. Ọ bụrụ na ihe ahụ nke mere ya n’ebe isi ya kwọchara akwọcha ma ọ bụ n’ihu isi ya zara aza ma na-achatụ ọbara ọbara, ọ bụrụkwa na ọ dị ka ekpenta, 44  ọ bụ onye ekpenta. Ọ dịghị ọcha. Onye nchụàjà ga-ekwu na ọ dịghị ọcha n’ihi ihe ahụ mere ya n’isi. 45  Ma onye ahụ na-arịa ọrịa ekpenta ga na-eyi uwe dọkara adọka. Ọ gaghịkwa edozi isi ya edozi. Ọ ga-ekpuchikwa afụ ọnụ ya, na-eti mkpu, sị, ‘Adịghị m ọcha! Adịghị m ọcha!’ 46  Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha n’oge niile ọ na-arịa ọrịa ahụ. Ebe ọ bụ na ọ dịghị ọcha, ọ ga-ebi iche. Ọ gaghị ebi n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu.+ 47  “Ọ bụrụ na ntụpọ yiri ọrịa ekpenta apụta n’uwe, ma ọ̀ bụ uwe e ji ajị anụ kpaa ma ọ̀ bụ uwe e ji ákwà linin kpaa, 48  ma ọ̀ bụ n’owu ndị gara ogologo ogologo ma ọ̀ bụ n’owu ndị gara uhiè uhiè n’uwe e ji ákwà linin kpaa ma ọ bụ nke e ji ajị anụ kpaa ma ọ̀ bụ n’akpụkpọ anụ ma ọ̀ bụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee, 49  ọ bụrụkwa na ọrịa ahụ mere ka e nwee ntụpọ na-achatụ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ma ọ bụ na-acha ọbara ọbara n’uwe ahụ, n’akpụkpọ anụ, n’owu ndị gara ogologo ogologo n’uwe, n’owu ndị gara uhiè uhiè n’uwe ma ọ bụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee, ọ bụ ekpenta. A ga-egosi ya onye nchụàjà. 50  Onye nchụàjà ga-eleru ntụpọ ahụ anya, ọ ga-edosakwa ihe ntụpọ ahụ pụtara na ya iche ruo ụbọchị asaa.+ 51  Mgbe o leruru ntụpọ ahụ anya n’ụbọchị nke asaa ma hụ na ọ gbasaala n’uwe ahụ, n’owu ndị gara ogologo ogologo n’uwe ahụ, n’owu ndị gara uhiè uhiè n’uwe ahụ ma ọ bụ n’akpụkpọ anụ (ihe ọ sọkwara ya bụrụ ihe e ji akpụkpọ anụ ahụ eme), ntụpọ ahụ bụ ajọ ọrịa ekpenta. Ihe ahụ ọ dị na ya adịghị ọcha.+ 52  Ọ ga-akpọ ihe ahụ ntụpọ ahụ pụtara na ya ọkụ, ma ọ̀ bụ uwe ahụ ma ọ̀ bụ owu ndị gara ogologo ogologo ma ọ̀ bụ owu ndị gara uhiè uhiè n’uwe ahụ e ji ajị anụ kpaa ma ọ̀ bụ n’uwe ahụ e ji ákwà linin kpaa ma ọ̀ bụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee, n’ihi na ọ bụ ajọ ọrịa ekpenta. A ga-akpọ ihe ahụ ọkụ. 53  “Ma ọ bụrụ na onye nchụàjà eleruo ya anya ma hụ na ntụpọ ahụ agbasaghị n’uwe ahụ ma ọ bụ n’owu ndị gara ogologo ogologo n’uwe ahụ ma ọ bụ n’owu ndị gara uhiè uhiè n’uwe ahụ ma ọ bụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee, 54  onye nchụàjà ga-enye iwu ka ha saa ihe ahụ ntụpọ pụtara na ya mmiri. Ọ ga-edosakwa ya iche ruo ụbọchị asaa ọzọ. 55  Onye nchụàjà ga-eleru ihe ahụ ntụpọ ahụ pụtara na ya anya mgbe a sachara ya nke ọma. Ọ bụrụ na otú ntụpọ ahụ dị agbanwebeghị, ọ bụrụgodị na ọ gbasabeghị, ihe ahụ adịghị ọcha. Ị ga-akpọ ya ọkụ n’ihi na o sila n’ime ma ọ bụ n’elu rie ihe ahụ. 56  Ma ọ bụrụ na onye nchụàjà eleruo ya anya ma hụ na ntụpọ ahụ apụwala mgbe a sachara ihe ahụ nke ọma, ọ ga-adọkapụ ebe ahụ ntụpọ ahụ dị n’uwe ahụ ma ọ bụ n’akpụkpọ anụ ahụ ma ọ bụ n’owu ndị ahụ gara ogologo ogologo n’uwe ahụ ma ọ bụ n’owu ndị gara uhiè uhiè n’uwe ahụ. 57  Ma ọ bụrụ na ọ pụtakwara ebe ọzọ n’uwe ahụ ma ọ bụ n’owu ndị gara ogologo ogologo n’uwe ahụ ma ọ bụ n’owu ndị gara uhiè uhiè n’uwe ahụ ma ọ bụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee, ọ na-agbasa agbasa. Ị ga-akpọ ihe ọ bụla ntụpọ ahụ pụtara na ya ọkụ.+ 58  Ma ọ bụrụ na ntụpọ ahụ adịghịzi n’uwe ahụ ma ọ bụ n’owu ndị gara ogologo ogologo n’uwe ahụ ma ọ bụ n’owu ndị gara uhiè uhiè n’uwe ahụ ma ọ bụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee mgbe ị sachara ya mmiri, ị ga-asa ya nke ugboro abụọ, ọ ga-adịkwa ọcha. 59  “Ihe a bụ iwu banyere ntụpọ yiri ọrịa ekpenta nke pụtara n’uwe e ji ajị anụ kpaa ma ọ bụ n’uwe e ji ákwà linin kpaa ma ọ bụ n’owu ndị gara ogologo ogologo n’uwe ma ọ bụ n’owu ndị gara uhiè uhiè n’uwe ma ọ bụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee. A ga-eji iwu a na-ekpebi ma ihe ndị a hà dị ọcha ka ọ̀ bụ na ha adịghị ọcha.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Okwu Hibru a sụgharịrị “ekpenta” pụtara ọtụtụ ihe. Ọtụtụ ọrịa na-efe efe nke na-eme mmadụ n’akpụkpọ ahụ́ nwere ike iso na ya. Ọrịa ụfọdụ na-atapara n’ákwà nakwa n’ụlọ nwekwara ike iso na ya.
Ma ọ bụ “ihe ahụ mere ya.”
Ma ọ bụ “nke ugboro abụọ.”
Ma ọ bụ “na ọrịa onye ahụ anaghịzi efe efe.”
Ya bụ, n’ajị na-adị n’agba.
Ya bụ, ajị na-adị n’agba.
Ya bụ, n’ajị na-adị n’agba.