Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

1 Baịbụl Ga-enyere Gị Aka Izere Nsogbu

1 Baịbụl Ga-enyere Gị Aka Izere Nsogbu

Baịbụl gwara anyị na ihe e dere na ya “bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie.” (2 Timoti 3:16) Ihe a Baịbụl kwuru ọ̀ bụ eziokwu? Ka anyị lee otú ihe Baịbụl kwuru sirila nyere ndị mmadụ aka izere nsogbu ụfọdụ siri ezigbo ike tupu ha aka njọ.

ỊṄỤBIGA MMANYA ÓKÈ

Delphine anyị kwuru gbasara ya n’isiokwu bu nke a ụzọ, chọpụtara na ichegbu onwe ya gbasara nsogbu ndị o nwere na-eme ka ọ na-aṅụ oké mmanya. Baịbụl akagbughị ịṅụ mmanya. Ma, ọ sịrị: “Anọla n’etiti ndị na-aṅụ oké mmanya.” (Ilu 23:20) A chọpụtala na ịṅụbiga mmanya ókè na-akpata ọrịa ndị dị ezigbo njọ, na-akpata esemokwu, na-emekwa ka ọtụtụ nde mmadụ na-anwụchu ọnwụ kwa afọ. Mmadụ ga-ezereli ọtụtụ nsogbu ndị a ma ọ na-eme ihe Baịbụl kwuru.

Delphine zeere nsogbu ndị ahụ. Ọ sịrị: “Achọpụtala m na ịṅụ mmanya anaghị eme ka m kwụsị ichegbu onwe m. M mere ihe e kwuru ná Ndị Filipaị 4:6, 7. Ebe ahụ sịrị: ‘Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama . . . mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ.’ Ọ bụrụ na mụ echegbuwe onwe m n’abalị ọ bụla, m na-ekpe ekpere, gwa Chineke otú ọ dị m n’obi. Iwe jide m, e nwee ihe na-enye m nsogbu n’obi, ma ọ bụkwanụ obi na-ekoropụ m, m na-agwa ya. M na-arịọ ya ka o nyere m aka ka m ghara ịna-echegbu onwe m. Chi bọọ, m na-agbalị ka m ghara ịna-echegbuzi onwe m. Ikpe ekpere mgbe niile emeela ka m na-eche banyere ihe ndị m nwere, kama ịna-echegbu onwe m banyere ihe ndị m na-enweghị. M kpebiri na agaghịzi m na-aṅụ mmanya na-aba n’anya. Obi eruola m ala ugbu a. Achọghịkwa m ka ihe ọ bụla mee ka m chegbuwakwa m onwe m.”

ỊKWA IKO

Ịkwa iko so n’ihe ndị kacha akpata obi mgbawa na nsogbu. Ma, ihe Baịbụl kwuru ga-enyeliri anyị aka izere nsogbu ndị a. Dị ka ihe atụ, o kwuru ụfọdụ ihe kacha eme ka mmadụ kwaa iko. Ha bụ ịchụ nwaanyị ma ọ bụ nwoke na ile ndị gba ọtọ. Otu nwoke aha ya bụ Samuel kwuru, sị: “Ịchụ nwaanyị anaghị esiri m ike. Mgbe ụfọdụ, e nwee nwaanyị ihe ya na-anaghị amasị m, mana mụ achọpụta na ihe m na-amasị ya, ịchụ ya atọwa m ụtọ.” Samuel chọpụtara na ndị mmadụ na-ekwukarị na ọ na-achụ nwaanyị, ma mgbe ọ na-ebughị n’obi ịchụ nwaanyị. Ihe a meziri ka o kpebie na ya ga na-achụ nwaanyị. Ma, omume a nyere ya nsogbu n’obi. O mechara kwuo, sị: “Omume ahụ nwere ike itinye mmadụ ná nsogbu n’ihi na ọ na-eme ka mmadụ na-eme ihe na-achọghị ịma otú ihe ọ na-eme ga-esi emetụta ndị ọzọ.”

Samuel gụrụ otu akwụkwọ e dere maka ndị na-eto eto n’adres Ịntanet bụ́ jw.org. O chebakwaara ihe e kwuru n’Ilu 20:11 echiche. Ebe ahụ sịrị: “Nwatakịrị na-esi n’omume ya eme ka a mata onye ọ bụ, ma ihe ọ na-eme ọ̀ dị ọcha, ziekwa ezi.” Olee otú amaokwu Baịbụl a si nyere ya aka? Samuel ghọtara na ịchụ nwaanyị bụ omume na-adịghị ọcha, o zighịkwa ezi. O kwuru, sị: “M mụtakwara na onye na-achụ nwaanyị ma ọ bụ nwoke na-amụta àgwà ndị ga-eme ka ọ ghara ịbụ ezigbo di ma ọ bụ ezigbo nwaanyị. M bidoro chewe otú obi ga-adị nwaanyị m ga-alụ ma ọ hụ na m na-achụ nwaanyị. Ọ bụ ihe a mere m ji mata na omume a nwere ike itinye mmadụ ná nsogbu. Ọ bụ eziokwu na ịchụ nwaanyị na-adịrị m mfe, ma o meghị ka ọ bụrụ ihe ọma.” Samuel kwụsịrị ịchụ nwaanyị. O meekwala ka o zere ịkwa iko.

E nwere otu nwoke aha ya bụ Antonio. Ile ndị gba ọtọ gaara eme ka ọ kwaa iko ma banye n’ezigbo nsogbu. Ile ndị gba ọtọ riri ya isi. Ọ bụ eziokwu na ọ lụọla nwaanyị, hụkwa nwaanyị ya n’anya, ọ na-ele ndị gba ọtọ ọtụtụ mgbe. Ma, ọ sịrị na ichebara ihe e dere na 1 Pita 5:8 echiche nyeere ya ezigbo aka. Ebe ahụ sịrị: “Nweenụ uche ziri ezi, na-echenụ nche. Onye mmegide unu, bụ́ Ekwensu, na-ejegharị dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.” Antonio kwuru, sị: “Foto ndị gba ọtọ juru ebe niile n’ụwa taa, ọ na-esikwa ike ya apụọ mmadụ n’obi ma o lee ya. N’eziokwu amaokwu Baịbụl ahụ nyeere m ezigbo aka iche banyere onye na-eji foto ndị ahụ anwa mmadụ. M mụtara na m kwesịrị icheta ozugbo m hụrụ foto ndị ahụ na ọ bụ Ekwensu ka ha si n’aka. Ugbu a, achọpụtala m na ọ bụ naanị Jehova ga-enyeliri m aka ‘inwe uche ziri ezi, ma na-eche nche’ iji nwee ike ịlụso ihe ndị ahụ na-emerụ uche m na obi m ma na-akpa alụmdi na nwunye anyị aka ọjọọ, ọgụ.” E nyeere Antonio aka, ya emechaakwa kwụsị omume ọjọọ ahụ. Ihe a nyekwaara ya aka izere nsogbu ndị ka njọ ọ gaara adaba na ha.

N’eziokwu, Baịbụl kwuru ihe ndị bara uru nwere ike inyere anyị aka izere ịba n’ezigbo nsogbu. Ma, ọ̀ bụrụkwanụ na e nwere nsogbu marala mmadụ ahụ́, ya ana-esikwara ya ike ịpụta na ya? Ka anyị lee otú Okwu Chineke nwere ike isi nyere anyị aka ịkwụsị ụdị nsogbu ahụ.

Ihe Baịbụl kwuru ga-enyeliri anyị aka izere nsogbu ụfọdụ