Levitikọs 12:1-8
-
Ihe nwaanyị ga-eme ka ọ dị ọcha ma ọ mụchaa nwa (1-8)
12 Jehova wee gwa Mosis, sị:
2 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Ọ bụrụ na nwaanyị adị ime ma mụọ nwa nwoke, nwaanyị ahụ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị asaa, otú ọ na-abụ onye na-adịghị ọcha mgbe ọ na-ahụ nsọ ya.+
3 N’ụbọchị nke asatọ, a ga-ebi nwa nwoke ahụ úgwù.+
4 Nwaanyị ahụ ka ga na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha ruo ụbọchị iri atọ na atọ na-esonụ n’ihi ọbara gbara ya. Ọ gaghị emetụ ihe ọ bụla dị nsọ aka. Ọ gaghịkwa abata n’ebe dị nsọ ruo mgbe ụbọchị ole o ji eme onwe ya ka ọ dị ọcha zuru.
5 “‘Ọ bụrụ na ọ mụrụ nwa nwaanyị, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị iri na anọ, otú ọ na-abụ onye na-adịghị ọcha mgbe ọ na-ahụ nsọ ya. Ọ ka ga na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha ruo ụbọchị iri isii na isii na-esonụ n’ihi ọbara gbara ya.
6 Mgbe ụbọchị ole o ji eme onwe ya ka ọ dị ọcha maka nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwaanyị ọ mụrụ zuru, ọ ga-akpụta ebule na-agafebeghị otu afọ ka e jiri chụọ àjà a na-esu ọkụ.+ Ọ ga-anwụtakwa nwa kpalakwukwu ma ọ bụ otu nduru ka e jiri chụọ àjà mmehie. Ọ ga-ewetara ha onye nchụàjà n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.
7 Onye nchụàjà ga-eweta ha n’ihu Jehova ma kpuchiere nwaanyị ahụ mmehie ya. Ọ ga-adịkwa ọcha n’ọbara gbara ya. Ihe a bụ iwu nwaanyị mụrụ nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwaanyị ga-edebe.
8 Ma ọ bụrụ na ọ gaghị ewetali atụrụ, ọ ga-anwụta nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ.+ A ga-eji otu chụọ àjà a na-esu ọkụ, jiri otu chụọ àjà mmehie. Onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie ya, ọ ga-adịkwa ọcha.