Ọnụ Ọgụgụ 19:1-22
-
Ehi na-acha ọbara ọbara na mmiri e ji eme ka ihe dị ọcha (1-22)
19 Jehova gwakwara Mosis na Erọn, sị:
2 “Ihe a bụ iwu Jehova nyere: ‘Gwa ndị Izrel ka ha kpụtara gị nne ehi ahụ́ dị mma, nke na-acha ọbara ọbara, nke na-enweghịkwa nkwarụ ọ bụla,+ nke a na-anyakwasịtụbeghị yok.
3 Unu ga-akpụnye ya Elieza onye nchụàjà. Ọ ga-esi n’ebe unu mara ụlọikwuu kpụpụ ya, a ga-egbukwa ya n’ihu ya.
4 Elieza onye nchụàjà ga-ejizi mkpịsị aka ya rụrụtụ ọbara nne ehi ahụ ma fesa ọbara ya n’ihu ụlọikwuu nzute.+ Ọ ga-eme ya ugboro asaa.
5 A ga-akpọzi nne ehi ahụ ọkụ n’ihu ya. A ga-akpọ akpụkpọ ya na anụ ya na ọbara ya na nsị ya ọkụ.+
6 Onye nchụàjà ga-ewere osisi sida, ahịhịa hisop,+ na ákwà na-acha uhie uhie ma tụba ha n’ọkụ ahụ na-ere nne ehi ahụ.
7 Onye nchụàjà ga-ejizi mmiri sụọ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. E mechaa, ọ ga-abata n’ebe unu mara ụlọikwuu. Ma onye nchụàjà ahụ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.
8 “‘Onye kpọrọ nne ehi ahụ ọkụ ga-asa uwe ya mmiri, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.
9 “‘Nwoke dị ọcha ga-esi n’ebe unu mara ụlọikwuu kporo ntụ nne ehi ahụ+ pụọ gaa kposa n’ebe dị ọcha. Nzukọ Izrel ga-edosa ya ka e jiri ya na-akwadebe mmiri e ji eme ka ihe dị ọcha.+ Ọ bụ àjà mmehie.
10 Onye kpokọtara ntụ nne ehi ahụ ga-asa uwe ya. Ọ ga-abụkwa onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.
“‘Ọ ga-abụrụ ndị Izrel na onye mbịarambịa binyeere ha iwu ga-adịgide adịgide.+
11 Onye ọ bụla nke metụrụ onye ọ bụla nwụrụ anwụ* aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị asaa.+
12 Onye ahụ ga-eji mmiri ahụ mee onwe ya ka ọ dị ọcha n’ụbọchị nke atọ. Ọ ga-adịkwa ọcha n’ụbọchị nke asaa. Ma ọ bụrụ na o meghị onwe ya ka ọ dị ọcha n’ụbọchị nke atọ, ọ gaghị adị ọcha n’ụbọchị nke asaa.
13 Onye ọ bụla nke metụrụ ozu onye nwụrụ anwụ aka ma ghara ime onwe ya ka ọ dị ọcha emerụọla ụlọikwuu Jehova.+ A ga-egbu ya.*+ Ebe ọ bụ na e fesaghị ya mmiri e ji eme ka ihe dị ọcha,+ ọ ka ga-abụ onye na-adịghị ọcha.
14 “‘Ihe a bụ iwu a ga-edebe ma ọ bụrụ na mmadụ anwụọ n’ime ụlọikwuu: Onye ọ bụla batara n’ụlọikwuu ahụ na onye ọ bụla nọ n’ụlọikwuu ahụ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị asaa.
15 Arịa ọ bụla ghe oghe, nke a na-ekwuchighị ekwuchi ma jiri eriri kechie ya, ga-abụ ihe na-adịghị ọcha.+
16 Onye ọ bụla nke nọ n’èzí metụ onye e ji mma agha gbuo aka ma ọ bụ metụ ozu onye nwụụrụ onwe ya aka ma ọ bụ metụ ọkpụkpụ mmadụ ma ọ bụ ili aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị asaa.+
17 Ha ga-ekporotụ ntụ anụ ahụ a kpọrọ ọkụ e ji chụọ àjà mmehie ka e jiri ya mee ka onye ahụ na-adịghị ọcha dị ọcha. A ga-ekponyetụ ntụ ahụ n’efere ma wụnye ya mmiri e kutere n’iyi.
18 Nwoke dị ọcha+ ga-ewerezi ahịhịa hisop,+ sụnye ya n’ime mmiri ahụ ma fesa ya n’ụlọikwuu ahụ nakwa n’arịa niile dị n’ime ya, fesakwa ya ndị* nọ n’ebe ahụ. Ọ ga-efesakwa ya onye ahụ metụrụ ọkpụkpụ ma ọ bụ onye e gburu egbu ma ọ bụ ozu onye nwụụrụ onwe ya ma ọ bụ ili aka.
19 Onye ahụ dị ọcha ga-efesa ya n’ahụ́ onye ahụ na-adịghị ọcha n’ụbọchị nke atọ nakwa n’ụbọchị nke asaa. Ọ ga-eme ka ọ dị ọcha* n’ụbọchị nke asaa.+ Onye ahụ na-adịghị ọcha ga-asụzi uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-adịkwa ọcha ná mgbede.
20 “‘Ma onye na-adịghị ọcha, nke na-emeghị onwe ya ka ọ dị ọcha, a ga-egbu ya*+ n’ihi na o merụọla ebe nsọ Jehova. E fesaghị ya mmiri e ji eme ka ihe dị ọcha. N’ihi ya, ọ dịghị ọcha.
21 “‘Ihe a ga-abụrụ ha iwu ga-adịgide adịgide: Onye na-efesa mmiri e ji eme ka ihe dị ọcha+ ga-asụ uwe ya. Onye metụkwara mmiri e ji eme ka ihe dị ọcha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.
22 Ihe ọ bụla onye ahụ na-adịghị ọcha metụrụ aka ga-abụ ihe na-adịghị ọcha. Onye* metụkwara ihe ahụ aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.’”+

