Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE BAỊBỤL KWURU

Ịda Mbà

Ịda Mbà

Gịnị bụ ịda mbà?

“Obi erukwaghị m ala, adawo m mbà nke ukwuu; ejegharịwo m ná mwute ogologo ụbọchị dum.”Abụ Ọma 38:6.

IHE NDỊ ỌKACHAMARA KWURU

Ọ bụghị mgbe niile ka obi na-adị onye ọ bụla n’ime anyị mma. Ma, e nwere ndị obi na-ajọgide njọ nke na ha anaghị enwe ike eme ihe ọ bụla. Ụdị nke ahụ bụ ọrịa. Ma, ihe otu ọkachamara kpọrọ obi ịjọ njọ, ọkachamara ọzọ nwere ike ịkpọ ya ọrịa. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-ada mbà, ya adị ha ka ha abaghị uru ma ọ bụkwanụ obi ha ana-ama ha ikpe maka ihe ha mere.

IHE BAỊBỤL KWURU

E nwere ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị Baịbụl kwuru na e nwere oge ha dara mbà. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe ihe wutere Hana ná mkpụrụ obi. Otú ọzọ e nwere ike isi kwuo ya bụ na obi tịwara ya. (1 Samuel 1:10) E nwekwara mgbe Ịlaịja dara mbà nke na ọ gwara Chineke ka o wepụ ndụ ya.—1 Ndị Eze 19:4.

Pọl gwara Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka n’oge ochie ka ha ‘na-agụgụ mkpụrụ obi dara mbà.’ (1 Ndị Tesalonaịka 5:14) Otu akwụkwọ kwuru na “mkpụrụ obi dara mbà” nwere ike ịpụta ndị “nsogbu ụwa mere ka ike gwụ ha.” O doro anya na e nwere mgbe ụfọdụ ndị fere Chineke n’oge ochie dara mbà.

Gịnị mere anyị ji ada mbà?

“Ihe niile e kere eke na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu ruo ugbu a.” —Ndị Rom 8:22.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru na anyị na-arịa ọrịa n’ihi na Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi. Dị ka ihe atụ, n’Abụ Ọma 51:5, Devid kwuru, sị: “Ebu m njehie pụta mgbe a mụpụtara m site n’ihe mgbu, abụ m onye mmehie malite mgbe nne m tụụrụ ime m.” Ndị Rom 5:12 kwukwara na “mmehie si n’aka otu mmadụ [ya bụ Adam] bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.” Anyị niile na-arịa ọrịa n’ihi na anyị ketara mmehie n’aka Adam. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị na “ihe niile e kere eke na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu.” (Ndị Rom 8:22) Ma, obi dị anyị ụtọ na Baịbụl kwuru na Chineke kwere nkwa na ya ga-eme ka ụwa ghọọ Paradaịs. N’oge ahụ, e nweghị onye ga-arịakwa ụdị ọrịa ọ bụla, e nweghịkwa onye ga-ada mbà. E nweghị dọkịta ga-ekweli anyị ụdị nkwa a.—Mkpughe 21:4.

Gịnị ka i nwere ike ime ma ị daa mbà?

“Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.” —Abụ Ọma 34:18.

IHE MERE O JI GBASA GỊ

Ihe na-adịghị mma nwere ike ịdabara anyị mgbe ụfọdụ. Ọ bụghịkwa ha niile ka anyị ga-emeli ihe ọ bụla banyere ha. (Ekliziastis 9:11, 12) Ma, o nwere ihe ndị i nwere ike ime ka obi malite ịdị gị ụtọ mgbe ị dara mbà.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru na ndị ahụ́ na-adịghị kwesịrị ịga hụ dọkịta. (Luk 5:31) N’ihi ya, i nwere ike ịga hụ dọkịta ma ọ bụrụ na obi na-ajọ gị njọ nke na o nweghị ihe ị na-emeli. Baịbụl kwukwara na ekpere bara ezigbo uru. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 55:22 kwuru, sị: “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị. Ọ dịghị mgbe ọ ga-ekwe ka onye ezi omume maa jijiji.” Ihe mere ị ga-eji kpee ekpere abụghị ka obi dị gị mma. Chetakwa na ekpere bụ otú anyị si agwa Jehova Chineke ihe dị anyị n’obi. Baịbụl kwukwara na “Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso.”—Abụ Ọma 34:18.

I nwekwara ike ịkọrọ ezigbo enyi gị otú obi dị gị mgbe ọ bụla ị dara mbà. (Ilu 17:17) Otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ Daniela kwuru, sị: “Mgbe obi na-ajọ m njọ, e nwere otu ụbọchị otu nwanna rịọrọ m ka m gwa ya ihe na-eme m. Kemgbe ọtụtụ afọ, anaghị m akọrọ onye ọ bụla banyere nsogbu m. Ma, mgbe m kọchaara nwanna ahụ nsogbu m, obi bịara ruo m ala.”