Samuel nke Mbụ 1:1-28

  • Elkena na ndị nwunye ya abụọ (1-8)

  • Mgbe Hana na-amụtabeghị nwa, o kpere ekpere ka ọ mụta nwa nwoke (9-18)

  • Hana mụrụ Samuel, nyekwa ya Jehova (19-28)

1  E nwere otu nwoke onye Ramateyim-zofim*+ n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu.+ Aha ya bụ Elkena.+ Ọ bụ nwa Jeroham, nwa Elaịhu, nwa Tohu, nwa Zọf, onye Ifrem.  Ọ lụrụ ụmụ nwaanyị abụọ. Aha otu bụ Hana, aha nke ọzọ abụrụ Penina. Penina mụrụ ụmụ, ma Hana amụtaghị nwa ọ bụla.  Nwoke ahụ na-esi n’obodo ya aga Shaịlo kwa afọ ife Jehova nke ụsụụ ndị agha na ịchụrụ ya àjà.+ Ụmụ Ịlaị ndị nwoke abụọ, bụ́ ndị nchụàjà Jehova,+ nọkwa ebe ahụ. Aha ha bụ Họfnaị na Finihas.+  Otu ụbọchị, mgbe Elkena chụrụ àjà, o kenyere Penina nwunye ya na ụmụ ya ndị nwoke niile na ụmụ ya ndị nwaanyị niile òkè.+  Ma, o kenyere Hana òkè pụrụ iche, n’ihi na ọ bụ ya ka ọ hụrụ n’anya. Ma, Jehova enyebeghị ya nwa.*  Nwunye di ya nọkwa na-akwa ya emo mgbe niile iji kpasuo ya iwe n’ihi na Jehova enyebeghị ya nwa.  Ihe a ka ọ na-eme n’afọ ọ bụla. Mgbe ọ bụla Hana gara n’ụlọ Jehova,+ nwunye di ya na-akwa ya ezigbo emo, nke na-eme ka ọ na-ebe ákwá, gharakwa iri nri.  Ma Elkena di ya sịrị ya: “Hana, gịnị mere i ji na-ebe ákwá? Gịnịkwa mere na ị naghị eri nri? Gịnị mere na obi adịghị gị mma?* Ọ̀ bụ na mụ abaraghị gị uru karịa ụmụ ndị nwoke iri?”  Mgbe ha richara nri, ṅụchaakwa mmanya na Shaịlo, Hana biliri. Ịlaị onye nchụàjà nọ ọdụ mgbe ahụ n’oche dị n’akụkụ ụzọ n’ụlọ nsọ*+ Jehova. 10  Obi jọrọ Hana ezigbo njọ, ya amalite ịrịọ Jehova arịrịọ,+ na-ebekwa ezigbo ákwá. 11  O kwekwara Chineke nkwa, sị: “Jehova nke ụsụụ ndị agha, ọ bụrụ na ị hụ ahụ́ a na-emekpa mụnwa bụ́ ohu gị ma cheta m, gharakwa ichefu ohu gị ma nye ohu gị nwa nwoke,+ m ga-enye gị ya, Jehova, ka o jiri ndụ ya niile jeere gị ozi. Agụba agaghịkwa emetụ ya n’isi.”+ 12  Ọ rịọtere Jehova arịrịọ aka. Ka ọ nọ na-arịọ ya, Ịlaị nọ na-ele ya anya n’ọnụ. 13  Hana nọ na-ekwu okwu n’ime obi ya. Naanị egbugbere ọnụ ya na-emegharị emegharị. A naghịkwa anụ olu ya. N’ihi ya, Ịlaị chere na mmanya na-egbu ya. 14  Ịlaị wee sị ya: “Gịnị mere i ji aṅụ oké mmanya? Kwụsị mmanya a ị na-aṅụ.” 15  Hana asị ya: “Onyenwe m, ọ bụghị na mmanya na-egbu m. O nwere ihe na-enye m ezigbo nsogbu n’obi. Aṅụghị m mmanya ma ọ bụ ihe ọ bụla na-aba n’anya. M nọ na-agwa Jehova otú ọ dị m n’obi.+ 16  Echela na ohu gị bụ nwaanyị na-abaghị uru ọ bụla. Ihe mere m ji na-ekpe ekpere kemgbe bụ na e nwere ihe na-agbawa m obi na ihe na-echegbu m.” 17  Ịlaị wee sị ya: “Laa n’udo, ka Chineke Izrel meekwara gị ihe ị rịọrọ ya.”+ 18  Ya asị ya: “Ka ihe mụnwa bụ́ ohu gị na-amasị gị.” Nwaanyị ahụ wee laa ma riwe ihe. Ihu ya agbarụghịkwa agbarụ ọzọ. 19  Elkena na ezinụlọ ya wee bilie n’isi ụtụtụ, kpọọrọ Jehova isiala. Mgbe ha mechara, ha laghachiri n’ụlọ ha na Rema.+ Elkena na Hana nwunye ya wee nwee mmekọahụ, Jehova echetakwa Hana.+ 20  N’ime otu afọ,* Hana bịara dị ime, mụọ nwa nwoke. Ọ gụrụ+ ya Samuel,* n’ihi na ọ sịrị, “M rịọtara ya Jehova.” 21  Ka oge na-aga, Elkena kpọọrọ ezinụlọ ya niile gaa ịchụrụ Jehova àjà a na-achụ n’afọ ọ bụla+ nakwa inye onyinye o kwere ná nkwa. 22  Ma Hana agaghị.+ Ọ gwara di ya, sị: “Agaghị m aga ugbu a. M kwụsị nwa a ara, m ga-akpọgara ya Jehova n’ụlọ ya. Ọ ga-ebikwa ebe ahụ.”+ 23  Elkena di ya asị ya: “Mee ihe dị mma n’anya gị. Nọrọ n’ụlọ ruo mgbe ị kwụsịrị ya ara. Ka Jehova nye aka ka ihe a i kwuru mee.” Nwaanyị ahụ wee nọrọ n’ụlọ na-enye nwa ya ara ruo mgbe ọ kwụsịrị ya ara. 24  Ozugbo ọ kwụsịrị ya ara, ọ kpọọrọ ya gawa Shaịlo. Ọ kpụkwa oké ehi dị afọ atọ, buru otu efa* ntụ ọka* na nnukwu ite mmanya.+ Mgbe o rutere Shaịlo,+ ọ kpọ nwa ya nwoke ahụ gaa n’ụlọ Jehova. 25  Ha wee gbuo oké ehi ahụ ma kpọtara Ịlaị nwa ahụ. 26  Hana wee sị ya: “Onyenwe m, ewela iwe. N’eziokwu, onyenwe m, ọ bụ m bụ nwaanyị ahụ gị na ya guzo ebe a, ya ana-arịọ Jehova arịrịọ.+ 27  Ọ bụ nwa a ka m nọ na-arịọ Jehova ka o nye m, ya enye m ya.+ 28  Ma ugbu a, m na-enye* ya Jehova. Ná ndụ ya niile, ọ bụ nke Jehova.” Elkena wee kpọọrọ Jehova isiala n’ebe ahụ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “onye Rema, onye si n’ezinụlọ Zọf.”
Na Hibru, “mechiri akpa nwa ya.”
Ma ọ bụ “Gịnị mere obi ji na-ajọ gị njọ?”
Ya bụ, n’ụlọikwuu.
O nwere ike ịbụ, “Ka oge na-aga.”
Samuel pụtara “Aha Chineke.”
Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu efa bụ ihe dị ka lita 22. Gụọ B14.
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Na Hibru, “na-agbazinye.”