Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere O Ji Dị Mma Ka Anyị Na-aja Ndị Ọzọ Mma?

Gịnị Mere O Ji Dị Mma Ka Anyị Na-aja Ndị Ọzọ Mma?

Echiche Baịbụl

Gịnị Mere O Ji Dị Mma Ka Anyị Na-aja Ndị Ọzọ Mma?

ỌTỤTỤ ndị na-eche na o nweghị ihe ha mere na-adị ndị ọzọ mma. Dị ka ihe atụ, ndị ọrụ na-ekwukarị na ndị ha na-arụrụ ọrụ enweghị ihe ha ji ha kpọrọ. Ọtụtụ ndị na-ekwu na o nweghị ihe ha bụ n’anya di ha ma ọ bụ nwunye ha. Ụmụaka ụfọdụ na-ekwukwa na o nweghị ihe ha mere mete papa ha na mama ha mma. Nke bụ́ eziokwu bụ na a sị na anyị niile na-agba mbọ na-aja ibe anyị mma, o nweghị onye ga na-ekwu ụdị ihe a ndị a na-ekwu.

N’ụwa anyị a taa, tupu ị hụ onye jara ibe ya mma, ọ na-adị ka ihe e siri n’ọkụ. Ọ naghị eju anyị anya n’ihi na Baịbụl kwuru na “n’oge ikpeazụ, a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ.” O kwukwara, sị: “Ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, . . . ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe.”—2 Timoti 3:1, 2.

Ò nwetụla mgbe mmadụ ji obi ya niile jaa gị mma? Ọ bụrụ na o nwetụla, ì chetara otú obi dị gị ụbọchị ahụ? Baịbụl sị na okwu e kwuru n’oge ya dị mma. (Ilu 15:23) Akwụkwọ Nsọ ga-enyere anyị aka ịmụta otú anyị ga-esi jiri obiọma na-emeso mmadụ ibe anyị ihe.

Lekwasị Anya n’Ebe Ndị Mmadụ Na-emezi Emezi

Chineke hụrụ anyị n’anya, ọ na-ahụkwa ebe anyị na-emezi emezi. Anyị mee nke ọma, obi na-atọ ya ụtọ. Baịbụl kwuru, sị: “Anya Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.” (2 Ihe E Mere 16:9) Ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke n’anya, anyị ga na-erubere ya isi, ọ ga-amakwa na anyị na-erubere ya isi.

Jehova anaghị eburu onyokomita na-achọ ebe anyị na-anaghị emezi emezi. Ya mewe otú ahụ, o nweghị onye n’ime anyị ga-eguzoli. (Abụ Ọma 130:3) Kama Jehova yiri onye na-egwu dayamọnd nke na-egwupụta ma nkume ma dayamọnd. Ya gwupụtachaa ha, ya ejiri nwayọọ na-ahọpụta ndị bụ́ dayamọnd. Ị manụ na obi ga-adị ya ụtọ mgbe ọ bụla ọ chọtara otu mkpụrụ dayamọnd. Ọ sọkwa dayamọnd ahụ ya jọọ njọ n’anya, ọ gaghị ahapụ ya n’ihi na ọ ma uru ọ ga-abara ya. Otú ahụkwa ka Chineke na-eme. Ihe mere o ji enyocha obi anyị abụghị ka ọ hụchata ebe anyị na-anaghị emezi emezi, kama ka ọ hụ ebe anyị na-emezi emezi. Ya hụ ya, obi atọọ ya ụtọ. Ọ ma na ọ bụrụ na anyị anọgide na-eme otú ahụ, anyị ga-abụ ndị ezigbo mmadụ, ndị ji ofufe ya kpọrọ ihe.

Anyị kwesịrị ịna-eme otú ahụ Chineke si eme. Anyị na ndị mmadụ nọrọ, o nwere ike ịbụ ebe ndị ha na-anaghị eme nke ọma ka anyị ga na-ahụ. Ma, ọ bụrụ na anyị na-ele ndị mmadụ anya otú Jehova si ele ha, anyị ga-achọpụta ebe ndị ha na-emezi emezi. (Abụ Ọma 103:8-11, 17, 18) Anyị chọpụta ya, anyị kwesịrị ịja ha mma. Olee otú i chere obi ga-adị ha ma anyị mee otú ahụ? Obi ga-adị ha ụtọ, ha nwedịrị ike gbaa mbọ na-emekwu nke ọma. Obi ga-adịkwa anyịnwa ụtọ n’ihi na Baịbụl kwuru na mmadụ na-aka enweta obi ụtọ ma o nye mmadụ ibe ya ihe.—Ọrụ Ndịozi 20:35.

Mmadụ Mee Ihe Dị Mma, Jaa Ya Mma

Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, ọ na-abụ ndị mmadụ mee ihe dị mma, ya ajaa ha mma. O nwere ụbọchị otu nwaanyị na-arịa ọrịa ji nnọọ akọ gaa metụ Jizọs aka n’efe. Nwaanyị ahụ ma na ọ bụrụ na ya emetụ efe ahụ aka, ọrịa ya ga-ala. Mgbe o metụrụ ya aka, Jizọs jara ya mma, sị ya: “Nwa m nwaanyị, okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma.”—Mak 5:34.

O nwekwara ụbọchị Jizọs nọ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem na-akụzi ihe. Ka ọ nọ na-ele ihe na-emenụ, ọ hụrụ ọtụtụ ndị ọgaranya ka ha na-atụnye ego n’igbe a na-atụnye ego. Ọ hụkwara otu nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye ka ọ bịara tụnye obere mkpụrụ ego abụọ ga-azụtali obere ihe. Ọ bụ eziokwu na ego ahụ nwaanyị ahụ tinyere n’igbe ahụ enweghị otú ọ hà ma e jiri ya tụnyere nke ndị ọgaranya ahụ, Jizọs jara ya mma n’ihu ọha. Ọ gwara ndị nọ ebe ahụ, sị: “N’eziokwu, ana m asị unu, ọ bụ ezie na nwaanyị a di ya nwụrụ dara ogbenye, ọ tụnyere ihe karịa ihe ha niile tụnyere. N’ihi na ndị a niile tụnyere onyinye site n’ọtụtụ ihe ha nwere, ma nwaanyị a tụnyere ihe niile o nwere o ji ebi ndụ, n’agbanyeghị na ọ nọ n’ụkọ.”—Luk 21:1-4.

Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Jizọs? Baịbụl kwuru, sị: “Ajụla imere ha ihe ọma bụ́ ndị e kwesịrị imere ya, mgbe ọ dị n’ike aka gị ime ya.”—Ilu 3:27.

Ịja Mma Bara Ezigbo Uru

Ụmụ mmadụ anaghị aja ibe ha mma n’ụwa anyị a. Ma, o nweghị onye n’ime anyị chọrọ ka a kpọọ ya asị ma ọ bụkwanụ leghara ya anya. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị dum na-aja ndị ọzọ mma, obi ga na-adị ha ụtọ. Mma anyị na-aja ha ga-emekwa ka ha na-agbakwu mbọ na-eme ihe dị mma.—Ilu 31:28, 29.

Baịbụl gwara Ndị Kraịst niile ka ha ‘na-echebara ibe ha echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.’ (Ndị Hibru 10:24) Ụwa anyị a agaraghị adị otú a ọ dị ma a sị na anyị hụrụ ibe anyị n’anya ma jiri mmadụ niile kpọrọ ihe. A sịkwa na anyị na-elekwasị anya n’ebe ndị mmadụ na-emezi emezi ma na-aja ha mma, ụwa a gaara amagbu onwe ya. N’eziokwu, ịja mma bara ezigbo uru.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Olee ihe mere o ji dị mma ka anyị na-aja ndị mmadụ mma ma ha mee ihe dị mma?—Ilu 15:23.

● Gịnị ka Jehova kwo enyocha obi anyị?—2 Ihe E Mere 16:9.

● Olee mgbe anyị kwesịrị ịja ndị ọzọ mma?—Ilu 3:27.

[Foto dị na peeji nke 29]

Ị̀ na-elekwasị anya n’ebe ndị mmadụ na-emezi emezi? Ị̀ na-aja ha mma ma ha mee ihe dị mma?