Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Isi Ọmụmụ Ihe A M Na-aga?

Olee Isi Ọmụmụ Ihe A M Na-aga?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị

Olee Isi Ọmụmụ Ihe A M Na-aga?

Ịga ọmụmụ ihe ọ̀ na-atọ gị ụtọ?

EE

Ya bụrụ otú ahụ, jide nke i ji

MBA

Oleenụ ihe ị ga-eme ka ọ tọwa gị ụtọ?

BAỊBỤL gwara Ndị Kraịst ka ha na-ezukọta, na-amụ Okwu Chineke. (Ndị Hibru 10:25) Ma, oleekwanụ ihe mmadụ ga-eme ma ọ bụrụ na ịga ọmụmụ ihe ahụ anaghị atọ ya ụtọ? Ọ bụrụ na ọ na-abụ ị nọrọ n’ọmụmụ ihe, ya adị gị ka ọ̀ gaara akara gị mma iji oge ahụ nọrọ ebe ọzọ na-eme ihe ọzọ, gịnị ka ị ga-eme? E nwere aro ndị anyị ga-atụrụ gị ugbu a, gbalịa lee ma ị̀ ga-eme ha.

1. NA-AGACHI YA ANYA

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị, dị ka ụfọdụ ndị na-emekarị.”—Ndị Hibru 10:25.

Olee ihe mere ị ga-eji na-agachi ihe na-anaghị atọ gị ụtọ anya? Ọ bụ maka na ime otú ahụ ga-eme ka ọ tọwa gị ụtọ. Weregodị ya na ị na-agba bọl. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịma agba bọl nke ọma, chọọkwa ka ọ na-atọ gị ụtọ, ị ga na-aga amụ ya ụbọchị ọ bụla a na-akụzi ya. Ọ bụ otu ihe ahụ ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka ọmụmụ ihe na-atọ gị ụtọ. Ka ị na-aga ya ka okwukwe i nwere na Chineke ga na-esikwu ike. Ọ bụzi ya ga-eme ka ị na-agba mbọ na-agachi ya anya.—Matiu 5:3.

Ihe ị ga-eme bụ: A gbasaa ọmụmụ ihe n’ụbọchị ọ bụla, gbalịa gakwuru otu n’ime ndị kwuru okwu, gwa ya ihe tọrọ gị ụtọ n’okwu o kwuru. Jiri akwụkwọ dee otu ihe ị mụtara n’ọmụmụ ihe ụbọchị ahụ. Ebe ọ bụ na ihe a na-amụkarị n’ọmụmụ ihe bụ otú anyị ga-esi na-akụziri ndị mmadụ Okwu Chineke, gbalịa mụta otú ka mma ị ga-esi na-akọwara mmadụ ihe ị mụtara na Baịbụl. Ị na-eme otú ahụ, ị ga-ahụ na ihe ndị a na-amụ n’ọmụmụ ihe ga na-abara gị ezigbote uru.

Nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Kelsey kwuru, sị: “Papa m na mama m kụziiri m na Onye Kraịst kwesịrị iji ịga ọmụmụ ihe kpọrọ ihe. Mgbe m bụ nwata, anaghị m anọkata hapụ ịga ọmụmụ ihe. Ọ marala m ahụ́.”

Nke bụ́ eziokwu bụ: Ọmụmụ ihe na-aka atọ ndị na-agachi ya anya ụtọ. Ọ bụ ha na-akakwa erite uru.

2. NA-EGE NTỊ

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: ‘Kpachara anya otu i si ege ntị.’—Luk 8:18, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Ndị na-eme nchọpụta kwuru na ọ bụrụ na mmadụ agaa igere okwu, e kwuchaa okwu ahụ, ọ ga-echefu ihe karịrị ọkara ihe e kwuru. Ọ bụrụ otú ahụ ka ego gị si efunahụ gị, ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ihe ị ga-eme ka ọ ghara ịna-efu?

Ihe ị ga-eme bụ: Gị na papa gị na mama gị nọrọ n’oche ihu ma unu gaa ọmụmụ ihe. Ọ ga-eme ka uche gị dịrị n’ihe a na-ekwu. Detuo ụfọdụ ihe ndị e kwuru. Ọ bụ eziokwu na onye ọ bụla nwere otú o si eme ka uche ya dịrị n’ihe a na-amụ, idetu ihe ga-eme ka ị na-ele onye na-ekwu okwu anya. I mechaa lebawa anya n’ihe ndị i deturu, ị ga-aka aghọta ha nke ọma.

Nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Kathleen kwuru, sị: “Ọ naara esiri m ike ige ntị ma m gaa ọmụmụ ihe, ma ọ naghịzi adị m otú ahụ. M gaa ọmụmụ ihe, m na-eburu n’obi ihe mere m ji bịa. Anaghị m aga ya ka a sịkwa. Ihe m kwo aga bụ ka m mụta otú m ga-esi na-eme ihe Chineke chọrọ, ka o wee nabata ofufe m na-efe ya.”

Nke bụ́ eziokwu bụ: Ọ bụrụ na mmadụ gara ọmụmụ ihe ghara ige ntị n’ihe a na-amụ, ọ dị ka onye gara ebe a kpọrọ oriri gbara ọnụ laa.

3. NA-ETINYE ỌNỤ

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Igwe na-amụcha igwe nkọ, otu a ka mmadụ si amụcha mmadụ ibe ya.”—Ilu 27:17, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

Ọ bụ eziokwu na ị ka na-eto eto, o nwere ezigbote uru ị bara n’ọmụmụ ihe. Echekwala na ma ị̀ bịara ma ị bịaghị, o nweghị ihe o mere. Buru n’obi na ọnụ ị na-etinye mgbe a na-amụ ihe na-abara ndị ọzọ uru. Oge ahụ gị na ndị mmadụ ji ekwurịta okwu tupu ọmụmụ ihe ebido na mgbe a gbasara na-agba ha ume.

Ihe ị ga-eme bụ: Gbalịa hụ na ị zara otu ajụjụ mgbe ọ bụla a na-eme ihe omume nwere ajụjụ na azịza. Soro na-azacha Ụlọ Nzukọ Alaeze ma a gbasaa ọmụmụ ihe, nyekwa aka na-arụ ọrụ ndị ọzọ e nwere. Ị gaa ọmụmụ ihe, gbalịa ka gị na onye gị na ya na-anabughị akpa nkata kpaa nkata.

Otu nwa okorobịa aha ya bụ Miles kwuru, sị: “Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na ise, ndị okenye gwara m ka m na-ewegara ndị chọrọ ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe maịkrofon. Ha gwakwara m ka m na-edozi ikpo okwu. Ọrụ ndị a ha nyere m mere ka m mara na m bara uru, meekwa ka m na-agachi ọmụmụ ihe anya ma na-aga n’oge. Ha mere ka m jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe.”

Nke bụ́ eziokwu bụ: Ọmụmụ ihe na-atọ onye na-etinye ọnụ n’ihe a na-amụ ụtọ karịa onye na-anaghị etinye ọnụ. N’ihi ya, mgbe ọ bụla ị gara ọmụmụ ihe, anọla na-ele n’anya n’anya.

Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”

[Okwu nkọwa dị na peeji nke 13]

BỊA ỌMỤMỤ IHE ANYỊ

Ị̀ ga-achọ

● Ịma ihe Baịbụl na-akụzi gbasara Chineke?

● Ịma ihe ị ga-eme ka ị bụrụ ezigbo mmadụ?

● Ka gị na ndị ezigbo mmadụ bụrụ enyi?

Ọ bụrụ na ị na-abịa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, ị ga-ama ihe a niile. O nwekwara ọtụtụ uru ndị ọzọ ị ga-erite. Anyị na-amụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ugboro abụọ n’izu. Onye ọ bụla chọrọnụ nwere ike bịa soro anyị mụọ ihe, o nweghịkwa ụtụ a ga-ana ya.

Jisie ike bịa. Ụdị ihe ị ga-ahụ ma ị bịa Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị abụghị ụdị ihe ị na-ahụ na chọọchị ndị ọzọ ị gatụrụla. Anyị na-amụsi Baịbụl ike ma anyị gaa ọmụmụ ihe. A na-eji ya akụziri anyị otú anyị ga-esi na-ebi ndụ dị mma.​—Diuterọnọmi 31:12; Aịzaya 48:17.

Nwa okorobịa a aha ya bụ Sai kwuru, sị: “Ụbọchị mbụ m banyere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova, ọ tụrụ m n’anya na o nweghị ihe dị ka Meri a kpụrụ akpụ ebe ahụ. O nweghị onye ọ bụla a na-akpọ pastọ, o nweghịkwa onye buuru efere bịakwute m ka m tụnye ego. Obi dị mmadụ niile ụtọ na m bịara, ahụ́ rukwara m ala. Aghọtara m ihe niile a mụrụ n’ụbọchị ahụ, ọ tọkwara m ụtọ. Mgbe ahụ ka m matara na ahụla m ebe a na-akụzi eziokwu, bụ́kwanụ ihe m na-achọ kemgbe.”

Nwa agbọghọbịa a aha ya bụ Deyanira kwuru, sị: “Adị m afọ iri na anọ mgbe mbụ m gara ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ozugbo ahụ m bịara, mmadụ niile abịa na-ekele m. Obi dị ha niile ụtọ na m bịara, ha chọkwara inyere m aka ka m mata ihe Baịbụl na-akụzi. Otú ahụ ha si mee m ụbọchị mbụ ahụ mere obi ji kaa m ịna-eso ha amụ ihe.”

[Igbe dị na peeji nke 14]

Leruo ihe ndị a ga-amụ n’ọmụmụ ihe nke izu a anya. N’ime ha niile, họrọ nke kacha masị gị. Lezie ihe ị ga-eme:

SI EBE A CHAKAPỤTA YA, MEEKWA IHE A GA-ASỊ GỊ MEE

Tupu ị gawa ọmụmụ ihe ahụ, zaa ajụjụ ndị a a jụrụ gị n’okpuru ebe a.

Gịnị bụ isiokwu a ga-ekwu na nke ahụ kacha masị gị?

․․․․․

Olee ihe ị na-atụ anya ka a kọwaa n’isiokwu ahụ?

․․․․․

kwuchaa okwu ahụ, zaa ajụjụ ndị a a jụrụ gị n’okpuru ebe a.

Gịnị ka ị mụtara n’isiokwu ahụ?

․․․․․

Olee ihe ị ga-achọ ịgwa onye kwuru okwu ahụ na ọ bụ ya kacha tọọ gị ụtọ n’okwu ya?

․․․․․