Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Nwere Ike Inyere Ndị Dị Ndụ Aka?

Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Nwere Ike Inyere Ndị Dị Ndụ Aka?

Echiche Baịbụl

Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Nwere Ike Inyere Ndị Dị Ndụ Aka?

KEMGBE ụwa, ndị mmadụ kweere na onye nwụrụ anwụ nwere ike nyere onye dị ndụ aka. Dị ka ihe atụ, e nwere otu onye Grik na-ede akụkọ ifo n’oge ochie. Aha ya bụ Họma. N’otu akwụkwọ o dere, ọ kọrọ gbasara otu nwoke chọrọ ịlaghachi obodo ya. Ọ sị na nwoke ahụ gara jụọ onye nwụrụ anwụ ase ka o nwee ike ịmata ụzọ ọ ga-esi laa obodo ya.

Ọtụtụ ndị na-eme e nwee ihe gbara ha gharịị, ha agakwuru ndị dibịa afa ka ha jụọrọ ha ndị nwụrụ anwụ ase. Ụfọdụ na-agadị dịnara n’ili ndị nna nna ha ma ọ bụkwanụ chụọrọ ha àjà. Ma, onye nwụrụ anwụ ọ̀ ga-enyeliri onye dị ndụ aka?

O Zuru Ụwa Ọnụ

Ọtụtụ chọọchị a ma ama n’ụwa taa na-akụzi na onye dị ndụ na onye nwụrụ anwụ nwere ike ikwurịta okwu. Otu akwụkwọ okpukpe kwuru na omume a zuru ụwa ọnụ. O kwukwara na otu n’ime ụzọ ndị mmadụ si eme ya bụ ịgakwuru ndị dibịa ka ha jụọrọ ha ndị nwụrụ anwụ ase. Otu akwụkwọ ndị Katọlik kwetara ihe akwụkwọ a kwuru, ọ bụ ya mere o ji sị: “A na-eme ya n’ebe niile n’ụwa, e nwekwara otú dị iche iche e si na-eme ya.” Ka a sịkwa ihe mere ụfọdụ ndị na-aga chọọchị ji na-agakwuru ndị dibịa afa ka ha si n’aka ha jụọ ndị nwụrụ anwụ ase.

Ọ bụ eziokwu na iwu ndị Katọlik kwuru na ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase adịghị mma, akwụkwọ ha kwuru na ọtụtụ ndị chọọchị ha mere ya n’oge ochie. Ma, olee ihe Baịbụl kwuru n’okwu a?

Ì Kwesịrị Ịjụ Onye Nwụrụ Anwụ Ase?

N’oge ochie, Jehova gwara ndị na-efe ya, sị: “A gaghị ahụ n’etiti unu onye ọ bụla nke . . . na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase.” (Diuterọnọmi 18:9-13) Gịnị mere Jehova ji gwa ha emela ụdị ihe ahụ? Ọ bụrụ n’eziokwu na onye dị ndụ na onye nwụrụ anwụ nwere ike ikwurịta okwu, í cheghị na Chineke gaara agwa ndị na-efe ya ka ha na ndị nwụrụ anwụ na-ekwurịta okwu? Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị otú onye dị ndụ na onye nwụrụ anwụ ga-esi kwurịta okwu. Olee otú anyị si mara?

Ị gụọ Baịbụl, ị ga-ahụ ọtụtụ ebe o kwuru na onye nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla. Dị ka ihe atụ, Ekliziastis 9:5 kwuru, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” Abụ Ọma 146:3, 4 kwukwara, sị: “Unu atụkwasịla ndị a ma ama obi, unu atụkwasịkwala nwa nke mmadụ obi, bụ́ onye ọ na-adịghị nzọpụta dị n’aka ya. Mmụọ ya na-apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ, echiche ya na-ala n’iyi.” Onye amụma Chineke aha ya bụ Aịzaya kwuru na onye nwụrụ anwụ “adịghị ndụ.”—Aịzaya 26:14.

Ma, ọtụtụ ndị na-ekwu na ha gakwuuru ndị dibịa afa, ha akpọpụtara ha ndị ha nwụrụ anwụ, ha na ha ekwuo okwu. Ụdị akụkọ ahụ abụghị ihe ọhụrụ, o gosikwara na ọtụtụ ndị na ndị mmụọ na-ekwurịta okwu. Ma, amaokwu Baịbụl ndị ahụ dị na paragraf bu nke a ụzọ gosiri na ọ bụghị ndị nwụrụ anwụ ka ha na ha kwurịtara okwu. Oleezi ndị ha na ha kwurịtara okwu?

Ole Ndị Ka Ha na Ha Kwurịtara Okwu?

Baịbụl kọọrọ anyị na e nwere ndị mmụọ ozi nupụụrụ Chineke isi. O kwukwara na ndị mmụọ ozi a ghọrọ ndị mmụọ ọjọọ. (Jenesis 6:1-5; Jud 6, 7) Ọ bụ ha na-eme ka ndị mmadụ chee na onye nwụọ, ya agaa biri ebe ọzọ. Ka ha nwee ike ime ka ndị mmadụ kweta ụgha a ha na-agha, ha na-apụta jiri olu onye ahụ nwụrụ anwụ gwa ndị dị ndụ okwu. Ndị ha na-agwa okwu ahụ nụ ya, ha echee na ọ bụ ndị ha nwụrụ anwụ na-agwa ha okwu.

O nwere otu akụkọ a kọrọ na Baịbụl gbasara otu eze chiri Izrel. Aha ya bụ Sọl. O nupụụrụ Jehova isi, Chineke ajụ ya. Mgbe o nwere nsogbu, ọ gakwuuru dibịa afa ka ọ kpọpụtara ya onye amụma nwụrụ anwụ aha ya bụ Samuel ka ọ jụọ ya ase. Sọl nụrụ ihe o kwo gaa, ma ọ bụghị Samuel gwara ya ihe ahụ. Mgbe Samuel nọdị ndụ, o kweghị aga ahụ Sọl, ọ kpọkwara ịgakwuru ndị dibịa afa asị. N’ihi ya, ọ bụ mmụọ ọjọọ ziri Sọl ozi ahụ ọ nụrụ. Mmụọ ọjọọ a mere ka à ga-asị na ọ bụ Samuel.—1 Samuel 28:3-20.

Chineke na ndị mmụọ ọjọọ adịghị ná mma, onye na-ajụ ha ase jikwa aka ya na-ekotere onwe ya nsogbu. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gwa anyị, sị: “Unu echigharịkwurula ndị na-agba afa, unu ajụkwala ndị ọrụ ha bụ ịkọ ọdịnihu ase, ka ha ghara ime ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha.” (Levitikọs 19:31) Diuterọnọmi 18:11, 12 kwukwara, sị: “Onye ọ bụla nke na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase . . . bụ ihe arụ n’anya Jehova.” Otu n’ime ihe mere Jehova ji gbuo Sọl bụ na ọ gwara “onye na-agba afa ka ọ jụọrọ ya ase.”—1 Ihe E Mere 10:13, 14.

Ya bụrụ na e nwere ihe gbara gị gharịị ná ndụ, gị achọọ onye ga-enyere gị aka, ònyezi ka i kwesịrị ịgakwuru? Baịbụl kpọrọ Jehova “Onye Ozizi Ukwu.” Ọ bụrụ na gị na ndị ị hụrụ n’anya na-amụ Okwu Chineke bụ́ Baịbụl ma na-eme ihe ndị o kwuru, e nwere ike ịsị na ‘ntị unu na-anụ okwu n’azụ unu, sị: “Lekwa ụzọ. Jeenụ ije na ya.”’ (Aịzaya 30:20, 21) Ọ bụ eziokwu na Chineke anaghị esi n’eluigwe agwa ezigbo Ndị Kraịst taa okwu, ọ na-eji Baịbụl agwa ha ihe ha ga-eme. Ọ bụ otú ahụ ka o si na-edu ha taa.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Gịnị ka Chineke kwuru gbasara ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase?—Diuterọnọmi 18:9-13.

● Ndị nwụrụ anwụ hà nwere ike ịgwa ndị dị ndụ ihe ha ga-eme? Gịnị mere i ji zaa otú ahụ?—Ekliziastis 9:5.

● Ònye ka anyị kwesịrị ịgakwuru ka ọ gwa anyị ihe anyị ga-eme ná ndụ?—Aịzaya 30:20, 21.