Ozi Ọma Luk Dere 8:1-56

  • Ụmụ nwaanyị ndị na-eso Jizọs (1-3)

  • Ihe atụ gbasara ọgha mkpụrụ (4-8)

  • Ihe mere Jizọs ji jiri ihe atụ na-akụzi ihe (9, 10)

  • A kọwara ihe atụ gbasara ọgha mkpụrụ (11-15)

  • E kwesịghị ikpuchi ọkụ ihe (16-18)

  • Nne na ụmụnne Jizọs (19-21)

  • Jizọs mere ka ebili mmiri dajụọ (22-25)

  • Jizọs gwara ndị mmụọ ọjọọ ka ha banye n’ime ìgwè ézì (26-39)

  • Ada Jaịrọs na otu nwaanyị nke bitụrụ uwe elu Jizọs aka (40-56)

8  Mgbe obere oge gachara, ọ gara n’obodo ukwu na n’obodo nta dị iche iche, na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke.+ Ndịozi ya iri na abụọ sokwa ya,  ha na ụmụ nwaanyị ụfọdụ a gwọrọ ọrịa dị iche iche, chụpụkwa ndị mmụọ ọjọọ ji ha. Ụmụ nwaanyị ndị ahụ bụ: Meri onye a na-akpọ Magdalin, onye mmụọ ọjọọ asaa si n’ahụ́ ya pụta,  Joana+ nwunye Kuza, bụ́ nwoke na-elekọta ụlọ Herọd, Suzana na ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị ọzọ, ndị ji ihe ha nwere na-ejere ya na ndịozi ya ozi.+  Ma mgbe ìgwè mmadụ na ndị si n’obodo dị iche iche bịakwute ya gbakọtara, o mere otu ihe atụ,+ sị:  “Ọgha mkpụrụ gawara ịgha mkpụrụ ya. Ka ọ nọ na-agha mkpụrụ, ụfọdụ n’ime ha dara n’akụkụ ụzọ, a zọọ ha ụkwụ, ụmụ nnụnụ abịa tụrụchaa ha.+  Ụfọdụ dara n’elu nkume. Mgbe ha pulitere, ha kpọnwụrụ n’ihi na mmiri ha ga-amịrị adịghị.+  Ụfọdụ dara n’ebe ogwu juru. Ogwu ndị ha na ha tolitekọrọ wee kpagbuo ha.+  Ma ndị ọzọ dara n’ala dị mma. Mgbe ha pulitere, ha mịrị mkpụrụ okpukpu otu narị (100).”+ Ka ọ na-ekwu ihe ndị a, ya asị: “Onye nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”+  Ma ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ihe ihe atụ a pụtara.+ 10  Ya asị: “Ọ bụ unu ka Chineke mere ka unu ghọta ihe nzuzo ndị dị nsọ nke Alaeze Chineke. Ma a na-emere ndị ọzọ ihe atụ,+ ka ha wee na-ele anya ma ghara ịhụ ihe ọ bụla, ka ha wee na-anụ ihe ma ghara ịghọta ihe ọ bụla.+ 11  Ma leenụ ihe ihe atụ ahụ pụtara: Mkpụrụ ahụ bụ okwu Chineke.+ 12  Ndị ahụ dara n’akụkụ ụzọ bụ ndị nụrụ okwu ahụ, Ekwensu abịa wepụ ya n’obi ha ka ha ghara ikwere, ka a gharakwa ịzọpụta ha.+ 13  Ndị ahụ dara n’elu nkume bụ ndị na-eji ọṅụ anabata okwu ahụ mgbe ha nụrụ ya, ma ha enweghị mgbọrọgwụ ọ bụla. Ha na-ekwere, ma ọ naghị anọte aka n’obi ha. Ha na-akwụsịkwa ikwere okwu ahụ ma ọnwụnwa bịara ha.+ 14  Ma ndị ahụ dara n’ebe ogwu juru bụ ndị nụrụ okwu ahụ, ma nchegbu na akụnụba+ na ikpori ndụ na-emegharị ha anya.+ Ihe ndị a na-akpagbu okwu ahụ ha nụrụ, ha anaghịkwa amị mkpụrụ.+ 15  Ma ndị ahụ dara n’ala dị mma bụ ndị ji ezigbo obi nụ okwu ahụ, ya adịgide n’obi ha,+ ha ana-edi nsogbu ndị bịaara ha, na-amịkwa mkpụrụ.+ 16  “O nweghị onye na-amụnye ọkụ* were ihe kpuchie ya ma ọ bụ dọsa ya n’okpuru àkwà.* Kama, ọ na-adọsa ya n’elu ihe e ji adọsa ọkụ, ka ọ na-enwuru ndị na-abata n’ụlọ.+ 17  N’ihi na e nweghị ihe e zoro ezo nke na-agaghị apụta ìhè. E nweghịkwa ihe ọ bụla e kpuchiri nke ọma nke a na-agaghị amata, nke na-agaghịkwa apụta ìhè.+ 18  N’ihi ya, na-egenụ ntị nke ọma, n’ihi na onye ọ bụla nke nwere ihe ka a ga-enyekwu.+ Ma onye ọ bụla na-enweghị, a ga-anapụdị ya nke o chere na ya nwere.”+ 19  Ma nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke+ gawara ebe ọ nọ, ma ha enweghị ike ịgaru ebe ọ nọ n’ihi ìgwè mmadụ.+ 20  Ma, a gwara ya, sị: “Nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke guzo n’èzí, na-achọ ịhụ gị.” 21  Ya asị ha: “Nne m na ụmụnne m ndị nwoke bụ ndị a na-anụ okwu Chineke ma na-eme ya.”+ 22  Otu ụbọchị, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere n’ụgbọ, o wee sị ha: “Ka anyị gafee n’ofe nke ọzọ nke mmiri a.” Ha wee jiri ụgbọ ahụ gawa.+ 23  Ma ka ha na-aga, ụra buuru ya. Oké ifufe malitekwara ife na mmiri ahụ, mmiri ana-awụbakwa n’ụgbọ ha, ya afọ obere ka ụgbọ ahụ kpuo.+ 24  N’ihi ya, ha gakwuuru ya ma kpọtee ya, sị: “Onye Ozizi, Onye Ozizi, mmiri na-achọ iri anyị!” Mgbe o tetara, ọ baara ifufe na ebili mmiri ahụ mba, ha adajụọ, ebe niile adaa jụụ.+ 25  O wee sị ha: “Ùnu nwekwara okwukwe?” Ma ezigbo ụjọ tụrụ ha, ya ejukwa ha anya, ha ana-asị ibe ha: “Onye a ọ̀ bụdị onye? Ifufe na oké osimiri na-erubedịrị ya isi.”+ 26  Ha wee kwụsị n’ikpere mmiri dị n’obodo ndị Geresa,+ nke chere Galili ihu. 27  Ma mgbe Jizọs pụtara n’elu ala, ya na otu nwoke mmụọ ọjọọ ji, nke si n’obodo ahụ, zuru n’ụzọ. Ọ dịkwala anya nwoke ahụ na-eyibeghị ákwà. Ọ naghịkwa anọ n’ụlọ, kama ọ na-anọ ebe a na-eli ozu.*+ 28  Mgbe ọ hụrụ Jizọs, o tisiri mkpu ike ma sekpuru ala n’ihu ya, jirikwa oké olu, sị: “Jizọs, Ọkpara Chineke Onye Kacha Elu, gịnị jikọrọ mụ na gị? Biko, emekpala m ahụ́.”+ 29  (N’ihi na Jizọs nọ na-agwa mmụọ ọjọọ ahụ* ka o si n’ime nwoke ahụ pụta. Mmụọ ọjọọ ahụ na-enyekarị nwoke ahụ nsogbu.*+ A na-ekekwa nwoke ahụ agbụ ígwè, tụọ ya ịga ugboro ugboro, na-echekwa ya nche. Ma ọ na-adọbi agbụ ndị ahụ, mmụọ ọjọọ ahụ na-achụbakwa ya n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị.) 30  Jizọs jụrụ ya, sị: “Gịnị bụ aha gị?” Ya asị: “Ìgwè,” n’ihi na ọtụtụ mmụọ ọjọọ abanyela n’ime ya. 31  Ha nọkwa na-arịọsi ya ike ka ọ ghara ịgwa ha ka ha baa n’abis.*+ 32  Ma, e nwere ìgwè ézì+ ndị nọ n’ugwu dị ebe ahụ na-ata ahịhịa. N’ihi ya, ha rịọrọ ya ka o kwe ka ha banye n’ime ézì ndị ahụ. O wee kwe ha.+ 33  Mmụọ ọjọọ ndị ahụ wee si n’ime nwoke ahụ pụọ banye n’ime ézì ndị ahụ. Ìgwè ézì ahụ nuuru daba n’ọdọ mmiri, mmiri erie ha. 34  Ma mgbe ndị na-azụ ézì ndị ahụ hụrụ ihe merenụ, ha gbaara ọsọ gaa n’obodo ha nakwa gburugburu ya kọọ ihe merenụ. 35  Ma ndị mmadụ pụtara ka ha hụ ihe merenụ. Ha wee bịakwute Jizọs ma hụ nwoke ahụ mmụọ ọjọọ si n’ime ya pụta ka o yi uwe, nọrọ ọdụ n’akụkụ ụkwụ Jizọs, isi kpakọkwara ya ọnụ. Egwu wee tụọ ha. 36  Ndị hụrụ otú ihe ahụ si mee kọọrọ ndị ahụ bịaranụ otú e si mee ka ahụ́ dị nwoke ahụ mmụọ ọjọọ ji mma. 37  Ọtụtụ ndị si obodo ndị gbara Geresa gburugburu gwara Jizọs ka o si ebe ha nọ pụọ, n’ihi na ezigbo ụjọ ji ha. O wee banye n’ụgbọ mmiri ka ọ pụọ. 38  Ma, nwoke ahụ mmụọ ọjọọ jibu nọ na-arịọ ya ka ya soro ya. Ma ọ gwara nwoke ahụ ka ọ lawa, sị:+ 39  “Laghachi n’ụlọ gị, na-akọkwa ihe Chineke meere gị.” O wee lawa, na-akọsa n’obodo ahụ niile ihe Jizọs meere ya. 40  Mgbe Jizọs laghachiri Galili, ndị obodo ahụ nabatara ya nke ọma, n’ihi na ha niile nọ na-atụ anya ya.+ 41  Ma, otu nwoke aha ya bụ Jaịrọs bịara. Nwoke a bụ onyeisi oche ụlọ nzukọ. O wee gbuo ikpere n’ala n’ihu Jizọs, malite ịrịọsi ya ike ka ọ bịa n’ụlọ ya,+ 42  n’ihi na otu nwa nwaanyị ọ mụrụ naanị ya, onye dị ihe dị ka afọ iri na abụọ, nọ n’ọnụ ọnwụ. Ka Jizọs nọ na-aga, ìgwè mmadụ nọ na-adagide ya. 43  E nwere otu nwaanyị na-arịa ọrịa oruru ọbara+ kemgbe afọ iri na abụọ. O nwebeghịkwa onye nwere ike ịgwọ ya.+ 44  O si n’azụ bịaruo Jizọs nso ma bitụ ọnụ ọnụ uwe elu ya aka.+ Ozugbo ahụkwa, ọrịa oruru ọbara na-arịa ya akwụsị. 45  Jizọs wee sị: “Ònye bitụrụ m aka?” Mgbe ha niile nọ na-agọ agọ, Pita sịrị: “Onye Ozizi, ìgwè mmadụ gbara gị gburugburu ma na-adagide gị.”+ 46  Ma Jizọs sịrị: “O nwere onye bitụrụ m aka, n’ihi na ama m na ike+ pụrụ m n’ahụ́.” 47  Mgbe nwaanyị ahụ hụrụ na Jizọs amatala ihe o mere, ọ maara jijiji bịa sekpuru ala n’ihu ya, kwuokwa n’ihu mmadụ niile ihe mere o ji bitụ ya aka na otú e si gwọọ ya ozugbo. 48  Ma ọ sịrị ya: “Nwa m nwaanyị, okwukwe gị emeela ka ahụ́ dị gị mma. Lawa n’udo.”+ 49  Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, otu onye na-anọchite anya onyeisi oche ụlọ nzukọ bịara, sị: “Nwa gị nwaanyị anwụọla. Enyezila Onye Ozizi nsogbu.”+ 50  Mgbe Jizọs nụrụ ihe a, ya asị Jaịrọs: “Atụla egwu, naanị nwee okwukwe, ọ ga-adịkwa ndụ.”*+ 51  Mgbe o rutere, o kweghị ka onye ọ bụla soro ya banye n’ụlọ ahụ ma e wezụga Pita, Jọn, Jems na nne na nna nwata nwaanyị ahụ. 52  Ma mmadụ niile nọ na-ebe ákwá, na-eti aka n’obi, na-eru uju maka na ọ nwụọla. O wee sị ha: “Kwụsịnụ ibe ákwá,+ n’ihi na ọ nwụghị anwụ, kama ọ na-ehi ụra.”+ 53  Ha wee malite ịchị ya ọchị, na-akwa ya emo, n’ihi na ha ma na ọ nwụọla. 54  Ma o seere ya n’aka ma sị ya: “Nwatakịrị, bilie!”+ 55  O wee dịrị ndụ,*+ biliekwa ozugbo,+ Jizọs agwa ha ka e nye ya nri ka o rie. 56  Aṅụrị wee ju nne ya na nna ya obi. Ma, Jizọs gwara ha ka ha ghara ịkọrọ onye ọ bụla ihe merenụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mpanaka; oriọna.”
Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”
Na Grik, “mmụọ ahụ na-adịghị ọcha.”
O nwere ike ịbụ, “Ọ dịla anya mmụọ ahụ jisiri ya ike.”
Ma ọ bụ “n’olulu na-enweghị nsọtụ.”
Na Grik, “a ga-azọpụta ya.”
Na Grik, “Mmụọ ya wee lọghachi.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Mmụọ.”