Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ajọ Omume Hà Ga-aga Ọkụ Ala Mmụọ?

Ndị Ajọ Omume Hà Ga-aga Ọkụ Ala Mmụọ?

ECHICHE BAỊBỤL

Ndị Ajọ Omume Hà Ga-aga Ọkụ Ala Mmụọ?

GERTRUDE, bụ́ onye na-akụziri ndị ọzọ ihe na chọọchị Pentikọstal, kwenyesiri ike na ọkụ ala mmụọ dị. Ọ na-adị ya ka ikwu na ọkụ ala mmụọ adịghị pụtara na ikpe ziri ezi adịghị. Ọ dị ya ka ọ bụrụ na ọkụ ala mmụọ adịghị, ihe ọ pụtara bụ na ndị ọjọọ agaghị ata ahụhụ maka arụrụala niile ha rụrụ. O nweghị ihe ọzọ Gertrude chọrọ ịnụ ma ọ́ bụghị ihe ahụ o kweere. Ọ sịrị, “Ọ ga-esiri m ike ife Chineke ma ọ bụrụ na ndị ajọ omume agaghị aga ọkụ ala mmụọ.”

Ndị ajọ omume hà ga-aga ọkụ ala mmụọ dị ka ọtụtụ okpukpe na-akụzi? Ọ bụrụ na ha agaghị aga, oleezi ntaramahụhụ a ga-enye ha?

Ahụhụ Chineke Tara Ndị Mbụ Mere Ihe Ọjọọ

Baịbụl kwuru na nwoke na nwaanyị mbụ Chineke kere zuru okè. (Jenesis 1:27; Diuterọnọmi 32:4) O dewere ha na paradaịs a gbara ogige ma nye ha ohere ịdị ndụ ebighị ebi. Ma, o nwere otu ihe a sịrị mmadụ abụọ mbụ ahụ bụ́ Adam na Iv emela. Chineke dọrọ ha aka ná ntị, sị: “I nwere ike iri mkpụrụ nke osisi ọ bụla dị n’ubi a rijuo afọ. Ma erila mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, n’ihi na n’ụbọchị i riri mkpụrụ si na ya, ị ga-anwụrịrị.”—Jenesis 2:16, 17.

Ọ dị mwute na nne na nna anyị mbụ ahụ dara ule ahụ na-esighị ike Chineke lere ha iji mara ma hà ga-ekwesị ntụkwasị obi ma rubere ya isi. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka Chineke maa ha ikpe ọnwụ. “Ọsụsọ ga-agba gị n’ihu tupu gị erie ihe oriri ruo mgbe ị laghachiri n’ala, n’ihi na e si na ya wepụta gị. N’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa n’ájá ka ị ga-alaghachi.”—Jenesis 3:19.

A sị na Chineke gaara akpọ Adam na Iv ọkụ n’ọkụ ala mmụọ, ọ̀ gaaraghị agwa ha? Nke bụ eziokwu bụ na o nweghị otú o si kwute okwu ịta ha ahụhụ ma ha nwụọ. Olee otú ha ga-esi taa ahụhụ? Ha enweghị mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ, nke ga-adịgide ndụ mgbe ha nwụchara. Baịbụl mere nnọọ ka nke a doo anya mgbe ọ sịrị: “Mkpụrụ obi ọ bụla nke na-emehie, ọ bụ ya ga-anwụ.”Ezikiel 18:4. *

Ebe ọ bụ Onye Okike anyị bụ Onye nyere anyị niile ndụ, ọ maara ihe niile banyere ọnwụ na ndụ. Na Baịbụl, ọ gwara anyị na “ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” (Ekliziastis 9:5) Ọ bụ ya mere na o nweghị mgbe Adam na Iv tara ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ. Naanị ihe mere bụ na ha laghachiri n’ájá, ma kwụsịzie ịdị adị. Ha “amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.”

Ànyị Nwere Ike Ịta Ahụhụ Ma Anyị Nwụọ?

Ndị Rom 5:12, Baịbụl sịrị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile.” N’ihi ya, ò kwesịrị ekwesị ikwere na ndị mmadụ na-ata ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ maka mmehie ha, ebe ọ bụ na Adam, onye kpataara mmadụ niile ọnwụ, ghọrọ ájá nkịtị mgbe ọ nwụrụ?—1 Ndị Kọrịnt 15:22.

Otu ahụhụ ahụ a gwara Adam na ọ ga-ata na-echerekwa anyị. “Ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ.” Ọzọkwa bụ na ozugbo mmadụ nwụrụ, ‘a tọhapụwo onye ahụ ná mmehie ya.’ (Ndị Rom 6:7, 23) Ọ bụrụ na ma onye ọma ma onye ọjọọ adịghị ata ahụhụ ma ha nwụọ, oleezi otú a ga-esi kwuo na Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi?

Otú Chineke Si Ekpe Ikpe Ziri Ezi

Mgbe Chineke kere nwoke na nwaanyị mbụ, ọ gwara ha ka ha mụọ ụmụ ma lekọta ụwa, ihe a ka bụkwa ihe o zubeere ụmụ mmadụ ndị na-erubere ya isi. (Jenesis 1:28) O gosiri na nke a ka bụ nzube ya, n’ihi na o mechara kwuo, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.

Ị̀ chọpụtara na ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa a? Ha ga-enwe ahụ́ zuru okè, nweekwa obi ụtọ. N’eziokwu, nzube Chineke ná mbụ, nke bụ́ ka naanị ndị ezi omume jupụta n’ụwa ‘ga-emezurịrị.’ Nke a ga-eme mgbe ọ ga-eji ụwa ọhụrụ dochie anya ụwa ọjọọ a.—Aịzaya 55:11; Daniel 2:44; Mkpughe 21:4.

A ga-akpọlite ọtụtụ ijeri mmadụ ndị nwụrụ mgbe ha na-amatabeghị ihe Chineke chọrọ ha n’aka, a ga-akụzikwara ha ihe ndị ha ga-eme iji nwee ike ibi ndụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke. (Aịzaya 11:9; Jọn 5:28, 29) Ma, onye ọ bụla n’ime ha nke jụrụ irube isi n’iwu Chineke ga-anwụ “ọnwụ nke abụọ.” A gaghị akpọlite onye nwụrụ ụdị ọnwụ a.—Mkpughe 21:8; Jeremaya 51:57.

O doro anya na Jehova, bụ́ Chineke nke ịhụnanya, agaghị ata ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ. (1 Jọn 4:8) Ọ gaghịkwanụ ahapụ ndị ọjọọ ka ha dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ ya mere Abụ Ọma 145:20 ji mesie anyị obi ike na “Jehova na-eche ndị niile hụrụ ya n’anya nche, ma ọ ga-ala ndị ajọ omume niile n’iyi.” Nke a ọ̀ naghị egosi na Jehova bụ Chineke nke ịhụnanya nakwa Onye na-ekpe ikpe ziri ezi?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Baịbụl kwuru na “mkpụrụ obi” bụ mmadụ n’onwe ya, ọ bụghị ihe dị iche dị n’ahụ́ mmadụ. Jenesis 2:7 sịrị: “Jehova bụ́ Chineke wee jiri ájá si n’ala kpụọ mmadụ ma kunye ume ndụ n’oghere imi ya, mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” E nyeghị Adam mkpụrụ obi dị iche n’ahụ́ ya. Kama, Adam n’onwe ya bụ mkpụrụ obi dị ndụ.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Ànyị nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ?—Ezikiel 18:4.

▪ Gịnị bụ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ?—Ekliziastis 9:5.

▪ Olee ihe Chineke ga-eme ndị ajọ omume?—Abụ Ọma 145:20.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peej 27]

Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.”—Ekliziastis 9:5

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 26]

Foto: www.comstock.com