Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È Kwesịrị Inwe Ndị Isi na Ndị Nkịtị n’Ụka?

È Kwesịrị Inwe Ndị Isi na Ndị Nkịtị n’Ụka?

 Echiche Baịbụl

È Kwesịrị Inwe Ndị Isi na Ndị Nkịtị n’Ụka?

Ụfọdụ n’ime utu aha ọtụtụ okpukpe na-akpọ ndị isi ha iji gosi ihe dị iche ná ndị isi okpukpe ha na ndị nkịtị bụ, Most Reverend, Right Reverend, Father, Most Holy Father, Rabaị, His Eminence, His Excellency, His Holiness, His All-Holiness. N’ọtụtụ okpukpe, e nwere ndị bụ́ ndị isi na ndị bụ́ ndị nkịtị, ma nke a ọ̀ bụ ihe Chineke sị ka a na-eme ka ọ̀ bụ ihe ụmụ mmadụ ji aka ha chepụta? Nke kacha mkpa bụ ma Chineke ọ̀ kwadoro ụdị ihe a?

CLETUS Wessels, bụ́ prọfesọ nkà mmụta okpukpe dere, sị: “N’Agba Ọhụrụ nakwa n’oge ndịozi Jizọs dị ndụ, e nweghị ebe e kwuru na e nwere ndị bụ́ ndị isi ma ọ bụ ndị bụ́ ndị nkịtị.” Akwụkwọ bụ́ Encyclopedia of Christianity sịrị: “Inwe ndị bụ́ ndị isi ụka, na ndị bụ́ ndị nkịtị n’ụka ji nke nta nke nta malite . . . A bịaziri lewe ‘ndị nkịtị’ na chọọchị anya dị ka ndị na-amaghị ihe ọ bụla banyere Chineke ma ọ bụ Baịbụl.” Ọ bụ na narị afọ nke atọ O.A., bụ́ ihe karịrị narị afọ abụọ Jizọs Kraịst bịachara n’ụwa laa, ka inwe ndị bụ́ ndị isi na ndị nkịtị n’ụka bịara gbasaa ebe niile!

Ebe ọ bụ na ndịozi Jizọs na Ndị Kraịst ndị ọzọ dịrị ndụ obere oge ka ndịozi nwụchara enweghị ndị bụ́ ndị isi na ndị nkịtị, ò mere ka inwe ya taa dịrị njọ? Baịbụl gosiri na ọ dị njọ. Lezie ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ.

“Unu Niile Bụ Ụmụnna”

Okwu Chineke na-agwa anyị na Ndị Kraịst niile bụ ndị ozi Chineke nakwa na ọ dịghị onye ka ibe ya, ọ dịghịkwa onye nọ n’okpuru ibe ya. (2 Ndị Kọrịnt 3:5, 6) Alexandre Faivre, bụ́ onye na-ede banyere okpukpe, sịrị na Ndị Kraịst oge mbụ “gbasiri mbọ ike ịhụ na ha enweghị ndị bụ́ ndị isi na ndị bụ́ ndị nkịtị” n’etiti ha. Nke ahụ dabara n’ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu niile bụ ụmụnna.”—Matiu 23:8.

N’eziokwu, e nwere ụmụ nwoke ndị tozuru etozu n’ihe gbasara Okwu Chineke, ndị bụ́ ndị nlekọta, ndị ọrụ ha gụnyere ịzụ atụrụ Chineke na ịkụziri ha ihe. (Ọrụ 20:28) Ma a naghị akwụ ụmụ nwoke ndị a ụgwọ maka ọrụ ndị a. Ọtụtụ n’ime ha na-arụ ọrụ ha ji akpata ego dị ka onye ọ bụla ọzọ, bụrụkwa ndị di na ndị nna. Ihe mere ha ji toruo ịbụ ndị nlekọta abụghị n’ihi na ha gara ụlọ akwụkwọ ebe a na-azụ ndị ụkọchukwu, kama ọ bụ n’ihi na ha na-amụchi Okwu Chineke anya ma na-akpa ụdị àgwà Chineke chọrọ ka ha na-akpa. Chineke chọrọ ka ha bụrụ ‘ndị na-emeru ihe n’ókè, ndị uche ha zuru okè, ndị na-eme ihe n’usoro, ndị na-ele ọbịa, ndị ruru eru izi ihe, . . . ndị nwere ezi uche, ọ bụghị ndị nwere mmụọ ịlụ ọgụ, ọ bụghị ndị hụrụ ego n’anya, ha kwesịrị ịbụ ndị na-elekọta ezinụlọ ha nke ọma.’—1 Timoti 3:1-7.

Ihe Mere Ime Ihe Baịbụl Kwuru Ji Ka Mma

Baịbụl sịrị: “Unu agabigala ihe e dere ede.” (1 Ndị Kọrịnt 4:6) Ọ dị mwute ikwu na mgbe ndị mmadụ hapụrụ idebe iwu a Chineke nyere, ọ na-eme ka ha na Chineke gharazie ịdị ná mma. Nke a bụkwa ihe na-eme ma e nwee ndị isi na ndị nkịtị n’ụka. Olee otú nke a si bụrụ eziokwu? Biko tụlee ihe isii ndị a.

1. Inwe ndị bụ́ ndị isi n’ụka na-egosi na mmadụ ga-anatarịrị ọkpụkpọ òkù pụrụ iche tupu ya abụrụ onye ozi Chineke. Ma, Baịbụl kwuru na ezi Ndị Kraịst niile kwesịrị ijere Chineke ozi ma na-eto aha ya. (Ndị Rom 10:9, 10) A bịa n’ije ozi n’ọgbakọ, a gwara Ndị Kraịst bụ́ ndị nwoke ka ha na-agbalị iru eru ije ozi. Nke a bụkwa otú Ndịàmà Jehova si eme.—1 Timoti 3:1.

2. Inwe ndị isi na ndị nkịtị n’ụka na-eme ka a na-ele ndị isi ụka anya dị ka ndị dị elu karịa ndị  nkịtị, oké aha ndị a na-etu ha na-egosikwa nke a. Ma, Jizọs sịrị: “Onye na-eme onwe ya dị ka onye ka nta n’etiti unu niile bụ onye dị ukwuu.” (Luk 9:48) Ọ bụ nke a ka Jizọs bu n’obi gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara inwe utu aha ndị a na-akpọ ha ma a bịa n’ihe gbasara ofufe ha.—Matiu 23:8-12.

3. N’ebe e nwere ndị isi ụka a na-akwụ ụgwọ, inweta ego a ga-eji na-akwụ ha ụgwọ nwere ike ịbụrụ ndị nkịtị ibu arọ, karịchaa ma ọ bụrụ na ndị isi a na-ebi ndụ okomoko. Ma ndị bụ́ ndị nlekọta n’etiti Ndị Kraịst na-enwe ọrụ ego ha na-arụ, nke ha ji akpata ego ha ji egbo mkpa ha, si otú a na-aghọrọ ndị ọzọ ezi ihe nlereanya. *Ọrụ 18:1-3; 20:33, 34; 2 Ndị Tesalonaịka 3:7-10.

4. Ebe ọ bụ ndị ọzọ na-enye ụkọchukwu ego ọ na-eji egbo mkpa ya, nke a nwere ike ime ka ọ na-asọ okwu anya ma ọ bụ ghara ikwu ihe otú Baịbụl si kwuo ya iji mee ka obi dị ndị chọọchị ya mma. E budịrị amụma n’Akwụkwọ Nsọ na ụdị ihe a ga-eme. “N’ihi na a ga-enwe oge mgbe ha na-agaghị anabata ozizi ahụ na-enye ezi ndụ, kama, dị ka ha si chọọ, ha ga-akpọkọtara onwe ha ndị ozizi ka ha wee na-anụ ihe na-atọ ha ụtọ ná ntị.”—2 Timoti 4:3.

5. Inwe ndị isi na ndị nkịtị n’ụka na-eme ka ndị nkịtị were na ọ bụ naanị ndị isi ụka ka okwu banyere ife Chineke gbasara, ebe ọrụ nke ha bụ naanị ịbịa gere okwuchukwu n’ụbọchị ụka. Ma, Ndị Kraịst niile kwesịrị ịbụ ndị ji Okwu Chineke kpọrọ ihe, ha kwesịkwara ịbụ ndị na-amụchi Baịbụl anya.—Matiu 4:4; 5:3.

6. Ọ bụrụ na ndị nkịtị amaghị Baịbụl, o nwere ike ịdịrị ndị isi ụka mfe iduhie ha ma ọ bụdị rigbuo ha. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nweela ọtụtụ mgbe ụdị ihe a mere n’ụwa a. *Ọrụ 20:29, 30.

Ndịàmà Jehova enweghị ndị isi ụka a na-akwụ ụgwọ n’ihi na ha chọrọ irube isi n’ihe Baịbụl kwuru, kama ha nwere ụmụ nwoke a na-adịghị akwụ ụgwọ, ndị ji obi ha niile na-azụ atụrụ Chineke ma na-akụziri ha ihe. Ọ ga-adị mma ma ị gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị ma jiri anya gị hụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Na narị afọ mbụ, ụfọdụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị nwere mgbe ha ‘dịrị ndụ site n’ozi ọma,’ site n’ịnara onyinye ụmụnna ha ji obi ọcha ha nye nakwa ikwe ka ha lee ha ọbịa.—1 Ndị Kọrịnt 9:14.

^ par. 16 Ụfọdụ n’ime ha bụ ịkwụ ụgwọ maka indọljens, imesi ndị hapụrụ okpukpe Katọlik ike, na ọbụna ndị isi ụka ịgba Baịbụl ọkụ n’ihi na ha achọghị ka Okwu Chineke ruo ndị nkịtị aka.—Gụọ nwanne magazin a bụ́ Ụlọ Nche nke November 15, 2002, peeji nke 27.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

▪ Olee otú ndị Chineke niile kwesịrị isi na-ele ibe ha anya?—Matiu 23:8.

▪ Olee otú Ndị Kraịst bụ́ ndị nwoke si eru eru ịbụ ndị nlekọta n’ọgbakọ?—1 Timoti 3:1-7.

▪ Gịnị mere inwe ndị isi na ndị nkịtị n’ụka adịghị Chineke mma?—1 Ndị Kọrịnt 4:6.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]

Jizọs adịghị ka ndị isi ụka, o weere onwe ya dị ka “onye ka nta”