Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Chineke Na Kraịst Si Ele Ụmụ Nwaanyị Anya?

Olee Otú Chineke Na Kraịst Si Ele Ụmụ Nwaanyị Anya?

Olee Otú Chineke Na Kraịst Si Ele Ụmụ Nwaanyị Anya?

OLEE otú anyị nwere ike isi mata kpọmkwem otú Jehova Chineke si ele ụmụ nwaanyị anya? Otu ụzọ anyị nwere ike isi mata ya bụ ịtụle àgwà Jizọs Kraịst, onye bụ́ “onyinyo nke Chineke a na-apụghị ịhụ anya” na onye na-ele ihe anya kpọmkwem otú Chineke si ele ihe anya. (Ndị Kọlọsi 1:15) Otú Jizọs si mesoo ụmụ nwaanyị dịrị ndụ n’oge ya ihe gosiri na Jehova na Jizọs na-asọpụrụ ụmụ nwaanyị, nakwa na ha anatụghị akwado mmegbu a na-emegbukarị ha n’ọtụtụ ala taa.

Dị ka ihe atụ, tụlee ihe merenụ mgbe Jizọs gwara otu nwaanyị okwu n’akụkụ otu olulu mmiri. Oziọma Jọn kwuru, sị: “Otu nwaanyị Sameria bịara isere mmiri. Jizọs wee sị ya: ‘Nye m mmiri ka m ṅụọ.’” Jizọs chọrọ ka ya na nwaanyị Sameria ahụ kwurịta okwu n’ihu ọha, n’agbanyeghị na ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu anaghị eso ndị Sameria emekọrịta ihe. Akwụkwọ bụ́ The International Standard Bible Encyclopedia kwuru na, nye ndị Juu, “iso nwaanyị kparịta ụka n’ihu ọha bụ arụ.” Otú ọ dị, Jizọs kwanyeere ụmụ nwaanyị ùgwù ma chebara ha echiche, ọ kpọghịkwa onye ọ bụla asị n’ihi na onye ahụ bụ nwaanyị ma ọ bụ n’ihi agbụrụ onye ahụ si. Kama nke ahụ, ọ bụ nwaanyị Sameria ahụ bụ onye mbụ Jizọs gwara hoo haa na ya bụ Mezaya ahụ.—Jọn 4:7-9, 25, 26.

N’oge ọzọ, otu nwaanyị nke rịarala ọrịa oruru ọbara na-emenye mmadụ ihere, bụ́ nke kpakwarala ya aka ọjọọ ruo afọ iri na abụọ, bịakwutere Jizọs. Mgbe nwaanyị ahụ metụrụ Jizọs aka, a gwọrọ ya ozugbo. “Jizọs tụgharịrị, hụ ya wee sị: ‘Nwee obi ike, nwa m nwaanyị; okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma.’” (Matiu 9:22) A gbasowe Iwu Mozis, nwaanyị nọ n’ọnọdụ ya ekwesịghị ịbata ebe ìgwè mmadụ nọ, ma ya fọdụ imetụ ndị ọzọ aka. Ma, Jizọs abaghịrị ya mba. Kama nke ahụ, o ji ọmịiko kasie ya obi ma kpọọ ya “nwa m nwaanyị.” Ọ ga-abụrịrị na ihe ahụ Jizọs gwara ya mere ka obi ruo ya ala! Ọzọkwa, ọ ga-abụrịrị na Jizọs nwere obi ụtọ na ọ gwọrọ nwaanyị ahụ!

Mgbe a kpọlitesịrị Jizọs n’ọnwụ, ndị mbụ o kwere ka ha hụ ya anya bụ Meri Magdalin na onye ọzọ na-eso ụzọ ya, bụ́ onye Baịbụl kpọrọ “Meri nke ọzọ.” A sị na Jizọs chọrọ, ọ gaara eme ka Pita, Jọn, ma ọ bụ ndị ọzọ na-eso ụzọ ya bụ́ ụmụ nwoke buru ụzọ hụ ya anya. Kama nke ahụ, ọ kwanyeere ụmụ nwaanyị ùgwù site n’ime ka ha bụrụ ndị mbụ hụrụ ya mgbe a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ. Otu mmụọ ozi gwara ha ka ha gaa kọọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs bụ́ ndị nwoke ihe ịtụnanya a merenụ. Jizọs gwara ụmụ nwaanyị ahụ, sị: “Gaanụ kọọrọ ụmụnna m.” (Matiu 28:1, 5-10) Ọtụtụ ndị Juu dịrị ndụ n’oge Jizọs kpọrọ ụmụ nwaanyị asị ma kwuo na ha enweghị ike ịgba akaebe n’ụlọikpe, ma o doro anya na Jizọs ekweghị ka nke ahụ mee ka ọ kpọọkwa ụmụ nwaanyị asị.

Ya mere, Jizọs emegbughị ụmụ nwaanyị ma ọ bụ kwado anya ụmụ nwoke na-eleda ha, kama ọ kwanyeere ha ùgwù, jirikwa ha kpọrọ ihe. Ihe ike a na-emeso ụmụ nwaanyị ekwekọtụghị n’ozizi Jizọs, anyị jikwa n’aka na otú o si lee ụmụ nwaanyị anya kwekọrọ kpọmkwem n’otú Nna ya, bụ́ Jehova, si ele ihe anya.

Ụmụ Nwaanyị Ndị Chineke Lekọtara

“N’oge ochie, ọ dịghị ebe ọ bụla n’ógbè Mediterenian ma ọ bụ na Nso Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa e nyere ụmụ nwaanyị nnwere onwe ha nwere ugbu a n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa. Ihe a na-emekarị bụ ido ụmụ nwaanyị n’okpuru ụmụ nwoke, dị ka ndị ohu na-anọ n’okpuru ndị nweere onwe ha, nakwa ndị na-eto eto n’okpuru ndị agadi. . . . A na-ewere ụmụaka ndị nwoke ná ndị bara nnọọ uru karịa ụmụaka ndị nwaanyị, mgbe ụfọdụkwa, a na-ahapụ ụmụaka ndị nwaanyị ka oyi tụgbuo ha.” Nke ahụ bụ otú otu akwụkwọ na-akọwa okwu Baịbụl si kọwaa otú ọtụtụ ndị si ele ụmụ nwaanyị anya n’oge ochie. Ọtụtụ mgbe, a na-ele ha anya dị ka ndị ohu.

E dere Baịbụl mgbe omenala ndị dị otú ahụ juru ebe niile. N’agbanyeghị nke ahụ, iwu Chineke ndị e dere na Baịbụl gosiri na Chineke ji ụmụ nwaanyị kpọrọ ihe nke ukwuu, nke a dịkwa nnọọ iche n’otú ọtụtụ ndị si ele ụmụ nwaanyị anya n’oge ochie.

Ihe Jehova mere n’oge dị iche iche iji chebe ụmụ nwaanyị na-efe ya ofufe gosiri na ọ na-eche banyere ọdịmma ụmụ nwaanyị. Ugboro abụọ, o mere ka a ghara idina nwunye Ebreham mara mma, bụ́ Sera, n’ike. (Jenesis 12:14-20; 20:1-7) Chineke meere nwunye Jekọb nke a na-ahụchaghị n’anya, bụ́ Lia, ebere site ‘n’imeghe akpa nwa ya,’ bụ́ nke mere ka ọ mụta nwa nwoke. (Jenesis 29:31, 32) Mgbe ụmụ nwaanyị Izrel abụọ na-aghọ nwa, bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke, tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ iji chebe ụmụ nwoke a mụrụ ọhụrụ, bụ́ ndị Hibru ka ndị Ijipt na-egbu ụmụaka ghara igbu ha, Jehova kwụrụ ha ụgwọ ma mee ka ha “nwee ezinụlọ.” (Ọpụpụ 1:17, 20, 21) Ọ zakwara ekpere Hana ji obi ya niile kpee. (1 Samuel 1:10, 20) Ọzọkwa, mgbe otu nwoke kwuru na ya ga-akpọrọ ụmụ nke nwunye otu onye amụma nwụrụ anwụ ka ha bụrụ ndị ohu ya n’ihi na onye amụma ahụ nwụrụ anwụ ji ya ụgwọ, Jehova agbahapụghị nwaanyị ahụ. Ịhụnanya kpaliri Chineke inye Ịlaịsha onye amụma ike ịmụba mmanụ nwaanyị ahụ ka o wee nwee ike ịkwụ ụgwọ ahụ, ka nweekwa mmanụ ga-ezuru ezinụlọ ya. Nwaanyị ahụ si otú ahụ mee ka ezinụlọ ya dịgide ndụ ma zere mmechuihu.—Ọpụpụ 22:22, 23; 2 Ndị Eze 4:1-7.

Ugboro ugboro, ndị amụma katọrọ mmegide a na-emegide ụmụ nwaanyị na ihe ike a na-emeso ha. Jeremaya onye amụma ji aha Jehova gwa ndị Izrel, sị: “Kpeenụ ikpe ziri ezi, meekwanụ ezi omume, napụtanụ onye a na-apụnara ihe n’aka onye na-erigbu ya; unu emegbula onye mbịarambịa ọ bụla, nwa na-enweghị nna ma ọ bụ nwaanyị di ya nwụrụ. Unu emesola ha ihe ike. Unu awụfukwala ọbara ọ bụla na-emeghị ihe ọjọọ n’ebe a.” (Jeremaya 22:2, 3) Tupu mgbe ahụ, a katọrọ ndị ọgaranya na ndị a ma ama n’Izrel n’ihi na ha chụpụrụ ụmụ nwaanyị n’ụlọ ha ma megbuo ụmụ ha. (Maịka 2:9) Chineke nke na-ekpe ikpe ziri ezi na-ahụ ahụhụ dị otú ahụ a na-ata ụmụ nwaanyị na ụmụ ha, ọ na-akatọkwa ya.

“Ezigbo Nwunye”

Onye dere akwụkwọ Ilu gosiri otú e kwesiri isi na-ele ezigbo nwunye anya. Ebe ọ bụ na a kọwara ọrụ magburu onwe ya nwaanyị nọ na di na-arụ nakwa ọnọdụ ya n’Okwu Chineke, anyị ji n’aka na Jehova kwadoro nkọwa ahụ. A natụghị emegbu nwaanyị dị otú ahụ emegbu ma ọ bụ na-ele ya anya dị ka onye na-abachaghị uru, kama nke ahụ, a na-eji ya akpọrọ ihe, na-akwanyere ya ùgwù, ma na-atụkwasị ya obi.

“Ezigbo nwunye” ahụ e kwuru banyere ya n’Ilu isi 31 bụ onye na-agba mbọ na onye na-arụsi ọrụ ike. Ọ na-arụ “ọrụ ọ bụla aka ya nwere mmasị ịrụ,” ọbụnakwa na-azụ ma na-ere ala na ụlọ. Ọ na-ahụ ala ma zụta ya. Ọ na-akwa uwe ime ma na-ere ha. Ọ na-enye ndị ahịa ájị̀. Ọ dị ike ma na-arụsi ọrụ ike. Ọzọkwa, e ji okwu amamihe ndị ọ na-ekwu na ebere ya kpọrọ ihe nke ukwuu. N’ihi ya, di ya, ụmụ ya, na nke kasị nke, Jehova, ji ya kpọrọ ihe nke ukwuu.

Chineke ezubeghị ka ụmụ nwoke na-erigbu ụmụ nwaanyị, na-emegbu ha, ma ọ bụ na na-akparị ha n’ụdị ọ bụla. Kama nke ahụ, nwaanyị lụrụ di kwesịrị inwe obi ụtọ na afọ ojuju dị ka “onye inyeaka” di ya.—Jenesis 2:18.

Na-enyenụ Ha Nsọpụrụ

Mgbe onye e nyere ike mmụọ nsọ bụ́ Pita na-edegara Ndị Kraịst bụ́ di akwụkwọ ozi banyere otú ha kwesịrị isi na-emeso nwunye ha, ọ gbara ha ume ka ha na-eṅomi àgwà Jehova na nke Jizọs Kraịst. O dere, sị: “Unu ndị bụ́ di, . . . na-enyenụ [ha] nsọpụrụ.” (1 Pita 3:7) Inye mmadụ nsọpụrụ pụtara na i ji onye ahụ kpọrọ ihe ma na-akwanyere ya ùgwù nke ukwuu. N’ihi ya, nwoke na-asọpụrụ nwunye ya anaghị eweda ya ala, na-elelị ya anya, ma ọ bụ na-emeso ya ihe ike. Kama nke ahụ, ọ na-eji okwu ọnụ ya na omume ya egosi na o ji ya kpọrọ ihe ma hụ ya n’anya—ma n’ihu ọha ma mgbe naanị ha abụọ nọ.

Di ịsọpụrụ nwunye ya na-eme nnọọ ka ha nwee obi ụtọ n’alụmdi na nwunye ha. Tụlee ihe atụ Carlos na Cecilia. N’otu oge n’alụmdi na nwunye ha, ha chọpụtara na ha na-arụ ụka mgbe mgbe, n’enwekwanụghị mgbe ha na-emesị kwekọrịta. Mgbe ụfọdụ, ha na-akwụsị nnọọ ighe ibe ha ọnụ. Ha amaghị otú ha ga-esi kwụsị nsogbu ahụ ha na-enwe. Nke nwoke na-ewe iwe ọkụ; ọ dịghịkwanụ ihe na-eju nke nwaanyị afọ, ọ dịkwa mpako. Ma, mgbe ha malitere ịmụ Baịbụl na ime ihe ndị ha na-amụta, ihe bịara gbanwewe. Cecilia kwuru, sị: “Ekwetara m na ihe ndị Jizọs kụziri na ihe nlereanya anya ya agbanweela m, gbanweekwa di m. N’ihi ihe nlereanya Jizọs, adịkwuola m umeala n’obi ma na-aghọta di m. Amụtala m ịdị na-achọ enyemaka Jehova n’ekpere, dị ka Jizọs mere. Carlos amụtala idi ihe ụfọdụ, ọ na-ejidekwa onwe ya ugbu a karịa mgbe mbụ—ọ mụtala ịsọpụrụ nwunye ya dị ka Jehova chọrọ.”

Alụmdi na nwunye ha abụghị nke ndị zuru okè, ma ọ nọọla ọtụtụ afọ. Ruo afọ ole na ole ugbu a, ha enweela nsogbu ndị tara akpụ—a chụrụ Carlos n’ọrụ, waakwa ya ahụ́ n’ihi ọrịa cancer. Ma, nsogbu ndị a tara akpụ akpaghị alụmdi na nwunye ha aka, kama nke ahụ, alụmdi na nwunye ha esiwanyela ike.

Kemgbe ụmụ mmadụ ghọrọ ndị na-ezughị okè, ọtụtụ obodo emesoola ụmụ nwaanyị omume gosiri na ha ejighị ha kpọrọ ihe. E tiela ha ihe, gwa ha okwu ọjọọ, dinaakwa ha n’ike. Ma ọ bụghị otú ahụ ka Jehova bu n’obi ka e si na-emeso ha. Baịbụl gosiri nnọọ na n’agbanyeghị otú ndị dị iche iche si ele ụmụ nwaanyị anya, e kwesịrị ịsọpụrụ ụmụ nwaanyị niile ma kwanyere ha ùgwù. Ọ bụ otú Chineke si chọọ ya.

[Foto dị na peeji nke 4 na 5]

Nwaanyị Sameria

[Foto dị na peeji nke 4 na 5]

Nwaanyị ahụ́ na-adịghị

[Foto dị na peeji nke 4 na 5]

Meri Magdalin

[Foto dị na peeji nke 6]

Jehova chebere Sera ugboro abụọ

[Foto dị na peeji nke 7]

Alụmdi na nwunye Carlos na Cecilia na-achọ itisa

[Foto dị na peeji nke 7]

Carlos na Cecilia taa