Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere M Kwesịrị Iji Na-ebi Ndụ Otú Baịbụl Kwuru Ka A Na-ebi?

Gịnị Mere M Kwesịrị Iji Na-ebi Ndụ Otú Baịbụl Kwuru Ka A Na-ebi?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . .

Gịnị Mere M Kwesịrị Iji Na-ebi Ndụ Otú Baịbụl Kwuru Ka A Na-ebi?

GỊ NA ụmụ agbọghọ abụọ gara ebe a na-ere nri n’ụlọ akwụkwọ unu iri nri ehihie. Otu n’ime ha nọ nnọọ na-ele nwa okorobịa ka batara ọhụrụ n’ụlọ akwụkwọ unu anya.

Otu n’ime ụmụ agbọghọ ahụ asị gị: “Ị̀ ma na ọ hụrụ gị n’anya? Ị̀ hụkwara ihe ọ na-ele gị? Anya ya ekweghị nnọọ apụ apụ n’ahụ́ gị!”

Nwa agbọghọ nke ọzọ akpụketekwuo gị nso wee takwụnyere gị ná ntị, sị: “Ị̀ makwa na o nwebeghị enyi nwaanyị!”

Nwa agbọghọ nke mbụ asị gị: “A sị na mụ enweghị enyi nwoke, o nweghị ihe gaara eme ka m ghara imeta ya enyi!”

Nwa agbọghọ nke mbụ ahụ kwuziri ihe ị na-anaghị achọ iji ntị anụ.

“Gịnị medịrị na i nweghị enyi nwoke?”

Ị maara na ha ga-ajụ gị ajụjụ a. Nke bụ́ eziokwu bụ na ị chọrọ inwe enyi nwoke. Ma, a gwara gị na ọ kacha mma ka i chere ruo mgbe i jikeere ịlụ di tupu gị na nwoke amalite ịkpa. A sị nnọọ na ọ bụghị . . .

Nwa agbọghọ nke ọzọ asị gị: “Okpukpe gị, ọ̀ kwa ya?”

Gị ekwuo n’obi gị, sị, ‘Ọ dị nnọọ ka ọ̀ ma ihe dị m n’obi.’

Mgbe ahụ, nwa agbọghọ nke mbụ ahụ asị gị: “Mgbe niile gị na Baịbụl! Gịnị mere na o nweghị mgbe ị na-ekporitụ ndụ?”

Ò nwetụla mgbe ọ dị gị otú ahụ, ya bụ, mgbe ndị mmadụ na-akwa gị emo maka na ị na-agbalị ibi ndụ otú Baịbụl kwuru ka a na-ebi? Olee ihe i mere?

▪ I ji obi ike kọwaa ihe ndị i kweere.

▪ Ahụ́ eruchaghị gị ala, ma ị kọwara ihe ndị i kweere otú ike kwere gị.

▪ I kwetara na ihe ndị enyi gị n’ụlọ akwụkwọ kwuru bụ eziokwu—na ị naghị ekpori ndụ!

Ì chetụla n’obi gị, sị, ‘Ọ̀ badịrị uru ibi ndụ otú Baịbụl kwuru ka a na-ebi?’ Nwa agbọghọ a na-akpọ Deborah chere otú ahụ. * Ọ sịrị: “Ndị ọgbọ m na-eme ihe ọ bụla sọrọ ha. O yiri ka à ga-asị na o nweghị onye na-atụrụ ha ihe ha na-eme. O yikwara ka ihe Baịbụl kwuru ka e mee ò siri ike. Otú ndị enyi m n’ụlọ akwụkwọ si ebi ndụ otú sọrọ ha masịrị m.”

Ọ̀ Dị Njọ Ichewe Otú Ahụ?

Onye so dee Baịbụl bụ́ Esaf nwere mgbe ọ nọ na-eche ná ndụ ya ma ọ̀ badịrị uru ibi ndụ otú dị Chineke mma. O dere, sị: “Amalitere m inwere ndị na-etu ọnụ anyaụfụ, mgbe m hụrụ udo ndị ajọ omume nwere.” O kwudịrị, sị: “N’ezie, ọ bụ n’efu ka m meworo ka obi m dị ọcha, kwọọkwa aka m iji gosi na aka m dị ọcha.”—Abụ Ọma 73:3, 13.

O doro anya na Jehova bụ́ Chineke ghọtara na mgbe ụfọdụ ndị mmadụ nwere ike ichewe ma ọ̀ bakwadịrị uru ibi ndụ otú o kwuru ka a na-ebi. A sị kwuwe, ọ bụ ya mere ka e dee ihe ahụ Esaf chere n’echiche na Baịbụl. N’ikpeazụ, Esaf kwetara na ibi ndụ otú iwu Chineke kwuru bụ ụzọ kacha mma isi bie ndụ. (Abụ Ọma 73:28) Olee ihe mere o ji kweta? Esaf maara ihe. Ihe mere o ji kweta abụghị maka na ihe ọjọọ dakwasịrị ya, kama, ọ bụ n’ihi na ọ mụtara ihe ná mmehie ndị ọzọ. (Abụ Ọma 73:16-19) Ị̀ ga-emeli ihe ahụ o mere?

Tụlee Ihe Na-eme Eme

Eze Devid emeghị ka Esaf. Ọ tara ahụhụ tupu ya amụta na ndị leghaara ihe Chineke kwuru anya na-ahụsi anya. Devid dinara nwunye otu n’ime ndị na-ejere ya ozi, gbalịakwa ikpuchi ihe o mere. N’ihi ya, o mejọrọ ndị ọzọ, mejọọkwa Chineke. O butekwaara ya nchegbu dị ukwuu. (2 Samuel 11:1-12:23) Mgbe Devid chegharịsịrị, Jehova si n’ike mmụọ nsọ ya kpalie ya ikwu otú obi dị ya n’abụ, meekwa ka e chekwaa okwu ndị ahụ n’ime Baịbụl maka abamuru anyị. (Abụ Ọma 51:1-19; Ndị Rom 15:4) Ya mere, ịmụta ihe ná njehie nke ndị ọzọ na-egosi na mmadụ maara ihe. Akwụkwọ Nsọ kwadokwara ya.

Iji nyere gị aka iṅomi ihe nlereanya Esaf ma zere mmehie Devid, tụlee ihe ụfọdụ ndị na-eto eto si ná mba dị iche iche kwuru, bụ́ ndị nwere mgbe ha hapụrụ ibi ndụ otú Baịbụl kwuru ka a na-ebi. Ihe ha mere bụ na ha kwara iko. Dị ka Devid mere, ha esila ná njehie ha chegharịa, ha na Chineke adịghachila ná mma. (Aịzaya 1:18; 55:7) Lee ihe ha nwere ikwu.

Teta!: Olee ihe ndị mebiri echiche gị na omume gị?

Deborah: “N’ụlọ akwụkwọ anyị, ahụrụ m na onye ọ bụla nwere enyi nwoke na enyi nwaanyị. O yikwara ka obi ọ̀ dịcha ha ụtọ. Mụ na ha soro kpapụ, m na-ahụkwa ka ha na-esusu ọnụ, na-amakụkwa ibe ha. M na-agbapụ iche, ya adịkwa m ka m bụrụ ha. Mgbe mgbe, m na-amụrụ anya ọtụtụ awa na-arọ nrọ ebe mụ na nwata nwoke ihe ya dị mụ mma nọ. Nke a mekwuru ka m chọọ ka mụ na ya na-anọ nakwa ka m mee ihe ọ bụla iji mezuo ihe ahụ na-agụ m.”

Mike: “M na-agụ akwụkwọ ndị na-akọ na mmekọahụ magburu onwe ya, na-ekirikwa ihe ndị na-akwado ya. Iso ndị enyi m na-akọ banyere mmekọahụ mere ka ọ gụsiwekwuo m ike. Naanị mụ na nwa agbọghọ nọrọzie, m na-eche na anyị nwere ike ịmetụwe ibe anyị aka n’enweghị mmekọahụ, na m nwere ike ịkwụsị mgbe ọ bụla m chọrọ.”

Andrew: “Ikiri ihe na-akpali mmekọahụ n’Intanet maara m ahụ́. M malitere ịṅụ oké mmanya. Mụ na ndị ntorobịa ndị na-adịghị eme ihe Baịbụl kwuru na-agakwa oriri na nkwari.”

Tracy: “Mgbe m dị afọ iri na isii, naanị ihe dị m mkpa bụ ka mụ na enyi m nwoke nọrọ. N’ime obi m, amaara m na mmadụ inwe mmekọahụ tupu ya alụọ di dị njọ, ma, akpọghị m ya asị. Achọghị m ịmalite inwe mmekọahụ tupu mụ alụọ di, ma ejitelighị m onwe m. Ruo oge ụfọdụ, akọnuche m amaghị m ikpe.”

Teta!: Otú ahụ i si bie ndụ ò mere gị obi ụtọ?

Deborah: “Ná mmalite, ọ dị m ka mụ enwerela onwe m. Obi dịkwa m ụtọ na mụ emechaala mewe ka ndị ọgbọ m. Ma, obi ụtọ ahụ adịteghị aka. Onwe m siwere m ísì, ùgwù m nwere lakwara. O nwekwaghị ihe fọrọ m n’ahụ́. M nwere mwute dị ukwuu na mụ abụghịzi nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, o nweghịkwa otú m ga-esi bụrụ ya ọzọ. Kemgbe ahụ, ajụọla m onwe m ugboro ugboro, sị, ‘Oleedị ihe kara m obi m ji gaa mewe omume ahụ?’ M na-ajụkwa onwe m, sị, ‘Gịnị mere—gịnị mere m ji leghara ụkpụrụ Jehova ji ịhụnanya nye anyị anya?’”

Mike: “Ọ malitere ịdị m ka ò nwere ebe nwụrụ anwụ n’ahụ́ m. M gbalịrị ka m leghara otú omume m si enye ndị ọzọ nsogbu anya, ma, o kweghị m. O wutere m ịmata na mgbe m na-ekpori ndụ, m nọ na-emejọ ndị ọzọ. Ụra ekwekwaghị m ohihi. Mmekọahụ rụrụ arụ mesịkwara kwụsị ịtọ m ụtọ. Mwute na ihere zuru m ahụ́.”

Andrew: “Ọ malitere ịdịkwuru m mfe ime ihe ọjọọ ndị batara m n’obi. Ma, n’otu mgbe ahụ, obi m nọ na-ama m ikpe, onwe m gwụkwara m ike.”

Tracy: “O teghị aka mụ aghọta ihe m mere onwe m. Omume rụrụ arụ mebiiri m ihe n’oge m na-eto agbọghọ. M chere na mụ na enyi m nwoke ga na-ekpori nnọọ ndụ. Anyị ekporighị ndụ. Ihe anyị kpataara onwe anyị bụ mwute, nhụsianya, na obi mgbu. Kwa abalị m na-ebe ákwá n’ihe ndina m, na-ekwu na a sị na m maara m gaara eme ihe otú Jehova kwuru.”

Teta!: Olee ndụmọdụ ị ga-enye ndị ntorobịa ndị na-eche na ibi ndụ otú Baịbụl kwuru agaghị ekwe ha ṅụrụ mmiri tọgbọ iko?

Deborah: “Ndụ gị agaghị aka mma ma i leghara ihe Baịbụl kwuru anya. Chee echiche otú obi ga-adị Jehova ma i soro ndụmọdụ ya. Chee echiche nke ọma banyere ihe ndị ga-esi n’ileghara ndụmọdụ ya anya pụta. Echefula na ọ bụghị naanị gị ka ihe ị chọrọ ime gbasara. Ọ gbasakwara ndị ọzọ. Ọ bụrụ na i leghara ndụmọdụ Chineke anya, ị ga-emebiri onwe gị ihe.”

Mike: “N’eziokwu, otú ndị ọgbọ gị si ebi ndụ nwere ike iyi ka ọ̀ magburu onwe ya ma i lerughị anya. Ma, leruo anya ala tupu gị emee ihe ọ bụla. Ùgwù gị na ọbụbụ ị bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ma ọ bụ nwa okoro na-amaghị nwaanyị so n’ihe ndị kacha baa uru Jehova nyere gị. Ịtụfu onyinye ndị ahụ maka na i nweghị ike ijide onwe gị bụ iweda onwe gị ala. Kọọrọ nne na nna gị na ndị ọzọ torola eto banyere nsogbu gị. Ọ bụrụ na i mehie ihe, kọọrọ ha ozugbo ma mezie ihe i mebiri. Ọ bụrụ na i mee ihe otú Jehova kwuru, obi ga-eru gị ala.”

Andrew: “Mgbe ị na-amachabeghị ihe, ị ga-eche na otú ndị ọgbọ gị si ebi ndụ atọgbuola onwe ya. Àgwà ha ga-emetụta gị. Ya mere, jiri amamihe họrọ ndị ga-abụ ndị enyi gị. Tụkwasị Jehova obi, ọ ga-eme ka i zere ịkwa m makwaara.”

Tracy: “Echela, sị, ‘Ọ gaghị eme m.’ Mama m kpọrọ m gwa m hoo haa na omume m ga-ebutere m obi mgbawa n’ikpeazụ. Nke a were m ezigbo iwe! Echere m na m maara ihe. Ma, o nweghị ihe m ma. Bie ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Jehova, ka ndị enyi gị bụrụkwa ndị na-eme otú ahụ. Nke a ga-aka enye gị obi ụtọ.”

Ihe Baịbụl Kwuru—Ọ̀ Na-ejichi Mmadụ Ejichi Ka Ọ̀ Na-echebe Mmadụ?

Ọ bụrụ na ndị ọgbọ gị akwaa gị emo maka na ị na-agbalị ibi ndụ otú Baịbụl kwuru, jụọ onwe gị ajụjụ ndị a: ‘Gịnị mere ha ji ajụ ibi ndụ otú Baịbụl kwuru ka a na-ebi? Hà agụọla Baịbụl n’onwe ha wee chọpụta uru a na-erite n’irube isi n’iwu Chineke? Hà ejirila nlezianya tụlee ọghọm na-aghọ ndị na-eleghara ihe Chineke kwuru anya? Ka ihe ha na-eme ọ̀ bụ naanị ihe ha hụrụ ndị ọzọ na-eme?’

Ikekwe, o nwere ndị ị maara ‘na-eso ìgwè mmadụ.’ (Ọpụpụ 23:2) Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ imere onwe gị mkpebi? Olee otú ị ga-esi mee nke a? Ọ bụ site n’ịgbaso ndụmọdụ Baịbụl nke bụ́ ‘ịchọpụta n’onwe gị ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.’ (Ndị Rom 12:2) Jehova bụ ‘Chineke obi ụtọ,’ ọ chọkwara ka i nwee obi ụtọ. (1 Timoti 1:11; Ekliziastis 11:9) Ụkpụrụ ndị e dere na Baịbụl bụ maka abamuru gị. N’eziokwu, i nwere ike ile ha anya dị ka ihe na-adịghị ekwe gị ṅụrụ mmiri tọgbọ iko. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na otú Baịbụl kwuru ka anyị si na-ebi ndụ na-echebe anyị ka anyị ghara imerụ ahụ́, dị nnọọ ka belt oche ụgbọala si echebe onye nọ n’ụgbọala ma e nwee ihe ọghọm.

N’eziokwu, Baịbụl bụ akwụkwọ i nwere ike ịtụkwasị obi. Ọ bụrụ na i kpebie ibi ndụ otú o kwuru ka ị na-ebi, ọ bụghị naanị na ị ga-eme ka obi dị Jehova ụtọ, kamakwa, ọ ga-abara gị uru.—Aịzaya 48:17.

Ị gaa n’Intanet, ị ga-enweta ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . . ” n’adres bụ́ www.watchtower.org/ype

[Ihe odide ala ala peeji]

^ par. 17 A gbanwere aha ndị e kwuru okwu ha n’isiokwu a.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

▪ Olee ihe nwere ike ime ka o siere gị ike ibi ndụ otú Baịbụl kwuru ka a na-ebi?

▪ Olee ihe mere o ji dị mkpa ka ị chọpụta n’onwe gị na ibi ndụ otú Chineke chọrọ ka anyị na-ebi bụ ụzọ kacha mma isi ebi ndụ?