Ọpụpụ 22:1-31

  • Iwu e nyere ndị Izrel (1-31)

    • Gbasara izu ohi (1-4)

    • Gbasara imebi ihe a kụrụ n’ubi (5, 6)

    • Gbasara ịkwụ mmadụ ụgwọ ihe ya (7-15)

    • Gbasara ịrafu mmadụ (16, 17)

    • Gbasara ife Chineke na imegbu mmadụ (18-31)

22  “Ọ bụrụ na mmadụ ezuo ehi ma ọ bụ atụrụ, wee gbuo ya ma ọ bụ ree ya, ọ ga-eji ehi ise kwụọ ụgwọ ehi ahụ, jirikwa atụrụ anọ kwụọ ụgwọ atụrụ ahụ.+ 2  (“Ọ bụrụ na a hụ onye ohi+ ka ọ na-abanye n’ụlọ mmadụ n’abalị, a kụgbuo ya, ikpe ọbara amaghị onye gburu ya. 3  Ọ bụrụ na anyanwụ awaala mgbe onye ohi ahụ bịara, ikpe ọbara mara onye gburu ya.) “Onye ohi ga-akwụ ụgwọ ihe o zuru. Ọ bụrụ na e nweghị ihe o nwere, a ga-ere ya kwụọ ụgwọ ihe o zuru. 4  Ọ bụrụ na a hụ ihe o zuru n’aka ya mgbe ihe ahụ ka dị ndụ, ọ ga-akwụ ụgwọ ya okpukpu abụọ, ma ọ̀ bụ ehi ma ọ̀ bụ jakị ma ọ̀ bụ atụrụ. 5  “Ọ bụrụ na mmadụ akpọpụ anụmanụ ya ka ha gaa taa nri n’ugbo ma ọ bụ n’ubi vaịn, ha ataa nri n’ugbo onye ọzọ, onye ahụ ga-eji ugbo ya kacha mma ma ọ bụ ubi vaịn ya kacha mma kwụọ ụgwọ ya. 6  “Ọ bụrụ na a mụnyere ọkụ, ya abanye n’osisi ogwu ma rechapụ ọka* ndị e kere n’ùkwù n’ùkwù ma ọ bụ ọka ndị kwụ ọtọ ma ọ bụ ubi, onye mụnyere ọkụ ahụ ga-akwụ ụgwọ ihe ọkụ ahụ mebiri. 7  “Ọ bụrụ na mmadụ enye mmadụ ibe ya ego ma ọ bụ ihe ọzọ ka o jidere ya, e wee zuru ya n’ụlọ onye ahụ, ọ bụrụ na a hụ onye zuru ya, ọ ga-akwụ ụgwọ ya okpukpu abụọ.+ 8  Ọ bụrụ na a hụghị onye zuru ya, a ga-akpọta onye nwe ụlọ ahụ n’ihu ezi Chineke+ ka a mara ma ọ̀ bụ ya weere ihe mmadụ ibe ya. 9  Mgbe ọ bụla mmadụ abụọ na-ese okwu n’ihi ehi, jakị, atụrụ, uwe, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ furu efu maka na otu onye sịrị, ‘Ọ bụ m nwe ihe a,’ ha abụọ ga-abịa n’ihu ezi Chineke.+ Onye ọ bụla Chineke kwuru na ọ bụ ya ka ikpe mara ga-akwụ onye nke ọzọ ụgwọ ihe ahụ okpukpu abụọ.+ 10  “Ọ bụrụ na mmadụ kpụnyere mmadụ ibe ya jakị ma ọ bụ ehi ma ọ bụ atụrụ ma ọ bụ anụ ụlọ ọ bụla ọzọ ka o lekọtara ya, o wee nwụọ ma ọ bụ e merụọ ya ahụ́ ma ọ bụ a kpụrụ ya, ma e nweghị onye hụrụ ihe merenụ, 11  onye a kpụnyere anụ ahụ ga-aṅụ iyi n’ihu Jehova na ya emetụghị ihe mmadụ ibe ya aka. Onye nwe anụ ahụ ga-ekwere ihe o kwuru. Onye ahụ a kpụnyere ya agaghị akwụ ụgwọ ya.+ 12  Ma ọ bụrụ na e zuru anụ ahụ mgbe ọ ka nọ n’aka ya, ọ ga-akwụ onye nwe ya ụgwọ ya. 13  Ọ bụrụ na ọ bụ anụ ọhịa dọgburu ya, ọ ga-ebute ozu anụ ahụ ka ọ bụrụ ihe akaebe. Ọ gaghị akwụ ụgwọ anụ ọ bụla anụ ọhịa dọgburu. 14  “Ma ọ bụrụ na mmadụ agbaziri anụmanụ mmadụ ibe ya, anụmanụ ahụ emerụọ ahụ́ ma ọ bụ nwụọ mgbe ọ na-anọghị n’aka onye nwe ya, onye ahụ gbaziiri ya ga-akwụ ụgwọ ya. 15  Ọ bụrụ na ọ nọ n’aka onye nwe ya, ọ gaghị akwụ ụgwọ ya. Ọ bụrụ na a kwụrụ onye nwe ya ụgwọ gbaziri ya, ego ahụ a kwụrụ ga-abụzi ụgwọ anụ ahụ. 16  “Ọ bụrụ na nwoke arafuo nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke a na-ekwebeghị nkwa ọlụlụ, ya na ya enwee mmekọahụ,* ọ ga-akwụ ụgwọ isi ya lụwa ya.+ 17  Ọ bụrụ na nna nwa agbọghọ ahụ ekweghị ka nwoke ahụ lụọ ya, ọ ga-akwụ ego ole a na-akwụ n’isi nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. 18  “Ahapụla nwaanyị na-agba afa ndụ.+ 19  “A ga-egbu onye ọ bụla ya na anụmanụ nwere mmekọahụ.+ 20  “Onye ọ bụla chụụrụ chi ọ bụla àjà ma e wepụ naanị Jehova, a ga-egbu ya.+ 21  “Unu emesila onye mbịarambịa ike, unu emegbukwala ya,+ n’ihi na e nwere mgbe unu bụ ndị mbịarambịa n’Ijipt.+ 22  “Unu emegbula nwaanyị di ya nwụrụ ma ọ bụ nwa na-enweghị nna.*+ 23  E nwee ka unu si megbuo ya, ya ebesara m ákwá, m ga-anụ ákwá ya.+ 24  M ga-ewesa unu ezigbo iwe, m ga-ejikwa mma agha gbuo unu. Ndị nwunye unu ga-abụ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, ụmụ unu ga-abụkwa ụmụ na-enweghị nna. 25  “Ọ bụrụ na i binye onye ọ bụla bụ́ ogbenye n’ime ndị m gị na ya bi ego, emesola ya otú ndị na-anara ọmụrụ nwa ma ha binye mmadụ ego si eme. Anarala ya ọmụrụ nwa.+ 26  “Ọ bụrụ na ị chịrị uwe mmadụ ibe gị ka ọ bụrụ ihe ibé mgbe i binyere ya ego,+ ị ga-achịghachiri ya uwe ya mgbe anyanwụ dara. 27  N’ihi na ọ bụ naanị ákwà o nwere o ji ekpuchi ahụ́ ya. Gịnịzi ka ọ ga-eji hie ụra?+ O besara m ákwá, m ga-anụ olu ya n’ihi na m na-eme ebere.*+ 28  “Akpọla Chineke iyi.*+ Akpọkwala onye na-achị* ndị gị iyi.+ 29  “Ejila obi abụọ enye m onyinye mgbe ubi gị mepụtara ihe n’ụba nakwa mgbe mmanya na mmanụ juru n’ebe a na-azọchapụtara gị mmanya na mmanụ.+ Ị ga-enye m nwa nwoke mbụ ị mụtara.+ 30  Ihe a ka ị ga-eme ehi gị na atụrụ gị:+ Ya na nne ya ga-anọ ruo ụbọchị asaa. N’ụbọchị nke asatọ, ị ga-enye m ya.+ 31  “Unu ga-abụrụ m ndị dị nsọ.+ Unu erikwala anụ ọ bụla anụ ọhịa dọgburu n’ọhịa.+ Unu ga-atụpụrụ ya nkịta.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Na Hibru, “edinaa.”
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”
Ma ọ bụ “na-eme amara.”
Ma ọ bụ “onyeisi.”
Ma ọ bụ “Ekwujọla Chineke.”