Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ Anụ E Ji Mere Enyi nke A Hụrụ n’Anya Ka Ọ̀ Bụ Ajọ Ogbu Ọchụ?

Ọ̀ Bụ Anụ E Ji Mere Enyi nke A Hụrụ n’Anya Ka Ọ̀ Bụ Ajọ Ogbu Ọchụ?

Ọ̀ Bụ Anụ E Ji Mere Enyi nke A Hụrụ n’Anya Ka Ọ̀ Bụ Ajọ Ogbu Ọchụ?

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA POLAND

OTU nkịta anya dị ọkụ tara otu onye ji ịgba mwemwe ọsọ emega ahụ́, e mesịa, ọbara gbagburu ya. Otu nwa agbọghọ bụ onye nkịta Rottweiler ya, tagburu. Otu ụdị nkịta ndị uwe ojii kpafuru akpafu merụrụ otu nwatakịrị nwoke dị afọ itoolu ahụ́ n’ụzọ dị njọ n’ihu nne na nna ya. Ndị a bụ nanị ole na ole n’ime ọdachi ndị otu ụdị nkịta kpataworo na Poland.

Iji gbochie ọdachị ndị dị otú ahụ, n’ebe ụfọdụ, ndị ọchịchị na-ekwe ka ndị mmadụ nwee ụdị nkịta ụfọdụ nanị mgbe ha natasịworo satifiketi. Barbara Zaleska, bụ́ onye so n’Òtù Na-elekọta Nkịta na Poland kwuru na ọ bụ onye nwe nkịta ka e kwesịrị ide satifiketi maka ya kama ịdị na-ede ha maka nkịta “n’ihi na ọ bụ onye nwe ya na-ekpebi ma nkịta mastiff, nkịta Rottweiler, na nkịta bullterrier hà ga na-eme dị ka ajọ anụ ọhịa ka hà ga-anọgide na-abụ enyi ụmụ mmadụ.”

N’ọnọdụ ụfọdụ, a na-ama ụma azụ nkịta ka ha bụrụ nkịta ndị na-egbu ọchụ. A sịrị na usoro ndị na-azụ ya na-eji eme ihe na-agụnye iti ha ihe, ịkwụwa ha agụụ, na ọbụna “ịkụziri ha otú e si atagbu ihe,” bụ́ nke gụnyere ịzụ nkịta ahụ ịwakpo na ịdọri nwa bebi. E mesịa, a na-eme ka nkịta ahụ wakpoo nkịta ndị ike ha karịrị nke ha bụ́ ndị o doro anya na ha ga-egbu. Mgbe a zụsịrị ya, nkịta ahụ na-adị njikere ikere òkè n’ọgụ nkịta, bụ́ nke na-atọgbu ndị na-agba chaa chaa na ndị na-ekiri ya bụ́ ndị akpịrị ọbara na-akpọ nkụ atọgbu.

Bible kwuru n’ụzọ doro anya otú Chineke si ele ịrụsa ụmụ anụmanụ arụrụala anya. Ọ na-ekwu, sị: “Onye ezi omume maara ndụ anụ ụlọ ya: ma obi ebere nile nke ndị na-emebi iwu bụ enweghị obi ebere.” (Ilu 12:10) Ndị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ adịghị arụsa ụmụ anụmanụ ajọ arụrụala. Anyị pụrụ inwe obi ụtọ na n’ụwa ọhụrụ Chineke, omume nke ịzụ ụmụ anụmanụ ịbụ ndị na-egbu ọchụ—n’ihi ntụrụndụ ma ọ bụ n’ihi nzube ọ bụla ọzọ—ga-akwụsị.—Abụ Ọma 37:9-11.