Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ekpere Ndị Chineke Na-anụ

Ekpere Ndị Chineke Na-anụ

 Echiche nke Bible

Ekpere Ndị Chineke Na-anụ

“Nọgidenụ na-arịọ, a ga-enyekwa unu; nọgidenụ na-achọ, unu ga-achọtakwa; nọgidenụ na-akụ, a ga-emeghekwara unu. N’ihi na onye ọ bụla na-arịọ na-anata, onye ọ bụla na-achọkwa na-achọta, a ga-emeghekwara onye ọ bụla nke na-akụ.”—LUK 11:9, 10.

N’IGOSI ntụkwasị obi zuru ezu n’okwu Jizọs Kraịst bụ́ nke e hotara n’elu, ọtụtụ Ndị Kraịst na-echigharịkwuru Chineke n’ekpere banyere nsogbu na nchegbu ha dị iche iche, na-enwe obi ike na ọ hụrụ ha n’anya ma na-eche banyere ha. Otú ọ dị, ụfọdụ na-enwe obi nkoropụ ka ha nọ na-echere ka a zaa ekpere ha. Ì chere na ekpere gị enweghị isi? Chineke ọ̀ na-ege ntị mgbe ị na-ekpe ekpere?

Ọ bụrụgodị na o yie ka a zaghị ekpere anyị, nke a apụtaghị na Chineke anụghị ha. Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Anya Jehova na-elekwasị ndị ezi omume, ntị ya dịkwa n’arịrịọ ha na-arịọsị ike.” (1 Pita 3:12) Ya mere, Jehova Chineke na-anụ ekpere ndị ezi omume, ma è kpepụtara ha ekpepụta ma è kpere ha n’ime obi. (Jeremaia 17:10) Jehova na-enyochakwa echiche na mmetụta na-akpali ekpere ọ bụla, nke ọbụna onye ahụ na-ekpe ekpere nwere ike ọ gaghị aghọtazu ma ọ bụ mara.—Ndị Rom 8:26, 27.

Otú ọ dị, ekpere aghaghị iru ihe ụfọdụ a chọrọ ma ọ bụrụ na Chineke ga-anabata ya. Nke mbụ, a ghaghị ikpegara ya nanị Chineke—ọ bụghị Jizọs, onye “senti” ma ọ bụ arụsị. (Ọpụpụ 20:4, 5) A ghaghịkwa ikpe ekpere n’aha Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst. (Jọn 14:6) Nke a ọ̀ pụtara na Jizọs na-ebu ụzọ nụrụ ekpere anyị nakwa na ọ na-ezigara Chineke ozi dị na ya? Ee e. Kama nke ahụ, site n’ikpegara Jehova ekpere n’aha Jizọs, anyị na-egosi na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst, anyị na-ekwetakwa na ọ bụ  nanị n’ihi mgbapụta sitere n’aka ya ka anyị nwere ike ịbịaru Chineke nso.—Ndị Hibru 4:14-16.

A ghaghị iji okwukwe na-ekpe ekpere. Onyeozi bụ́ Pọl kọwapụtara, sị: “Ma okwukwe adịghị ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị [Chineke] ezi mma, n’ihi na onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, nakwa na ọ bụ onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Olee otú mmadụ sị ama ma ò nwere ụdị okwukwe ahụ? Otu onye so dee Bible, nke bụ́ Jems na-aza, sị: “M ga-egosikwa gị okwukwe m site n’ọrụ m.” (Jems 2:18) Ee, okwukwe na-eduga n’ịrụ ọrụ, ọrụ ndị ahụkwa, n’aka nke ọzọ, na-egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya ma na-agbalị ime ihe ga-atọ ya ụtọ.

Ndị na-efe Chineke ofufe aghaghị ịnọgide na-ekpe ekpere. Jizọs mere ka nke a pụta ìhè na Luk 11:9, 10, bụ́ nke e hotara ná mmalite. E kwuwerị, o bụrụ na mmadụ na-ekpe ekpere nanị otu ugboro banyere otu ihe, nke a ọ́ dịghị egosi na ihe ahụ ọ na-arịọ adịghị ya mkpa n’ezie?

Ihe Chineke Kwere ná Nkwa

N’agbanyeghị ugboro ole anyị na-ekpe ekpere nakwa otú anyị si na-ekpesi ya ike, anyị ka na-ebi n’ime “oge pụrụ iche nke siri ike obibi.” (2 Timoti 3:1) Ọ bụ ezie na Jizọs kwuru na ụmụazụ ya ga-enwe obi ụtọ, o kwughị na ha agaghị enwe nsogbu ná ndụ ma ọlị. (Matiu 5:3-11) Otú ọ dị, o kwuru na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ inwe obi ụtọ n’agbanyeghị iru újú, agụụ, akpịrị ịkpọ nkụ, ma ọ bụ mkpagbu.

Obi ụtọ nke Jizọs kwuru okwu ya adịghị adabere n’ọnọdụ anyị ịbụ ndị kwesịrị ekwesị. Kama nke ahụ, ọ bụ afọ ojuju onwe onye nke anyị na-enwe n’ihi na anyị na-ejere Chineke ozi. N’ihi ya, anyị pụrụ inwe obi ụtọ ruo n’ókè ụfọdụ ọbụna n’ime oké ọgba aghara.—2 Ndị Kọrint 12:7-10.

Ịhụ Maka Nsogbu Onwe Onye

Ya bụrụ otú ahụ, ọ̀ bụ ihe na-enweghị isi, bụ́ ikpegara Chineke ekpere maka mkpa onwe onye ndị dị ka ịchọta onye òtù ọlụlụ kwesịrị ekwesị ma ọ bụ ịhụ maka nsogbu ezinụlọ, nsogbu ahụ́ ike ma ọ bụ nsogbu metụtara ọrụ? Ee e, n’ihi na, ọ bụ ezie na Chineke adịghị ekwe nkwa ịgbanwe ọnọdụ ndụ anyị n’ụzọ ọrụ ebube, ọ ga-enye anyị amamihe iji nagide ha. Jems dere n’ihe banyere ọnwụnwa, sị: “Ọ bụrụ na amamihe kọrọ onye ọ bụla n’ime unu, ka ọ nọgide na-arịọ Chineke, n’ihi na o ji mmesapụ aka na-enye mmadụ nile ihe, n’akọchaghịkwa akọcha; a ga–enyekwa ya.” (Jems 1:5) Ya mere, Jehova ga-eduzi anyị site na mmụọ nsọ ya. Nke a ga-enyere anyị aka ịghọta na itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ mgbe anyị na-eme mkpebi dị iche iche.

N’ezie, mmụọ Chineke adịghị emere anyị mkpebi. Kama ya, a chọrọ mgbalị onwe onye. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị nwere nsogbu, ànyị emewo nchọpụta banyere ya ma nyochaa ihe nile metụtara ọnọdụ ahụ? Nke a ga-abụ ọrụ ga-egosi Chineke na anyị nwere okwukwe. (Jems 2:18) Ànyị anọgidewo na-agbalị idozi nsogbu anyị, nọgide na-arịọ maka nduzi Chineke? (Matiu 7:7, 8) Ànyị ejiriwo nlezianya nyochaa ụkpụrụ Bible ndị metụtara ọnọdụ ahụ? Okwu Chineke pụrụ ime ka anyị “ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ ndị a kwadebere n’ụzọ zuru ezu maka ezi ọrụ nile ọ bụla.”—2 Timoti 3:16, 17.

Ọ bụ ezie na Chineke nwere ike itinye aka n’ihe omume ụmụ mmadụ ma wepụ nsogbu nile anyị nwere, o nyewo anyị ohere iji ikike anyị nwere ime nhọrọ mee ihe. N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị na–eji ikike ime nhọrọ ha nwere eme ihe n’ụzọ na-emerụ ndị ọzọ ahụ́. N’ihi ya, ụfọdụ n’ime nsogbu ndị anyị na-ekpe ekpere maka ha pụrụ ịdịgide ruo mgbe ụwa ọhụrụ Chineke ga-abịa. (Ọrụ 17:30, 31) O nwere ike ịbụ ọnọdụ nke dị n’ógbè ebe anyị bi, ihe dị ka ime mpụ ma ọ bụ ibu agha; ma ọ bụ ọ pụrụ ịgụnye anyị ịtachi obi n’ihe isi ike nke ndị mmegide kpatara. (1 Pita 4:4) Anyị aghaghị ikweta na n’ime ụwa a nke na-adịghị asọpụrụ Chineke, ọnọdụ ụfọdụ agaghị aka mma.

Ka o sina dị, Chineke hụrụ ndị na-efe ya ofufe n’anya, ọ chọkwara inyere ha aka. Mgbe Alaeze ya ga-amalite ịchị ụwa n’enweghị ihe ịma aka, ọ ga-ewepụ kpam kpam ajọ nsogbu nile nke ụwa a. (Mkpughe 21:3, 4) Ma ka ọ dịgodị, anyị kwesiri ịnọgịde na-arịọ maka nduzi ya iji hụ maka nsogbu dị iche iche a na-enwe ná ndụ. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova ga-emezu nkwa ahụ e dekọrọ na Bible n’Aịsaịa 41:10: “Atụla egwu gị ka m nọnyeere; elela anya gburugburu n’ụjọ, n’ihi na Mụ onwe m bụ Chineke gị: M ga-agba gị ume; ee, M ga-enyere gị aka; ee, m ga-eji aka nri nke ezi omume m kwagide gị.”