Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ị Pụrụ Isi Nagide Nsogbu nke Ibi n’Etiti Ọha Mmadụ Na-atụfukarị Ihe

Otú Ị Pụrụ Isi Nagide Nsogbu nke Ibi n’Etiti Ọha Mmadụ Na-atụfukarị Ihe

 Otú Ị Pụrụ Isi Nagide Nsogbu nke Ibi n’Etiti Ọha Mmadụ Na-atụfukarị Ihe

“N’USORO okike . . . ọ dịghị ihe dị ka ihe na-abaghịzi uru.” Nke ahụ, dị ka magazin bụ́ Time si kwuo, bụ echiche nke otu onye a na-akwanyere ùgwù nke bụ́ ọkachamara n’ihe banyere imegharị ihe maka iji ya mee ihe ọzọ. Ọ na-ezo aka n’ụzọ dị ịrịba ama a na-esikarị eji ihe nwụrụ anwụ ma ọ bụ ihe a na-ejighịzi eme ihe, bụ́ nke sitere n’otu akụkụ nke usoro njikọ nke ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha, eme ihe n’ụzọ ga-abara akụkụ ndị ọzọ uru. A kọrọ na otu ọkachamara ahụ chere na “ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ iṅomi ụzọ nke enweghị ihe mkpofu nke usoro okike, ma, ọ ga-achọ nkà na ụzụ ọhụrụ na nnukwute mgbanwe n’akparamàgwà.”

 Ma eleghị anya, ihe ka ọtụtụ n’ime anyị apụghị imepụta nkà na ụzụ ọhụrụ. Ma anyị pụrụ ịchịkwa àgwà anyị! Inwe àgwà ziri ezi n’ebe ụkpụrụ ụfọdụ bụ́ isi nke àgwà kwesịrị ekwesị dị, ga-enyekwara anyị aka ịnagide nsogbu ndị a na-enwe n’ibi n’etiti ọha mmadụ na-atụfukarị ihe.

Abụla Onye Na-emefusị Ihe

Otu onye n’ime mmadụ ise ọ bụla nọ n’ụwa na-ebu agụụ alakpu ụra n’abalị. Ịmara nke a kwesịrị ime ka anyị buru n’uche mkpa ọ dị iji ihe oriri akpọrọ ihe na izere imefusị ya. Otu di na nwunye laghachiri Europe ka ha rụsịrị ọrụ ozi ala ọzọ ruo afọ 28 n’Africa kwuru na otu n’ime ihe ịma aka ndị kasị ukwuu ha nwere n’ịbụ ndị mba ha maraghachiri ahụ́ bụ ịnagide “ụzọ ndị mmadụ si atụfusị ihe oriri.”

Ndị nne na nna maara ihe na-akụziri ụmụ ha ikunye nanị nri ha ga-erichali n’efere ha. Ime otú ahụ na-ebelata ihe a ga-ekpofu na imefusị ihe. Ọ ka mma mmadụ ibu ụzọ kuru obere tupu o kwuo ka e kunyere ya ọzọ. N’eziokwu, ndị mụrụ ụmụ aghaghị isetịpụ ihe nlereanya. Jizọs setịpụụrụ anyị nile ihe nlereanya site n’igosi ezi ekele maka ndokwa Chineke, ma nke anụ ahụ́ ma nke ime mmụọ. Bible na-egosi na Jizọs jiri nlezianya zere imefusị ihe oriri—n’agbanyeghị na e nwetara ya n’ụba n’ụzọ ọrụ ebube!—Jọn 6:11-13.

A pụkwara itinye ụkpụrụ nke izere mmefusị ihe n’ọrụ n’ihe banyere uwe, ngwá ụlọ, na ígwè ọrụ. Ịrụzi ihe na iji ha na-eme ihe ruo ogologo oge o kwere mee, na-egosi na anyị nwere ekele maka ihe anyị nwere. Anyị ekwesịghị ịbụ ndị a ghọgburu site ná mgbalị nke ndị na-eme mkpọsa ngwá ahịa na-eme iji mee ka anyị gharazie inwe afọ ojuju n’ihe anyị nwere site n’ikwe anyị nkwa ihe buru ibu karị, ka mma, na-arụ ọrụ ngwa ngwa karị, sie ike karị. N’eziokwu, anyị pụrụ inwe ikike nke ịgbanwe ihe onwunwe ndị a ka pụrụ iji mee ihe. Ma tupu anyị emee otú ahụ, anyị kwesịrị ịtụle àgwà na ebumnobi anyị.

 Zere Anyaukwu

Ka ụmụ Izrel si n’ọzara na-aga Ala Nkwa ahụ, e nyere ha ihe oriri n’ụdị mana. Dị ka akụkọ Bible ahụ si kwuo, e nyere ha mana n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu. Otú ọ dị, a dọrọ ụmụ Izrel aka ná ntị ịghara inwe anyaukwu; ha kwesịrị iwere nanị nke ga-egboro ha mkpa ha nwere n’oge nke ọ bụla. Ndị nke nupụrụ isi chọpụtara na anyaukwu abaghị uru, n’ihi na mana ha rifọrọ gbara ikpuru ma malite isi ísì. (Ọpụpụ 16:16-20) N’ụzọ doro anya, Bible katọsiri anyaukwu ike ugboro ugboro.—Ndị Efesọs 5:3.

Ọ bụghị nanị Bible kwuru nke a. Dị ka ihe atụ, Seneca, onye Rom bụ́ ọkà ihe ọmụma na onye na-ede egwuregwu na narị afọ mbụ, chọpụtara na afọ adịghị eju onye anyaukwu. O kwuru, sị: “Nye onye anyaukwu ihe nile e kere eke pere nnọọ mpe.” Erich Fromm, bụ́ ọkà ihe ọmụma nke narị afọ nke 20, ruru nkwubi okwu yiri nke ahụ: “Anyaukwu yiri olulu na-enweghị nsọtụ bụ́ nke na-eme ka ike gwụ onye na-etinye mgbalị nile iji gboo mkpa ya, ma afọ adịghị eju ya.” E wezụga izere anyaukwu na mmefusị ihe, e nwere ọtụtụ ihe dị mma ọtụtụ ndị họwooro ime.

Mụta Isoro Ndị Ọzọ Kerịta Ihe

Tupu ị tụfuo ihe ndị ka dị mma, chee ma ọ̀ dị onye pụrụ inwe obi ụtọ iwere ha. Dị ka ihe atụ, mgbe ụmụaka tofere uwe ha, à pụrụ inyefe ha ụmụaka ndị ọzọ ka ha jiri ha mee ihe? Ị̀ pụrụ ime ihe yiri nke ahụ banyere ihe onwunwe ndị ọzọ ka bara uru bụ́ ndị ị na-adịkwaghị eji eme ihe otú ị na-ejibu ha eme? Soro onye ọzọ kerịta ọṅụ nke otu ihe onwunwe nyere gị site n’inyefe ya ihe ahụ. Onye America na-ede akwụkwọ na onye na-eme ihe ọchị bụ́ Mark Twain kwuru n’otu oge, sị: “Iji nweta ọṅụ zuru ezu, ị ghaghị inwe onye gị na ya ga-ekerịta ya.” Ikekwe ị chọpụtawo na ọṅụ e so onye ọzọ kerịta bụ ọṅụ a mụbara amụba. E wezụga nke ahụ, site n’isoro onye ọzọ kerịta ihe otú a, ị ga-enye aka gbochie mmetụta ọjọọ nke àgwà nke ịtụfu ihe na-enwe.

Isoro ndị ọzọ na-ekerịta ihe bụ omume ọma nke Bible na-atụsi aro ya ike. (Luk 3:11; Ndị Rom 12:13; 2 Ndị Kọrint 8:14, 15; 1 Timoti 6:18) N’ezie, lee ka ụwa ga-esi ka mma ma ọ bụrụ na mmadụ nile nọ na ya dị njikere isoro ndị ọzọ na-ekerịta ihe!

Nwee Afọ Ojuju n’Ihe Ndị Dị Mkpa

Onye nwere afọ ojuju na-enwe obi ụtọ. Nke a bụ eziokwu n’ebe nile. Otu ilu Gris na-ekwu, sị: “Onye obere ihe na-adịghị eju afọ, ọ dịghị ihe ga-eju ya afọ.” Nke Japan na-ekwukwa, sị: “Onye afọ na-adịghị eju bụ ogbenye.” Bible na-ekwukwa nnọọ okwu ọma banyere inwe afọ ojuju. Anyị na-agụ, sị: “N’ezie, ọ bụ ụzọ isi rite uru dị ukwuu, bụ́ nsọpụrụ Chineke a ya na inwe afọ ojuju. N’ihi na ọ dịghị ihe anyị webataworo n’ime ụwa, ọ dịghịkwa ihe anyị pụrụ iburu pụọ na ya. Ya mere, ebe anyị nwere ihe oriri na ihe mgbokwasị, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.”—1 Timoti 6:6-8; Ndị Filipaị 4:11.

Otú ọ dị, inwe afọ ojuju n’ihe anyị nwere pụrụ ịchọ “nnukwute mgbanwe n’akparamàgwà” anyị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Susanne chọpụtara n’oge na-adịbeghị anya na ọ dị mkpa ka ya mee mgbanwe dị otú ahụ. O kwuru, sị: “Ekpebiri m na ebe ọ bụ na apụghị m inweta ihe nile m chọrọ, aghaghị m ịmụta ịchọ ihe m nwere. Ugbu a enwere m obi ụtọ na afọ ojuju.”

Inwe afọ ojuju na-eweta obi ụtọ n’ezie. Prọfesọ Argir Hadjihristev, bụ́ onye Bulgaria bụ́ ọkachamara n’ihe banyere ịka nká, na-ekwu, sị: “Nke mbụ, ihe ọjọọ bụ́ isi bụ mmadụ enweghị afọ ojuju n’obere ihe o nwere.” N’izo aka n’abamuru ahụ́ ike nke inwe afọ ojuju na-eweta, ọ gbakwụnyere, sị: “Onye na-adịghị agbalị ibi ndụ dị mma karịa onye agbata obi ya, onye na-adịghị agbalị mgbe nile inwewanye ihe, na-ebi ndụ n’asọghị mpi, n’ihi ya kwa bụrụ onye na-adịghị enwe nchekasị. Nke ahụ dịkwa mma n’ahụ́.”

Ee, ọha mmadụ na-atụfukarị ihe apụghị iweta ezi obi ụtọ. Ọbụna ọ kadịrịị njọ ma e nwee àgwà nke ịtụfu ihe! O yiri ka ọnụ ọgụgụ na-ebuwanye ibu nke ndị mmadụ hà amalitewala ịghọta nke a. Ị̀ ghọtawala ya?

[Foto dị na peeji nke 9]

Ọ dị mkpa ka ụmụaka mụta ụzọ isi zere imefusị ihe oriri

[Foto dị na peeji nke 9]

Jizọs setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’izere mmefusị ihe

[Foto dị na peeji nke 10]

Gịnị ma i nye ndị ọzọ ihe ndị ị na-ejighịzi eme ihe kama ịtụfu ha atụfu?