Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Chi Jiri n’Ehihie

Mgbe Chi Jiri n’Ehihie

 Mgbe Chi Jiri n’Ehihie

SITE N’AKA NDỊ EDEMEDE TETA! N’ANGOLA NAKWA NA ZAMBIA

‘Ị̀ SỊRỊ chi iji n’ehihie? Ọ pụghị ime eme!’ ka ụfọdụ ndị pụrụ ikwu. Ọ bụghị nanị na ọ pụrụ ime eme kama ọ na-eme ọtụtụ ugboro n’afọ iri ọ bụla—mgbe ọ bụla ọnwa kpuchiri anyanwụ kpam kpam. Gịnị mere ọnwa ji ekpuchi anyanwụ, n’ihi gịnịkwa ka o ji abụ nnọọ ihe dị ịrịba ama ikiri? A ga-enweta azịza ya site n’ibu ụzọ tụlee ihe banyere ọnwa.

Ị̀ marala otú ọdịdị ọnwa na-esi agbanwe mgbe ọ na-agba ụwa gburugburu? Mgbe ọnwa nọ n’otu akụkụ, anyanwụ anọrọ n’akụkụ nke ọzọ n’ihu igwe, anyị na-ahụ ihe anyị na-akpọ ọnwa gbazuru agbazu ka ọ na-apụta n’ebe ọwụwa anyanwụ ka anyanwụ na-ada n’ebe ọdịda anyanwụ. Ka ọtụtụ ụbọchị na-agabiga, kwa abalị, ọnwa na-apụta mgbe oge ụfọdụ gasịrị, na-eji nwayọọ nwayọọ esi n’akụkụ ihu igwe ahụ gakwuruwa anyanwụ na-awa awa. Akụkụ na-enye ìhè nke ọnwa na-eji nwayọọ nwayọọ na-adịwanye obere, e mesịa ọ ghọọ ibé ọnwa nkịtị. Mgbe ọnwa na anyanwụ nọ n’ihu igwe n’otu ụbọchị dum, ọbụna ibé ọnwa ahụ na-apụ n’anya, ọnwa ahụkwa, bụ́ nke akụkụ ya gbachiri agbachi na-eche ihu n’ụwa, na-afọdụ nke nta ka a ghara ịhụ ya anya. A na-akpọ nke a ọnwa ọhụrụ. Usoro ahụ na-atụgharịzi, ọnwa na-esi n’ebe anyanwụ dị na-apụ ma mesịa ghọghachi ọnwa gbazuru agbazu. Ihe a na-eme ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụbọchị 28 ọ bụla.

Ihe bụ́ isi na-akpata chi iji n’ehihie bụ ọnwa ọhụrụ. Dị ka ọ na-adịkarị, ọ na-agafere nnọọ anyanwụ n’ihu igwe n’ehihie, anyị adịghị amata n’ihi na ụzọ ha na-aga na ya anọghị n’otu ahịrị. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, anyanwụ, ọnwa, na ụwa na-abịa nọrọ kpọmkwem n’otu ahịrị. Mgbe ahụ, ndò ọnwa na-ekpuchi ihu ụwa, na-akpata chi iji n’ehihie.

Ihe na-akpata chi iji n’ehihie bụ mmekọrịta pụrụ iche dị n’etiti anyanwụ, ọnwa, na ụwa. Anyanwụ buru oké ibu, na-aka ọnwa obosara ihe dị ka okpukpu 400. Otú ọ dị, n’ụzọ dị ịrịba ama, anyanwụ ji ihe dị ka okpukpu 400 dị anya site n’ebe anyị nọ karịa ọnwa. N’ihi ya, ọ na-eyi anyị ka anyanwụ na ọnwa ha fọrọ nke nta ka ha hara nhata. Ya mere, mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ iyi ka ọnwa ò kpuchiri anyanwụ kpam kpam.

Ka ọnwa wee nwee ike ikpuchi anyanwụ kpam kpam otú ahụ, ọ bụghị nanị na anyanwụ, ọnwa, na ụwa aghaghị ịnọ kpọmkwem n’otu ahịrị kamakwa ha aghaghị ime otú ahụ mgbe ọnwa nọ n’akụkụ ụzọ ya ahụ nke dịdebere ụwa. * N’oge ndị a, ọnụ ọnụ ndò ọnwa bụ́ nke yiri okoso na-eme ka ọchịchịrị gbaa n’ụzọ dị warara na mbara ụwa.

N’ihe banyere chi jiri n’ehihie June 21, 2001, onyinyo ya ga-eru kilomita 200 n’obosara. Akụkụ ga-agba ọchịchịrị gaje ịmalite n’oge anyanwụ ga-awa n’ụsọ oké osimiri ebe ọwụwa anyanwụ nke Ebe Ndịda America ma gafere Ebe Ndịda Atlantic, bụ́ ebe ọ ga-anọru ogologo oge kasịnụ bụ́ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ minit ise. Mgbe ọ gafesịrị Angola, Zambia, Zimbabwe, na Mozambique, ọ ga-ejedebe mgbe anyanwụ ga-ada n’ụsọ oké osimiri Madagascar. Ka anyị hụ otú ndị nọ n’Angola nakwa na Zambia bụ́ ndị kiriri ihe omume a dị ịrịba ama nke mere n’ihu igwe si hụ ya.

 Ndokwa Ndị E Mere Maka Ihe Omume Ahụ

N’ịbụ ndị nwere atụmanya dị elu, ndị ọkachamara n’ime nnyocha, ndị na-eji inyocha mbara igwe emere ihe ntụrụndụ, na ọtụtụ ndị ọzọ nubara n’Africa maka chi iji n’ehihie a nke narị afọ iri ọhụrụ. Ebe ọ bụ na Lusaka, Zambia, bụ nanị isi obodo nọ n’akụkụ ebe chi ga-eji n’ehihie, ọtụtụ ndị nleta tinyere isi n’ebe ahụ iji kirie ya.

Ikekwe nke a bụ ihe omume metụrụla na Zambia bụ́ nke kasị dọta mmasị ndị na-eme njem nleta. Nanị ụbọchị ole na ole tupu chi ahụ jiri n’ehihie, ọtụtụ puku ndị nleta jupụtara na Lusaka. E mewo nkwadebe maka ihe omume ahụ ọtụtụ ọnwa tupu oge ahụ eruo. E tinyejuru akwụkwọ maka iji họtel, ụlọ ndị ọbịa, ogige ebe ndị a na-eme mkpapụ, na ebe obibi ndị mmadụ mee ihe, bụ́ ebe ndị e nyere ìgwè ndị nleta ahụ ụlọ.

Ebe dị iche iche ọha na eze ga-anọ kirie ya gụnyere ọdụ ụgbọelu Lusaka, bụ́ ebe ndị nleta pụrụ irute n’ụtụtụ, kirie ihe omume ahụ, ma lawazie ná mgbede. Ruo ọtụtụ izu, ụlọ ọrụ telivishọn na redio mara ọkwa ihe omume ahụ dị ịrịba ama bụ́ nke na-abịanụ, na-adọ aka ná ntị ugboro ugboro banyere ihe ize ndụ dị n’ile anya kpọmkwem n’anyanwụ. Ọnụ ọgụgụ ugegbe anya ndị pụrụ iche a ga-eji kirie ya, bụ́ ndị e rere, karịrị ihe a tụrụ anya ya, ọtụtụ ụlọ ahịa rechakwara nke ha.

Otú ọ dị, ebe mbụ chi iji n’ehihie ahụ ga-ewere ọnọdụ na kọntinenti Africa bụ Angola, n’obodo Sumbe, bụ́ nke dị n’ụsọ oké osimiri. Ọ bụ n’ebe a ka ndị ga-ekiri ya ga-ahụ ka chi jiri n’ehihie ruo minit anọ na ọkara, bụ́ nke ga-anọkarịsị ọdụ n’ala akọrọ.

Ọtụtụ ọnwa tupu chi ahụ jiri n’ehihie, e debere n’isi obodo Angola, bụ́ Luanda nakwa n’obodo ndị ọzọ bụ́ isi, bọọdụ mkpọsa ndị na-ama ọkwa chi ahụ ga-eji n’ehihie ma na-adọ aka ná ntị banyere ihe ize ndụ ya. Onyinyo ọnwa ahụ gaje isi n’etiti mba ahụ gafere, n’ihi ya ndị Angola nile ma ọ dịghị ihe ọzọ ga-ahụ onyinyo ọnwa gbachitụrụ agbachi. Ndị Luanda ga-ahụ ka e kpuchiri pasent 96 nke ihu anyanwụ. Gọọmenti, site ná nkwado nke ụlọ ọrụ ndị mmadụ nwe, mere ndokwa ka a tụbata ọtụtụ nde ugegbe anya ndị pụrụ iche e ji ekiri anyanwụ, maka nkesa. E nyere ndị na-enweghị ego ọtụtụ n’ime ha n’efu.

Ebe bụ́ isi chi jiri n’ehihie n’Angola bụ Sumbe, bụ́ nke dị n’ọmarịcha warara ala dị larịị, bụ́ nke dị n’ụsọ oké osimiri dị n’agbata Ebe Ndịda Atlantic na etiti ala ugwu dị larịị nke Angola. Agha ndị kasị njọ, bụ́ ndị bibiworo Angola eruteghị akụkụ Sumbe, n’ihi ya ndị nleta batara n’obodo agha na-akpaghị aka bụ́ nke ihe dị ka mmadụ 25,000 na-ahụ n’anya ma nwee omume enyi bi na ya. Iji nye ndị nleta ahụ nile ụlọ, a kwadebere ebe ndị ọzọ a na-elekọta ndị na-eme njem nleta, e meziwanyekwara ụlọ ọrụ na-enye ọkụ eletrik n’ógbè ahụ. E mere ndokwa maka usoro izi ihe metụtara chi iji n’ehihie maka ndị ọkà mmụta sayensị, ndị minista gọọmenti, na ndị ọrụ na-akwalite ọdịmma ndị mmadụ bụ́ ndị sitere n’Angola nakwa ná mba ndị ọzọ. E wuru nnukwute ebe ihe nkiri n’ụsọ mmiri ahụ maka ihe omume ntụrụndụ buru ibu n’ụzọ a na-ahụtụbeghị mbụ na Sumbe.

Ụbọchị ahụ Na-akpali Akpali Eruo

Otu n’ime abamuru ndị dị n’ịnọ n’Angola kirie chi ahụ jiri n’ehihie bụ na ihu igwe na-adị mma na June. Ma cheedị banyere ihe mwute ọ bụ mgbe urukpuru kpuchiri ógbè Sumbe n’ụbọchị bu ụbọchị ahụ chi ga-eji n’ehihie ụzọ! Ná mgbede ahụ nile ruokwa n’ụtụtụ echi ya, nnukwute urukpuru kpuchiri obodo ahụ. Olileanya nile e nwere ịhụ ka ọnwa kpuchiri anyanwụ ọ̀ ga-adakpọ? Ka ọ na-erule oge chi bọchara urukpuru ahụ malitere ịgbasa, ka ọ na-erulekwa n’owu ụtụtụ, ihu igwe achawala anụnụ anụnụ n’enweghị urukpuru. Lee ahụ́ iru ala ọ bụ! N’otu aka ahụ, e nwere nchegbu na Zambia mgbe chi ọbụbọ gosiri ihu igwe gbachiri agbachi, nke jupụtara n’urukpuru. Ma n’ebe ahụkwa, ihu igwe gbachapụrụ ka oge na-aga. Gee ntị ka ndị ji anya ha hụ ihe merenụ na-akọwa otú ihe si mee.

Angola: “Anyị họọrọ ikiri mkpuchi ọnwa ga-ekpuchi anyanwụ ahụ n’ebe dị elu chere ihu n’oké osimiri. Ka oge awa ahụ na-eru nso, ìgwè mmadụ gbakọtara n’ụsọ mmiri obodo ahụ nakwa n’ebe ndị e wepụtara iche maka ịnọ kirie ihe omume ahụ. N’etiti ehihie, bụ́ mgbe ọnwa na-aga ịmalite ikpuchi anyanwụ, ọtụtụ ndị kpuuru ugegbe anya ha ma malite ile ‘mkpuchi’ mbụ ọnwa ga-ekpuchi ihu anyanwụ. N’oge na-adịghị anya mgbe etiti ehihie gasịrị, ọnwa malitere ikpuchi anyanwụ. E ji enyo e ji ahụ ihe dị n’ebe dị anya ma ọ bụ teliskop hụ ọtụtụ ntụpọ ojii dị n’ihu anyanwụ. Ndị na-ekiri ya hụrụ ka onyinyo ji nke nta nke nta na-ekpuchi ntụpọ ndị ahụ. Ka ọnwa gara n’ihu na-ekpuchi anyanwụ, ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ dalatara nke ukwuu, ìhè malitekwara ịcha ụcha pụrụ iche. N’ikpeazụ, ka onyinyo ahụ na-abịanụ kpuchiri ibé ikpeazụ nke anyanwụ ahụ, ọchịchịrị gbara.”

 Zambia: “Ebe ọ bụ na alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke Zambia dị na Makeni, Lusaka, ọ bụ ebe dị mma ịnọ kirie mkpuchi ọnwa ga-ekpuchi anyanwụ. N’elekere 3:07 nke ehihie, ọnwa malitere ikpuchi anyanwụ. Onyinyo ụfọdụ malitere ịbọ n’ahụ́ ụlọ, na-eme ka a hụ kpọm kpọm sitere n’ìhè. Ifufe belatara, ụmụ nnụnụ mechikwara ọnụ. Ụmụ anụmanụ bi n’ọhịa malitere ịkwadebe maka ụra abalị. N’elekere 3:09 nke ehihie, sekọnd ole na ole tupu ọnwa ekpuchie anyanwụ kpam kpam, ihu anyanwụ nke na-apụ n’anya fọdụziri kpọm kpọm ole na ole nke ìhè bụ́ ndị na-egbuke egbuke, e mesịa ya afọdụ nanị otu. A maara ihe omume ndị a dị ịtụnanya dị ka kpọm kpọm Baily na mgbaaka diamọnd n’otu n’otu. * Ihe sochiri ya bụ mgbukepụ ìhè na-acha pinki pinki, bụ́ nke na-eduga n’ọnwa ikpuchi anyanwụ kpam kpam nakwa n’ọchịchịrị!”

Angola: “Ọdịdị mgbaaka diamọnd ahụ na-enwu mara mara kpatara ihe ijuanya na iti mkpu. E mesịa, n’elekere 1:48 nke ehihie n’ógbè ahụ, ọnwa malitere ikpuchi anyanwụ kpam kpam. E nwere mmeghachi omume dịgasị iche iche. Ụfọdụ ndị nọ nnọọ na-ese foto. Ndị ọzọ malitere itikọ mkpu ọnụ, ‘Kpam kpam! Kpam kpam! Kpam kpam!’ Ndị ọzọ malitekwara ịfụ mkpọrọhịhị na iti mkpu n’ijuanya ka chi jiri n’ehihie. Ìhè na-egbukepụ egbukepụ yiri ka ọ̀ dị gburugburu anyanwụ ahụ ọnwa kpuchiri. Anyị pụrụ ịhụ ìhè na-enwu ka ọkụ gburugburu ọnụ ọnụ nke ọnwa ahụ gbara ọchịchịrị. Na mberede, dị nnọọ ka oge ọ gara ngwa ngwa, ọnwa gafetụrụ, ìhè anyanwụ ewee si n’akụkụ nke ọzọ nke onyinyo ahụ nwuo.

“Ka ihu anyanwụ malitere ịpụta, anyị hụrụ ntụpọ ojii ndị ahụ dị n’ihu anyanwụ, bụ́ ndị e kpuchiburu ekpuchi, ka ha si n’ọchịchịrị ahụ na-apụta otu otu ka ọdịdị gbara gburugburu nke anyanwụ ahụ, bụ́ nke a ma ama, ji nwayọọ nwayọọ na-apụtaghachi.”

Zambia: “Chi jiri n’ehihie n’ebe a ruo minit 3 na sekọnd 14, n’ihi ya, e nwere oge iji chee banyere ịdị ịtụnanya nke ihe omume ahụ. Ọchịchịrị gbara, ma e nwere mgbuketụ nke ìhè anyanwụ na ndịda mbara igwe. Ọ bụ ezie na ọ ka na-acha anụnụ anụnụ,  a hụrụ mbara ala ndị anyanwụ na-ekpuchikarị na mbara igwe—dị ka ihe atụ, a hụrụ Jupiter na Saturn nke ọma. Ikekwe akụkụ kasị dị ịrịba ama nke chi ahụ jiri n’ehihie bụ ìhè ahụ gbara anyanwụ ahụ ọnwa kpuchiri gburugburu. Ọ pụtara dị ka ìhè na-achatatụ ọcha na pinki pinki gburugburu efere ojii. Ndị na-ekiri ya, bụ́ ndị ọ dọọrọ uche ha kpam kpam, kọwara ya dị ka ‘ihe dị ịtụnanya, nke dị ebube.’ Ọnwa ahụ ji nwayọọ nwayọọ chipụ, na-eme ka a hụkwuo ihu anyanwụ, na-emekwa ka ìhè anyanwụ rute n’ụwa n’enweghị ihe mgbochi. Ka ọ na-erule n’elekere 4:28 nke mgbede, chi ahụ jiri n’ehihie abọọla!”

Ihe Ndị A Mụtara Site na Chi ahụ Jiri n’Ehihie

Mgbe ọ gasịrị, ọtụtụ ndị kwuru okwu banyere mmetụta na-akpali akpali ahụmahụ ahụ nwere n’ahụ́ ha. N’Angola, otu nwanyị kwuru na ọ fọrọ nke nta ka anya mmiri gbaa ya. Onye ọzọ kwuru okwu banyere onyinye magburu onwe ya Chineke nyere. Onye ọzọkwa kwuru na ọ bụ nanị Onye Okike na-ahụ n’anya ga-enye ihe omume a dị ịrịba ama ka ndị mmadụ wee nwee ike inwe ekele maka ịma mma dị egwu nke isi iyi nke ike a na-enweta n’ụwa.

O doro anya na ọtụtụ ndị nọ n’Africa na-akwanyere Onye Okike na Bible ùgwù nke ukwuu. Ka Ndịàmà Jehova nọ n’obodo Sumbe na-agwa ndị ọzọ banyere chi ahụ jiri n’ehihie ma na-ekwu na nke a bụ nanị otu n’ime ọrụ ndị dị ebube nke Jehova, bụ́ Onye Okike anyị, ndị bi n’ebe ahụ gosipụtara ezi mmasị n’ikwurịta banyere ihe ahụ. Ọtụtụ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi nara magazin Ụlọ Nche ndị kasị ọhụrụ bụ́ ndị na-ekwu banyere ọrụ ndị a dị ebube.

Ihe a mere n’ihu igwe nyeere ọtụtụ nde ndị mmadụ aka ichezọ nsogbu ha ruo minit ole na ole dị mkpirikpi ma lekwasị anya n’ihe na-akpali akpali ma dị egwu n’ezie. N’ịbụ ndị hụworo akụkụ ndị dị ebube nke anyanwụ, bụ́ ndị a na-adịghị ahụkebe anya, ụfọdụ ndị chere echiche banyere ebube a na-adịghị ahụ anya nke Onye Okike ya, bụ́ Jehova Chineke, bụ́ nke dị egwu ọbụna karị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ebe ọ bụ na ụzọ ndị ọnwa na ụwa na-aga na ha dị gburugburu, ókè anyanwụ na ọnwa hà n’ibu, ma a na-ele ha anya, na-adịtụ iche na-adebere n’ebe ha nọ n’ụzọ ndị ha na-aga na ha. Mgbe ọnwa nọ n’akụkụ ụzọ ya nke kasị dịrị anya site n’ụwa, akụkụ kasị gbaa ọchịchịrị nke onyinyo ọnwa nwere ike ọ gaghị erutecha na mbara ụwa. Mgbe nke a mere, ndị nọ n’ụwa na-ekiri ya, bụ́ ndị nọ n’ebe onyinyo ahụ rutere ga-ahụ ka ọnwa kpuchiri etiti anyanwụ, na-eme ka a hụ anyanwụ dị ka mgbaaka na-egbukepụ ìhè, bụ́ nke dị gburugburu onyinyo gbara ọchịchịrị.

^ par. 19 Ihe na-akpata ihe ahụ a na-ahụ bụ́ nke a maara dị ka kpọm kpọm Baily bụ ìhè anyanwụ na-agafe na ndagwurugwu ọnwa n’oge na-adịghị anya tupu ọnwa ekpuchie anyanwụ kpam kpam. Okwu bụ́ “mgbaaka diamọnd” na-akọwa ọdịdị nke anyanwụ nwa obere oge tupu ọnwa ekpuchie ya kpam kpam, bụ́ mgbe a ka na-ahụ akụkụ dị nta nke anyanwụ, na-eme ka ọdịdị ya yie mgbaaka na-acha ọcha bụ́ nke na-egbukepụ ìhè, nke yiri nke mgbaaka diamọnd.

[Ihe Osise dị na peeji nke 19]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

→ →

Anyanwụ → Ọnwa ⇨ Ebe gbara ọchịchịrị ⇨ Ụwa

→ →

[Ebe E Si Nweta Foto]

© 1998 Visual Language

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Kpọm kpọm Baily

Ọnwa ikpuchi anyanwụ kpam kpam

Mgbaaka diamọnd

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike a natara Juan Carlos Casado, www.skylook.net

[Foto dị na peeji nke 21]

Ndị na-ekiri chi jiri n’ehihie na Lusaka, Zambia