Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 87

Jiri Amamihe Kwadebe Maka Ọdịnihu

Jiri Amamihe Kwadebe Maka Ọdịnihu

LUK 16:1-13

  • IHE ATỤ ONYE NA-ELEKỌTA ỤLỌ NKE BỤ́ ONYE AJỌ OMUME

  • JIRI AKỤ̀ GỊ ‘METARA ONWE GỊ NDỊ ENYI’

Ihe atụ Jizọs ka mepụrụ gbasara nwa furu efu kwesịrị ime ka ndị ọnaụtụ, ndị odeakwụkwọ, na ndị Farisii ghọta na Chineke dị njikere ịgbaghara ndị mmehie chegharịrị echegharị. (Luk 15:1-7, 11) Jizọs bidoziri ịgwa ndị na-eso ụzọ ya okwu. O meere ha ihe atụ ọzọ gbasara otu ọgaranya nke nụrụ na onye na-elekọtara ya ụlọ mere ihe ọ na-ekwesịghị ime.

Jizọs kwuru na e boro onye ahụ na-elekọtara ọgaranya ahụ ụlọ ebubo na ọ na-emefusị akụ̀ nna ya ukwu. N’ihi ya, nna ya ukwu kwuru na ya ga-achụ ya n’ọrụ. Onye ahụ na-elekọtara ya ụlọ kwuru n’obi ya, sị: “Gịnị ka m ga-eme, ebe ọ bụ na nna m ukwu ga-anapụ m ọrụ ilekọtara ya ụlọ? Ike adịghị m igwu ala, ihere na-eme m ịrịọ arịrịọ.” O kpebiri ihe ọ ga-eme. Ọ sịrị: “Ehee! Ama m ihe m ga-eme, ka ọ ga-abụ, mgbe a chụpụrụ m n’ọrụ ilekọta ụlọ, ndị mmadụ ga-anabata m n’ebe obibi ha.” Ọ kpọrọ ndị ji nna ya ukwu ụgwọ ozugbo ma jụọ ha, sị: ‘Gịnị ka unu ji nna m ukwu n’ụgwọ?’—Luk 16:3-5.

Onye nke mbụ zara ya, sị: “Otu narị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bat nke mmanụ oliv,” ya bụ, ihe dị ka narị galọn mmanụ oliv ise na iri asatọ. O nwere ike ịbụ na onye a jí ụgwọ nwere ubi a kụrụ ọtụtụ osisi oliv ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ọ na-agba ahịa mmanụ oliv. Onye a na-elekọta ụlọ gwara ya, sị: “Were akwụkwọ e dere ihe unu kwekọrịtara ma nọdụ ala dee iri ise ọsọ ọsọ [ya bụ, ihe dị ka narị galọn abụọ na iri itoolu].”—Luk 16:6.

Ọ jụrụ onye ọzọ jí nna ya ukwu ụgwọ, sị: “Gị onwe gị, gịnị ka i ji n’ụgwọ?’ Ọ zara ya, sị: “Otu narị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kọọ nke ọka wit,” ya bụ, ọka wit ga-eju ihe dị ka narị akpa osikapa atọ na iri na atọ. Onye ahụ na-elekọta ụlọ gwara ya, sị: “Were akwụkwọ e dere ihe unu kwekọrịtara ma dee iri asatọ.” Ọ pụtara na o wepụụrụ ya ọka wit ga-eju akpa osikapa iri isii na atọ.—Luk 16:7.

Akụ̀ nna ya ukwu ka dị ya n’aka, n’ihi ya, o nwere ikike iwepụrụ ndị ji nna ya ukwu ụgwọ ihe n’ụgwọ ha ji. O ji ihe ahụ o wepụụrụ ha n’ụgwọ ha ji na-emeta ha enyi, ka ọ ga-abụ a chụọ ya n’ọrụ, ha enyere ya aka.

Ma, nna ya ukwu mechara mata ihe o mere. Ọ bụ eziokwu na ihe ụfọdụ o nwere furu, ma ihe onye a na-elekọtara ya ụlọ mere masịrị ya. Ọ jakwara ya mma. Ihe mere o ji jaa ya mma bụ na n’agbanyeghị na onye a na-elekọtara ya ụlọ “bụ onye ajọ omume,” o “ji ezi amamihe mee ihe.” Jizọs kwuziri, sị: “Ụmụ nke usoro ihe a maara ihe n’ụzọ bara uru karịa ụmụ nke ìhè n’otú ha si emeso ndị ọgbọ ha ihe.”—Luk 16:8.

Jizọs anaghị ekwu na ihe onye ahụ na-elekọtara nna ya ukwu ụlọ mere dị mma, ọ naghịkwa ekwu na iji aghụghọ azụ ahịa dị mma. Gịnịzi ka ọ na-ekwu? Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Jirinụ akụ̀ ajọ omume metara onwe unu ndị enyi, ka ọ ga-abụ, mgbe akụ̀ dị otú ahụ na-adịkwaghị, ha ewee nabata unu n’ebe obibi ebighị ebi.” (Luk 16:9) Ihe a Jizọs kwuru na-akụziri anyị ka anyị na-elepụ anya n’ihu ma jiri amamihe na-eme ihe. “Ụmụ nke ìhè,” ya bụ, ndị ohu Chineke, kwesịrị iji ihe ndị ha nwere na-eme ihe ga-abara ha uru, ya bụ, ihe ga-eme ka ha nweta ndụ ebighị ebi.

Ọ bụ naanị Jehova na Ọkpara ya nwere ike ịkpọbata mmadụ n’Alaeze eluigwe ma ọ bụ na Paradaịs a ga-enwe n’ụwa nke Alaeze ahụ ga-achị. Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike meta ha enyi. Otú anyị ga-esi eme ya bụ iji ihe ndị anyị nwere na-akwado ihe ndị gbasara Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú a, anyị ga-enweta ndụ ebighị ebi mgbe ọlaedo, ọlaọcha, na akụnụba ndị ọzọ ga-ala n’iyi ma ọ bụ mgbe ọ na-enweghịzi uru ha ga-aba.

Jizọs kwukwara na ọ bụrụ na anyị ejiri akụ̀ anyị ma ọ bụ ihe ndị anyị nwere na-eme ihe kwesịrị ekwesị ugbu a, a ga-enyefe anyị ihe ndị ka mkpa ka anyị lekọtawa. Jizọs kwuru, sị: “Ya mere, ọ bụrụ na unu ekwesịghị ntụkwasị obi n’akụ̀ ajọ omume, ònye ga-enyefe ezi akụ̀ n’aka unu [dị ka ihe ndị gbasara Alaeze Chineke]?”—Luk 16:11.

Ihe Jizọs na-eme ka ndị na-eso ụzọ ya mata bụ na e nwere nnukwu ihe a ga-achọ n’aka ha tupu a nabata ha “n’ebe obibi ebighị ebi.” Mmadụ enweghị ike ịbụ ezigbo ohu Chineke, bụrụkwa ohu akụ̀ ajọ omume. Ọ bụ ya mere Jizọs jizi kwuo, sị: “Ọ dịghị odibo nke pụrụ ịbụ ohu nna ukwu abụọ; n’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya, ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya. Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.”—Luk 16:9, 13.