Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 49

Jizọs Ekwusaa Ozi Ọma na Galili, Nyekwa Ndịozi Ya Ọzụzụ

Jizọs Ekwusaa Ozi Ọma na Galili, Nyekwa Ndịozi Ya Ọzụzụ

MATIU 9:35–10:15 MAK 6:6-11 LUK 9:1-5

  • JIZỌS AGAGHACHI NA GALILI KWUSAA OZI ỌMA

  • O ZIPỤRỤ NDỊOZI YA KA HA GAA ZIE OZI ỌMA

Kemgbe ihe dị ka afọ abụọ ugbu a, Jizọs ji ike ya niile na-ekwusa ozi ọma. Ma ugbu a, ọ̀ ga-akwụsịtụ ma jiritụ ya nwayọọ? Kama ijiri ya nwayọọ, Jizọs gbakwuru mbọ kwusaa ozi ọma. Ọ malitere “ijegharị n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta niile [dị na Galili], na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ ha, na-ekwusakwa ozi ọma alaeze ahụ ma na-agwọ ụdị ọrịa ọ bụla na ụdị nsogbu ahụ́ ike ọ bụla.” (Matiu 9:35) Ihe ọ hụrụ mere ka o dokwuo ya anya na o kwesịrị ịgbakwu mbọ iji kwusakwuo ozi ọma. Mana, olee otú ọ ga-esi eme ya?

Ka Jizọs na-aga ebe dị iche iche, ọ hụrụ na e nwere ndị e kwesịrị ka e were eziokwu nke okwu Chineke nyere aka ma kasie obi. A gbara ha akpụkpọ, chụsasịakwa ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. O meteere ha ebere. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ee, ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.”—Matiu 9:37, 38.

Jizọs ma ihe ga-enye aka n’ihe a. Ọ kpọrọ ndịozi iri na abụọ ya, kee ha abụọ abụọ, ha aghọọ ìgwè ndị na-ekwusa ozi ọma. Ya enyezie ha ntụziaka a doro anya. Ọ sịrị ha: “Unu abanyela n’okporo ụzọ ndị mba ọzọ, unu abanyekwala n’obodo ndị Sameria; kama nke ahụ, na-agakwurunụ atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel. Mgbe unu na-aga, na-ekwusanụ, sị, ‘Alaeze eluigwe eruwo nso.’”—Matiu 10:5-7.

Alaeze ha ga-ekwusa banyere ya bụ nke ahụ Jizọs kwuru okwu ya n’ekpere ahụ o ji kụzie otú e si ekpe ekpere. ‘Alaeze ahụ adịla nso’ n’ihi na Jizọs Kraịst, Eze Chineke họpụtara ịchị n’Alaeze ya nọ ya mgbe ahụ. Oleekwanụ ihe ga-egosi na  ndị na-eso ụzọ Jizọs bụ ndị na-anọchite anya Alaeze ahụ n’eziokwu? Jizọs nyere ha ikike ịgwọ ndị mmadụ na ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ha ga-eme ihe a niile na-anaghị ego ọ bụla. Oleezikwanụ otú ndịozi Jizọs ga-esi egboro onwe ha mkpa ha? Dị ka ihe atụ, olee otú ha ga-esi enweta nri ụbọchị?

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara iwere ihe ndị ha ga-eji egbo mkpa ha ma ha gawa ikwusa ozi ọma. Ha agaghị etinye ọlaedo, ọlaọcha, ma ọ bụ ọla kọpa n’obere akpa ha. Ha agaghịdị ewere obere akpa nri ma ọ bụ werekwuo uwe ime ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ ọzọ ma ha gawa. Gịnị mere na ha agaghị ewere ihe ndị a? Jizọs gwara ha okwu mesiri ha obi ike. Ọ sịrị ha: “Onye ọrụ kwesịrị ka e nye ya nri.” (Matiu 10:10) Ndị ga-anabata ha na ozi ha na-ekwusa ga-enye aka gboo mkpa ha. Jizọs sịrị ha: “N’ebe ọ bụla unu banyere n’ụlọ, nọrọnụ n’ebe ahụ ruo mgbe unu si n’ebe ahụ pụọ.”—Mak 6:10.

Jizọs gwakwara ha ihe ha ga-eme ma ha gaa n’ụlọ ndị mmadụ izi ha ozi ọma Alaeze ahụ. Ọ sịrị: “Mgbe unu na-abanye n’ụlọ, keleenụ ndị ezinụlọ ahụ; ọ bụrụkwa na ụlọ ahụ kwesịrị ekwesị, ka udo unu na-asị ka o nwee dịkwasị ya; ma ọ bụrụ na o kwesịghị ekwesị, ka udo nke si n’ebe unu nọ lọghachiri unu. N’ebe ọ bụla ọ na-adịghị onye nabatara unu ma ọ bụ onye gere ntị n’okwu unu, mgbe unu na-apụ n’ụlọ ahụ ma ọ bụ n’obodo ahụ, tichapụnụ ájá dị n’ụkwụ unu.”—Matiu 10:12-14.

O nwere ike ịdaba na n’obodo ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-aga, ndị obodo ahụ niile ga-ajụ ozi ọma ha na-ezi. Gịnị ga-eme obodo dị otú ahụ? Jizọs sịrị na a ga-ama ha ikpe mbibi. Ọ sịrị: “N’ezie, ana m asị unu, Ọ ga-adịrị ala Sọdọm na Gọmọra mfe n’Ụbọchị Ikpe karịa obodo ahụ.”—Matiu 10:15.