Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 4

Meri Dị Ime Ma Ọ Lụbeghị Di

Meri Dị Ime Ma Ọ Lụbeghị Di

MATIU 1:18-25 LUK 1:56

  • JOSEF AMATA NA MERI DỊ IME

  • MERI AGHỌỌ NWUNYE JOSEF

Meri dị ime ọnwa anọ ugbu a. Ọ̀ kwa i chetara na ọ gara nọnyere onye ikwu ya bụ́ Elizabet n’ebe ugwu Judia mgbe ọ ka dị ime ọhụrụ? Ma ugbu a, Meri alọghachila Nazaret. Afọ ime ya apụtawakwala. Obere oge ndị ọzọ ga-amata na ọ dị ime. Chegodi otú ọnọdụ ya a ga-esi na-eche ya uche.

Ihe kacha enye ya nsogbu n’obi bụ na Josef onye ọkwá nkà ekwela ya nkwa ọlụlụ. Meri makwa ihe Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel kwuru a ga-eme nwaanyị ọ bụla gara ya na nwoke ọzọ enwee mmekọahụ mgbe e kwerela ya nkwa ọlụlụ. Iwu ahụ kwuru na a ga-eji nkume tụgbuo nwaanyị ahụ. (Diuterọnọmi 22:23, 24) Ọ bụ eziokwu na Meri na nwoke ọzọ enweghị mmekọahụ, ihe na-enye ya nsogbu n’obi bụ otú ọ ga-esi kọwaara Josef otú o si dịrị ime, nakwa ihe nwere ike ime.

Meri anọghị ya kemgbe ọnwa atọ, ọ ga na-agụsikwa Josef agụụ ike ịhụ ya. Mgbe ha hụrụ, Meri gwara Josef na ya dị ime. Ọ gbalịrị ime ka Josef ghọta na ọ bụ n’ike mmụọ nsọ Chineke ka ya dị ime. Ma, o siiri Josef ike ịghọta ihe Meri na-ekwu, siekwara ya ike ikweta.

Josef ma na Meri bụ ezigbo nwaanyị nwere aha ọma. Josef hụkwara Meri n’anya. Ma, n’agbanyeghị ihe niile Meri gwara ya, ọ ka chere na o nweghị otú ọzọ Meri ga-esi dịrị ime ma ọ́ bụghị na nwoke ọzọ tụwara ya ime ahụ. Ọ chọghị ka e jiri nkume tụgbuo Meri ma ọ bụ menye ya ihere n’ihu ọha. N’ihi ya, o kpebiri ịgba ya alụkwaghịm na nzuzo. N’oge ahụ, a na-ele ndị kwere onwe ha nkwa ọlụlụ anya ka ndị lụrụla alụ. Iji gbubie nkwa ọlụlụ, ndị ahụ kwere onwe ha nkwa ga-agba alụkwaghịm.

Mgbe Josef nọ na-eche ihe a niile, ụra buuru ya. Mmụọ ozi Jehova bịakwutere ya ná nrọ sị ya: “Atụla egwu ịkpọrọ Meri nwunye gị laa, n’ihi na ọ bụ mmụọ nsọ mere ka ọ dị ime ahụ ọ dị. Ọ ga-amụ nwa nwoke, ị ga-agụ ya Jizọs, n’ihi na ọ ga-azọpụta ndị ya ná mmehie ha.”—Matiu 1:20, 21.

Mgbe Josef tetara, obi dị ya ụtọ na otú Meri si dịrị ime edoola ya anya. O gbughị oge ime ihe mmụọ ozi ahụ gwara ya. Ọ kpọọrọ Meri laa n’ụlọ ya. Ihe a o mere dị ka agbamakwụkwọ. O gosiri ọha mmadụ na ya na Meri aghọọla di na nwunye. Mana, Josef na Meri enweghị mmekọahụ n’oge niile ọ dị ime Jizọs.

Mgbe ọtụtụ ọnwa gachara, Josef na Meri, onye dịzi ime ọmụmụ ugbu a, na-akwado isi Nazaret mee njem. Olee ebe ha na-achọ ịga ugbu a ime Meri ruwerela ọmụmụ?