Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 71

Ndị Farisii Agbaa Nwoke Kpuburu Ìsì Ajụjụ

Ndị Farisii Agbaa Nwoke Kpuburu Ìsì Ajụjụ

JỌN 9:19-41

  • NDỊ FARISII AGBAA NWOKE AHỤ KPUBURU ÌSÌ AJỤJỤ

  • NDỊ NDÚ OKPUKPE BỤ NDỊ KPURU “ÌSÌ”

Ndị Farisii ekwetaghị na Jizọs mere ka nwoke ahụ kpuru ìsì kemgbe a mụrụ ya hụwa ụzọ. N’ihi ya, ha kpọrọ ndị mụrụ ya ka ha jụọ ha ajụjụ. Ndị mụrụ ya ma na e nwere ike ‘ịchụpụ ha n’ụlọ nzukọ.’ (Jọn 9:22) Ịchụpụ ha n’ụlọ nzukọ ga-eme ka ha ghara iso ndị Juu ibe ha na-efe Chineke, meekwa ka ihe siere ha ike.

Ndị Farisii jụrụ ndị mụrụ nwoke ahụ kpuburu ìsì ajụjụ abụọ. Ha jụrụ ha, sị: “Onye a ọ̀ bụ nwa unu nke unu sịrị na o kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya? Oleezi otú o si na-ahụ ụzọ ugbu a?” Ndị mụrụ ya zara ha, sị: “Anyị maara na onye a bụ nwa anyị, marakwa na o kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya. Ma otú o si hụwa ụzọ ugbu a, anyị amaghị, anyị amaghịkwa onye meghere anya ya.” Ọ bụrụgodị na nwa ha akọọrọla ha ihe merenụ, ha leziri anya ka ha ghara ikwu ihe ga-etinye ha ná nsogbu. Ha gwara ndị Farisii ahụ, sị: “Jụọnụ ya. Ọ ghọọla dimkpa. Ọ ga-azara ọnụ ya.”—Jọn 9:19-21.

Ndị Farisii kpọrọ nwoke ahụ ọzọ yie ya egwu. Ha gwara ya ihe na-abụghị eziokwu banyere Jizọs. Ha sịrị ya: “Nye Chineke otuto; anyị maara na nwoke a bụ onye mmehie.” Nwoke ahụ kpuburu ìsì zara ha, sị: “Ma ọ̀ bụ onye mmehie, amaghị m. Otu ihe m maara bụ na, ọ bụ ezie na m kpuburu ìsì, ana m ahụ ụzọ ugbu a.”—Jọn 9:24, 25.

Ndị Farisii ewereghị ihe ahụ nwoke ahụ kwuru. Ha jụrụ ya, sị: “Gịnị ka o mere gị? Olee otú o si meghee anya gị?” Nwoke ahụ ji obi ike gwa ha, sị: “M kọworo ya unu, ma unu egeghị ntị. Gịnị mere unu ji chọọ ịnụ ya ọzọ? Ùnu chọrọ ịghọ ndị na-eso ụzọ ya?” Ihe a nwoke a kwuru were ndị Farisii iwe, ha agwa ya, sị: “Ị bụ onye na-eso ụzọ nwoke ahụ, ma anyị bụ ndị na-eso ụzọ Mozis. Anyị maara na Chineke gwara Mozis okwu; ma anyị amaghị ebe nwoke a si.”—Jọn 9:26-29.

Ihe a ndị Farisii kwuru juru nwoke ahụ anya, ya agwa ha, sị: “Ọ bụ nnọọ ihe ijuanya na unu amaghị ebe o si ma ya emeghee anya m.” Nwoke ahụ gwara ha ụdị onye Chineke na-ege ntị ma na-anụ ekpere ya. Ọ sịrị ha: “Anyị maara na Chineke adịghị ege ndị mmehie ntị, kama ọ bụrụ na mmadụ na-atụ egwu Chineke ma na-eme uche ya, ọ na-ege ya ntị. Malite n’oge ochie, a nụtụbeghị na mmadụ meghere anya onye kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya.” Nwoke a kpuburu ìsì gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na nwoke a esighị n’ebe Chineke nọ bịa, ọ pụghị ime ihe ọ bụla ma ọlị.”—Jọn 9:30-33.

Ebe ọ bụ na ndị Farisii enweghị ike ịgbagha ihe a nwoke a kwuru, ha katọrọ ya, sị: “A mụrụ gị n’ime mmehie, n’agbanyeghị nke a, ị̀ na-ezi anyị ihe?” Ha chụpụziri ya.—Jọn 9:34.

Mgbe Jizọs nụrụ ihe merenụ, ọ hụrụ nwoke ahụ ma jụọ ya, sị: “Ì nwere okwukwe n’ebe Nwa nke mmadụ nọ?” Nwoke ahụ zara ya, sị: “Ònyekwanụ ka ọ bụ ka m wee nwee okwukwe n’ebe ọ nọ?” Jizọs gwara ya, sị: “Ị hụwo ya, onye a gị na ya na-ekwu okwu bụ ya.”—Jọn 9:35-37.

Nwoke ahụ gwara Jizọs, sị: “Enwere m okwukwe n’ebe ọ nọ.” Ọ kpọọrọ Jizọs isiala iji gosi na o nwere okwukwe na ya ma na-akwanyere ya ùgwù. Jizọs sịrị: “Ọ bụ ikpe a mere m ji bịa n’ụwa a: ka ndị na-adịghị ahụ ụzọ wee hụ ụzọ, ka ndị na-ahụkwa ụzọ wee kpuo ìsì.”—Jọn 9:38, 39.

Ndị Farisii nọ́ ebe ahụ maara na ha na-ahụ ụzọ. Ma, oleekwanụ gbasara ọrụ ha chere na ha na-arụ, ya bụ, ịkụziri ndị mmadụ okwu Chineke? Ha jụrụ Jizọs, sị: “Anyị onwe anyị kwa, ànyị kpuru ìsì?” Jizọs sịrị ha: “Ọ bụrụ na unu kpuru ìsì, unu agaraghị enwe mmehie ọ bụla. Ma, ugbu a, unu na-asị, ‘Anyị na-ahụ ụzọ.’ Mmehie unu na-adịgide.” (Jọn 9:40, 41) A sị na ha abụghị ndị na-akụziri ndị Izrel okwu Chineke, ọ gaara edo anya ihe mere na ha ekweghị na Jizọs bụ Mesaya ahụ. Ma ebe ha ma Iwu Chineke ma ghara ikwere na Jizọs bụ Mesaya, ọ bụ mmehie dị oké njọ ka ha mere.