Igbo
Job​—Jehova Gwọrọ Ya Ọrịa Na-arịa Ya
https://cms-imgp.jw-cdn.org/img/p/502019376/univ/wpub/502019376_univ_sqr_xl.jpg
ijwia isiokwu 5

ṄOMIE OKWUKWE HA | JOB

Jehova Gwọrọ Ya Ọrịa Na-arịa Ya

Jehova Gwọrọ Ya Ọrịa Na-arịa Ya

 N’ikpeazụ, ụmụ nwoke ndị bịara ileta Job kwụsịrị ikwu okwu. O nwere ike ịbụ na naanị mkpọtụ a na-anụ n’ebe ha nọ bụ mkpọtụ ikuku na-ekpo ọkụ nke si n’ọzara Arebia na-eme. Ike okwu agwụla Job. Ọ maghịzi ihe ọzọ ọ ga-ekwu. Weregodị ya na ị na-ahụ ya ka o ji iwe na-ele ndị enyi ya atọ bụ́ Elifaz, Bildad, na Zofa anya, ka à ga-asị na ọ na-asị ha, ‘Kwuwenụnụ, ka ùnu ekwujuola?’ Ha achọghịdị ile Job anya. Obi adịghị ha mma na n’agbanyeghị na ha gwakasịrị ya okwu ahụ́, ihe niile ha kwuru dị ka mmiri a wụsara n’elu okwute. (Job 16:3) Ma, Job kpebisikwuru ike igosi na ya jisiri Chineke aka ike.

 O nwere ike ịbụ na Job chere na naanị ihe fọọrọ ya bụ ofufe ọ na-efe Chineke. Akụnụba ya efunyụọla anya, ọ gbarala aka ụmụ ya iri, ndị enyi ya na ndị agbata obi ya anaghịzi akwado ya, ma ya fọdụzie ịkwanyere ya ùgwù. Ọ na-arịakwa ọrịa ugbu a. Ọrịa a emeela ka akpụkpọ ahụ́ ya na-ejizi oji, ọnyá jukwara ya ahụ́, ikpuru na-arịgharịkwa ya n’ahụ́. Ume ọ na-ekupụta na-esidị ísì ọjọọ. (Job 7:5; 19:17; 30:30) Okwu ọjọọ ụmụ nwoke ahụ gwara Job meziri ka iwe ju ya obi. Ihe bụ́zi mkpa ya bụ igosi na ya abụghị onye mmehie na-arụrụ aka otú ha kwuru na ọ bụ. Ihe ikpeazụ Job kwuru mere ka ha mechie ọnụ. Okwu ọjọọ si ha n’ọnụ na-ezo ka mmiri emechaala kwụsị. Ma, Job na ahụ́ ụfụ ka na-alụ. Ọ ka chọsiri enyemaka ike.

 Ma, otú Job si ele nsogbu ya anya adịchaghị mma, anyị ghọtakwara ihe kpatara ya. Ihe dị ya mkpa bụ onye ga-agbazi ya ma nye ya ndụmọdụ. Ihe ọzọ ahụ́ ya chọrọ bụ agbamume na nkasi obi, bụ́kwanụ ihe ndị enyi ya atọ na-emereghị ya. È nwetụla mgbe ọ dị gị mkpa ka a gbazie gị ma kasie gị obi? È nwetụla mgbe ndị i chere na ha bụ ndị enyi gị mere ihe gbawara gị obi? Ịmụta otú Jehova Chineke si nyere ohu ya bụ́ Job aka na ihe Job mere nwere ike ịbara gị uru, meekwa ka i nwee olileanya.

Onye Ndụmọdụ Ma Ihe ma Dị Obiọma

 Ihe ọzọ e kwuru n’akwụkwọ Job dị ịtụnanya. E nwere onye ọzọ so Job na ndị enyi ya atọ nọrọ ebe ahụ. Ọ bụ nwa okorobịa aha ya bụ Elaịhu. Ọ nọ ebe ahụ kemgbe, ma ọ gbara nkịtị na-ege ndị ahụ katara ahụ́ ntị ka ha na-arụrịta ụka. Ihe ọ nọ na-anụ adịtụghị ya mma ná ntị.

 Elaịhu na-ewesa Job iwe. Ọ na-ewute ya ịhụ ka Job “na-agbalị ka o gosi na ya bụ onye ezi omume kama igosi na ọ bụ Chineke bụ onye ezi omume.” Ma, Elaịhu metekwaara Job ebere. Ọ ghọtara na ahụ́ niile na-afụ Job ụfụ, na o nwere ezi obi, nakwa na ndụmọdụ na nkasi obi dị ya ezigbo mkpa. Ka a sịkwa ihe mere na obi adịghị Elaịhu mma maka ihe mmadụ atọ ahụ sị na ha bịara ịkasi Job obi nọ na-ekwu. Ọ nụrụ ka ha nọ na-agwa Job okwu ọjọọ, na-agbalị ime ka okwukwe ya gharazie isi ike, na-akpụ ùgwù ya n’ala, na-emekwa ka ọ ghara ijisi Chineke aka ike. Nke ka njọ bụ na otú ha si rọgharịa okwu ha mere ka o yie ka Chineke ọ̀ bụ onye ọjọọ. Ọ bụ ya mere o ji na-enu Elaịhu enu n’obi ikwu okwu.​—Job 32:2-4, 18.

 O kwuru, sị: “Abụ m nwata, ma unu bụ ndị okenye. Ọ bụ ya mere m ji kwanyere unu ùgwù ghara ikwu okwu, anwaghịkwa m ịgwa unu ihe m ma.” Ma, o nweghịzi ike ịgba nkịtị. O kwuziri, sị: “Ọ bụghị naanị afọ ole mmadụ dị na-eme ka ọ mara ihe, ọ bụghịkwa naanị ndị mere agadi na-aghọta ihe dị mma.” (Job 32:6, 9) Elaịhu kwutere okwu aka iji gosi na ihe a o kwuru bụ eziokwu. Ma, otú o si kwuo okwu dị iche n’otú Elifaz, Bildad, na Zofa si kwuo okwu. O mere ka obi sie Job ike na ya agaghị akparị ya ma ọ bụ kwuo ihe ga-eme ka obi dakwuo ya mbà. Ọ kwanyekwaara Job ùgwù, kpọọ ya aha ya mgbe ọ na-agwa ya okwu, kwuokwa ihe gosiri na o kwetara na e ji Job mere ihe ọchị. a O medara obi gwa Job, sị: “Ma ugbu a, Job, biko nụrụ okwu m.”​—Job 33:1, 7; 34:7.

Elaịhu kpọrọ Job aha ya mgbe ọ na-agwa ya okwu, jiri obiọma gwa ya okwu ma kwanyere ya ùgwù

 Elaịhu dụrụ Job ọdụ n’ezoghị ọnụ. Ọ sịrị ya: “E nwere ihe i kwuru ná ntị m . . . ‘Abụ m onye ezi omume. Anaghị m eme mmehie. Aka m dị ọcha. Anaghị m eme ihe ọjọọ. Ma Chineke na-achọ ihe ọ ga-akụdo aka mesie m ike.’” Elaịhu kwuziri ihe bụ́ nsogbu Job. Ọ jụrụ ya, sị: “Obi ò siri gị nnọọ ike na ị bụ onye ezi omume nke na ị na-asị, ‘Abụ m onye ezi omume karịa Chineke’?” Elaịhu achọghị ka Job chewe otú a. N’ihi ya, ọ sịrị ya: “I kwuteghị ihe a i kwuru.” (Job 33:8-12; 35:2) Elaịhu ma na iwe juru Job obi n’ihi ihe ndị funahụrụ ya nakwa n’ihi otú ndị enyi ọjọọ ya si mesie ya ike. Ma, Elaịhu dọrọ Job aka ná ntị, sị: “Kpachara anya ka iwe ghara ime ka i mewe ihe ọjọọ.”​—Job 36:18.

Elaịhu Mere Ka O Doo Anya na Jehova Dị Obiọma

 Ihe kacha mkpa Elaịhu mere bụ na ọ gbachiteere Jehova Chineke. Ihe o kwuru mere ka a ghọta otu eziokwu a na-anaghị agbagha agbagha, ya bụ, na “Chineke emekataghị mee ihe ọjọọ. Onye Pụrụ Ime Ihe Niile emekataghị mee ihe na-adịghị mma. . . . Onye Pụrụ Ime Ihe Niile anaghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.” (Job 34:10, 12) Iji gosi Job n’eziokwu na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi ma na-eme ebere, Elaịhu chetaara ya na Jehova gbachiri ya nkịtị kemgbe ọ na-agbakasịrị ya ọnụ ma ghara ịta ya ahụhụ. (Job 35:13-15) Elaịhu emeghịkwa ka à ga-asị na ọ ma ihe niile gbasara Chineke, kama o gosiri na ọ dị umeala n’obi. Ọ sịrị: “Chineke dị ukwuu karịa otú anyị nwere ike ịmata.”​—Job 36:26.

 Ọ bụ eziokwu na Elaịhu ezoghị ọnụ mgbe ọ na-adụ Job ọdụ, ma o ji obiọma gwa ya okwu. Ọ gwara Job banyere olileanya magburu onwe ya o nwere, nke bụ́ na otu ụbọchị, Jehova ga-eme ka ahụ́ dịghachi ya mma. Chineke ga-ekwu banyere ohu ya na-erubere ya isi, sị: “Ka ahụ́ ya dị ọhụrụ karịa otú ọ dị mgbe ọ bụ nwata. Ka o nweghachi ike o nwere mgbe ọ bụ okorobịa.” Otú ọzọ Elaịhu si gosi Job obiọma bụ ịgwa ya ka o kwuo otú obi dị ya kama ịgwa ya naanị ihe o kwesịrị ime. Ọ sịrị ya: “Kwuo okwu, n’ihi na achọrọ m igosi na aka gị dị ọcha.” (Job 33:25, 32) Ma, Job azaghị ya ihe ọ bụla. O nwere ike ịbụ na ọ chọghị ịgbachitewere onwe ya ebe ọ bụ na Elaịhu ji obiọma gwa ya okwu mgbe ọ na-enye ya ndụmọdụ ahụ. O nwedịrị ike ịbụ na Job bere ákwá n’ihi otú a Elaịhu si chebara ya echiche.

 E nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’aka ụmụ nwoke abụọ a nwere okwukwe. Anyị na-amụta n’aka Elaịhu otú anyị ga-esi na-adụ ndị e kwesịrị ịdụ ọdụ ọdụ ma kasie ha obi. Ezigbo enyi agaghị ezo ọnụ ịgwa enyi ya ihe ọ na-anaghị emeta ma ọ bụkwanụ ịdọ ya aka ná ntị tupu ya emee mmehie dị oké njọ. (Ilu 27:6) Anyị kwesịrị ịna-agwa ndị enyi anyị eziokwu, jirikwa obiọma na-agwa ndị nọ ná mkpa okwu ma na-agba ha ume, ọ bụrụgodị na ha kwuru ihe na-adịghị mma. Ọ bụrụkwa na ọ dị mkpa ka e nye anyịnwa ndụmọdụ, ihe Job mere na-echetara anyị na anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ma gee ntị na ndụmọdụ e nyere anyị, kama ịjụ ya. Ndụmọdụ dị anyị niile mkpa, e kwesịkwara ka a na-agbazi anyị. Ịnabata ya nwere ike ịzọ anyị ndụ.​—Ilu 4:13.

‘Jehova Si n’Oké Ifufe Gwa Job Okwu’

 Mgbe Elaịhu nọ na-ekwu okwu, o kwuru ugboro ugboro banyere ifufe, ígwé ojii, égbè eluigwe, na àmụ̀mà. O kwuru banyere Jehova, sị: “Geenụ ntị nke ọma ka unu nụ mkpọtụ olu ya na-eme.” Obere oge o kwuchara ihe a, o kwukwara banyere “ifufe mmiri.” (Job 37:2, 9) O nwere ike ịbụ na ka ọ nọ na-ekwu okwu, mmiri malitere iru, ifufe amalitekwa ife ma na-efesikwu ike. N’ikpeazụ, ọ ghọziri oké ifufe mmiri. Ihe dị ezigbo ịtụnanya meziri. Jehova kwuru okwu.​—Job 38:1.

Cheedị ihe ọ dị ka ya mmadụ ịga ụlọ akwụkwọ, onye ga-akụziri ya banyere ihe ndị e kere eke abụrụ Onye kere eluigwe na ala

 Anyị gụwa akwụkwọ Job, obi na-adị anyị ụtọ ma anyị rute n’isiakwụkwọ ndị a magburu onwe ha e dere ihe Jehova gwara Job. Ihe Jehova kwuru dị nnọọ ka oké ifufe nke buuru okwu niile na-abaghị uru Elifaz, Bildad, na Zofa kwuru bufuo. Jehova agwaghịdị ụmụ nwoke ahụ okwu ruokwa mgbe e mechara. O lekwasịrị anya naanị n’ebe Job nọ. O ji obiọma gbazie ohu ya ọ hụrụ n’anya otú nna si agbazi nwa ya n’ezoghị ọnụ.

 Jehova ma na ahụ́ niile na-afụ Job ụfụ. O metekwaara ya ebere otú ọ na-emetere ụmụ ya ọ hụrụ n’anya mgbe ọ bụla ha na-ata ahụhụ. (Aịzaya 63:9; Zekaraya 2:8) Jehova makwa na Job nọ “na-ekwu okwu n’agbanyeghị na e nweghị ihe ọ ma,” si otú ahụ na-eme ka nsogbu ya ka njọ. N’ihi ya, Jehova jụrụ Job ọtụtụ ajụjụ mere ka o chebara onwe ya echiche. Ajụjụ mbụ ọ jụrụ ya bụ: “Olee ebe ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa? Gwa m, ma ọ bụrụ na i chere na ị na-aghọta ihe.” Mgbe Chineke malitere ike ihe, “kpakpando ụtụtụ,” ya bụ, ndị mmụọ ozi niile, tiri mkpu otuto n’ihi otú ihe ndị e kere eke si dị ezigbo ịtụnanya. (Job 38:2, 4, 7) Ma, Job amaghịdị ihe ọ bụla banyere ihe a.

Jehova si n’oké ifufe gwa Job okwu, jiri ịhụnanya mee ka ọ gbanwee echiche ya

 Jehova kwuweziri banyere ihe dị iche iche o kere eke. Anyị nwere ike ịsị na ọ kpọọrọ Job kụzitụrụ ya ihe ụfọdụ gbasara ihe ndị mmadụ na-akpọ sayensị n’oge a, dị ka ihe ndị dị na mbara igwe, bayọlọji, ihe ndị dị n’ala, nakwa fiziks. Jehova kọwaara Job gbasara ọtụtụ anụmanụ ndị dị n’ebe Job bi n’oge ahụ, dị ka ọdụm, ugoloọma, ewu ọhịa, jakị ọhịa, atụ́, enyí nnụnụ, ịnyịnya, agụ nkwọ, ugo, Behimọt (ọ ga-abụ enyí mmiri), nakwa Levayatan (o nwere ike ịbụ agụ iyi). Cheedị ihe ọ dị ka ya mmadụ ịga ụlọ akwụkwọ, onye ga-akụziri ya banyere ihe ndị e kere eke abụrụ Onye kere eluigwe na ala. b

Ịkụziri Job Banyere Ịdị Umeala n’Obi na Ịhụnanya

 Gịnị mere Chineke ji si otú a gwa Job okwu? Ọ dị ezigbo mkpa ka Job dịkwuo umeala n’obi. Mkpesa Job nọ na-eme maka na o chere na ọ bụ Jehova na-ata ya ahụhụ nọ na-eme ka nsogbu ya ka njọ, na-emekwa ka ya na Nna ya hụrụ ya n’anya ghara ịdị ná mma. N’ihi ya, Jehova jụrụ Job ugboro ugboro ebe ọ nọ mgbe o kere anụmanụ ndị ahụ dị ịtụnanya, jụọkwa ya ma ọ̀ ga-enyeli ha nri, chịa ha, ma ọ bụ zụọ ha. Ọ bụrụ na Job enwelighị ike ilekọta ihe ndị a Jehova kere, oleezi ihe mere ọ ga-eji na-ekpe Onye kere ihe niile ikpe? Ọ̀ bụ na Jehova amaghị ihe karịa Job?

Job arụghị Jehova ụka ma ọ bụ gọrọwa isi ya

 Ihe niile Jehova kwuru gosiri na ọ hụrụ Job n’anya nke ukwuu, chọọkwa ka Job chee echiche. O yiri ka ọ̀ na-agwa Job, sị: ‘Nwa m, ọ bụrụ na m nwere ike ike ihe ndị a ma na-elekọta ha, ì chere na agaghị m elekọtali gị? Ọ̀ bụ eziokwu na m ga-agbakụta gị azụ, gbawa gị aka ụmụ, napụ gị ihe ndị i nwere, kpatakwara gị ọrịa? Ọ́ bụghị naanị m bụ Onye nwere ike inyeghachi gị ihe ndị fụnahụrụ gị ma gwọọ gị ajọ ọrịa na-arịa gị?’

 Ọ bụ naanị ugboro abụọ ka Job zaghachiri Jehova mgbe ọ nọ na-ajụ ya ajụjụ ndị ahụ mere ka o chee echiche. Ọ rụghị Jehova ụka ma ọ bụ gọrọwa isi ya. O ji obi umeala kweta na ọ machaghị ihe, ihe ndị o kwuru n’echeghị echiche wutekwara ya. (Job 40:4, 5; 42:1-6) Ihe a Job mere gosiri na o nwere ezigbo okwukwe. N’agbanyeghị ihe niile o diri, ọ kwụsịghị inwe ezigbo okwukwe. Ọ nabatara aka ná ntị Jehova dọrọ ya, gbanweekwa otú o si ele ihe anya. Anyị nwekwara ike ịjụ onwe anyị ajụjụ a ga-eme ka anyị chee echiche: ‘M̀ dị umeala n’obi nke na m na-anabata ịdọ aka ná ntị na ndụmọdụ?’ Ụdị enyemaka a dị anyị niile mkpa. Ọ bụrụ na anyị anabata ya, anyị na-eṅomi okwukwe Job.

“Unu Ekwughị Eziokwu Banyere M”

 Jehova meziri ihe ugbu a iji kasie Job obi n’ahụhụ ọ na-ata. Jehova gwara Elifaz okwu. Ọ ga-abụ ya kacha bụrụ agadi n’ime mmadụ atọ ahụ sị na ha bịara ịkasi Job obi. Jehova gwara ya, sị: “M na-ewesa gị na ndị enyi gị abụọ ezigbo iwe maka na unu ekwughị eziokwu banyere m otú ohu m Job kwuru.” (Job 42:7) Chebagodịrị ihe a Jehova kwuru echiche. Ọ̀ na-ekwu na ihe niile ụmụ nwoke atọ ahụ kwuru bụ asị asị ma ọ bụ na ihe niile Job kwuru bụ eziokwu? Mbanụ! c Ma, e nwere ihe dị iche n’etiti Job na ndị ahụ na-ebo ya ebubo. Nsogbu ndị bịaara Job mere ka obi gbawaa ya, ọ na-eru uju, obi dakwara ya mbà n’ihi ebubo a na-ebo ya. O doro anya na ụdị ihe a nwere ike ime ka o kwuo okwu n’echeghị echiche mgbe ụfọdụ. Ma, Elifaz na ndị enyi ya abụọ enweghị ụdị nsogbu ndị ahụ. Ha leziri anya kwuo ihe ndị ha kwuru maka na ha dị mpako, ha enweghịkwa okwukwe na Chineke. Ọ bụghị naanị na ha gwakasịrị nwoke aka ya dị ọcha okwu ahụ́, kama ha kwukwara ihe na-abụghị eziokwu banyere Jehova, si otú ahụ mee ka o yie ka Chineke ọ̀ bụ onye ajọ omume obi fere azụ.

 Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji gwa ụmụ nwoke ahụ ka ha chụọ àjà ga-efu ha ezigbo ihe. Ha ji oké ehi asaa na ebule asaa chụọ àjà ahụ. Ihe a abụghị obere okwu n’ihi na Iwu Mosis mechara kwuo na nnukwu onye nchụàjà ga-eji oké ehi chụọ àjà ma o mee mmehie ga-eme ka ikpe ma mba Izrel. (Levitikọs 4:3) Oké ehi bụ anụmanụ kacha oké ọnụ Iwu Mosis kwuru ka e jiri na-achụ àjà. Ihe ọzọ bụ na Jehova kwuru na ihe ga-eme ka ọ nabata àjà ahụ ndị na-ebo Job ebubo ga-achụ bụ naanị ma Job buru ụzọ kpeere ha ekpere. d (Job 42:8) O doro anya na obi jụụrụ Job na Chineke ya gbachiteere ya ma kpee ikpe ziri ezi.

“Ohu m Job ga-ekpere unu ekpere.”​—Job 42:8

 Obi siri Jehova ike na Job ga-eme ihe ọ gwara ya mee ma gbaghara ndị ahụ mere ihe wutere ya nke ukwuu. Job emechughịkwa Nna ya ihu. (Job 42:9) Isi o rubeere Jehova bụ ihe kacha gosi na o jisiri Jehova aka ike, karịa ihe ọ bụla o nwere ike ikwu n’ọnụ. Nrubeisi Job mekwara ka Jehova gọzie ya otú na-enweghị atụ.

“Ihe Gbasara Onye Ọzọ Na-emetụ Jehova n’Obi”

 Ihe gbasara Job nọ “na-emetụ Jehova n’obi.” (Jems 5:11) Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Jehova mere ka ahụ́ dịghachi Job mma. Chegodị otú obi dị Job mgbe ọ ghọtara na ahụ́ ya adịla “ọhụrụ karịa otú ọ dị mgbe ọ bụ nwata,” otú Elaịhu kwuru. Ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya bịaziri na-akwado ya, na-abịara ya mgbaru ma na-enye ya onyinye. Jehova mere ka Job baakwa ọgaranya, ya enwee akụnụba o nweburu okpukpu abụọ. Oleekwanụ maka nsogbu kachanụ bịaara ya, ya bụ, ụmụ ya nwụnahụrụ ya? Job na nwunye ya mụtara ụmụ iri ọzọ. Ihe a kasitụrụ ha obi. Jehova rụkwara ọrụ ebube gbatịa afọ ndụ Job. Job dịrị ndụ otu narị afọ na iri anọ (140) n’elu nke ọ dịrịla adị, hụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya ruo ọgbọ nke anọ. Baịbụl kwuru, sị: “Job nwụziri mgbe o merela ezigbo agadi, ndụ ya jukwara ya afọ.” (Job 42:10-17) Na Paradaịs, Job na nwunye ya ọ hụrụ n’anya na ụmụ ha nakwa ụmụ ha iri ahụ Setan gburu ga-adịghachi ndụ ma bụrụ otu ezinụlọ.​—Jọn 5:28, 29.

 Gịnị mere Jehova ji kwụọ Job ụgwọ ọrụ buru ibu otú a? Baịbụl zara, sị: “Unu anụla otú Job si tachie obi.” (Jems 5:11) Ihe Job diri karịrị ihe ọtụtụ n’ime anyị nwere ike ichetụdị n’echiche. Ihe okwu bụ́ “tachie obi” na-agwa anyị abụghị naanị na ọnwụnwa bịaara ya. Kama, o diri ọnwụnwa ndị ahụ ma ka nwee okwukwe na Jehova, hụkwa ya n’anya. Kama iwewa iwe, ọsụkọsụ ana-asụgbu ya, ọ dị njikere n’oge niile ahụ ịgbaghara ndị ma ụma mee ya ihe ọjọọ. O nweghị mgbe ọ kwụsịrị inwe olileanya ma ọ bụ kwe ka ihe ọ bụla kpaa ihe kacha ya mkpa aka, ya bụ, ijisi Chineke ya aka ike.​—Job 27:5.

 Anyị niile kwesịrị ịtachi obi. O doro anya na Setan ga-agbalị ime ka obi daa anyị mbà otú o mere Job. Ma, ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe ma tachie obi, dị umeala n’obi, dị njikere ịgbaghara ndị ọzọ, kpebisie ike ijisi Chineke aka ike, anyịnwa nwekwara ike inwe olileanya ịdị ndụ mgbe ihe ga-adị ezigbo mma n’ọdịnihu. (Ndị Hibru 10:36) E nweghị ihe ga-aka wee Setan iwe ma ọ bụ mee Jehova, bụ́ Onye hụrụ anyị n’anya, obi ụtọ karịa anyịnwa inwe okwukwe ka Job.

a Elifaz, Bildad, na Zofa kwuru ọtụtụ okwu mgbe ha na-agwa Job okwu. Ihe ha kwuru ruru ihe dị ka isi akwụkwọ itoolu na Baịbụl. Ma, e nweghị otu ebe ha kpọrọ Job aha ya.

b Mgbe Jehova na-agwa Job okwu, e nwere oge ndị o ji ihe ndị a na-ahụ anya gwa ya okwu, nweekwa oge ndị o kwuru okwu ka ọ̀ na-atụrụ ya ilu ma ọ bụ na-amara ya atụ. (Ị chọọ ịhụ ihe atụ, gụọ Job 41:1, 7, 8, 19-21.) Na nke ọ bụla n’ime ha, ihe Chineke bu n’obi bụ ka o nyere Job aka ka ọ na-akwanyekwuru Onye kere ya ùgwù.

c Pọl onyeozi mechadịrị kwuo otu ihe bụ́ eziokwu Elifaz kwuru. (Job 5:13; 1 Ndị Kọrịnt 3:19) Ihe Elifaz kwuru bụ eziokwu doro anya, ma ikwu na o mezuru n’isi Job abụghị eziokwu.

d E nweghị ebe ọ bụla e kwuru na a gwara Job ka ọ chụọrọ nwunye ya àjà.