Levitikọs 4:1-35

  • Àjà mmehie (1-35)

4  Jehova wee gwa Mosis, sị: 2  “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Ọ bụ ihe a ka mmadụ* ga-eme ma ọ bụrụ na o mehie n’amaghị ụma+ wee mee nke ọ bụla n’ime ihe ndị Jehova nyere iwu ka a ghara ime: 3  “‘Ọ bụrụ na onye nchụàjà e tere mmanụ*+ emehie+ wee mee ka ikpe ma ndị Izrel, ọ ga-ewetara Jehova oké ehi ahụ́ dị mma ka ọ bụrụ àjà mmehie maka mmehie o mere.+ 4  Ọ ga-akpụta oké ehi ahụ n’ihu Jehova n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute+ ma bikwasị aka ya n’isi oké ehi ahụ. Ọ ga-egbukwa oké ehi ahụ n’ihu Jehova.+ 5  Onye nchụàjà ahụ e tere mmanụ*+ ga-eweretụ ọbara oké ehi ahụ ma weta ya n’ime ụlọikwuu nzute. 6  Onye nchụàjà ahụ ga-arụnye mkpịsị aka ya n’ọbara ahụ+ ma fesa ya n’ala n’ihu Jehova, n’ihu ákwà mgbochi e ji gechie ebe nsọ ahụ. Ọ ga-eme ya ugboro asaa.+ 7  Onye nchụàjà ahụ ga-eweretụ ọbara tee na mpi ndị dị n’ebe ịchụàjà insens na-esi ísì ọma,+ nke dị n’ihu Jehova n’ụlọikwuu nzute. Ọ ga-awụsakwa ọbara niile fọrọ n’ọbara oké ehi ahụ n’ala ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ,+ nke dị n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. 8  “‘Ọ ga-ewepụta abụba niile dị n’oké ehi ahụ e ji achụ àjà mmehie, ma abụba kpuchiri eriri afọ ya ma abụba niile dị gburugburu eriri afọ ya, 9  nakwa akụrụ ya abụọ na abụba dị n’elu ha bụ́ ndị dị n’akụkụ úkwù ya. Ọ ga-ewepụta abụba kpuchiri imeju ya, wepụtakwa akụrụ ya abụọ.+ 10  Ọ bụ ihe ndị ahụ a na-ewepụta n’oké ehi e ji achụ àjà udo+ ka ọ ga-ewepụta. Onye nchụàjà ahụ ga-esu ha ọkụ ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ. 11  “‘Ma akpụkpọ oké ehi ahụ, ya na anụ ya niile, isi ya, ụkwụ ya, eriri afọ ya, na nsị ya,+ 12  ya bụ, ihe niile fọrọ n’oké ehi ahụ, ka ọ ga-ahụ na e bupụrụ ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu ma buga ha n’ebe dị ọcha, n’ebe a na-ekpofu ntụ.* Ọ ga-edokwasị ha n’elu nkụ kpọọ ha ọkụ.+ Ọ bụ n’ebe a na-ekpofu ntụ ka a ga-akpọ ha ọkụ. 13  “‘Ọ bụrụ na ikpe ama nzukọ Izrel niile maka na ha mere mmehie n’amaghị ụma,+ ma ọgbakọ ahụ amaghị na ha emeela ihe Jehova nyere ha iwu ka ha ghara ime,+ 14  e wee mata na ha emehiela, ọgbakọ ahụ ga-eweta oké ehi ka ọ bụrụ àjà mmehie. Ha ga-eweta ya n’ihu ụlọikwuu nzute. 15  Ndị okenye nzukọ ahụ ga-ebikwasị aka ha n’isi oké ehi ahụ n’ihu Jehova, a ga-egbukwa oké ehi ahụ n’ihu Jehova. 16  “‘Onye nchụàjà e tere mmanụ* ga-eweretụ ọbara oké ehi ahụ ma weta ya n’ụlọikwuu nzute. 17  Onye nchụàjà ahụ ga-arụnye mkpịsị aka ya n’ọbara ahụ ma fesa ya n’ala n’ihu Jehova, n’ihu ákwà mgbochi.+ Ọ ga-eme ya ugboro asaa. 18  Ọ ga-eweretụ ọbara tee na mpi ndị dị n’ebe ịchụàjà+ nke dị n’ihu Jehova, n’ụlọikwuu nzute. Ọ ga-awụsakwa ọbara niile fọrọ afọ n’ala ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ, nke dị n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.+ 19  Ọ ga-ewepụta abụba niile dị n’oké ehi ahụ ma suo ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà.+ 20  Ọ ga-eme oké ehi a ihe o mere oké ehi nke ọzọ e ji chụọ àjà mmehie. Ọ bụ otú ọ ga-eme ya. Onye nchụàjà ga-ekpuchiri ha mmehie ha,+ a ga-agbagharakwa ha. 21  Ọ ga-ahụ na e bupụrụ oké ehi ahụ ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu ma kpọọ ya ọkụ, otú ọ kpọrọ oké ehi nke mbụ ahụ ọkụ.+ Ọ bụ àjà mmehie a ga-achụ maka ọgbakọ ahụ.+ 22  “‘Ọ bụrụ na onyeisi+ emee mmehie n’amaghị ụma wee mee otu n’ime ihe niile Jehova bụ́ Chineke ya nyere iwu ka a ghara ime, ikpe wee ma ya, 23  ma ọ bụkwanụ ya amata na ya adaala iwu, ọ ga-eweta nwa mkpi ahụ́ dị mma ka ọ bụrụ àjà ya. 24  Ọ ga-ebikwasị aka ya n’isi nwa mkpi ahụ ma gbuo ya n’ebe a na-egbu anụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ n’ihu Jehova.+ Ọ bụ àjà mmehie. 25  Onye nchụàjà ga-eji mkpịsị aka ya rụrụ ọbara anụ ahụ e ji achụ àjà mmehie ma tee ya na mpi+ ndị dị n’ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ. Ọ ga-awụsakwa ọbara ya fọrọ afọ n’ala ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ.+ 26  Ọ ga-esu abụba ya niile ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà otú a na-eme abụba àjà udo.+ Onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie ya, a ga-agbagharakwa ya. 27  “‘Ọ bụrụ na onye* ọ bụla ọzọ ná ndị m emehie n’amaghị ụma, ikpe ewee ma ya maka na o mere otu n’ime ihe ndị Jehova nyere iwu ka a ghara ime,+ 28  ma ọ bụkwanụ ya amata na ya emehiela, ọ ga-eweta nne ewu ahụ́ dị mma ka ọ bụrụ àjà ya maka mmehie o mere. 29  Ọ ga-ebikwasị aka ya n’isi anụ e ji achụ àjà mmehie ahụ ma gbuo ya n’otu ebe ahụ a na-egbu anụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ.+ 30  Onye nchụàjà ga-eji mkpịsị aka ya rụrụ ọbara anụ ahụ ma tee ya na mpi ndị dị n’ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ. Ọ ga-awụsakwa ọbara ya niile fọrọ afọ n’ala ebe ịchụàjà.+ 31  Ọ ga-ewepụta abụba ya niile,+ otú a na-ewepụta abụba ndị dị n’anụ e ji achụ àjà udo.+ Onye nchụàjà ga-esu ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, ka o wee bụrụ àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova. Onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie ya, a ga-agbagharakwa ya. 32  “‘Ma ọ bụrụ na ọ chọrọ iweta nwa atụrụ ka ọ bụrụ àjà maka mmehie ya, ọ ga-eweta obere nne atụrụ ahụ́ dị mma. 33  Ọ ga-ebikwasị aka ya n’isi anụ e ji achụ àjà mmehie ahụ ma gbuo ya n’ebe a na-egbu anụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ ka ọ bụrụ àjà mmehie.+ 34  Onye nchụàjà ga-eji mkpịsị aka ya rụrụ ọbara anụ ahụ e ji chụọ àjà mmehie ma tee ya na mpi ndị dị n’ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ.+ Ọ ga-awụsakwa ọbara ya niile fọrọ afọ n’ala ebe ịchụàjà. 35  Ọ ga-ewepụta abụba ya niile otú e si ewepụta abụba ndị dị n’ebule e ji achụ àjà udo. Onye nchụàjà ga-esu ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’elu àjà Jehova e suru ọkụ.+ Onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie o mere, a ga-agbagharakwa ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ọ bụ nnukwu onye nchụàjà ka a na-ekwu maka ya.
Ọ bụ nnukwu onye nchụàjà ka a na-ekwu maka ya.
Ma ọ bụ “ntụ ya na abụba gwakọtara,” ya bụ, abụba si n’àjà ndị a chụrụ.
Ọ bụ nnukwu onye nchụàjà ka a na-ekwu maka ya.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”