Gbasara Anyị

Ole Ndị Ka Ndịàmà Jehova Bụ?

Ndịàmà Jehova nọ n’ebe niile n’ụwa. Anyị na-efe Jehova, Onye kere ihe niile, onye bụ́kwa Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile. (Abụ Ọma 83:18; Mkpughe 4:11) Anyị bụ Ndị Kraịst. Anyị kweere na Jizọs Kraịst bụ Ọkpara Chineke nakwa Onye Nzọpụta anyị. (Jọn 3:16; Ọrụ Ndịozi 4:10-12) Ihe niile anyị kweere si na Baịbụl. (2 Timoti 3:16) Anyị na-agba gị ume ka i jiri ihe ndị e kwuru ebe a, jirikwa Baịbụl nke gị mata ma ihe ndị anyị kweere hà si na Baịbụl n’eziokwu.

Lee vidio bụ́ Olee Ndị Ka Ndịàmà Jehova Bụ? ka ị matakwuo banyere anyị.

Ihe Ole na Ole Gbasara Anyị

Matakwuo Gbasara Anyị ná Mba Dị Iche Iche

Frequently Asked Questions

Gịnị Ka Ndịàmà Jehova Kweere?

Chọpụta ihe ụfọdụ banyere ihe iri na ise só n’ihe bụ́ isi anyị kweere.

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Eme Ememme Ụfọdụ?

Gụọ gbasara ajụjụ atọ dị mkpa banyere Ndịàmà Jehova na ime ememme.

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Eme Ememme Ncheta Ụbọchị Ọmụmụ?

Lee ihe anọ mere Chineke anaghị anabata ememme ụbọchị ọmụmụ.

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Ekwe Ka A Mịnye Ha Ọbara?

E nwere ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu gbasara Ndịàmà Jehova na ịmịnye mmadụ ọbara. Gụọ ihe a ka ị mata ihe anyị kweere n’ihe gbasara ịmịnye mmadụ ọbara.

Ndịàmà Jehova Hà Bụ Ndị Kraịst?

Biko, legodị ihe ụfọdụ mere anyị ji dị iche na chọọchị ndị na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst.

Ajụjụ Ndị Ọzọ A Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova

Ị ga-ahụ azịza ọtụtụ ajụjụ ị chọrọ ịjụ gbasara anyị.

Contact Us

Gwa Anyị Ka Anyị na Gị Mụwa Baịbụl

A ga-eji Baịbụl zaa gị ajụjụ ị jụrụ, ma ọ bụkwanụ mee ka ị matakwuo gbasara Ndịàmà Jehova.

Gaa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova

Mata gbasara ọmụmụ ihe anyị. Chọta ebe anyị na-amụ ihe dị gị nso.

Kpọtụrụ Ndịàmà Jehova

Chọpụta otú ị ga-esi kpọtụrụ anyị n’ụlọ anyị ọ bụla.

Ihe A Na-eme n’Ụlọ Ọrụ Anyị na Oge E Ji Aga Elegharị Anya Ebe Ahụ

Chọpụta ụlọ ọrụ anyị nke dị gị nsọ. Chọpụtakwa oge mmadụ nwere ike ịga legharịa anya ebe ahụ.