Anyị Na-akpọ Gị Ka Ị Bịa

Ncheta Ọnwụ Jizọs

Tọzdee, Eprel 2, 2026

Anyị na-akpọ gị ka ị bịa nnọkọ abụọ a, a gaghịkwa ana gị ego

Okwu Pụrụ Iche A Ga-esi na Baịbụl Kwuo

“Ònye Ga-eme Ka Ụwa Dịghachi Mma?”

Ị ga-amụta ọmarịcha ihe dị iche iche Chineke ga-emere ụmụ mmadụ nakwa ndị ọ ga-eme n’ụwa a n’ọdịnihu.

Gosi M Ebe A Ga-anọ Ekwu Okwu A Pụrụ Iche

Ncheta Ọnwụ Jizọs

Ná nnọkọ a dị ezigbo mkpa, Ndịàmà Jehova ga-echeta ọnwụ Jizọs otú o nyere anyị iwu ka anyị na-eme.​—Luk 22:19.

Ajụjụ Ndị A Na-ajụkarị Banyere Nnọkọ Abụọ A

Olee ndị nwere ike ịbịa?

Onye ọ bụla nwere ike ịbịa. Kpọrọ ndị ezinụlọ gị bịa.

Awa ole ka ha ga-ewe?

Okwu pụrụ iche a ga-esi na Baịbụl kwuo ga-ewe nkeji iri atọ. E kwuchaa ya, a ga-amụ otu isiokwu si na Baịbụl nke ndị na-ege ntị nwere ike itinye ọnụ.

Ncheta Ọnwụ Jizọs ga-ewe ihe dị ka otu awa.

Olee ebe a ga-anọ eme ha?

Ị chọọ ịmata ebe a ga-anọ eme ha, gaa n’elu pịa ebe e dere “Gosi M Ebe A Ga-anọ Eme Ncheta Ọnwụ Jizọs” nakwa “Gosi M Ebe A Ga-anọ Ekwu Okwu A Pụrụ Iche.”

M̀ ga-akwụ ụgwọ tupu mụ abata ma ọ bụ buru ụzọ kweta na m ga-abịa nnọkọ ndị ọzọ?

Mba.

À ga-ana ụtụ?

Mba. Anyị anaghị ana ụtụ n’ọmụmụ ihe anyị.​—Matiu 10:8.

È nwere ụdị uwe a chọrọ ka mmadụ yiri bịa?

Mba. Ma, Ndịàmà Jehova na-agbalị iji ejiji dị mma. Ọ na-egosi na ha ji nnọkọ ha kpọrọ ihe.

Gịnị ka a na-eme ná Ncheta Ọnwụ Jizọs?

A na-eji abụ na ekpere ebido ya, jirikwa abụ na ekpere mechie ya. Ọ bụ Onyeàmà Jehova na-ekpe nke ọ bụla n’ekpere ndị a. A na-esikwa na Baịbụl ekwu okwu ga-akọwa uru ọnwụ Jizọs bara na otú anyị ga-esi rite uru n’ihe Chineke na Jizọs meere anyị.

Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Mere Otú Ndịàmà Jehova Si Eme Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị Ji Dị Iche n’Otú Chọọchị Ndị Ọzọ Si Eme Ya?

Olee mgbe a ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs n’ọdịnihu?

2026: Tọzdee, Eprel 2

2027: Mọnde, Mach 22

2028: Sọnde, Eprel 9

Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ, lee vidio ndị a.

Na-echeta Ọnwụ Jizọs

Na vidio a, ị ga-ahụ ihe ndị a na-eme ná Ncheta Ọnwụ Jizọs, matakwa ihe ọma ndị ga-emere anyị n’ọdịnihu n’ihi ọnwụ Jizọs.

Gịnị Mere Jizọs Ji Nwụọ?

Ọ ga-abụ na ị nụla na Jizọs nwụrụ maka mmehie anyị. Ma, olee otú ọnwụ otu onye ga-esi abara ọtụtụ nde mmadụ uru?

Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?

Jiri anya gị hụrụ ihe na-eme na ya.

Pịa ebe a ka i were akwụkwọ ịkpọ òkù a n’ụdị ya ọ bụla ị chọrọ.