Job 32:1-22

  • Elaịhu tinyere ọnụ n’ihe a na-ekwu (1-22)

    • O wesara Job na ndị enyi Job iwe (2, 3)

    • O cheere ka ndị ọzọ kwuchaa tupu ya ekwuwe (6, 7)

    • Ọ bụghị naanị afọ ole mmadụ dị na-eme ka ọ mara ihe (9)

    • Ọ na-enu Elaịhu enu ikwu okwu (18-20)

32  Ụmụ nwoke atọ a kwụsịrị ịgbalị ka ha saa Job okwu maka na o kwetasiri ike na ya bụ onye ezi omume.*+  Ma ezigbo iwe were Elaịhu nwa Barakel, onye si n’agbụrụ Bọz,+ n’ezinụlọ Ram. O wesara Job oké iwe maka na Job na-agbalị ka o gosi na ya bụ onye ezi omume kama igosi na ọ bụ Chineke bụ onye ezi omume.+  O wesakwara ndị enyi Job atọ oké iwe maka na e nweghị ezigbo ihe ha sara Job, kama ha kwuru na Chineke bụ onye ọjọọ.+  Elaịhu nọ na-eche ka ndị ọzọ kwuchaa tupu ya agwa Job ihe ọ chọrọ ịgwa ya, n’ihi na ha niile tọrọ ya.+  Mgbe Elaịhu hụrụ na ụmụ nwoke atọ a enweghịzi ihe ha ga-ekwu, ezigbo iwe were ya.  Elaịhu nwa Barakel onye si n’agbụrụ Bọz wee malite ikwu okwu. Ọ sịrị: “Abụ m nwata,Ma unu bụ ndị okenye.+ Ọ bụ ya mere m ji kwanyere unu ùgwù ghara ikwu okwu,+Anwaghịkwa m ịgwa unu ihe m ma.   M kwuru n’obi m, sị, ‘Ka ndị okenye kwuo okwu. Ka ndị dịrịla ndụ ọtụtụ afọ kwuo okwu ka ndị ma ihe.’   Ma, ọ bụ mmụọ nsọ nke Chineke na-enye ndị mmadụ,Bụ́ ume nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, na-eme ka ha ghọta ihe.+   Ọ bụghị naanị afọ ole mmadụ dị na-eme ka ọ mara ihe,Ọ bụghịkwa naanị ndị mere agadi na-aghọta ihe dị mma.+ 10  Ọ bụ ya mere m ji asị, ‘Geenụ m ntị. M ga-agwakwa unu ihe m ma.’ 11  M nọ na-eche ka unu kwuchaa. M nọ na-ege ntị n’ihe unu na-akọwa+Mgbe unu nọ na-achọ ihe unu ga-ekwu.+ 12  M gere unu ntị nke ọma,Ma e nweghị onye n’ime unu mere ka Job mata na ihe ọ na-ekwu abụghị eziokwu*Ma ọ bụ saa ya ihe ndị o kwuru. 13  N’ihi ya, unu ekwula, sị, ‘Anyị ma ihe. Ọ bụ Chineke ga-agwa ya na ihe ọ na-ekwu abụghị eziokwu, ọ bụghị mmadụ.’ 14  Ọ bụghị m ka ọ gwara ihe ndị o kwuru. N’ihi ya, agaghị m asa ya ihe ndị unu sara ya. 15  Ụjọ ji ha. Ha enweghịzi ihe ha ga-asa ya. Okwu agwụla ha n’ọnụ. 16  M nọ na-echere, ma e nweghịzi ihe ha na-ekwu. Ha kwụ ebe ahụ. E nweghịzi ihe ha na-asa ya. 17  Ọ bụ ya mere mụnwa ga-eji saa ya okwu. M ga-ekwukwa ihe m ma, 18  N’ihi na okwu juru m ọnụ. Mmụọ Chineke nke dị n’ime m na-enu m enu ka m kwuo okwu. 19  Ime ahụ́ m dị ka mmanya na-enweghị ebe o si ekupụ,Ka karama akpụkpọ ọhụrụ chọrọ ịgbawa agbawa.+ 20  Ka m kwuo okwu ka ahụ́ dajụọ m. M ga-emeghe ọnụ m kwuo okwu. 21  Agaghị m ele onye ọ bụla anya n’ihu.+ Agaghịkwa m eto onye ọ bụla otuto elu ọnụ,* 22  N’ihi na amaghị m otú e si eto mmadụ otuto elu ọnụ. Ọ bụrụ na m na-eme otú ahụ, Onye kere m ga-ebibi m ngwa ngwa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “maka na ọ bụ onye ezi omume n’anya onwe ya.”
Ma ọ bụ “baara Job mba.”
Ma ọ bụ “etu onye ọ bụla aha.”