Job 32:1-22
32 Ụmụ nwoke atọ a kwụsịrị ịgbalị ka ha saa Job okwu maka na o kwetasiri ike na ya bụ onye ezi omume.*+
2 Ma ezigbo iwe were Elaịhu nwa Barakel, onye si n’agbụrụ Bọz,+ n’ezinụlọ Ram. O wesara Job oké iwe maka na Job na-agbalị ka o gosi na ya bụ onye ezi omume kama igosi na ọ bụ Chineke bụ onye ezi omume.+
3 O wesakwara ndị enyi Job atọ oké iwe maka na e nweghị ezigbo ihe ha sara Job, kama ha kwuru na Chineke bụ onye ọjọọ.+
4 Elaịhu nọ na-eche ka ndị ọzọ kwuchaa tupu ya agwa Job ihe ọ chọrọ ịgwa ya, n’ihi na ha niile tọrọ ya.+
5 Mgbe Elaịhu hụrụ na ụmụ nwoke atọ a enweghịzi ihe ha ga-ekwu, ezigbo iwe were ya.
6 Elaịhu nwa Barakel onye si n’agbụrụ Bọz wee malite ikwu okwu. Ọ sịrị:
“Abụ m nwata,Ma unu bụ ndị okenye.+
Ọ bụ ya mere m ji kwanyere unu ùgwù ghara ikwu okwu,+Anwaghịkwa m ịgwa unu ihe m ma.
7 M kwuru n’obi m, sị, ‘Ka ndị okenye kwuo okwu.
Ka ndị dịrịla ndụ ọtụtụ afọ kwuo okwu ka ndị ma ihe.’
8 Ma, ọ bụ mmụọ nsọ nke Chineke na-enye ndị mmadụ,Bụ́ ume nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, na-eme ka ha ghọta ihe.+
9 Ọ bụghị naanị afọ ole mmadụ dị na-eme ka ọ mara ihe,Ọ bụghịkwa naanị ndị mere agadi na-aghọta ihe dị mma.+
10 Ọ bụ ya mere m ji asị, ‘Geenụ m ntị.
M ga-agwakwa unu ihe m ma.’
11 M nọ na-eche ka unu kwuchaa.
M nọ na-ege ntị n’ihe unu na-akọwa+Mgbe unu nọ na-achọ ihe unu ga-ekwu.+
12 M gere unu ntị nke ọma,Ma e nweghị onye n’ime unu mere ka Job mata na ihe ọ na-ekwu abụghị eziokwu*Ma ọ bụ saa ya ihe ndị o kwuru.
13 N’ihi ya, unu ekwula, sị, ‘Anyị ma ihe.
Ọ bụ Chineke ga-agwa ya na ihe ọ na-ekwu abụghị eziokwu, ọ bụghị mmadụ.’
14 Ọ bụghị m ka ọ gwara ihe ndị o kwuru.
N’ihi ya, agaghị m asa ya ihe ndị unu sara ya.
15 Ụjọ ji ha. Ha enweghịzi ihe ha ga-asa ya.
Okwu agwụla ha n’ọnụ.
16 M nọ na-echere, ma e nweghịzi ihe ha na-ekwu.
Ha kwụ ebe ahụ. E nweghịzi ihe ha na-asa ya.
17 Ọ bụ ya mere mụnwa ga-eji saa ya okwu.
M ga-ekwukwa ihe m ma,
18 N’ihi na okwu juru m ọnụ.
Mmụọ Chineke nke dị n’ime m na-enu m enu ka m kwuo okwu.
19 Ime ahụ́ m dị ka mmanya na-enweghị ebe o si ekupụ,Ka karama akpụkpọ ọhụrụ chọrọ ịgbawa agbawa.+
20 Ka m kwuo okwu ka ahụ́ dajụọ m.
M ga-emeghe ọnụ m kwuo okwu.
21 Agaghị m ele onye ọ bụla anya n’ihu.+
Agaghịkwa m eto onye ọ bụla otuto elu ọnụ,*
22 N’ihi na amaghị m otú e si eto mmadụ otuto elu ọnụ.
Ọ bụrụ na m na-eme otú ahụ, Onye kere m ga-ebibi m ngwa ngwa.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “maka na ọ bụ onye ezi omume n’anya onwe ya.”
^ Ma ọ bụ “baara Job mba.”
^ Ma ọ bụ “etu onye ọ bụla aha.”