AJỤJỤ NDỊ MMADỤ NA-AJỤKARỊ

Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Ele Olili Ozu Anya?

Igbo
Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Ele Olili Ozu Anya?
https://cms-imgp.jw-cdn.org/img/p/502016216/univ/art/502016216_univ_sqr_xl.jpg
ijwfq isiokwu 50

Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Ele Olili Ozu Anya?

Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Ele Olili Ozu Anya?

 Ọ bụ ihe Baịbụl kwuru mere anyị ji ele olili ozu anya otú anyị si ele ya, ọ bụkwa ya mere anyị ji eme ihe ndị anyị na-eme n’oge a na-eli ozu. Lee ụfọdụ n’ime ha:

  •   Mmadụ iru uju ma onye nke ya nwụọ adịghị njọ. Ndị na-eso ụzọ Jizọs ruru uju mgbe ndị nke ha nwụnahụrụ ha. (Jọn 11:33-35, 38; Ọrụ Ndịozi 8:2; 9:39) Ọ bụ ya mere na anyị anaghị ewere oge olili ozu ka oge oriri na nkwari. (Ekliziastis 3:1, 4; 7:1-4) Kama, anyị na-ewere ya ka oge e kwesịrị ịkasi ndị na-eru uju obi.​—Ndị Rom 12:15.

  •   Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla. N’agbanyeghị agbụrụ anyị si ma ọ bụ omenala a na-eme n’obodo anyị, anyị anaghị eme omenala ma ọ bụ ihe ndị ọzọ Baịbụl na-akwadoghị ndị mmadụ na-eme maka na ha kweere na ndị nwụrụ anwụ ka dị ndụ nakwa na ha nwere ike inyere ndị dị ndụ aka ma ọ bụ mesie ha ike. (Ekliziastis 9:5, 6, 10) Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ bụ ịmụrụ onye nwụrụ anwụ anya abalị, imere onye nwụrụ anwụ nnukwute ememme olili ozu ma ọ bụ ememme ịkwa ozu, ịchụrụ ndị nwụrụ anwụ àjà, ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase, ịrịọ ha arịrịọ, nakwa ịgba mkpe. Anyị anaghị etinye aka n’omenala niile ahụ n’ihi na anyị na-erube isi n’iwu dị na Baịbụl nke bụ́: “Nọrọkwanụ iche. Unu emetụzila ihe na-adịghị ọcha aka.”​—2 Ndị Kọrịnt 6:17.

  •   Olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ. Baịbụl na-akụziri anyị na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ nakwa na oge na-abịa mgbe ọnwụ na-agaghịzi adị. (Ọrụ Ndịozi 24:15; Mkpughe 21:4) Olileanya a nyeere Ndị Kraịst oge ochie aka, ọ na-enyekwara anyị aka ka anyị ghara ịna-eru uju ka ndị na-enweghị olileanya.​—1 Ndị Tesalonaịka 4:13.

  •   Baịbụl gwara anyị ka anyị na-emeru ihe n’ókè. (Ilu 11:2) Oge olili ozu abụghị oge ‘mmadụ kwesịrị igosi’ na ọ bụ aka ji akụ̀ ma ọ bụ onye a ma ama. (1 Jọn 2:16) Anyị anaghị akwadebe olili ozu ga-efu nnukwu ego iji mee ndị mmadụ obi ụtọ ma ọ bụkwanụ zụọ igbe ozu na uwe dara oké ọnụ ka ndị mmadụ jawa anyị ike.

  •   Anyị anaghị amanye ndị ọzọ ka ha kweta ihe anyị kweere gbasara olili ozu. N’ihe gbasara olili ozu, anyị na-esoro ihe a Baịbụl kwuru: “Onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.” (Ndị Rom 14:12) Ma, ọ bụrụ na mmadụ enye anyị ohere, anyị ‘na-emeda obi’ kọwaara ya ihe anyị kweere, anyị ‘na-akwanyekwara ya ezigbo ùgwù mgbe anyị na-akọwa ya.’​—1 Pita 3:15.

Onyeàmà Jehova nwụọ, olee otú Ndịàmà Jehova si eli ya?

 Ebe a ga-anọ: Ọ bụrụ na ezinụlọ mmadụ nwụnahụrụ ekpebie na a ga-ekwuru onye nwụnahụrụ ha okwu olili ozu, ọ bụ hanwa ga-ekwu ebe a ga-anọ ekwu ya. O nwere ike ịbụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, n’ụlọ onye ahụ nwụrụ anwụ, ma ọ bụ n’akụkụ ebe a ga-eli ya.

 Ihe a na-eme: A na-ekwu okwu si na Baịbụl iji kasie ndị mmadụ nwụnahụrụ obi. A na-akọwakwa ihe Baịbụl kwuru gbasara ọnwụ nakwa olileanya e nwere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. (Jọn 11:25; Ndị Rom 5:12; 2 Pita 3:13) N’okwu ahụ, a ga-ekwu àgwà ọma ụfọdụ e ji mara onye ahụ nwụrụ anwụ. E nwekwara ike ikwu ihe ọma ndị ọzọ nwere ike ịmụta n’otú o si rubere Jehova isi.​—2 Samuel 1:17-27.

 E nwere ike ịbụ abụ si na Baịbụl. (Ndị Kọlọsi 3:16) A ga-ekpe ekpere na-akasi obi, jiri ya pịachie ihe omume ahụ.​—Ndị Filipaị 4:6, 7.

 Ịkwụ ụgwọ ma ọ bụ ịna ụtụ: Anyị anaghị ana ndị mmadụ ego ma e kwuoro ha okwu si na Baịbụl ma ọ bụ ma e kwuoro ha okwu olili ozu, anyị anaghịkwa asị ndị mmadụ tụọ ụtụ n’ọmụmụ ihe anyị.​—Matiu 10:8.

 Ndị ga-abịa: Ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova nwere ike ịbịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze gere okwu olili ozu. Onye ọ bula nwere ike ịbịa nnọkọ a otú ahụ onye ọ bụla nwekwara ike ịbịa ọmụmụ ihe anyị ndị ọzọ.

Ndịàmà Jehova hà na-aga olili ozu ndị okpukpe ndị ọzọ haziri?

 Onyeàmà Jehova ọ bụla na-eji akọnuche ya e ji Baịbụl zụọ kpebiere onwe ya ma ọ̀ ga-aga ma ọ̀ bụ na ọ gaghị aga. (1 Timoti 1:19) Ma, anyị anaghị eso okpukpe ndị ọzọ eme ihe ndị anyị ma na Baịbụl akwadoghị.​—2 Ndị Kọrịnt 6:14-17.