Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

Ndụ M Bịara Na-aka Njọ

Ndụ M Bịara Na-aka Njọ
  • A MỤRỤ M N’AFỌ: 1952

  • ABỤ M ONYE: AMERỊKA

  • NDỤ M BIRI: ANA M EWE IWE ỌKỤ

NDỤ M BIRI NA MBỤ:

Etoro m na Lọs Anjelis nke dị na Kalịfọnịa dị n’Amerịka. Ndị ọjọọ na ndị na-aṅụ ọgwụ ike juru n’ebe ndị mụ na ndị ezinụlọ anyị biri na Lọs Anjelis. Abụ m nwa nke abụọ n’ime ụmụ isii nne na nna m mụrụ.

Mama anyị na-akpọ anyị aga chọọchị. Ma, mgbe m tolitewere, m biwere ndụ ọjọọ na nzuzo. M nọ n’òtù ukwe chọọchị anyị. N’ụbọchị Sọnde ọ bụla, m na-eso ha ekwe ukwe. Ma, n’ụbọchị ndị ọzọ, m na-aṅụ ọgwụ ọjọọ, na-aga atụrụ ndụ n’ụlọ oriri na nkwari, na-akwakwa iko.

M na-ewekarị iwe ọkụ. M na-eji ihe ọ bụla ruru m aka alụ ọgụ. O nweghịdị uru chọọchị m na-aga baara m. M na-ekwukarị na “ọ bụ Onyenwe anyị nwe ịbọ ọbọ, ma o ji m mere ngwá ọrụ o ji abọ ọbọ.” Mgbe m na-aga ụlọ akwụkwọ sekọndrị n’ihe dị ka n’agbata afọ 1967 na afọ 1969, ihe òtù a na-akpọ Black Panthers na-eme bidoro masịwa m nke na m bidoro mewe ka ha. Òtù a bụ òtù na-azọchitere ndị a na-emegbu emegbu. M banyere n’òtù ụmụ akwụkwọ na-achọ ihe ruuru ha. Anyị mere ngagharị iwe mgbe ụfọdụ. Mgbe ọ bụla anyị mere ya, a na-emechi ụlọ akwụkwọ anyị ruo oge ụfọdụ.

Ka oge na-aga, ngagharị iwe anaghịzi ezuru m ime ihe ike otú m chọrọ. Ọ bụ ya mere m ji bido iso ndị ọzọ na-emekpọ ndị na-abụghị ndị agbụrụ anyị ọnụ. Dị ka ihe atụ, e nwere otu ụbọchị mụ na ndị enyi m gara ebe a na-ele fim, e tinye fim gosiri otú e si taa ndị Afrịka ahụhụ mgbe ha gbara ohu n’Amerịka, iwe eju anyị obi, anyị ebido kụwa ụmụ ndị ọcha sokwa na-ele fim ahụ ihe. Mgbe anyị si ebe ahụ pụọ, anyị gawara ebe ndị ọcha bi, na-achọ ndị ọzọ anyị ga-akụ ihe.

Tupu mụ eruo afọ iri abụọ, mụ na ụmụnne m ndị nwoke atọ aghọọla ndị omekome a ma ama. Ndị uwe ojii na-achụgharị anyị ka ha nwụchie anyị. Otu n’ime ụmụnne m ndị nwoke m tọrọ nọ n’òtù ọjọọ a ma ama. Mụ na ha na-akpakwa. Ndụ m bịara na-aka njọ.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:

E nwere otu enyi m ndị mụrụ ya bụ Ndịàmà Jehova. Otu ụbọchị, ha gwara m ka m soro ha gaa ọmụmụ ihe ha, mụ ekweta. Malite n’ụbọchị mbụ m gara ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, m chọpụtara na otú ha si eme ihe dị iche. Onye ọ bụla jicha Baịbụl nke ya, na-asapetakwa ebe ndị a na-agụ. Ụmụaka sochadị ná ndị kụziri ihe n’ụbọchị ahụ. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ mgbe m matara na Chineke nwere aha, nakwa na aha ya bụ Jehova. Obi tọkwara m ụtọ na a na-akpọ aha Chineke n’ọmụmụ ihe ha. (Abụ Ọma 83:18) Ndị nọ n’ọgbakọ ahụ si n’agbụrụ dị iche iche, ma ha anaghị asọ ibe ha asọ.

Achọbughị m ka Ndịàmà Jehova mụwara m Baịbụl, ma achọrọ m ịna-aga ọmụmụ ihe ha. N’otu abalị m gara ọmụmụ ihe ha, ụfọdụ ndị enyi m gawara ebe a na-eme egwuregwu. Ka ha nọ ebe ahụ, ha hụrụ otu nwa okorobịa yi jaket e ji akpụkpọ anụ mee, gwa ya ka o nye ha jaket ahụ, ya ajụ. Ha kụwara ya ihe, kụgbuo ya. N’echi ya, ha ji ihe ahụ ha mere na-etu ọnụ. Mgbe a na-ekpe ha ikpe n’ụlọikpe, ọ dịghịdị ha ka è nwere ezigbo ihe ha mere. A tụrụ ọtụtụ n’ime ha nga mkpụrụ ọka. Obi tọgburu m atọgbu na esoghị m ha n’abalị ahụ. Ekpebiri m ịgbanwe ndụ m ma bido mụwa Baịbụl.

Ebe ọ bụ na m kpọrọ agbụrụ ọzọ asị, na-ahụkwa ọtụtụ ndị ọzọ dị ka m, ihe m hụrụ n’ebe Ndịàmà Jehova nọ tụrụ m n’anya. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe otu nwoke onye ọcha bụ́ Onyeàmà Jehova chọrọ ịga ihe ná mba ọzọ, ya agwa otu ezinụlọ Ndịàmà Jehova ibe ya bụ́ ndị isi ojii ka ha lekọtara ya ụmụ ya. E nwekwara mgbe otu nwa okorobịa onye isi ojii na-achọ ebe ọ ga-ebi, otu ezinụlọ bụ́ ndị ọcha agwa ya ka ọ bịa ka ha na ya biri. Ọ bịara doo m anya na ọ bụ Ndịàmà Jehova na-akpa àgwà dabara n’ihe Jizọs kwuru na Jọn 13:35. Ọ sịrị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” Ugbu a ka m nwetara ezigbo ụmụnna hụrụ ibe ha n’anya.

M mụtara na Baịbụl na m kwesịrị ịgbanwe otú m si ele ndị agbụrụ ọzọ anya. M chọpụtara na m kwesịrị ịgbalị ka mụ na ndị ọzọ na-adị n’udo nakwa na ọ bụ ihe bara uru m kwesịrị iji ndụ m na-eme. (Ndị Rom 12:2) M ji nwayọọ nwayọọ gbanwee. N’ọnwa Jenụwarị afọ 1974, e mere m baptizim, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova.

M chọpụtara na m kwesịrị ịgbalị ka mụ na ndị ọzọ na-adị n’udo nakwa na ọ bụ ihe bara uru m kwesịrị iji ndụ m na-eme

N’agbanyeghị na emeela m baptizim, o nwere mgbe ụfọdụ ọ na-esiri m ike ijide onwe m ma a kpasuo m iwe. Dị ka ihe atụ, e nwere otu ụbọchị anyị nọ n’ozi ọma, mụ adọwa ụgbọala m otu ebe na-aga. Obere oge, mụ ahụ ka otu onye ohi bịara tụrụ redio dị n’ụgbọala m. Mụ achụwa ya. Mgbe m chụkwutewere ya, ya atụsa redio ahụ n’ala gbalaga. Mgbe m kọọrọ ndị mụ na ha so ihe merenụ, otu n’ime ha bụ́ okenye ọgbakọ jụrụ m, sị: “Stephen, gịnịdị ka ị gaara eme ma á sị na i jidere onye ohi ahụ?” Ihe ahụ ọ jụrụ m mere ka m chebara onwe m echiche, meekwa ka m na-agbakwu mbọ ka mụ na ndị ọzọ na-adị ná mma.

N’ọnwa Ọktoba afọ 1974, m bidoro ikwusa ozi ọma oge niile, na-eji otu narị awa akụziri ndị mmadụ Baịbụl kwa ọnwa. Ka oge na-aga, a kpọrọ m ịga rụwa ọrụ n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Bruklin dị na Niu Yọk. N’afọ 1978, m laghachiri Lọs Anjelis ka m nwee ike ilekọta mama m ahụ́ na-adịghị. Mgbe afọ abụọ gachara, m lụrụ nwaanyị. Aha nwunye m bụ Aarhonda. O nyeere m ezigbo aka ilekọta mama m ruo mgbe mama m nwụrụ. Ka oge na-aga, mụ na nwunye m gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Mgbe anyị gụchara, e zigara anyị Panama, bụ́ ebe anyị ka nọ na-ekwusa ozi ọma oge niile.

Kemgbe m mechara baptizim, e nweela ọtụtụ ihe merenụ nke gaara eme ka m jiri iwe mebie ihe. Ma, amụtala m isi n’ebe ndị chọrọ ịkpasu m iwe nọ pụọ ma ọ bụkwanụ ijide onwe m ma a kpasuo m iwe. Ma nwunye m ma ọtụtụ ndị ọzọ ajaala m mma n’ihi otú m si ejide onwe m ma a kpasuo m iwe. Ọ na-ejudị mụnwa anya na agbanweela m. Ama m na ọ bụghị n’ike m. Kama, ọ bụ ike Baịbụl kpara n’ahụ́ m mere m ji gbanwee.—Ndị Hibru 4:12.

URU NDỊ M RITERELA:

Baịbụl enyerela m aka ka ndụ m nwee isi. O nyekwarala m aka ịma ihe m ga-eme ka mụ na ndị ọzọ na-adị n’udo. Anaghịzi m akụ ndị mmadụ ihe. Kama, m na-eji Baịbụl enyere ha aka ka ndụ ha ka mma. E nwedịrị onye mụ na ya na-adịghị ná mma mgbe anyị nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị m kụziiri Baịbụl, ya emee baptizim. Mgbe e mechara ya baptizim, mụ na ya biri n’otu ọnụ ụlọ ruo oge ụfọdụ. Mụ na ya bụ ezigbo enyi kemgbe ahụ. Mụ na nwunye m akụzierela ihe karịrị mmadụ iri asatọ Baịbụl, ha aghọọ Ndịàmà Jehova.

M na-ekele Jehova na o mere ka ndụ m nwee isi, meekwa ka m nweta ezigbo ụmụnna na-eme m obi ụtọ.